13 N’ihi ya, okwu Jehova ga-adị ha ka:
“E nye iwu, e nyeghachi iwu. E nye iwu, e nyeghachi iwu,
N’ahịrị n’ahịrị, n’ahịrị n’ahịrị,+
Ntakịrị n’ebe a, ntakịrị n’ebe ahụ.”
N’ihi ya, ha gawa ije,
Ha ga na-adagharị, jiri azụ daa,
Merụọ ahụ́, a mata ha n’ọnyà, jidekwa ha.+