13 “Emeela m ka otu onye pụta maka na m na-eme ezi omume.+
M ga-emekwa ka ihe ọ bụla ghara ịnọchiri ya ụzọ.
Ọ bụ ya ga-arụ obodo m.+
Ọ ga-ahapụkwa ndị m a dọọrọ n’agha ka ha laa.+ Ọ gaghị asị ka a kwụọ ya ụgwọ. Ọ gaghịkwa anara aka azụ.”+ Ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru ihe a.