16 Ndị na-ahụ gị ga-ekporopụ anya na-ele gị.
Ha ga-eleru gị anya ma sị,
‘Ọ̀ bụ onye a bụ onye ahụ nọ na-eme ka ụwa maa jijiji,
Onye nọkwa na-emenye alaeze dị iche iche ụjọ?+
17 Ọ̀ bụ ya bụ onye mere ka ụwa niile dị ka ala ịkpa,
Meriekwa obodo ndị dị na ya,+
Onye na-anaghịkwa ekwe ahapụ ndị o ji eji ka ha laa?’+