14 Ọkụ bidoro rewe alaka ya ndị buru ibu, sikwa na ya repịa alaka ya ndị obere nakwa mkpụrụ ya.
O nweghịkwa alaka ọ bụla siri ike fọrọ na ya. E nweghị nke e nwere ike iji pịa mkpara ndị na-achị achị na-eji.+
“‘Ihe a bụ abụ iru uju. Ọ ga-abụkwa abụ iru uju a ma ama.’”