15 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: ‘N’ụbọchị ọ ga-abanye n’ili, m ga-eme ka ndị mmadụ ruo uju. M ga-eji maka ya kpochie mmiri miri emi, meekwa ka iyi ya kwụsị ịsọ asọ, ka mmiri ya gharazie ihi nne. M ga-ejikwa maka ya mee ka Lebanọn gbaa ọchịchịrị. Osisi niile dị n’ọhịa ga-akpọnwụkwa.