16 M ga-eme ka mba niile maa jijiji ma ha nụ ụda ọdịda ya mgbe m ga-eme ka ọ banye n’ili, ya na ndị niile na-abanye n’olulu. A ga-akasikwa osisi niile dị n’Iden+ obi n’ime ala, ha na ezigbo osisi Lebanọn ndị kacha mma, nakwa osisi niile mmiri gbara gburugburu.