17 O wee jụọ ya nke ugboro atọ, sị: “Saịmọn nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya?” O wee wute Pita na ọ jụrụ ya nke ugboro atọ, sị: “Ị̀ hụrụ m n’anya?” Pita wee sị ya: “Onyenwe anyị, ị ma ihe niile. Ị ma na m hụrụ gị n’anya.” Jizọs sịziri ya: “Na-enye ụmụ atụrụ m nri.+