14 Nke a bụ nke ugboro atọ m ga-abịa hụ unu, agaghịkwa m abụrụ unu ibu arọ ma m bịa. N’ihi na ọ bụ unu ka m na-achọ, ọ bụghị ihe unu nwere.+ N’ihi na a naghị atụ anya ka ụmụ+ kpata akụ̀ dowere ndị mụrụ ha, kama a na-atụ anya ka ndị nne na nna kpata akụ̀ dowere ụmụ ha.