‘Inye Ezinụlọ Mmadụ Ihe Na-akpa Ha’—Izute Ihe Ịma Aka Ya n’Ala Ndị Na-emepe Emepe
“MA Ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha, ma nke kachasị ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnarịwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” Otú ahụ ka Pọl onyeozi kwuru. (1 Timoti 5:8) Ọ bụ ezie na ịzụlite ezinụlọ aghọwo ihe na-esiwanye ike ná mba ndị bara ọgaranya, ime otú ahụ n’ala na-emepe emepe ọtụtụ mgbe na-eweta ọbụna ihe ịma aka siri ike karị.
Dị ka ihe atụ, n’Africa, ihe isi ike akụ̀ na ụba bụ ọnọdụ a na-ahụkarị, ọ bụghị ihe a na-adịghị ahụkebe. Ọrụ dị ụkọ, mgbe ha dịkwa, ọ pụrụ ịdị mkpa ka di na nwunye rụọ ọrụ iji nye nanị ihe e ji ebi ndụ. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka ndị isi ezinụlọ gaa ebe dị anya iji chọta ọrụ, na-ahapụ nwunye na ụmụ ha ruo ọtụtụ ọnwa—ma ọ bụ afọ. Ụlọ zuru ezu pụkwara isi ike inweta. Ọtụtụ ezinụlọ Africa buru ibu; ya mere ebe obibi na-akpa akpa, n’enweghị ihe ndị bụ isi dị mkpa ná ndụ. Ọnọdụ ndị na-adịghị mma na-ejupụtakarị.
Tụkwasị na nke a, omenala ógbè, ọdịnala nọworo ogologo oge, na echiche ndị na-ewu ewu pụrụ imegide mmụọ nke Okwu Chineke, bụ́ Bible. Tụlee ụfọdụ àgwà ndị jupụtara ebe nile banyere alụmdi na nwunye na ụmụaka. Ụfọdụ ndị isi ezinụlọ kweere na ibu ọrụ ha bụ nanị ịkwụ ụgwọ ụlọ na ụgwọ akwụkwọ ọ bụ iwu na a ga-akwụ. Ha na-ahapụrụ nwunye ha—na mgbe ụfọdụ ụmụ ndị meworo okenye karị—ọrụ nke iweta ụdị ihe ndị ahụ bụ isi dị ka nri na uwe.
Ọzọ, ụfọdụ ndị di chere na “ego m bụ ego m, ma ego gị bụ ego m kwa.” Nke a na-akpasukarị iwe n’etiti ndị nwunye na-akpata ego. Otu nwanyị onye Tanzania mere mkpesa, sị: “A na-emefu ego ahụ n’ịṅụ mmanya, ọ bụghị n’isi anyị ma ọ bụ n’isi ụmụaka. Anyị na-ekerịta ọrụ, ma ọ bụ mee ihe ka ukwuu na ya, ma ọ na-ewere ego nile na-agwa anyị na ọ bụ nke ya—na ọ bụ ya kpatara ya.”
Otú ọ dị, ndị Kraịst na-ebute Okwu Chineke ụzọ karịa ọdịbendị obodo ma ọ bụ echiche zuru ebe nile. Bible na-enye nduzi na-enye aka n’ihe banyere ilekọta ezinụlọ mmadụ. Dị ka ihe atụ, ọ na-asị na “ọ bụghị ọrụ ụmụ ịkpadoro ndị mụrụ ha ihe, kama ọ bụ ọrụ ndị mụrụ ụmụ ịkpadoro ụmụ ha.” (2 Ndị Kọrint 12:14) N’ihi ya, ndị ikom na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị nwere ike ịrụ ọrụ adịghị ahapụrụ ya nwunye ha ma ọ bụ ụmụ ha ndị meworo okenye karị iweta nri na uwe maka ezinụlọ n’ihi umengwụ; ibu ọrụ ahụ dị kpọmkwem n’ubu onye isi ezinụlọ.—1 Ndị Kọrint 11:3.
N’eziokwu, ego nke di na-akpata nwere ike ọ gaghị ezu iji lekọta mkpa nile nke ezinụlọ ya. Ma ọ bụrụ na nwunye ya si n’èzí akpata ego, nwoke bụ́ onye Kraịst agaghị ewe iwe. Kama nke ahụ, ọ ga-emeso ya dị ka ‘nwanyị e jikọtara ya na ya’ nke a na-akwanyere ùgwù. (Malakaị 2:14) Otú a, ọ gaghị eji obi ọjọọ were ego ọ tara ahụhụ kpata ma rifuo ya n’echebaraghị mmetụta ya echiche. N’ụzọ megidere nke ahụ, ya na nwunye ya ‘na-agbakọta izu’ ma kpebie otú ha pụrụ isi jiri ego ha mee ihe kasị mma maka abamuru nke ezinụlọ nile. (Ilu 13:10, NW) Ebe o kwere omume, di ọbụna ga-enye nwunye ya ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nnwere onwe akụ̀ na ụba, dị ka “nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma” nwere n’oge Bible. (Ilu 31:10, 11, 16) Ịgbaso ndụmọdụ Bible n’ihe ndị dị otú ahụ na-akwalite obi ụtọ na afọ ojuju ezinụlọ.
Iche Ihe Ịma Aka nke Enweghị Ọrụ Ihu
Tụlee nsogbu nke enweghị ọrụ. Mgbe ọrụ dị ole na ole, ụgwọ ọnwa dịkwa ala, ọtụtụ ndị isi ezinụlọ n’Africa achọwo ọrụ n’ebe dị anya n’ụlọ—n’ebe a na-egwupụta ihe n’ala, n’ebe a na-emepụta ihe, n’ugbo, na n’ubi. Ọ bụrụ na nwoke bụ́ onye Kraịst nọ n’ọnọdụ a, ọ pụrụ ịchọta nnọọ onwe ya ịbụ onye e kewapụrụ n’ebe ndị ofufe ibe ya nọ ma bụrụ onye e kpughere nye mkpakọrịta ọjọọ. (Ilu 18:1; 1 Ndị Kọrint 15:33) Ọ bụ ezie na ezinụlọ ya pụrụ ịgba mbọ ime ihe nile ha pụrụ ime n’ọnọdụ ahụ, o yikarịrị ka ha ga-ata ahụhụ n’ihi enweghị nna n’ụlọ ibute ụzọ n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụ inye nkwado mmetụta uche. N’ụzọ na-emegide onwe ya, anọghị n’ụlọ ruo ogologo oge pụkwara ịkpata ihe ahụ o kwesịrị igbochi—ihe isi ike ego.
Otu nne na-asị: “Di m gara igwu ala maka ọlaedo. O zubere ịlọghachi ma otu ọnwa gasịa ma ọ bụ ọ karịsịa mgbe ọnwa abụọ gasịrị. O mesịrị bụrụ otu afọ! A hapụụrụ m ụmụ isii ilekọta. Mgbe ahụ e nwekwara ụgwọ ụlọ ịkwụ. Ebe ọ bụ na ahụ esighị m ike, m ghaghị ịkwụ ụgwọ ụlọ ọgwụ. Uwe dị anyị mkpa, anyị aghaghịkwa iri ihe kwa ụbọchị. Enweghị m ọrụ ọ bụla. Ọ tara akpụ. Akụkụ kasị sie ike bụ ilekọta ụmụaka ahụ n’ụzọ ime mmụọ—ọmụmụ ihe ezinụlọ, nzukọ, na ọrụ nkwusa. Otú ọ dị, site ná nkwado Jehova anyị gabigara oge ndị ahụ.”
Ọbụna ụfọdụ ndị nne enwewo nrụgide ịhapụ ezinụlọ ha ruo ọtụtụ ọnwa iji rụọ ọrụ. Ụfọdụ na-akpata ihe ha ji ebi ndụ dị ka ndị ahịa njegharị, a dịghịkwa ahụkebe ha n’ụlọ. A na-esi otú a manye ụmụaka ndị meworo okenye karị iwere ọrụ nke nne na nna ma hụ maka nri, ọrụ ụlọ, na ọbụna inye ụmụnne ha ndị nta ọzụzụ. Ikere òkè n’ọrụ ime mmụọ na-ata ahụhụ. Ee, nrụgide ga-adị n’ezinụlọ ahụ pụrụ ịdị ukwuu!
Otú ọ dị, mgbe ọnọdụ akụ̀ na ụba siri ike, nne ma ọ bụ nna nwere ike ọ gaghị enwe ụzọ ọzọ isi nye ezinụlọ ya ihe ndị na-akpa ya ma ọ bụghị ịchọ ọrụ n’ebe dị anya. N’oge Bible ihe àmà na-egosi na ụmụ Jekọb aghaghị ịhapụ ezinụlọ ha iji nweta ihe oriri n’Ijipt. (Jenesis 42:1-5) Ya mere mgbe ọnọdụ yiri nke ahụ bilitere taa, ndị isi ezinụlọ aghaghị inyocha abamuru ihe onwunwe nke ọrụ n’ebe dị anya pụrụ iweta ma e jiri ya tụnyere mbibi ime mmụọ na nke mmetụta uche nke nkewapụ ogologo oge. Ọtụtụ ezinụlọ na-ahọrọ ịtachi obi n’ihe isi ike akụ̀ na ụba kama ikewapụ onwe ha ruo ogologo oge. Ha na-eburu n’uche okwu Pọl dị na 1 Timoti 6:8: “Ebe anyị nwere ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ, afọ ga-eju anyị n’ihe ndị a.”—Tụlee Ilu 15:17.
Ọtụtụ mgbe e nwere ihe ndị a ga-eji edochi ime njem. Site n’igosipụta ọgụgụ isi na nkà, ụfọdụ enwewo ike imepụta ọrụ site n’ije ozi ndị bara uru.a (Tụlee Ilu 31:24.) Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ nanị ịnakwere ọrụ ndị dị ala ndị ndị ọzọ na-ele anya dị ka ndị dị nta. (Ndị Efesọs 4:28) Pọl onyeozi n’onwe ya ‘dọgburu onwe ya n’ọrụ ma na-arụ ọrụ abalị na ehihie’ iji zere ịbụrụ ndị ọzọ ibu arọ n’ụzọ ego. (2 Ndị Tesalọnaịka 3:8) Ndị ikom bụ́ ndị Kraịst taa pụrụ ịgbaso ihe ilereanya ahụ.
Nsogbu Agụmakwụkwọ
Nsogbu ọzọ metụtara agụmakwụkwọ. N’ụfọdụ ebe dịpụrụ adịpụ, ndị nne na nna na-ezipụkarị ụmụ ha ije binyere ndị ikwu ruo ogologo oge iji nye ụmụaka ahụ agụmakwụkwọ zuru ezu. N’ịbụ ndị e kewapụrụ n’ebe nne na nna ha nọ, ụmụaka dị otú ahụ mgbe mgbe na-enwe ihe isi ike ịga nzukọ ma ọ bụ ikere òkè n’ozi ubi. N’ịbụ ndị a napụrụ ọzụzụ dị mkpa, ha na-adaba n’ụzọ dị mfe ná mkpakọrịta ọjọọ. N’ihi ya, ọtụtụ ahapụwo ụzọ ndụ ndị Kraịst.
Ajụjụ adịghị ya na agụmakwụkwọ ụwa nwere uru ndị dị na ya. Ma Bible ji agụmakwụkwọ ime mmụọ kpọrọ ihe karị, Chineke enyewokwa ndị nne na nna ibu ọrụ nke inye ntụziaka dị otú ahụ. (Deuterọnọmi 11:18, 19; Ilu 3:13, 14) Otú ọ dị, izipụ nwatakịrị ruo ogologo oge yiri ka ọ ga-emebi mgbalị nne ma ọ bụ nna ịzụlite ya “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.”—Ndị Efesọs 6:4.b
Mgbe ohere dị n’ógbè maka agụmakwụkwọ yiri ihe na-ezughị ezu, ọ pụrụ ịbụ na ndị nne na nna agaghị enwe nhọrọ ọzọ na-abụghị ime ihe ha onwe ha pụrụ ime iji kụziere ụmụ ha nkà ndị bụ isi. “Onye Nkụzi Ukwu” anyị, bụ́ Jehova, na-enyekwa aka. (Aịsaịa 30:20, NW) Ọgbakọ Ndịàmà Jehova ndị dị n’ógbè na-enye ọtụtụ ndokwa agụmakwụkwọ. Ọtụtụ ọgbakọ na-eduzi klas ịmụ ka e si agụ na ka e si ede. Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke bụkwa ndokwa enyemaka nke pụrụ ime ka ikike ịgụ ihe na ikwu okwu nke ọma nke nwatakịrị dịwanye nkọ.
Echiche Ziri Ezi Banyere Ịmụ Ụmụ
Inye ụmụaka ihe na-akpa ha pụrụ isi ike karịsịa mgbe ha dị ọtụtụ. Ndị nne na nna bụ́ ndị Africa na-ekwukarị na ha hụrụ ụmụaka n’anya; n’ihi ya, ha na-amụ ole ha pụrụ ịmụ! Ọ bụ ezie na a pụrụ ile ụmụ anya dị ka ihe onwunwe akụ̀ na ụba, ọtụtụ ndị nne na nna enweghị ike inye ọnụ ọgụgụ dị ukwuu n’ime ha ihe na-akpa ha n’ụzọ zuru ezu.
N’ezie, Bible na-asị na “ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa ka ụmụ bụ.” (Abụ Ọma 127:3) Otú ọ dị, rịba ama na e dere okwu ndị ahụ n’oge ọnọdụ dị mma n’Israel. Ka oge na-aga, ụnwụ nri dị oké njọ na agha mere ka ịmụ ụmụ sie ike. (Abụ Ákwá 2:11, 20; 4:10) N’ihi ọnọdụ siri ike nke jupụtara n’ala ndị na-emepe emepe, ndị Kraịst ji ihe akpọrọ ihe kwesịrị ichesi echiche ike banyere ụmụ ole ha pụrụ inye nri, iyiwe uwe, inye ụlọ, na ịzụ n’ụzọ ezi uche dị na ya. Ebe ha gbakọworo ihe ọ ga-efu, ọtụtụ di na nwunye na-ekpebi na ọ ga-akasị mma ịghara ịgbaso ọdịnala ma kpaara ọnụ ọgụgụ ụmụ ha nwere ókè.c—Tụlee Luk 14:28.
N’ụzọ doro anya, ndị a bụ “oge dị oké egwu.” (2 Timoti 3:1-5) Ka usoro ihe a na-akpọda n’ọgwụgwụ ya a na-apụghị izere ezere, ihe ịrụ ụka adịghị ya na nrụgide ndị na-adakwasị ezinụlọ dị iche iche n’ala ndị na-emepe emepe ga-aba ụba. Ma, site n’ịrapagidesi ike n’ụkpụrụ Okwu Chineke, ndị isi ezinụlọ pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ilekọta ma mkpa elu ahụ ma nke ime mmụọ nke ezinụlọ ha, n’ihi na Jehova na-ekwe ndị na-ejere ya ozi n’iguzosi ike n’ihe nkwa a, sị: “M gaghị aha gị aka ma ọlị, M gaghị ahapụkwa gị ma ọlị.” (Ndị Hibru 13:5) Ee, ọbụna n’ala ndị na-enweghị ihe ọ bụla, ndị Kraịst pụrụ izute ihe ịma aka nke inye ezinụlọ ha ihe na-akpa ha n’ụzọ gara nke ọma!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu bụ́ “Imepụta Ọrụ ná Mba Ndị Na-emepe Emepe” ná mbipụta October 22, 1994 (Bekee), nke magazin anyị a na-ebipụtakọ ya na nke a, bụ́ Teta!
b Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche nke February 15, 1983.
c E nyere ihe ọmụma na-enye aka n’usoro isiokwu bụ́ “Nhazi Ezinụlọ—Ihe Iseokwu Zuru Ụwa Ọnụ,” nke pụtara na Teta! nke June 8, 1993.