12 Ọ bụrụ na ọ ga-eweta ya iji nye ekele,+ ọ ga-eweta àjà ekele ahụ ya na achịcha na-ekoghị eko nke a gwara mmanụ na achịcha dị fere fere na-ekoghị eko nke e tere mmanụ,+ tinyere ntụ ọka e gweriri egweri nke a gwọrọ nke ọma, n’ụdị achịcha a gwara mmanụ.