Levitikọs
7 “‘Nke a bụ iwu metụtara àjà ikpe ọmụma:+ Ọ bụ ihe kasị nsọ.+ 2 N’ebe+ ha na-egbu anụ àjà nsure ọkụ ka ha ga-anọ gbuo anụ àjà ikpe ọmụma, a ga-efesakwa+ ọbara+ ya gburugburu n’elu ebe ịchụàjà. 3 Ma ọ ga-achụ abụba+ ya dum n’àjà, bụ́ ọdụ ya nke bụ́ abụba abụba nakwa abụba nke kpuchiri eriri afọ ya, 4 tinyere akụrụ ya abụọ na abụba dị n’elu ha, ya bụ, abụba dị n’úkwù ya. Ọ ga-ewepụtakwa abụba dị n’elu imeju ya, ya na akụrụ ya.+ 5 Onye nchụàjà ga-esure ha n’ọkụ n’elu ebe ịchụàjà ka ọ bụrụ àjà a na-esure n’ọkụ nye Jehova.+ Ọ bụ àjà ikpe ọmụma. 6 Nwoke ọ bụla so ná ndị nchụàjà ga-eri ya.+ A ga-anọ n’ebe dị nsọ rie ya. Ọ bụ ihe kasị nsọ.+ 7 Otú àjà mmehie dị, otú ahụ ka àjà ikpe ọmụma dị. Otu iwu na-achị ha.+ Ọ ga-aghọ nke onye nchụàjà ahụ nke ga-eji ya kpuchie mmehie.
8 “‘Ma onye nchụàjà nke chụụrụ onye ọ bụla àjà nsure ọkụ, akpụkpọ+ anụ nke àjà nsure ọkụ ahụ, bụ́ nke onye ahụ wetaara onye nchụàjà, ga-aghọ nke onye nchụàjà ahụ.
9 “‘Àjà ọka* ọ bụla e ghere n’ekwú+ nakwa nke ọ bụla e ji mmanụ ghee n’ime ite nwere afọ+ nakwa nke e ghere n’ite+ bụ nke onye nchụàjà chụrụ ya n’àjà. Ọ ga-aghọ nke ya.+ 10 Ma àjà ọka ọ bụla a gwara mmanụ+ ma ọ bụ nke dị gharị gharị+ ga-abụ nke ụmụ ndị ikom Erọn niile, onye ọ bụla ga-enweta dị ka ibe ya nwetara.
11 “‘Nke a bụ iwu metụtara àjà udo+ nke onye ọ bụla ga-ewetara Jehova: 12 Ọ bụrụ na ọ ga-eweta ya iji nye ekele,+ ọ ga-eweta àjà ekele ahụ ya na achịcha na-ekoghị eko nke a gwara mmanụ na achịcha dị fere fere na-ekoghị eko nke e tere mmanụ,+ tinyere ntụ ọka e gweriri egweri nke a gwọrọ nke ọma, n’ụdị achịcha a gwara mmanụ. 13 Mgbe ọ na-eweta àjà udo ya bụ́ àjà ekele, ọ ga-eweta ihe a ga-eji chụọrọ ya àjà, ya na achịcha koro eko.+ 14 Ọ ga-esikwa na nke ọ bụla n’ime ha were otu ka ọ bụrụ òkè dị nsọ nye Jehova;+ ọ ga-aghọ nke onye nchụàjà bụ́ onye fesara ọbara anụ àjà udo ahụ n’elu ebe ịchụàjà.+ 15 A ga-eri anụ àjà udo ya, bụ́ àjà ekele, n’ụbọchị ọ chụrụ àjà ya. Ọ gaghị edofọ nke ọ bụla ruo ụtụtụ.+
16 “‘Ọ bụrụ na àjà o wetara ka a chụọrọ ya bụ nkwa o kwere+ ma ọ bụ àjà afọ ofufo,+ a ga-eri ya n’ụbọchị ọ chụrụ àjà ahụ, e nwekwara ike iri nke fọdụrụ na ya echi ya. 17 Ma ihe fọdụrụ n’anụ ahụ a chụrụ n’àjà n’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọ ya ọkụ.+ 18 Otú ọ dị, ọ bụrụ na e rie anụ àjà udo ya n’ụbọchị nke atọ, a gaghị anabata onye wetara àjà ahụ nke ọma.+ A gaghị agụnyere ya nke a.+ Ọ ga-aghọ ihe rụrụ arụ, mkpụrụ obi nke riri ụfọdụ n’ime ya ga-aza ajụjụ maka njehie ya.+ 19 A gaghị eri anụ ọ bụla metụrụ ihe ọ bụla na-adịghị ọcha eri.+ A ga-akpọ ya ọkụ. Ma anụ ndị nke ọzọ, onye ọ bụla dị ọcha nwere ike iri ya.
20 “‘Mkpụrụ obi ọ bụla nke riri anụ àjà udo, bụ́ nke a chụụrụ Jehova, mgbe ọ na-adịghị ọcha, a ga-ebipụ mkpụrụ obi ahụ n’etiti ndị ya.+ 21 Ọ bụrụkwa na mkpụrụ obi emetụ ihe ọ bụla na-adịghị ọcha aka, bụ́ ihe na-adịghị ọcha si n’ahụ́ mmadụ pụta+ ma ọ bụ anụmanụ na-adịghị ọcha+ ma ọ bụ ihe ọ bụla na-adịghị ọcha nke a na-asọ oyi,+ wee rie ụfọdụ n’ime anụ àjà udo, bụ́ nke a chụụrụ Jehova n’àjà, a ga-ebipụ mkpụrụ obi ahụ n’etiti ndị ya.’”
22 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị: 23 “Gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Unu erila abụba ọ bụla+ nke oké ehi ma ọ bụ nke nwa ebule ma ọ bụ nke ewu. 24 A pụrụ iji abụba nke anụ nwụrụ anwụ na abụba nke anụ a dọgburu adọgbu+ mee ihe ọ bụla ọzọ, ma unu erila ya ma ọlị. 25 N’ihi na onye ọ bụla nke riri abụba nke si n’anụ o ji chụọrọ Jehova àjà a na-esure n’ọkụ, a ga-ebipụ mkpụrụ obi riri ya+ n’etiti ndị ya.
26 “‘Unu erila ọbara ọ bụla+ n’ebe ọ bụla unu bi, ma ọ̀ bụ nke anụ ufe ma ọ bụ nke anụ ọhịa. 27 Mkpụrụ obi ọ bụla nke riri ọbara ọ bụla, a ga-ebipụ mkpụrụ obi ahụ+ n’etiti ndị ya.’”
28 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị: 29 “Gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Onye na-ewetara Jehova àjà udo, ga-ewere ụfọdụ n’ime àjà udo+ ya chụọrọ Jehova àjà. 30 Ọ ga-eji aka ya weta abụba ya,+ tinyere obi ya, ka ọ bụrụ àjà a na-esure n’ọkụ nye Jehova. Ọ ga-eweta ya na obi ya ka e wee fegharịa ya ka ọ bụrụ àjà a na-efegharị efegharị+ n’ihu Jehova. 31 Onye nchụàjà ga-esure abụba ahụ n’ọkụ+ n’elu ebe ịchụàjà, ma obi ya ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya.+
32 “‘Unu ga-enyekwa onye nchụàjà ụkwụ aka nri ya ịbụ òkè dị nsọ+ site n’àjà udo unu. 33 Onye ọ bụla n’ime ụmụ Erọn nke chụrụ ọbara nke anụ àjà udo na abụba ya n’àjà ga-enweta ụkwụ aka nri ya dị ka òkè ya.+ 34 N’ihi na m na-anara ụmụ Izrel obi anụ àjà a na-efegharị efegharị+ na ụkwụ anụ nke bụ́ òkè dị nsọ site n’àjà udo ha, m ga-anara ha ụmụ Izrel nye Erọn bụ́ onye nchụàjà na ụmụ ya, ka ọ bụrụ ụkpụrụ na-adịru mgbe a na-akaghị aka.
35 “‘Ọ bụ nke a bụ òkè Erọn dị ka onye nchụàjà nakwa òkè ụmụ ya dị ka ndị nchụàjà site n’àjà a na-esure n’ọkụ nye Jehova, n’ụbọchị ọ kpọtara+ ha nso ijere Jehova ozi dị ka ndị nchụàjà, 36 dị nnọọ ka Jehova nyere n’iwu ka e were ya nye ha n’ụbọchị o tere ha mmanụ+ n’etiti ụmụ Izrel. Ọ bụ ụkpụrụ dịịrị ọgbọ unu niile ruo mgbe a na-akaghị aka.’”+
37 Nke a bụ iwu metụtara àjà nsure ọkụ,+ àjà ọka+ na àjà mmehie+ na àjà ikpe ọmụma+ na àjà e ji ahọpụta mmadụ+ na àjà udo,+ 38 dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu n’Ugwu Saịnaị,+ n’ụbọchị o nyere ụmụ Izrel iwu ịchụrụ Jehova àjà n’ala ịkpa Saịnaị.+