22 Otú ọ dị, nwoke ọjọọ ọ bụla na-abaghị n’ihe+ n’ime ndị ikom ahụ ha na Devid so gaa zara ma na-asị: “Ebe ọ bụ na ha esoghị anyị gaa, anyị agaghị enye ha ihe ọ bụla si n’ihe nkwata anyị napụtara, ma e wezụga ịkpọnye onye nke ọ bụla nwunye ya na ụmụ ya ndị ikom, ka ha duru ha laa.”