9 ‘Ọ bụrụ na ọdachi,+ mma agha, amamikpe, ma ọ bụ ọrịa na-efe efe+ ma ọ bụ ụnwụ+ adakwasị anyị, anyị ga-eguzo n’ihu ụlọ a+ nakwa n’ihu gị (n’ihi na aha gị+ dị n’ụlọ a), ka anyị wee kpọkuo gị maka enyemaka mgbe anyị nọ n’ahụhụ, biko, nụrụ ma zọpụta anyị.’+