13 ha wee sị ha: “Unu agaghị akpọbata ndị a unu dọtara n’agha n’ebe a, n’ihi na nke a ga-eme ka anyị bụrụ ndị ikpe mara n’ihu Jehova. Unu na-achọ ịtụkwasị ihe ná mmehie anyị nakwa n’ikpe ọmụma anyị, n’ihi na ikpe ọmụma anyị dị ukwuu,+ ọ na-ewesokwa Izrel iwe dị ọkụ.”+