12 Ndị ikom ahụ ji ikwesị ntụkwasị obi+ na-arụ ọrụ ahụ. A họpụtara Jehat na Obedaya bụ́ ndị Livaị, ndị si n’agbụrụ Meraraị,+ tinyere Zekaraya na Meshọlam, bụ́ ndị si n’agbụrụ Kohat,+ ka ha bụrụ ndị nlekọta ha. Ndị Livaị, ndị onye ọ bụla n’ime ha bụ ọkà n’ịkpọ ngwá egwú,+