58 Dị ka ihe atụ, mgbe gị na onye na-emegide gị n’okwu ikpe na-agakwuru onye na-achị achị, mewe ihe ozugbo, mgbe unu ka nọ n’ụzọ, iji dozie esemokwu gị na ya, ka o wee ghara ịkpụga gị n’ihu ọkàikpe, ọkàikpe enyefeekwa gị n’aka onye ọrụ nche ụlọikpe, onye ọrụ nche ụlọikpe atụbakwa gị n’ụlọ mkpọrọ.+