ISI NKE 4
O Gburu Nwanne Ya n’Ihi Iwe
Adam na Iv mụrụ ọtụtụ ụmụ mgbe ha si n’ogige Iden pụta. Nwa mbụ ha bụ́ Ken bụ onye ọrụ ugbo. Nwa ha nke abụọ bụ́ Ebel na-azụ atụrụ.
Otu ụbọchị, Ken na Ebel chụụrụ Jehova àjà. Ị̀ ma ihe àjà bụ? Ọ bụ onyinye pụrụ iche a na-enye Jehova. Jehova nabatara àjà Ebel, ma ọ nabataghị nke Ken. Ihe a mere ka Ken wee ezigbo iwe. Jehova gwara Ken na iwe ọ na-ewe nwere ike ime ka o mee ihe ọjọọ. Ma, Ken egeghị Jehova ntị.
Kama, ọ gwara Ebel, sị: “Ka anyị gaa n’ọhịa.” Mgbe ha nọ naanị ha n’ọhịa, Ken kụgburu ya. Gịnị ka Jehova mere Ken? Ọ tara Ken ahụhụ. Ahụhụ ọ tara ya bụ na ọ chụpụrụ ya n’ụlọ ha, chụga ya ebe dị anya. E kweghị ka Ken laghachi n’ụlọ ha ọzọ.
Gịnị ka anyị ga-amụta n’akụkọ a? Iwe nwere ike wewe anyị ma ihe anaghị aga otú anyị si chọọ. Ọ bụrụ na anyị wewe iwe, ma ọ bụ na ndị ọzọ achọpụta na anyị na-ewe iwe ma gwa anyị kwụsị ya, anyị kwesịrị ịkwụsị ya ozugbo tupu iwe ahụ emee ka anyị mee ihe ọjọọ.
Jehova na-echeta Ebel n’ihi na o mere ihe dị mma, hụkwa ya n’anya. Chineke ga-akpọlite ya n’ọnwụ mgbe ọ ga-eme ka ụwa a bụrụ paradaịs.
“Buru ụzọ gaa ka gị na nwanne gị kpezie, gaghachizie, nye onyinye gị.”—Matiu 5:24