Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 101 p. 234-p. 235 para. 4
  • A Kpọgara Pọl Rom

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Kpọgara Pọl Rom
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nwee Obi Ike, Jehova Bụ Onye Na-enyere Gị Aka
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • “O Nweghị Onye Ọ Bụla n’Ime Unu Ga-ala n’Iyi”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Kpọsaa Alaeze Jehova N’atụghị Egwu!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • ‘Ịgba Àmà nke Ọma’
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 101 p. 234-p. 235 para. 4
Ebe Pọl na ndị ọzọ gwuuru mmiri na-apụta n’akụkụ oké osimiri dị na Mọlta, ụfọdụ ejide ibé osisi si n’ụgbọ mmiri kụrisịrị akụri aka, mmiri eburu ha pụta n’elu ala

ISI NKE 101

A Kpọgara Pọl Rom

Mgbe Pọl gachara nke ugboro atọ ya kwusaa ozi ọma n’ebe dị iche iche, ọ gara Jeruselem. E jidere ya n’ebe ahụ ma tụọ ya mkpọrọ. N’otu abalị, ọ hụrụ ọhụụ, Jizọs agwa ya n’ọhụụ ahụ, sị: ‘Ị ga-aga Rom zie ozi ọma.’ E si Jeruselem kpọga ya Sizaria. Pọl nọrọ afọ abụọ n’ụlọ mkpọrọ n’ebe ahụ. Mgbe ọ na-azara ọnụ ya n’ihu Gọvanọ Festọs, ọ gwara gọvanọ, sị: ‘Achọrọ m ka Siza kpee m ikpe na Rom.’ Festọs gwara ya, sị: ‘Ebe ị sị na ị chọrọ ka Siza kpee gị ikpe, ọ bụ Siza ga-ekpe ya.’ E tinyeziri Pọl n’ụgbọ mmiri na-aga Rom, ụmụnna abụọ aha ha bụ Luk na Arịstakọs esoro ya gawa.

Mgbe ha nọ n’ụgbọ mmiri na-aga, oké ifufe malitere ife. O fegidere ruo ọtụtụ ụbọchị. Ndị niile nọ n’ụgbọ ahụ chere na ha ga-anwụ. Ma Pọl sịrị ha: ‘Otu mmụọ ozi gwara m ná nrọ, sị: “Atụla egwu, Pọl. Ị ga-eru Rom, o nweghịkwa ihe ga-eme onye ọ bụla nọ n’ụgbọ a.” Nweenụ obi ike. Anyị agaghị anwụ.’

Oké ifufe ahụ fegidere ruo abalị iri na anọ. N’ikpeazụ, mgbe ha ruwere ebe ala dị n’agwaetiti Mọlta, ụgbọ ha tọrọ n’ájá, ebili mmiri akụrisịa ya. Ma, narị mmadụ abụọ na iri asaa na isii (276) ndị nọ n’ụgbọ ahụ pụtara n’enweghị ihe mere ha. Ụfọdụ gwuuru mmiri pụta, ndị ọzọ ejide ibé osisi si n’ụgbọ ahụ aka, mmiri eburu ha pụta n’elu ala. Ndị Mọlta kwanyeere ha ọkụ ka ahụ́ kporo ha ọkụ, lekọtakwa ha.

Mgbe ọnwa atọ gachara, ndị agha kpọọrọ Pọl hà banye n’ụgbọ mmiri ọzọ gawa Rom. Mgbe o ruru Rom, ụmụnna nọ ebe ahụ gara hụ ya. Mgbe ọ hụrụ ha, o kelere Jehova, obi esiekwa ya ike. Ọ bụ eziokwu na e ji Pọl eji, a hapụrụ ya ka ọ nọrọ n’ụlọ ọ na-akwụ ụgwọ ya, onye agha ana-eche ya nche. Ọ nọrọ ebe ahụ afọ abụọ. Ndị mmadụ na-agakwa ahụ ya, ya ana-ezi ha ozi ọma gbasara Alaeze Chineke nakwa gbasara Jizọs. Pọl nọkwa ebe ahụ degara ọgbakọ dị iche iche dị n’Eshia Maịnọ nakwa na Judia akwụkwọ ozi. N’eziokwu, Jehova ji Pọl mee ka ozi ọma ruo ná mba dị iche iche.

“Anyị na-eme ka a mata na anyị bụ ndị ozi Chineke n’ihe niile. Anyị na-edi ọnwụnwa, mkpagbu, ihe isi ike na nsogbu dị iche iche.”​—2 Ndị Kọrịnt 6:4

Ajụjụ: Gịnị mere Festọs ji ziga Pọl Rom? Gịnị mere Pọl mgbe ha na-aga Rom?

Ọrụ Ndịozi 21:30; 23:11; 25:8-12; 27:1–28:31; Ndị Rom 15:25, 26

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya