Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 103 p. 238-p. 239 para. 2
  • “Ka Alaeze Gị Bịa”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ka Alaeze Gị Bịa”
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Gịnị Ka Chineke Bu n’Obi Kee Ụmụ Mmadụ?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ndụ Ahụhụ Amalite
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ihe Chineke Zubere Maka Ụwa Ga-emezu n’Isi Nso
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 103 p. 238-p. 239 para. 2
Ebe ndị toro eto na ụmụntakịrị na-enwe obi ụtọ na Paradaịs

ISI NKE 103

“Ka Alaeze Gị Bịa”

Jehova kwere anyị nkwa, sị: ‘Ibe ákwá, ihe mgbu, ọrịa, ma ọ bụ ọnwụ agaghịzi adị. M ga-ehichapụ anya mmiri niile n’anya ha. A gaghịzi echeta ihe ọjọọ niile mere n’oge gara aga.’

Jehova mere ka Adam na Iv biri n’ogige Iden. Ọ chọrọ ka ha biri n’udo ma na-enwe obi ụtọ na ya. Ọ chọkwara ka ha na-efe Nna ha nke eluigwe nakwa ka ha mụọ ụmụ mụjuo ụwa. Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi. Ma, ihe a emeghị ka Chineke gbanwee ihe o bu n’obi. N’akwụkwọ a, anyị ahụla na Chineke na-emezu ihe ọ bụla o kwere ná nkwa. Ọ ga-eji Alaeze ya gọzie ụwa niile, otú o kwere Ebreham ná nkwa.

Ebe ndị toro eto, ụmụntakịrị, na anụ ọhịa nọ na Paradaịs

N’oge na-adịghị anya, Setan, ndị mmụọ ọjọọ ya, na ndị ọjọọ niile agaghịzi adị. Onye ọ bụla ga na-efe naanị Jehova. Anyị agaghịzi na-arịa ọrịa ma ọ bụ na-anwụ anwụ. Ụbọchị ọ bụla anyị tetara ụra, ahụ́ ga-agbasi anyị ike, obi ana-atọkwa anyị ụtọ na anyị dị ndụ. Ụwa ga-aghọ paradaịs. Onye ọ bụla ga-enwe ezigbo nri ọ ga-eri na ezigbo ụlọ ọ ga-ebi. Ndị mmadụ ga na-adị obiọma, e nweghịzi onye ga na-eme ibe ya ihe ọjọọ. Anụ ọhịa agaghịzi na-atụ anyị ụjọ, anyị agaghịkwa na-atụ ha ụjọ.

Obi ga-atọgbu onye ọ bụla atọgbu mgbe Jehova ga-amalite ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Anyị ga-anabata ndị fere Chineke n’oge ochie, dị ka Ebel, Noa, Ebreham, Sera, Mosis, Rut, Esta na Devid. Ha ga-eso anyị mee ka ụwa bụrụ paradaịs. A ga na-enwe ọrụ ndị na-eme obi ụtọ anyị ga na-arụ mgbe niile.

Jehova chọrọ ka i biri na paradaịs. Ị ga-amatakwu ya karịa otú ị ma ya ugbu a. N’ihi ya, ka anyị gbalịa na-abịarukwu Jehova nso kwa ụbọchị, na-emekwa otú ahụ ruo mgbe ebighị ebi.

“Jehova Chineke anyị, onye dị ike, i ruru eru ka ndị niile too gị ma sọpụrụ gị, n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile.”​—Mkpughe 4:11

Ajụjụ: Olee ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-emere anyị n’ụwa? N’ime ndị niile a kọrọ akụkọ ha n’akwụkwọ a, olee onye nke ị ga-achọ ịhụ na Paradaịs?

Mkpughe 21:3, 4; Job 33:25; Ilu 2:21, 22; Aịzaya 11:2-10; 33:24; 65:21; Matiu 6:9, 10; Jọn 5:28, 29; 17:3

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya