Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 1 Gịnị Mere E Ji Ekpe Ya?
    Ụlọ Nche—2010 | Ọktoba 1
    • Ekpere

      1 Gịnị Mere E Ji Ekpe Ya?

      EKPERE. E nweghị ọtụtụ isiokwu si na Baịbụl na-amasị ndị mmadụ ka ya. Ka anyị tụlee ajụjụ asaa ndị mmadụ na-ajụkarị banyere ekpere; anyị ga-ahụkwa otú Baịbụl si zaa ha. A kwadebere isiokwu ndị a iji nyere gị aka ikpe ekpere—ịmalite ikpe ekpere ma ọ bụ ime ka ekpere gị ka mma.

      N’OMENALA na okpukpe niile dị n’ụwa, ndị mmadụ na-ekpe ekpere. Ha na-ekpe ya mgbe naanị ha nọ; ha na-ekpe ya n’ìgwè. Ha na-ekpe ekpere na chọọchị, n’ụlọ nsọ, n’ụlọ nzukọ ndị Juu, n’ụlọ okpukpe ndị Alakụba, nakwa n’ụlọ arụsị. Ha nwere ike iji ute ekpere, chaplet, wiil ekpere, ihe oyiyi, akwụkwọ ekpere, ma ọ bụ ekpere ndị e dere n’obere bọọdụ ha na-ekowe ekowe, na-ekpe ya.

      N’ihe niile dị ndụ n’ụwa, ọ bụ naanị mmadụ na-ekpe ekpere. N’ezie, e nwere ọtụtụ ụzọ anyị na ụmụ anụmanụ si yie. Nri, ikuku, na mmiri dị anyị mkpa otú ọ dị ha. A na-amụ anyị otú a na-amụ ha, anyị adị ndụ ma nwụọ ka ha. (Ekliziastis 3:19) Ma, ọ bụ naanị mmadụ na-ekpe ekpere. N’ihi gịnị?

      Ikekwe, azịza ya kacha mfe bụ na ọ dị anyị mkpa. A si ka e kwuwe, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ weere ekpere ka ụzọ isi gwa ihe ha weere dị ka ihe dị nsọ na ihe na-adịru mgbe ebighị ebi okwu. Baịbụl gosiri na e kere anyị inwe agụụ ime ihe ndị dị otú ahụ. (Ekliziastis 3:11) Ọ dị mgbe Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.”—Matiu 5:3.

      Anyị nwere “mkpa ime mmụọ.” E wezụga ya, olee ihe mere ndị mmadụ ji ewu nnukwu ụlọ okpukpe, achịkọta ihe ochie ndị metụtara ofufe, na-ekpekwa ekpere ọtụtụ awa? N’ezie, ụfọdụ na-eche na ha ma ọ bụ ụmụ mmadụ ibe ha ga-egboli mkpa ime mmụọ ha. Ma, ị̀ chọpụtala na ụmụ mmadụ erughị nnọọ eru ime ya? Anyị adịghị nnọọ ike, ndụ anyị dị mkpụmkpụ, anyị amaghịkwa ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ọ bụ naanị onye ka anyị nnọọ mara ihe, onye ka anyị ike, na onye na-adị ogologo ndụ karịa anyị nwere ike inye anyị ihe dị anyị mkpa. Oleekwanụ ihe bụ́ mkpa ime mmụọ ndị a na-akpali anyị ikpe ekpere?

      Tụlegodị ihe a: Ọ̀ dịtụla mgbe ọ gụrụ gị agụụ inweta nduzi, amamihe, ma ọ bụ azịza nke ajụjụ ndị karịrị echiche mmadụ? Ọ̀ dịtụla mgbe i chere na nkasi obi dị gị mkpa n’ihi ọnwụ onye ị hụrụ n’anya nke gbawara gị obi, mgbe nduzi dị gị mkpa n’ihi mkpebi ị na-amaghị otú ị ga-esi mee ya, ma ọ bụ mgbe mgbaghara dị gị mkpa n’ihi na obi gị na-apịa gị ụtarị maka ihe i mere?

      Baịbụl mere ka anyị mara na anyị nwere ike ikpe ekpere maka ihe ndị ahụ. Ọ bụ Baịbụl bụ akwụkwọ ga-akacha enyere anyị aka n’ihe banyere ekpere, ekpere ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi kpere dịkwa na ya. Ha kpere ekpere maka nkasi obi, nduzi, mgbaghara mmehie, na maka azịza nke ajụjụ ndị kacha sie ike.—Abụ Ọma 23:3; 71:21; Daniel 9:4, 5, 19; Habakọk 1:3.

      Ọ bụ ezie na ekpere ndị ahụ abụghị otu, e nwere ihe jikọrọ ha niile. Onye nke ọ bụla n’ime ndị kpere ha maara ihe dị mkpa ga-eme ka a zaa ekpere mmadụ, bụ́ ihe ọtụtụ ndị n’ụwa taa na-amaghị ma ọ bụ na-eleghara anya. Ha maara onye e kwesịrị ikpegara ekpere.

  • 2 Ònye Ka E Kwesịrị Ikpegara Ya?
    Ụlọ Nche—2010 | Ọktoba 1
    • Ekpere

      2 Ònye Ka E Kwesịrị Ikpegara Ya?

      EKPERE niile hà na-aga otu ebe, n’agbanyeghị onye e kpegaara ha? N’ụwa taa, ndị mmadụ na-echekarị otú ahụ. Echiche a na-amasị ọtụtụ ndị na-akwado òtù ngwakọta ofufe, bụ́kwa ndị chọrọ ka okpukpe niile dị mma, n’agbanyeghị otú ozizi ha si dịgasịa iche. Ma, echiche ahụ ò nwere ike ịbụ ụgha?

      N’ezie, Baịbụl na-akụzi na ọtụtụ ekpere ndị mmadụ na-ekpe na-agahie ụzọ. N’oge e dere Baịbụl, ndị mmadụ na-ekpegakarịrị ihe oyiyi a pịrị apị ekpere. Ma, Chineke dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị ugboro ugboro ka ha zere ime otú ahụ. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 115:4-6 kwuru banyere arụsị, sị: “Ha nwere ntị, ma ha apụghị ịnụ ihe.” Ihe ebe ahụ na-ekwu doro anya. Olee uru ọ bara ikpegara chi na-emekataghị nụ ihe ị na-ekwu ekpere?

      Otu ihe doro anya a kọrọ na Baịbụl mekwuru ka nke a pụta ìhè. Ezi onye amụma Chineke bụ́ Ịlaịja mara ndị amụma Bel aka ka ha kpegara chi ha ekpere, e mechaakwa Ịlaịja ekpegara nke ya. Ịlaịja kwuru na ezi Chineke ga-aza ekpere ahụ ma chi ụgha agaghị aza. Ndị amụma Bel nabatara aka ahụ a mara ha ma kpesie ekpere ike ruo ogologo oge, jiridị oké olu kpọkusie chi ha ike—ma o nweghị isi! Akụkọ ahụ kwuru, sị: “Ọ dịghịkwa onye na-azaghachi, ọ dịghịkwa onye na-aṅa ntị.” (1 Ndị Eze 18:29) Oleekwanụ maka Ịlaịja?

      Mgbe Ịlaịja kpechara ekpere nke ya, Chineke ya zara ya ozugbo, si n’eluigwe zite ọkụ nke repịara àjà Ịlaịja chụrụ. Olee ihe mere ekpere ya ji dị iche? Ọ dị otu ihe dị mkpa anyị ga-ahụ n’ekpere Ịlaịja nke e dere ná 1 Ndị Eze 18:36, 37 ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ahụ. Ọ bụ ekpere dị nnọọ nkenke—o nwere naanị okwu iri atọ n’asụsụ Hibru e ji dee Baịbụl. N’agbanyeghị nke ahụ, n’okwu ole na ole ahụ Ịlaịja kwuru, ọ kpọrọ Chineke aha ya, bụ́ Jehova, ugboro atọ.

      Bel, nke pụtara “onye nwe” ma ọ bụ “nna ukwu,” bụ chi ndị Kenan, ọtụtụ obodo nwekwara Bel nke ha. Ma, Jehova bụ aha pụrụ iche, nke naanị otu Onye na-aza n’eluigwe na ụwa. Chineke a gwara ndị ya, sị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m; agaghị m enye onye ọzọ nsọpụrụ m.”—Aịzaya 42:8.

      Ekpere Ịlaịja na ekpere ndị amụma Bel ahụ hà gara otu ebe? Ofufe Bel nke gụnyere ịkwa iko na ọbụna iji mmadụ achụ àjà na-eweda mmadụ ala. Ma, ife Jehova mere ka ndị Jehova, bụ́ ndị Izrel, nwee ùgwù, mee ka ha zere omume ndị na-eweda mmadụ ala. N’ihi ya, chebagodịrị ya echiche: Ọ bụrụ na i degaara otu enyi gị ị na-akwanyere nnọọ ùgwù akwụkwọ ozi, ị̀ ga-atụ anya ka e nye ya onye aha ya na aha enyi gị na-abụghị otu, onye àgwà ya na nke enyi gị na-eyitụghị? Mbanụ!

      Ọ bụrụ na i kpegara Jehova ekpere, onye ị na-ekpegara ya bụ Onye Okike, bụ́ Nna nke mmadụ niile.a Aịzaya onye amụma kwuru n’ekpere, sị: “Gị onwe gị, Jehova, bụ Nna anyị.” (Aịzaya 63:16) N’ihi ya, ọ bụ nnọọ Onye a ka Jizọs Kraịst na-ekwu banyere ya mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ana m arịgokwuru Nna m na Nna unu nakwa Chineke m na Chineke unu.” (Jọn 20:17) Ọ bụ Jehova bụ Nna Jizọs. Ọ bụ ya bụ Chineke nke Jizọs kpegaara ekpere na nke ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpegara ekpere.—Matiu 6:9.

      Baịbụl ọ̀ gwara anyị ka anyị na-ekpegara Jizọs, Meri, ndị senti, ma ọ bụ ndị mmụọ ozi, ekpere? Ee e—ọ bụ naanị Jehova ka ọ gwara anyị ka anyị na-ekpegara ekpere. Ka anyị tụlee ihe abụọ mere o ji dị otú ahụ. Nke mbụ, ekpere bụ ofufe, Baịbụl kwukwara na ọ bụ naanị Jehova ka e kwesịrị ife ofufe. (Ọpụpụ 20:5) Nke abụọ, Baịbụl gosiri na Chineke bụ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Ọ bụ ezie na Jehova enyefeela ọtụtụ ihe n’aka ndị ọzọ, nke a bụ ọrụ ọ na-enyefetụbeghị onye ọzọ. Ọ bụ Chineke nke kwere nkwa ịnụrụ ekpere anyị n’onwe ya.

      Ya mere, ọ bụrụ na ị chọrọ ka Chineke nụ ekpere gị, cheta ndụmọdụ a Akwụkwọ Nsọ nyere: “Onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.” (Ọrụ 2:21) Ma, Jehova ọ̀ na-anụ ekpere niile n’agbanyeghị otú e si kpee ha? Ka ọ̀ dị ihe ọzọ ọ dị mkpa ka anyị mara ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova nụ ekpere anyị?

      [Ihe e dere n’ala ala peeji]

      a Omenala okpukpe ụfọdụ na-ekwu na ọ dị njọ ịkpọ aha Chineke, ma n’ekpere. Ma, aha ahụ pụtara ihe dị ka puku ugboro asaa n’asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl, ọtụtụ n’ime ebe ndị ha pụtakwara bụ n’ekpere na abụ ọma nke ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi.

      [Foto dị na peeji nke 5]

      Aka Ịlaịja mara ndị amụma Bel gosiri na ekpere niile anaghị aga otu ebe

  • 3 Olee Otú E Kwesịrị Isi Na-ekpe Ya?
    Ụlọ Nche—2010 | Ọktoba 1
    • Ekpere

      3 Olee Otú E Kwesịrị Isi Na-ekpe Ya?

      A BỊA n’ekpere, ọtụtụ omenala okpukpe na-elekwasị anya n’ihe ndị a na-ahụ anya, dị ka otú mmadụ ga-anọ, ihe ọ ga-ekwu, na ihe ọ ga na-eme mgbe ọ na-ekpe ekpere. Ma, Baịbụl na-enyere anyị aka ịghara ilekwasị anya n’ihe ndị dị otú ahụ ma lekwasị anya n’ihe ndị ka mkpa n’ajụjụ ahụ bụ́, “Olee otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere?”

      Baịbụl gosiri na ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’ebe na n’ọnọdụ dị iche iche kpee ekpere. Ha kpere ya n’ime obi ha ma ọ bụ n’olu dara ụda dabere n’ọnọdụ ha nọ. Ha legidere anya n’elu ma ọ bụ hulata ehulata kpee ekpere. Kama iji ihe oyiyi, chaplet, ma ọ bụ akwụkwọ ekpere dị ka ihe ga-enyere ha aka n’ekpere, naanị ihe ha na-eme bụ ikwu ihe dị ha n’obi n’okwu nke aka ha. Olee ihe mere Chineke ji nụ ekpere ha?

      Dị ka isiokwu bu nke a ụzọ kwuru, ọ bụ naanị otu Chineke, bụ́ Jehova, ka ha kpegaara ekpere. O nwekwara ihe ọzọ dị mkpa. Jọn nke Mbụ 5:14 kwuru, sị: “Obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ bụ na ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.” Ọ dị mkpa ka ekpere anyị kwekọọ n’uche Chineke. Gịnị ka nke a pụtara?

      Iji na-ekpe ekpere kwekọrọ n’uche Chineke, ọ dị anyị mkpa ịma uche ya. N’ihi ya, ịmụ Baịbụl dị ezigbo mkpa iji mee ka Chineke nụ ekpere anyị. Nke a ọ̀ pụtara na Chineke agaghị anụ ekpere anyị ọ gwụla ma anyị bụ ndị ọkà mmụta Baịbụl? Mba, ma Chineke na-atụ anya ka anyị mụọ uche ya, gbalịa ịghọta ya na ime ya eme. (Matiu 7:21-23) Ọ dị anyị mkpa ikpe ekpere kwekọrọ n’ihe anyị na-amụta.

      Ka anyị na-amụta banyere Jehova na uche ya, anyị na-enwekwu okwukwe—bụ́ ihe ọzọ dị mkpa n’ekpere. Jizọs kwuru, sị: “Ihe niile unu na-arịọ n’ekpere ma nwee okwukwe, unu ga-enweta ha.” (Matiu 21:22) Okwukwe apụtaghị mmadụ ikwere ihe ọ bụla ọ nụrụ. Kama, ọ pụtara ikwere ihe nwere ezigbo ihe akaebe kwadoro ya n’agbanyeghị na a naghị ahụ ihe ahụ anya. (Ndị Hibru 11:1) E nwere ọtụtụ ihe akaebe na Baịbụl na-egosi na Jehova, onye anyị na-enweghị ike ịhụ anya, dị adị, bụrụ onye anyị nwere ike ịtụkwasị obi na onye dị njikere ịza ekpere nke ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ. Anyị nwekwara ike ịrịọ ya mgbe ọ bụla ka o nyekwuo anyị okwukwe, ọ na-atọkwa Jehova ụtọ inye anyị ihe dị anyị mkpa.—Luk 17:5; Jems 1:17.

      Lekwa ihe ọzọ dị mkpa n’otú e kwesịrị isi na-ekpe ekpere. Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) Ya mere, Jizọs bụ ụzọ anyị nwere ike isi bịakwute Nna ya, bụ́ Jehova. N’ihi ya, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere n’aha ya. (Jọn 14:13; 15:16) Nke ahụ apụtaghị na anyị kwesịrị ikpegara Jizọs ekpere. Kama nke ahụ, anyị na-ekpe ekpere n’aha Jizọs, na-echeta na ọ bụ Jizọs mere ka anyị nwee ike ịbịakwute Nna anyị zuru okè, onye dịkwa nsọ.

      E nwere mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs ya na ha kacha dịrị ná mma jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, kụziere anyị otú e si ekpe ekpere.” (Luk 11:1) O doro anya na ha anaghị ajụ maka ihe ndị ahụ dị mkpa anyị ka tụlechara. Ha chọrọ nnọọ ịmara ihe ha ga na-ekpe n’ekpere—e kwuo ya n’ụzọ ọzọ, ha na-ajụ, sị, ‘Olee ihe anyị kwesịrị ikpe ekpere maka ya?’

      [Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

      Ekpere ndị Chineke na-anụ na-ekwekọ n’uche ya, a na-ekpe ha n’okwukwe, nakwa n’aha Jizọs

  • 4 Gịnị Ka E Kwesịrị Ikpe Maka Ya?
    Ụlọ Nche—2010 | Ọktoba 1
    • Ekpere

      4 Gịnị Ka E Kwesịrị Ikpe Maka Ya?

      A KPỌỌLA ya ekpere Ndị Kraịst a kacha ekpeghachi ebe niile. Ma nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu ma ọ bụ na ọ bụghị, ekpere nlereanya Jizọs—nke a na-akpọ mgbe ụfọdụ Ekpere Onyenwe anyị ma ọ bụ ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe—bụ nnọọ otu n’ime ekpere ndị a kacha aghọtahie. Ọtụtụ nde mmadụ na-ekwughachi okwu ndị dị n’ekpere ahụ n’isi kwa ụbọchị, ikekwe ugboro ugboro. Ma, ọ dịghị mgbe Jizọs bu n’uche ka a na-ekpeghachi ekpere ahụ otú ahụ. Olee otú anyị si mara?

      Obere oge tupu Jizọs akụzie ekpere ahụ, o kwuru, sị: “Mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro.” (Matiu 6:7) Jizọs ò kwuziri ihe megidere ihe a o kwuburu site n’ikwu okwu ndị a ga-eburu n’isi bụ́ ndị a ga na-ekwughachi n’ekpere? Mbanụ! Kama nke ahụ, Jizọs na-akụziri anyị ihe ndị anyị ga na-ekpe ekpere banyere ha, ọ na-akụzikwara anyị ihe ndị kacha mkpa anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe anyị na-ekpe ekpere. Ka anyị lerukwuo ihe ndị ahụ o kwuru anya. Ekpere ahụ dị na Matiu 6:9-13.

      “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.”

      Jizọs si otú ahụ chetara ndị na-eso ụzọ ya na e kwesịrị ikpegara Nna ya, bụ́ Jehova, ekpere niile. Ma, ị̀ maara ihe mere aha Chineke ji dị mkpa otú ahụ na ihe mere o ji dị mkpa ka e doo ya nsọ?

      Malite n’oge na-adịghị anya e kechara mmadụ, e jirila ụgha tetọọ aha nsọ Chineke. Onye iro Chineke, bụ́ Setan, kwuru na Jehova bụ Onye Ọchịchị na-agha ụgha, nke na-eche naanị banyere onwe ya, na onye na-ekwesịtụghị ịchị ihe ndị O kere eke. (Jenesis 3:1-6) Ọtụtụ adụnyerela Setan úkwù, na-akụzi na Chineke enweghị ịhụnanya, na ọ dị obi ọjọọ, na ọ naghị agbaghara mmehie ma ọ bụ na-ekwu na ọ bụdịghị ya bụ Onye Okike. Ndị ọzọ emegidela aha ya, wepụ aha ahụ bụ́ Jehova ná nsụgharị Baịbụl ha ma machibido ndị mmadụ ịkpọ ya akpọ.

      Baịbụl na-egosi na Chineke ga-emezi ihe ndị ahụ niile. (Ezikiel 39:7) Mgbe o mere nke ahụ, ọ ga-egboro gị mkpa gị niile. Olee otú ọ ga-esi mee ya? Ihe ọzọ Jizọs kwuru n’ekpere ahụ zara ajụjụ ahụ.

      “Ka alaeze gị bịa.”

      Taa, ndị nkụzi okpukpe na-akụzi nnọọ ihe dị iche iche banyere Alaeze Chineke. Ma, dị ka ndị nọ na-ege Jizọs ntị maara, ndị amụma Chineke buru amụma ogologo oge gara aga na Mesaya, bụ́ Onye Nzọpụta Chineke họpụtara, ga-achị otu Alaeze nke ga-agbanwe ụwa. (Aịzaya 9:6, 7; Daniel 2:44) Ọ ga-edo aha Chineke nsọ site n’ịgba ụgha Setan n’anwụ, ma kwatuzie Setan na ọrụ ya niile. Alaeze Chineke ga-akwụsị agha, ọrịa, ụnwụ nri—ọbụna ọnwụ. (Abụ Ọma 46:9; 72:12-16; Aịzaya 25:8; 33:24) Mgbe ị na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa, ihe ị na-ekpe ekpere ya bụ ka nkwa niile ahụ mezuo.

      “Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”

      Okwu Jizọs na-egosi na uche Chineke ga-emerịrị n’ụwa dị ka ọ na-eme n’eluigwe, bụ́ ebe Chineke bi. Ọ dịbeghị onye nweliri ike ịkwụsị uche Chineke ime n’eluigwe; n’ebe ahụ, Ọkpara Chineke busoro Setan na ndị mmụọ ozi ya agha, ma chụda ha n’ụwa. (Mkpughe 12:9-12) Arịrịọ nke atọ a n’ekpere nlereanya ahụ, dị ka abụọ ndị bu ya ụzọ, na-enyere anyị aka ilekwasị anya n’ihe kacha mkpa—ọ bụghị uche anyị, kama uche Chineke. Ọ bụ uche ya na-akacha abara ihe niile o kere eke uru mgbe niile. N’ihi ya, nwoke ahụ zuru okè, bụ́ Jizọs, gwadịrị Nna ya, sị: “Ka uche gị mee, ọ bụghị nke m.”—Luk 22:42.

      “Nye anyị nri taa.”

      Ihe ọzọ Jizọs kwuziri gosiri na anyị nwekwara ike ikpe ekpere banyere mkpa anyị. O nweghị ihe dị njọ n’ikpegara Chineke ekpere ka o gbooro anyị mkpa ndị anyị na-enwe kwa ụbọchị. N’ezie, ime otú ahụ na-echetara anyị na Jehova bụ onye “na-enye mmadụ niile ndụ na ume na ihe niile.” (Ọrụ 17:25) Baịbụl mere ka anyị mara na ọ bụ nna hụrụ ụmụ ya n’anya nke ọ na-atọ ụtọ inye ụmụ ya ihe ndị dị ha mkpa. Ma, dị ka ezi nna, ọ gaghị emere ha ihe ndị ha rịọrọ ma ọ bụrụ na ha agaghị abara ha uru.

      “Gbaghara anyị ụgwọ anyị ji.”

      Ì ji Chineke ụgwọ n’ezie? Mgbaghara ya ọ̀ dị gị mkpa? Ọtụtụ ndị taa amakwaghị na e nwere ihe bụ́ mmehie na otú ọ jọruru ná njọ. Ma, Baịbụl na-akụzi na ọ bụ mmehie kpatara nsogbu ndị kacha njọ anyị na-enwe, n’ihi na ọ bụ ya bụ isi ihe mere ụmụ mmadụ ji anwụ anwụ. Ebe a mụrụ anyị ná mmehie, anyị niile na-emehie mgbe niile, ọ bụkwa naanị mgbaghara Chineke ga-eme ka anyị nwee olileanya ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. (Ndị Rom 3:23; 5:12; 6:23) Obi na-eru anyị ala ịmata na Baịbụl kwuru, sị: “Gị onwe gị, Jehova, dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie.”—Abụ Ọma 86:5.

      “Napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.”

      Ị̀ ghọtara na ọ dị gị oké mkpa ka Chineke chebe gị? Ọtụtụ ndị achọghị ikwere na “ajọ onye ahụ,” bụ́ Setan, dịtụdị adị. Ma, Jizọs kụziri na Setan dị adị, ọ kpọdịrị ya “onye na-achị ụwa a.” (Jọn 12:31; 16:11) Setan emebiela ụwa a ọ na-achị, ọ dịkwa nnọọ njikere imebi gị, ime ka gị na Nna gị, bụ́ Jehova, ghara inwe ezigbo mmekọrịta. (1 Pita 5:8) Ma, Jehova ka nnọọ Setan ike, ọ na-atọkwa Jehova ụtọ ichebe ndị hụrụ Ya n’anya.

      Isi ihe ole na ole a dị n’ekpere nlereanya Jizọs anyị tụlere abụghị ihe niile anyị kwesịrị ikpe n’ekpere. Cheta na 1 Jọn 5:14 gwara anyị banyere Chineke, sị: “Ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.” N’ihi ya, echegbula onwe gị na nsogbu gị dị nnọọ obere ịkọrọ ya Chineke.—1 Pita 5:7.

      Ma, oleekwanụ maka oge na ebe e kwesịrị ịnọ ekpe ekpere? Ò nwere ihe oge na ebe anyị nọ kpee ekpere mere?

  • 5 Ò Nwere Ihe Ebe na Mgbe E Kpere Ya Mere?
    Ụlọ Nche—2010 | Ọktoba 1
    • Ekpere

      5 Ò Nwere Ihe Ebe na Mgbe E Kpere Ya Mere?

      O DORO anya na ị chọpụtala na ihe na-adị ihe ka ọtụtụ n’òtù okpukpe mkpa bụ nnukwu ụlọ ekpere nakwa na ha na-ekwu kpọmkwem oge ndị e kwesịrị iji na-ekpe ekpere n’ụbọchị. Baịbụl ò kwuru na anyị kwesịrị ikpe ekpere naanị n’oge na n’ebe ụfọdụ?

      Baịbụl gosiri na e nwere mgbe kwesịrị ekwesị ikpe ekpere. Dị ka ihe atụ, tupu Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya erie nri, o kpere ekpere iji kelee Chineke. (Luk 22:17) Mgbe ndị na-eso ụzọ ya zukọtakwara ife Chineke, ha kpekọrọ ekpere ọnụ. Ha si otú ahụ nọgide na-eme ihe a na-eme kemgbe n’ụlọ nzukọ ndị Juu na n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Chineke zubere ka ụlọ nsọ ahụ bụrụ “ụlọ ekpere dịịrị mba niile.”—Mak 11:17.

      Mgbe ndị ohu Chineke zukọtara ma kpekọọ ekpere ọnụ, ekpere ha nwere ike ịdị irè. Ọ bụrụ na echiche ìgwè ahụ bụ otu, ekpere ha ekwekọọkwa n’ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ, ọ na-atọ Chineke ụtọ. Ekpere ahụ nwedịrị ike ịkpali ya ime ihe o nwere ike ịbụ na ọ garaghị eme. (Ndị Hibru 13:18, 19) Ndịàmà Jehova na-ekpe ekpere mgbe niile ná nzukọ ha. Anyị ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù ka ị bịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị gị nso ma jiri ntị gị nụrụ ekpere ndị dị otú ahụ.

      Ma, Baịbụl ekwughị na ọ bụ naanị n’oge ma ọ bụ n’ebe ụfọdụ ka e kwesịrị ikpe ekpere. A kọrọ na Baịbụl banyere ndị ohu Chineke kpere ekpere n’oge ọ bụla, na n’ebe ọ bụla. Jizọs kwuru, sị: “Mgbe ị na-ekpe ekpere, banye n’ọnụ ụlọ gị, mgbe i mechisịrị ọnụ ụzọ gị, kpekuo Nna gị nke nọ na nzuzo ekpere; Nna gị nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-akwụ gị ụgwọ.”—Matiu 6:6.

      Obi ọ́ gaghị adị gị ụtọ ime ihe ahụ e kwuru n’elu? I nwere nnọọ ike ịgakwuru Ọkaakaa eluigwe na ụwa n’ekpere mgbe ọ bụla, mgbe naanị gị nọ, obi esiekwa gị ike na ọ ga-ege gị ntị. Ka a sịkwanụ ihe mere Jizọs ji achọkarị ịnọ naanị ya iji kpee ekpere! Otu mgbe, Jizọs ji otu abalị dum kpegara Chineke ekpere, bụ́ mgbe o doro anya na ọ na-achọ ka Chineke duzie ya ná mkpebi dị oké mkpa ọ na-achọ ime.—Luk 6:12, 13.

      Ndị ikom na ndị inyom ndị ọzọ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl kpere ekpere mgbe ha chọrọ ime mkpebi ndị dị oké mkpa ma ọ bụ mgbe nsogbu ndị tara akpụ chere ha aka mgba. Mgbe ụfọdụ, ha kpere ekpere n’olu dara ụda, mgbe ụfọdụkwa, ha ekpee ya n’obi ha; ha kpere ekpere mgbe ha nọ n’ìgwè na mgbe naanị ha nọ. Ihe dị mkpa bụ na ha kpere ekpere. Chineke gbadịrị ndị ohu ya ume, sị: “Na-ekpenụ ekpere n’akwụsịghị akwụsị.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:17) Ọ dị njikere ige ntị mgbe niile n’ekpere nke ndị na-eme uche ya. Agbamume ahụ ọ́ naghị egosi na ọ hụrụ anyị n’anya?

      Ma, n’ụwa taa ndị mmadụ na-anaghị atụkwasị ibe ha obi, ọtụtụ na-eche ma ekpere ọ̀ bara uru n’ezie. I nwere ike ịjụ, sị, ‘Ọ̀ ga-enyere m aka n’ezie?’

      [Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

      Anyị nwere ike ikpe ekpere n’oge ọ bụla na n’ebe ọ bụla

  • 6 Ọ̀ Ga-enyere Anyị Aka?
    Ụlọ Nche—2010 | Ọktoba 1
    • Ekpere

      6 Ọ̀ Ga-enyere Anyị Aka?

      Ò NWERE aka ọ bụla ekpere na-enyere anyị? Ee, Baịbụl gosiri na ekpere nke ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi na-enyere ha nnọọ aka. (Luk 22:40; Jems 5:13) N’ezie, ikpe ekpere nwere ike inyere anyị ezigbo aka n’ụzọ ime mmụọ, n’uche na ọbụna n’ụzọ anụ ahụ́. Olee otú o nwere ike isi mee otú ahụ?

      Ọ dị mma, ka e were ya na i nwere nwa mmadụ nyere onyinye. Ị̀ ga-akụziri ya na inwe obi ụtọ maka onyinye ahụ ezuola? Ka ị̀ ga-akụziri ya iji ọnụ ya kelee onye nyere ya onyinye ahụ? Mgbe anyị kwupụtara ihe ndị dị mkpa dị anyị n’obi ekwupụta, anyị na-eme ka ha dokwuo anyị anya ma dịkwuodị anyị mkpa. Otu ihe ahụ ọ̀ na-eme mgbe a bịara n’ịgwa Chineke okwu? Ee, ọ na-eme! Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

      Ekpere ekele. Mgbe anyị kelere Nna anyị maka ihe ọma ndị na-emere anyị, anyị na-elekwasị anya ná ngọzi ndị anyị na-enweta. N’ihi ya, anyị nwere ike ikelewekwu Chineke, inwekwu obi ụtọ, na inwekwu nchekwube.—Ndị Filipaị 4:6.

      Ihe atụ: Jizọs kelere Nna ya n’ihi otú o si na-anụ ma na-aza ekpere ya.—Jọn 11:41.

      Ekpere maka mgbaghara. Mgbe anyị rịọrọ Chineke mgbaghara, anyị na-eme ka akọ na uche anyị na-arụkwu ọrụ nke ọma, mee ka nchegharị anyị sikwuo anyị n’obi, ghọtakwuokwa otú mmehie dịruru ná njọ. Obi anyị na-akwụsịkwa ịma anyị ikpe.

      Ihe atụ: Devid kpere ekpere iji gosi nchegharị ya na mwute ọ na-enwe.—Abụ Ọma nke 51.

      Ekpere maka nduzi na amamihe. Ịrịọ Jehova ka o duzie anyị ma ọ bụ nye anyị amamihe dị anyị mkpa iji mee ezi mkpebi nwere nnọọ ike inyere anyị aka ịdị umeala n’obi. O nwere ike ichetara anyị adịghị ike anyị ma nyere anyị aka ịtụkwasịkwu Nna anyị nke eluigwe obi.—Ilu 3:5, 6.

      Ihe atụ: Sọlọmọn ji obi umeala rịọ maka nduzi na amamihe iji chịa Izrel.—1 Ndị Eze 3:5-12.

      Ekpere onye nọ ná nsogbu. Ọ bụrụ na anyị awụpụrụ Chineke obi anyị dị ka mmiri mgbe anyị nọ ná nchegbu, obi ga-eru anyị ala, anyị ga-adaberekwa n’ebe Jehova nọ kama ịdabere n’onwe anyị.—Abụ Ọma 62:8.

      Ihe atụ: Eze Esa kpere ekpere mgbe o chere onye iro ka ya ike ihu.—2 Ihe E Mere 14:11.

      Ekpere maka ọdịmma ndị nọ ná mkpa. Ụdị ekpere ndị ahụ na-enyere anyị aka izere anyaukwu, na-enyekwara anyị aka inwekwu ọmịiko.

      Ihe atụ: Jizọs kpere ekpere maka ndị na-eso ụzọ ya.—Jọn 17:9-17.

      Ekpere otuto. Mgbe anyị toro Jehova maka ọrụ ya ndị dị ebube na àgwà ya ndị magburu onwe ha, anyị ga na-akwanyekwuru ya ùgwù ma na-ekelekwu ya. Ụdị ekpere ndị ahụ nwekwara ike inyere anyị aka ịbịarukwu Chineke na Nna anyị nso.

      Ihe atụ: Devid ji obi ụtọ kelee Chineke maka ihe ndị o kere eke.—Abụ Ọma nke 8.

      Ngọzi ọzọ a na-enweta n’ekpere bụ “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.” (Ndị Filipaị 4:7) Mmadụ inwe obi iru ala n’ụwa a nọ ná nsogbu bụ ngọzi dị ụkọ. Ọ badịrị uru n’ụzọ anụ ahụ́. (Ilu 14:30) Ma ànyị na-enweta ya naanị n’ihi mgbalị anyị? Ka ò nwere ihe ka mkpa na-eso eme ka anyị nweta ya?

      [Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]

      Ekpere na-abara anyị ọtụtụ uru—n’ụzọ anụ ahụ́, n’uche, nakwa nke ka nke, n’ụzọ ime mmụọ

  • 7 Chineke Ọ̀ Ga-anụ Ya Ma Zaa Ya?
    Ụlọ Nche—2010 | Ọktoba 1
    • Ekpere

      7 Chineke Ọ̀ Ga-anụ Ya Ma Zaa Ya?

      AJỤJỤ ahụ dị n’elu na-akpali nnọọ mmasị ndị mmadụ, na-emekwa ka ha chee echiche. Baịbụl gosiri na Jehova na-anụ ekpere taa. Ma ọ̀ ga-anụ nke anyị ma ọ bụ na ọ gaghị anụ kacha dịrị anyị n’aka.

      Jizọs katọrọ ndị ndú okpukpe nke oge ya, bụ́ ndị na-ekpe ekpere ihu abụọ; mkpa ha bụ naanị ime nsọ nsọ n’ihu ọha. O kwuru na ndị dị otú ahụ ‘ga-enwetazu ụgwọ ọrụ ha,’ nke pụtara na ha ga-enweta naanị ihe ha kacha achọ, bụ́ ndị mmadụ ịhụ ha, ma ha agaghị enweta ihe dị ha mkpa, bụ́ Chineke ige ha ntị. (Matiu 6:5) Taakwa, ọtụtụ na-ekpe ekpere kwekọrọ n’uche ha, ọ bụghị nke kwekọrọ n’uche Chineke. Ebe ọ bụ na ha na-eleghara ụkpụrụ Baịbụl ndị anyị kwurula okwu ha anya, Chineke anaghị ege ha ntị.

      Oleekwanụ banyere gị? Chineke ọ̀ ga-anụ ma zaa ekpere gị? Azịza ya adabereghị n’agbụrụ, mba ma ọ bụ ọkwá gị. Baịbụl mesiri anyị obi ike, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Ị̀ bụ ụdị onye ebe a na-ekwu banyere ya? Ọ bụrụ na ị na-atụ egwu Chineke, ị ga-eji Chineke kpọrọ nnọọ ihe, na-atụ egwu imejọ ya. Ọ bụrụ na ị na-eme ezi omume, ị ga-achọ ime ihe Chineke sịrị na o ziri ezi, kama ime uche gị ma ọ bụ uche ụmụ mmadụ ibe gị. Ị̀ chọrọ n’ezie ka Chineke na-ege ntị n’ekpere gị? Baịbụl gosiri gị otú i nwere ike isi kpee ekpere Chineke anụ.a

      N’ezie, ọtụtụ ndị na-achọ ka Chineke jiri ọrụ ebube zaa ekpere ha. Ma, ọbụna n’oge Baịbụl, Chineke arụghị ụdị ọrụ ebube ahụ mgbe niile. Mgbe ụfọdụ, ọtụtụ narị afọ gafere n’agbata mgbe Chineke rụrụ otu ọrụ ebube a kọrọ na Baịbụl na mgbe ọ rụrụ ọzọ. Ọzọkwa, Baịbụl gosiri na oge ọrụ ebube gwụrụ mgbe ndịozi nwụchara. (1 Ndị Kọrịnt 13:8-10) Nke a ọ̀ pụtaziri na Chineke anaghị aza ekpere taa? N’ezie, ọ na-aza! Tụlee ụfọdụ ekpere ndị ọ na-aza.

      Chineke na-enye amamihe. Jehova bụ Isi Iyi nke ezi amamihe niile. Ọ na-eji mmesapụ aka enye ya, na-enye ya ndị chọrọ nduzi ya na ndị chọrọ iji ya na-eduzi ndụ ha n’efu.—Jems 1:5.

      Chineke na-enye mmụọ nsọ ya na uru niile ọ na-aba. Mmụọ nsọ bụ ike Chineke nke nọ n’ọrụ. Ọ dịghị ike ka ya. O nwere ike inyere anyị aka idi ọnwụnwa. O nwere ike ime ka anyị nwee nnọọ udo nke obi mgbe ihe na-echegbu anyị. O nwere ike inyere anyị aka ịzụlite àgwà ndị ọzọ magburu onwe ha ga-eme ka ndị mmadụ na-akpa anyị nso. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Jizọs mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike na Chineke na-enye onyinye a n’ụba.—Luk 11:13.

      Chineke na-enye ndị na-achọsi ya ike ihe ọmụma. (Ọrụ 17:26, 27) Gburugburu ụwa, e nwere ndị ji obi ha niile na-achọ eziokwu. Ha chọrọ ịmata banyere Chineke—ihe aha ya bụ, nzube ya maka ụwa na ụmụ mmadụ, na otú ha nwere ike isi bịaruo ya nso. (Jems 4:8) Ndịàmà Jehova na-ahụkarị ndị dị otú ahụ, ọ na-atọkwa ha ụtọ ịkọrọ ha otú Baịbụl si zaa ụdị ajụjụ ndị ahụ.

      Ọ̀ bụ ihe mere i ji nweta magazin a? Ị̀ na-achọ Chineke? Ikekwe, ọ bụ otú a ka o si na-aza ekpere gị.

      [Ihe e dere n’ala ala peeji]

      a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú i nwere ike isi kpee ekpere Chineke anụ, gụọ isi 17 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya