Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 160
  • Gịnị Mere E Ji Kpọọ Jizọs Ọkpara Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere E Ji Kpọọ Jizọs Ọkpara Chineke?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Jizọs ọ̀ dịrị ndụ n’eluigwe tupu a mụọ ya n’ụwa?
  • Olee ọrụ Jizọs rụrụ tupu ya abịa n’ụwa?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Jizọs Kraịst Ònye Ka Ọ Bụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Jizọs Ọ̀ Bụ Ọkpara Chineke n’Eziokwu?
    Teta!—2006
  • Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 160
Ebe Jizọs na-ekpegara Nna ya nke eluigwe ekpere

Gịnị Mere E Ji Kpọọ Jizọs Ọkpara Chineke?

Ihe Baịbụl kwuru

A kpọrọ Jizọs “Ọkpara Chineke” ọtụtụ ugboro na Baịbụl. (Jọn 1:49) Okwu ahụ bụ́ “Ọkpara Chineke” na-eme ka a mata na ọ bụ Chineke kere ihe niile, ya bụ, onye nyere ma Jizọs ma ihe niile ndụ. (Abụ Ọma 36:9; Mkpughe 4:11) Baịbụl anaghị akụzi na Chineke mụrụ nwa otú ahụ ndị mmadụ si amụ ụmụ.

Baịbụl kpọkwara ndị mmụọ ozi “ụmụ ezi Chineke.” (Job 1:6) Baịbụl kwukwara na mmadụ mbụ bụ́ Adam bụ “nwa Chineke.” (Luk 3:38) Ma, ebe ọ bụ na Jizọs bụ onye mbụ Chineke kere nakwa naanị onye o ji aka ya kee, Baịbụl kpọrọ Jizọs Ọkpara Chineke bu ụzọ mụọ.

  • Jizọs ọ̀ dịrị ndụ n’eluigwe tupu a mụọ ya n’ụwa?

  • Olee ọrụ Jizọs rụrụ tupu ya abịa n’ụwa?

Jizọs ọ̀ dịrị ndụ n’eluigwe tupu a mụọ ya n’ụwa?

Ee. Jizọs bụ mmụọ ozi Chineke n’eluigwe tupu a mụọ ya n’ụwa ya abụrụ mmadụ. Jizọs kwuru, sị: “Esi m n’eluigwe bịa.”​—Jọn 6:38; 8:23.

Chineke bu ụzọ kee Jizọs tupu ya ekee ihe ndị ọzọ. Baịbụl kwuru gbasara Jizọs, sị:

  • “Ọ bụ . . . Onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke.”​—Ndị Kọlọsi 1:15.

  • Ọ bụ “mmalite nke ihe Chineke kere.”​—Mkpughe 3:14.

Jizọs mezuru amụma e buru gbasara “onye malitere n’oge ochie, n’oge a na-amaghị ama gara aga.”​—Maịka 5:2; Matiu 2:​4-6.

Olee ọrụ Jizọs rụrụ tupu ya abịa n’ụwa?

O nwere ọkwá dị elu n’eluigwe. Jizọs kwuru gbasara ọkwá ya mgbe ọ nọ na-ekpe ekpere. Ọ sịrị: “Nna, mee ka m nwee ebube . . . bụ́ ebube m nwere n’akụkụ gị mgbe ụwa na-adịbeghị.”​—Jọn 17:5.

O nyeere Nna ya aka kee ihe ndị ọzọ niile. Jizọs so Chineke rụọ ọrụ “dị ka onye ọkà ọrụ.” (Ilu 8:30) Baịbụl kwuru gbasara Jizọs, sị: “E si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile n’eluigwe na n’elu ụwa.”​—Ndị Kọlọsi 1:16.

Chineke si n’aka Jizọs kee ihe ndị ọzọ niile. Ihe ndị so n’ihe ndị ahụ bụ ma ndị mụọ ozi, ma eluigwe na ụwa. (Mkpughe 5:11) E nwere ike iji otú a Chineke na Jizọs si rụkọọ ọrụ tụnyere otú onye na-ese ụlọ na onye na-arụ ụlọ si arụkọ ọrụ. Ọ na-abụ onye na-ese ụlọ sechaa; onye na-arụ ụlọ ejirizie ihe ahụ o sere rụọ ụlọ.

Ọ bụ Okwu ahụ. Mgbe Baịbụl na-ekwu gbasara oge Jizọs nọ n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa, ọ kpọrọ Jizọs “Okwu ahụ.” (Jọn 1:1) Okwu ahụ Baịbụl kpọrọ ya gosiri na Chineke si n’aka Ọkpara ya gwa ndị mmụọ ozi ndị ọzọ ihe ndị ha ga na-eme.

O nwekwara ike ịbụ na Jizọs rụrụ ọrụ ka Ọnụ Na-ekwuru Chineke n’ebe ụmụ mmadụ nọ. Ebe ọ bụ na Jizọs bụ Okwu Chineke, ọ ga-abụ na o si n’aka Jizọs nye Adam na Iv iwu ahụ o nyere ha n’ogige Iden. (Jenesis 2:​16, 17) Ọ ga-abụkwa na Jizọs bụ mmụọ ozi ahụ chebere ndị Izrel oge ochie mgbe ha nọ n’ala ịkpa, nakwa mmụọ ozi ahụ a gwara ha ka ha rube isi n’ihe o kwuru.​—Ọpụpụ 23:​20-23.a

a Ọ bụghị naanị Okwu ahụ ka Chineke si n’aka ya gwa ndị mmadụ okwu. Dị ka ihe atụ, o sikwa n’aka ndị mmụọ ozi ndị ọzọ na-abụghị Ọkpara ya nye ụmụ Izrel Iwu ndị o nyere ha.​—Ọrụ Ndịozi 7:53; Ndị Galeshia 3:19; Ndị Hibru 2:​2, 3.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya