Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Iden—Ọ̀ Bụ Ebe Mbụ Ụmụ Mmadụ Biri?
    Ụlọ Nche—2011 | Jenụwarị 1
    • Iden—Ọ̀ Bụ Ebe Mbụ Ụmụ Mmadụ Biri?

      WEREGODỊ ya na ị nọ n’otu ubi a gbara ogige. O nweghị ihe na-adọpụ uche gị, ị naghị anụ ụzụ a na-anụkarị n’obodo ndị mepere emepe. Ubi a buru ibu, udo dịkwa na ya. Nke kadị nke bụ na i nweghị nchegbu ọ bụla, o nweghị ọrịa ma ọ bụ ihe mgbu na-enye gị nsogbu, o nweghịkwa ihe ahụ́ gị na-asọ. Ihe niile dị gị n’ahụ́ na-arụ ọrụ nke ọma nke mere ahụ́ ji ruo gị ala n’ebe a.

      Ebe mbụ anya gị gara bụ n’okooko osisi ndị tụrụ àgwà mara mma, ebe ọzọ abụrụ n’osimiri ndị na-enwu gbaa, nakwa n’ọtụtụ akwụkwọ osisi na ahịhịa ndị na-acha nnọọ ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ ka anwụ na-acha ha. Ikuku ndụ na-ekusa gị n’ahụ́, gị ana-anụkwa ísì ụtọ ọ na-ebusa. Ị na-anụ ụda akwụkwọ osisi ndị ikuku na-ebugharị, ụda mmiri osimiri nke na-akụ n’okwute, ubé na abụ nnụnụ, nakwa ubé ụmụ ahụhụ ndị nọ n’ọrụ. Ka i ji anya nke uche gị na-ahụ ebe ahụ, ọ́ naghị agụ gị agụụ ịnọ na ya?

      Ndị bi ebe dị iche iche n’ụwa kweere na ọ bụ n’ebe dị otú ahụ ka ụmụ mmadụ malitere ndụ. Kemgbe ọtụtụ narị afọ, a kụzierela ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu, ndị Krisendọm, na ndị Alakụba banyere ogige Iden, bụ́ ebe Chineke tinyere Adam na Iv ka ha biri. Baịbụl kwuru na ha biri n’udo ma nwee obi ụtọ n’ebe ahụ. Ha na ụmụ anụmanụ dị n’udo, ha na Chineke, bụ́ onye ji obiọma nye ha olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ebe obibi ahụ mara mma, dịkwa n’udo.—Jenesis 2:15-24.

      Ndị Hindu kwekwaara na paradaịs oge ochie n’ụdị nke ha. Ndị na-ekpe okpukpe Budha kweere na ndị ndú ha a ma ama, bụ́ ndị a na-akpọkwa Budha, malitere ịdị ndụ n’oge ochie mgbe ụwa dị ka paradaịs. Ọtụtụ okpukpe dị n’Afrịka na-akọ akụkọ ndị yiri nnọọ akụkọ Adam na Iv.

      N’eziokwu, a na-akọ banyere paradaịs nke oge gboo n’ọtụtụ okpukpe na n’omenala dị iche iche. Otu onye edemede kwuru, sị: “Ọtụtụ obodo kweere na n’oge ochie, e nwere paradaịs nke zuru okè, bụ́ ebe e nwere nnwere onwe, udo, obi ụtọ, ụba ihe oriri, ebe a na-enweghịkwa nchekasị, esemokwu, nakwa ebe a na-anaghị amanye mmadụ ime ihe ọ na-achọghị ime. . . . Nkwenkwe a emeela ka ma onye ukwu ma onye nta nwee mmasị na paradaịs ahụ furu efu ha na-echefubeghị, nke na-agụsikwa ha agụụ ike inwetaghachi.”

      Ọ̀ ga-abụ na akụkọ niile ahụ si n’otu ebe? Ò nwere ike ịbụ na ‘ihe ahụ ma onye ukwu ma onye nta nwere mmasị na ya’ bụ ihe mere eme ha na-echeta echeta? Ọ̀ bụ eziokwu na e nwere ebe bụ́ ogige Iden n’oge ochie nakwa na Adam na Iv dịrị adị n’ezie?

      Ndị na-arụ Baịbụl ụka na-akatọ ozizi ahụ. N’oge a ụwa meperela anya, ọtụtụ ndị na-eche na akụkọ ndị dị otú ahụ bụ naanị akụkọ ifo. Ọ bụ ihe ijuanya na ọ bụghị naanị ndị na-ekweghị na Chineke na-arụ Baịbụl ụka. Ọtụtụ ndị ndú okpukpe na-eme ka ndị mmadụ ghara ikwere na e nwere mgbe e nwere ogige Iden. Ha na-ekwu na ọ dịghị mgbe e nwere ebe dị otú ahụ. Ha na-ekwu na akụkọ Iden bụ ihe atụ, akụkọ ifo, ma ọ bụ ilu.

      N’ezie, e nwere ilu na Baịbụl. Ọ bụ Jizọs tụrụ ilu ndị a kacha mara amara na ya. Ma, Baịbụl kọrọ akụkọ Iden dị ka akụkọ mere eme doro anya, ọ bụghị dị ka ilu. Ma, ọ bụrụ na ihe ahụ Baịbụl kọrọ banyere Iden emeghị eme, oleezi otú a ga-esi tụkwasị ihe ndị ọzọ ọ kọrọ obi? Ka anyị tụlee ihe mere ụfọdụ ndị ji agba akụkọ ogige Iden ụkwụ ma hụ ma ihe ha na-ekwu ò rijuru afọ. Anyị ga-atụlekwa ihe mere akụkọ ahụ ji kwesị ịgbasa onye ọ bụla n’ime anyị.

  • Ọ̀ Dị Mgbe e Nwere Ogige Iden n’Ezie?
    Ụlọ Nche—2011 | Jenụwarị 1
    • Ọ̀ Dị Mgbe e Nwere Ogige Iden n’Ezie?

      Ị̀ MAARA akụkọ Adam na Iv na akụkọ ogige Iden? Ọtụtụ ndị n’ụwa maara ya. Ọ́ gaghị adị mma ka ị gụọ ya n’onwe gị? Ị ga-ahụ ya na Jenesis 1:26–3:24. Lekwa ihe akụkọ ahụ na-ekwu:

      Jehova Chinekea ji ájá kpụọ mmadụ, gụọ ya Adam ma tinye ya n’otu ogige nke dị n’ebe a na-akpọ Iden. Ọ bụ Chineke kụrụ ubi ahụ. Mmiri na-ede ya nke ọma, o nwere ọtụtụ osisi mara mma na-amị mkpụrụ. N’etiti ubi ahụ, e nwere ‘osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ.’ Chineke gwara ụmụ mmadụ ka ha ghara iri mkpụrụ osisi a, kwuo na ha ga-anwụ ma ha rie ya. Ka oge na-aga, Jehova weere otu n’ime ọgịrịga Adam meere ya onye inyeaka, bụ́ nwaanyị a kpọrọ Iv. Chineke nyere ha ọrụ ilekọta ubi ahụ ma gwa ha ka ha mụọ ọmụmụ ma jupụta ụwa.

      Mgbe Iv nọ naanị ya, agwọ gwara ya okwu, nwaa ya ka o rie mkpụrụ osisi ahụ a sịrị ha erila, kwuo na Chineke ghaara ha ụgha, nakwa na o nwere ihe ọma ọ na-ezoro ha, bụ́ nke ga-eme ka ha dị ka Chineke. O nwetara Iv, Iv erie mkpụrụ osisi ahụ a sịrị ha erila. Adam mechara soro nwunye ya nupụrụ Chineke isi. Jehova mara Adam, Iv na agwọ ahụ ikpe. Mgbe a chụpụchara ụmụ mmadụ n’ubi paradaịs ahụ, ndị mmụọ ozi nọchiri ọnụ ụzọ ya.

      O nwere mgbe ọtụtụ ndị ọkà mmụta, ndị gụrụ oké akwụkwọ, na ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu na ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ Baịbụl bụ́ Jenesis bụ eziokwu, meekwa emee. N’oge ndị a, ọtụtụ ndị na-arụzi akụkọ ndị dị otú ahụ ụka. Ma, olee ihe mere ha jizi enwe obi abụọ n’ihe Jenesis kọrọ banyere Adam, Iv na ogige Iden? Ka anyị tụlee ajụjụ anọ a na-ajụkarị.

      1. È nwere ebe bụ́ ogige Iden n’ezie?

      Gịnị mere ha ji enwe obi abụọ n’okwu a? O nwere ike ịbụ na nkà ihe ọmụma so kpata ya. Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị ọkà mmụta okpukpe kwuru na o nwere ebe ogige Chineke ahụ ka dị. Ma, ndị ọkà ihe ọmụma, ndị dị ka Plato na Aristotle, bụ́ ndị Gris, megharịrị chọọchị anya. Ndị ọkà ihe ọmụma a kweere na o nweghị ihe zuru okè dị n’ụwa. Naanị n’eluigwe ka e nwere ihe zuru okè. N’ihi ya, ndị ọkà mmụta okpukpe chere na ọ ga-abụrịrị na Paradaịs mbụ ahụ dị nso n’eluigwe.b Ụfọdụ kwuru na ubi ahụ dị n’elu ugwu dị oké elu nke na-adịghị nso n’ụwa a rụrụ arụ; ndị ọzọ kwuru na ọ dị n’Ebe Ugwu Ụwa ma ọ bụ n’Ebe Ndịda Ụwa; ndị ọzọkwanụ kwuru na ọ dị n’ọnwa ma ọ bụ dịrị nso n’ọnwa. Ọ bụghị ihe ijuanya na ndị mmadụ weziiri ihe mere n’Iden ka akụkọ ifo. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta nke oge a kwuru na ebe ahụ a sịrị na Iden dị abụghị ebe ọ dị, na-ekwu na ọ dịtụghị mgbe e nwere ebe dị otú ahụ.

      Ma, Baịbụl ekwughị ihe dị otú ahụ banyere ubi ahụ. Na Jenesis 2:8-14, e nwere ihe ụfọdụ a kapịrị ọnụ banyere ubi ahụ. Ọ dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ebe a kpọrọ Iden. Otu osimiri nke ghọrọ isi mmiri anọ na-ede ubi ahụ mmiri. E kwuru aha nke ọ bụla n’ime ha anọ, kwutụkwa ihe ụfọdụ banyere ebe ha na-asọga. Ọ dịla anya ndị ọkà mmụta nwewara mmasị ịmata ihe ndị ahụ e kwuru, nke mere ka ọtụtụ n’ime ha nyochaa ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru iji mata ebe Iden oge ochie ahụ dị. Ma, mgbe ha mere nke a, ha enweghị otu olu n’ihe ha chọpụtara. Nke a ọ̀ pụtara na ihe Baịbụl kwuru banyere Iden, ubi ya, na osimiri ndị dị na ya bụ akụkọ ifo?

      Chegodị echiche: Ihe ndị mere n’ubi Iden malitere ihe dị ka puku afọ isii gara aga. O doro anya na ọ bụ Mozis dere ha, ma eleghị anya, o si n’akụkọ ndị a kọọrọ ya ma ọ bụdị n’akwụkwọ ndị dịbu adị dee ha. N’agbanyeghị nke ahụ, Mozis dere ihe ndị ahụ mgbe ihe dị ka puku afọ abụọ na narị ise ha mechara gachara. Iden adịkwaghị adị n’oge ahụ. N’ihi ya, ọ̀ ga-abụ na ihe ndị e ji hụwa ebe ahụ ama, dị ka osimiri, agbanweela n’ime ọtụtụ narị afọ gaferelanụ? Ala na-echigharị echigharị mgbe niile. Ebe o nwere ike ịbụ na Iden dịbu bụ ebe ala ọma jijiji na-emekarị—bụ́ ebe ihe dị ka otu ala ọma jijiji n’ime ala ọma jijiji ise ọ bụla kacha njọ na-eme n’ụwa taa na-eme. N’ebe ndị dị otú ahụ, ọdịdị ala na-agbanwe mgbe niile. O nwekwara ike ịbụ na Iju Mmiri nke oge Noa gbanwere ọdịdị ala otú anyị na-agaghị amatali taa.c

      Ma, lekwa ihe ole na ole anyị maara: Akwụkwọ Jenesis kwuru na ubi ahụ bụ ebe dịrị adị n’ezie. Osimiri abụọ n’ime osimiri anọ ahụ a kpọrọ aha n’akụkọ ahụ, ya bụ, Yufretis na Taịgris, ma ọ bụ Hidekel, ka na-asọ taa. Ụfọdụ n’ime ebe mmiri ndị ahụ si asọpụta dị nnọọ nso n’ibe ha. Akụkọ ahụ kwudịrị aha ala ndị osimiri ndị ahụ sọfere, kwuokwa akụ̀ ndị dị n’ime ala e ji mara ebe ahụ. Akụkọ a doro ndị Izrel, bụ́ ndị mbụ gụrụ ya, anya.

      Ọ̀ bụ otú ahụ ka akụkọ ifo na-adị? Ka hà na-ahapụkarị ịkọ otú ihe ụfọdụ si mee kpọmkwem bụ́ ndị e nwere ike iji chọpụta ma hà bụ́ eziokwu ma ọ bụ ụgha? Otú e si amalite akụkọ ifo bụ: “E nwere otu mgbe, n’ala dị anya.” Ma, akụkọ mere eme na-ekwu kpọmkwem otú ihe si mee, dị ka akụkọ Iden mere.

      2. Ànyị kwesịrị ikwere n’ezie na Chineke ji ájá kpụọ Adam ma jiri agịrịga Adam kpụọ Iv?

      Ndị ọkà mmụta sayensị nke oge a ekwuola na ihe dị iche iche dị n’ala, dị ka ikuku hydrogen, ikuku oxygen, na carbon, dịchakwa n’ahụ́ mmadụ. Ma, olee otú e si jikọta ihe ndị ahụ mee mmadụ?

      Ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na ndụ maliteere onwe ya, na ọ malitere n’ụdị dị mfe ma jiri nwayọọ nwayọọ na-adịzi mgbagwoju anya ka ọtụtụ nde afọ na-agafe. Ma, okwu ahụ bụ́ “mfe” nwere ike iduhie mmadụ, n’ihi na ihe niile dị ndụ, ọbụna obere ihe ndị dị ndụ anya nkịtị na-anaghị ahụ bụ́ ndị nwere otu mkpụrụ ndụ, dị nnọọ mgbagwoju anya. E nweghị ihe na-egosi na ọ dịtụla mgbe ihe dị ndụ pụtaara onwe ya ma ọ bụ na ọ ga-emekata mee otú ahụ. Kama nke ahụ, ihe niile e kere eke nwere ihe na-egosi na ọ bụ onye nwere ọgụgụ isi ka nnọọ nke anyị kere ha.d—Ndị Rom 1:20.

      Ị̀ ga-anụ egwú dị ụtọ ma ọ bụ kirie ihe osise mara mma ma ọ bụ hụ ihe ndị nkà na ụzụ mepụtara ma ka na-esi ọnwụ na ihe ndị a pụtaara onwe ha? Mbanụ! Ma ihe ndị ahụ magburu onwe ha adịghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere otú ahụ́ mmadụ si dị mgbagwoju anya, maa mma, ma ọ bụ otú e si jiri nkà kee ya. Olee otú anyị ga-esi chewe na e nweghị Onye kere ya? E wezụga nke ahụ, akwụkwọ Jenesis kọwara na n’ime ihe niile dị ndụ n’ụwa, ọ bụ naanị ụmụ mmadụ ka e kere n’onyinyo Chineke. (Jenesis 1:26) Ọ dabara nnọọ adaba na ọ bụ naanị ụmụ mmadụ yiri Chineke n’ịchọ imepụta ihe, mgbe ụfọdụ na-echepụta egwú ndị dị ụtọ, na-ese ihe, na-ejikwa nkà na ụzụ emepụta ihe dị iche iche. Ò kwesịrị iju anyị anya na Chineke ka anyị mara otú e si emepụta ihe?

      A bịa n’iji ọgịrịga nwoke kee nwaanyị, olee ihe siri ike na ya?e Chineke gaara esi n’ụzọ ọzọ kee nwaanyị ma ọ chọọ, ma otú ahụ o si kee ya nwere ihe dị mkpa ọ pụtara. Ọ chọrọ ka nwoke na nwaanyị ahụ lụọ ma dịrị n’otu, ka à ga-asị na ha bụ “otu anụ ahụ́.” (Jenesis 2:24) Otú nwoke na nwaanyị si enyerịtara ibe ha aka, ghọọ ndị dị n’otu ma na-elekọta ibe ha, ọ́ naghị egosi nnọọ na ọ bụ Onye Okike maara ihe ma hụ ha n’anya kere ha?

      E wezụga nke ahụ, ndị ọkà mmụta nke oge a, bụ́ ndị na-amụ banyere ihe mmadụ bu pụta ụwa, kwetara na ọ dị ka mmadụ niile hà si n’otu nwoke na nwaanyị. N’ihi ya, ihe Jenesis kọrọ esighị ike nkweta?

      3. Osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ na osisi nke ndụ yiri akụkọ ifo.

      N’ezie, akwụkwọ Jenesis ekwughị na osisi ndị a nwere ikike pụrụ iche. Kama nke ahụ, ha bụ osisi nkịtị ndị Jehova ji mere ihe nnọchianya.

      Ọ̀ bụ na ụmụ mmadụ anaghị eme ihe yiri nke ahụ mgbe ụfọdụ? Dị ka ihe atụ, ọkàikpe nwere ike ịdọ mmadụ aka ná ntị ka ọ ghara ileda ụlọikpe ya anya. Ọ bụghị oche ndị dị n’ụlọikpe ahụ, ọkụ ndị e tinyere na ya, na ahụ́ ájá ya ka ọkàikpe ahụ na-ekwu ka a ghara ileda anya kama ọ bụ ndị na-ekpe ikpe n’ụlọikpe ahụ, bụ́ ndị ụlọikpe ahụ nọchiri anya ha. Ndị eze dị iche iche na-elekwa mkpara na okpueze anya dị ka ihe ndị na-anọchi anya ike ọchịchị ha.

      Oleezi ihe osisi ndị ahụ nọchiri anya ha? E nweela ọtụtụ ihe ndị dị mgbagwoju anya ndị mmadụ kwurula. Ọ bụ ezie na ezigbo azịza ya dị mfe, ma o nwere ihe dị mkpa ọ pụtara. Osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ nọchiri anya ikike ọ bụ naanị Chineke nwe, ya bụ, ikike ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe bụ́ ihe ọjọọ. (Jeremaya 10:23) Ka a sịkwa ihe mere ịghọrọ mkpụrụ osisi ahụ ji bụrụ ohi! N’aka nke ọzọ, osisi nke ndụ ahụ nọchiri anya onyinye nke naanị Chineke nwere ike inye mmadụ, ya bụ, ndụ ebighị ebi.—Ndị Rom 6:23.

      4. Ikwu na agwọ kwuru okwu yiri ihe na-eme n’akụkọ ifo.

      N’ezie, akụkọ agwọ a a kọrọ na Jenesis nwere ike ịdị mgbagwoju anya, karịsịa ma ọ bụrụ na anyị echebaraghị ebe ndị ọzọ na Baịbụl echiche. Ma, Akwụkwọ Nsọ ji nwayọọ nwayọọ mee ka ihe a dị mgbagwoju anya doo anya.

      Olee onye ma ọ bụ ihe mere ka o yie ka agwọ ahụ ọ̀ na-ekwu okwu? Ndị Izrel oge ochie maara ihe ndị ọzọ mere ka a ghọtakwuo ihe agwọ ahụ mere. Dị ka ihe atụ, ha maara na ọ bụ ezie na anụmanụ anaghị ekwu okwu, mmụọ nwere ike ime ka o yie ka anụmanụ ọ̀ na-ekwu okwu. Ọ bụ Mozis dekwara akụkọ Belam; Chineke zigara otu mmụọ ozi ka o mee ka ịnyịnya ibu Belam kwuo okwu ka mmadụ.—Ọnụ Ọgụgụ 22:26-31; 2 Pita 2:15, 16.

      Ndị ọzọ bụ́ mmụọ, tinyere ndị nke bụ́ ndị iro Chineke, hà nwere ike ịrụ ọrụ ebube? Mozis hụrụ ka ndị dibịa anwansi ndị Ijipt rụghachiri ụfọdụ ọrụ ebube ndị o ji ike Chineke rụọ, dị ka ime ka mkpara yie ka ọ̀ ghọrọ agwọ. O doro anya na ọ bụ ndị iro Chineke bụ́ mmụọ nyere ikike e ji rụọ ọrụ ebube ndị ahụ.—Ọpụpụ 7:8-12.

      O doro anya na ọ bụkwa Mozis si n’ike mmụọ nsọ dee akwụkwọ Job. Akwụkwọ ahụ kwuru ọtụtụ ihe banyere onye iro kachanụ nke Chineke, bụ́ Setan, onye mara Jehova aka na ndị ohu ya niile agaghị ekwesị ntụkwasị obi. (Job 1:6-11; 2:4, 5) Ọ̀ ga-abụzi na ndị Izrel oge ochie chere na Setan ji agwọ ahụ rụọ ọrụ n’Iden, mee ka o yie ka ọ̀ na-ekwu okwu, duhie Iv ma mee ka ọ ghara ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ? O yiri ka hà chere otú ahụ.

      Ọ̀ bụ Setan ji agwọ ahụ rụọ ọrụ? Jizọs mechara kwuo na Setan bụ “onye ụgha, bụrụkwa nna ya.” (Jọn 8:44) “Nna ụgha” ga-abụ onye ghara ụgha mbụ a ghatụrụla, ọ́ bụghị ya? Ọ bụ n’okwu agwọ ahụ gwara Iv ka e nwere ụgha mbụ a ghatụrụla. Agwọ ahụ kwuru ihe megidere ịdọ aka ná ntị Chineke, nke bụ́ na onye riri mkpụrụ osisi ahụ Chineke sịrị erila ga-anwụ, ma kwuo, sị: “Unu agaghị anwụ ma ọlị.” (Jenesis 3:4) O doro anya na Jizọs maara na Setan ji agwọ ahụ rụọ ọrụ. Mkpughe Jizọs nyere Jọn onyeozi mere ka nke ahụ doo anya, n’ihi na ọ kpọrọ Setan “agwọ mbụ ahụ.”—Mkpughe 1:1; 12:9.

      Ọ̀ bụ nnọọ ihe siri ike ikweta na mmụọ dị ike nwere ike iji agwọ rụọ ọrụ, mee ka o yie ka ọ̀ na-ekwu okwu? Ụmụ mmadụ, bụ́dị ndị na-esirughị nnọọ ike ka ndị bụ́ mmụọ, nwere ike ime ka o yie ka ihe ndị na-adịghị ndụ hà na-ekwu okwu ma mee ka ihe ndị na-enweghị ike ime eme yie ka hà mere eme.

      Ihe Akaebe Kacha Gbaa Ọkpụrụkpụ

      Ị́ hụghị na ịrụ akụkọ Jenesis ụka enweghị isi? N’aka nke ọzọ, e nwere ọtụtụ ihe ndị na-egosi na akụkọ ndị dị na ya mere eme.

      Dị ka ihe atụ, a kpọrọ Jizọs Kraịst “onye àmà nke kwesịrị ntụkwasị obi.” (Mkpughe 3:14) Ebe ọ bụ na o zuru okè, o nweghị mgbe ọ ghara ụgha ma ọ bụ kwuo ihe na-abụghị eziokwu. E wezụga nke ahụ, ọ kụziri na ya dịrị ndụ ogologo oge tupu ya aghọọ mmadụ—n’ezie, ya na Nna ya, bụ́ Jehova, bi “mgbe ụwa na-adịbeghị.” (Jọn 17:5) N’ihi ya, ọ dị ndụ mgbe ndụ malitere n’ụwa. Olee akaebe onye àmà a kacha bụrụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi gbara?

      Otú Jizọs si kwuo okwu banyere Adam na Iv gosiri na ha bụ ndị dịrị ndụ. O kwuru banyere alụmdi na nwunye ha mgbe ọ na-ekwu banyere ndokwa Jehova mere ka nwoke na-alụ naanị otu nwaanyị. (Matiu 19:3-6) Ọ bụrụ na ọ dịghị mgbe ha dịrị ndụ, ya abụrụkwa na ubi ahụ ha biri na ya bụ ubi akụkọ ifo, ọ pụtara na e duhiere Jizọs ma ọ bụkwanụ na ọ bụ onye ụgha. Ọ dịghị ha abụọ nke bụ́ eziokwu! Jizọs dịrị ndụ n’eluigwe, hụ mgbe ọdachi ahụ mere n’ubi ahụ mere. Ò nwere ihe akaebe ga-akarị nke ahụ?

      N’ezie, ịrụ akụkọ Jenesis ụka bụ ime ka a ghara inwe okwukwe na Jizọs. Ekweghịkwa n’akụkọ ahụ na-emekwa ka o siere ndị mmadụ ike ịghọta ihe ndị kacha gbaa ọkpụrụkpụ Baịbụl kụziri na nkwa ya ndị na-emesi nnọọ obi ike. Ka anyị hụ ihe mere o ji dị otú ahụ.

      [Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

      a Jehova bụ aha a kpọrọ Chineke na Baịbụl.

      b Echiche ahụ esighị n’Akwụkwọ Nsọ. Baịbụl na-akụzi na ihe niile Chineke kere zuru okè; ezughị okè si ebe ọzọ. (Diuterọnọmi 32:4, 5) Mgbe Jehova kechara ụwa, o kwuru na ihe niile o kere “dị nnọọ mma.”—Jenesis 1:31.

      c Ọ ga-abụ na Iju Mmiri ahụ, bụ́ nke Chineke wetara, kpochapụrụ ihe niile e ji mara ubi Iden ahụ. Ezikiel 31:18 gosiri na na narị afọ nke asaa T.O.A. (Tupu Oge Anyị), “osisi ndị dị n’Iden” adịlarị anya ha na-adịkwaghị. N’ihi ya, ndị niile mechara na-achọ ubi Iden amaghị ihe ha na-eme.

      d Gụọ broshuọ bụ́ The Origin of Life—Five Questions Worth Asking, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

      e Ọ dị mma ịmara na ndị ọkà mmụta ọgwụ na ahụ́ ike nke oge a achọpụtala na ọgịrịga na-alachi n’ụzọ pụrụ iche. Ọ dị iche n’ọkpụkpụ ndị ọzọ n’ihi na o nwere ike iruchi ma ọ bụrụ na ihe ndị jikọtara ya n’ahụ́ ka dị.

  • Ihe Mere Okwu Banyere Iden Ji Gbasa Gị
    Ụlọ Nche—2011 | Jenụwarị 1
    • Ihe Mere Okwu Banyere Iden Ji Gbasa Gị

      OTU n’ime ihe ndị kacha eju anya ndị ọkà mmụta kwuru mere ha ji arụ akụkọ Iden ụka bụ na amaokwu ndị ọzọ dị na Baịbụl akwadoghị ya. Dị ka ihe atụ, Paul Morris, bụ́ Prọfesọ Na-akụzi Ihe Banyere Okpukpe, dere, sị: “E nweghị ebe ọzọ a kọrọ banyere Iden na Baịbụl.” Ọtụtụ ndị a sịrị bụ́ ndị ọkachamara nwere ike ikwenyere ihe ahụ o kwuru, ma ọ bụghị eziokwu.

      Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl kwuru banyere Iden, Adam, Iv, na agwọ ahụ ọtụtụ ugboro.a Ma, ihe na-ezighị ezi ndị ọkà mmụta ole na ole kwuru enweghị ihe ha bụ ma ejiri ha tụnyere ihe ka njọ na ihe ka emebi ihe a na-ekwu. Ndị ndú okpukpe na ndị na-akatọ Baịbụl ikwu na akụkọ ndị ahụ a kọrọ na Jenesis banyere ogige Iden emeghị eme bụ nnọọ ịgba Baịbụl ụkwụ. Olee otú o si bụrụ otú ahụ?

      Mmadụ agaghị aghọtali ihe e kwuru n’ebe ndị ọzọ na Baịbụl ma ó bughị ụzọ ghọta ihe mere n’Iden. Dị ka ihe atụ, e dere Okwu Chineke inyere anyị aka ịmata azịza nke ajụjụ ndị kacha mkpa ụmụ mmadụ na-ajụ. Ugboro ugboro, ihe Baịbụl zara banyere ajụjụ ndị ahụ metụtara ihe mere n’Iden. Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ.

      ● Olee ihe mere anyị ji aka nká ma na-anwụ anwụ? E kere Adam na Iv ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ma ha nọgide n’okpuru Jehova. Naanị ihe ga-eme ka ha nwụọ bụ inupụrụ ya isi. N’ụbọchị ahụ ha nupụrụ isi, ha malitere ịnwụ. (Jenesis 2:16, 17; 3:19) Ha ezukwaghị okè, naanị ihe ha nwezikwara ike ibufere ụmụ ha bụ mmehie na ezughị okè. N’ihi ya, Baịbụl kọwara, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.”—Ndị Rom 5:12.

      ● Olee ihe mere Chineke ji kwere ka ajọ omume dịrị? N’ogige Iden, Setan kpọrọ Chineke onye ụgha nke na-ezoro ndị o kere eke ihe ọma. (Jenesis 3:3-5) O si otú ahụ kwuo na otú Jehova si achị ezighị ezi. Adam na Iv họọrọ iso Setan; n’ihi ya, ha jụkwara ọbụbụeze Jehova ma si otú ahụ kwuo na mmadụ nwere ike ikpebiri onwe ya ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ebe ikpe ziri ezi na amamihe Jehova zuru okè, ọ maara na e nwere naanị otu ụzọ isi gosi na ihe ahụ Setan kwuru abụghị eziokwu, ya bụ, ikwe ka oge gafee, nye ụmụ mmadụ ohere ịchị onwe ha otú ha họọrọ. Aka Setan na-etinye n’ọchịchị ha so kpata ajọ omume sirila na ya pụta, nke ahụ ejirikwala nwayọọ nwayọọ gosi otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ: Mmadụ agaghị achịli onwe ya n’enwetaghị enyemaka Chineke.—Jeremaya 10:23.

      ● Olee ihe bụ́ nzube Chineke maka ụwa? Otú Jehova si kee ogige Iden gosiri na ọ chọrọ ka ụwa maa mma. Iji mee ka ụwa niile maa mma otú ahụ, ihe niile dị na ya ana-arụkọkwa ọrụ, Chineke nyere Adam na Iv ọrụ ịmụju ụwa ma ‘mee ka ọ dịrị n’okpuru’ ha. (Jenesis 1:28) Ya mere, nzube Chineke maka ụwa bụ ka ọ bụrụ paradaịs nke ezinụlọ ụmụ Adam na Iv nke zuru okè ma dịrị n’otu bi na ya. Ọtụtụ ihe e kwuru na Baịbụl bụ otú Chineke ga-esi mezuo nzube mbụ ya ahụ.

      ● Olee ihe mere Jizọs Kraịst ji bịa n’ụwa? Nnupụisi Adam na Iv n’ogige Iden wetaara ha na ụmụ ha niile amamikpe ọnwụ, ma n’ihi ịhụnanya Chineke, o mere ka e nwee olileanya. O zitere Ọkpara ya n’ụwa ka o nye ihe Baịbụl kpọrọ ihe mgbapụta. (Matiu 20:28) Olee ihe nke ahụ pụtara? Jizọs bụ “Adam ikpeazụ”; o mere ihe Adam na-emelighị. Jizọs nọgidere na-abụ mmadụ zuru okè site n’ịnọgide na-erubere Jehova isi. O nyeziri ndụ ya dị ka àjà, ma ọ bụ ihe mgbapụta, bụ́ nke ga-eme ka e nwee ike ịgbaghara ụmụ mmadụ niile kwesịrị ntụkwasị obi mmehie ha, ha emechaakwa nwee ike ibi ụdị ndụ ahụ Adam na Iv biri n’Iden tupu ha emehie. (1 Ndị Kọrịnt 15:22, 45; Jọn 3:16) Jizọs si otú ahụ mee ka e jide n’aka na nzube Jehova nke bụ́ ime ka ụwa ghọọ paradaịs yiri Iden ga-emezurịrị.b

      Nzube Chineke adịghị inyoghi inyoghi, ọ bụghịkwa echiche nkà mmụta okpukpe na-edoghị anya. O doro anya. Dị nnọọ ka ogige Iden bụ ebe dịrị adị n’ụwa nke ụmụ anụmanụ na ụmụ mmadụ biri na ya, nkwa Chineke maka ọdịnihu ga-eme eme, ọ ga-emekwa n’oge na-adịghị anya. Nkwa ndị a hà ga-eru gị aka? Ọ dị gị n’aka karịchaa. Chineke chọrọ ka nkwa a ruo mmadụ niile ọ ga-ekwe mee aka, ma ndị birila ndụ ọjọọ.—1 Timoti 2:3, 4.

      Ka Jizọs nọ n’ọnụ ọnwụ, ọ gwara otu nwoke nke ndụ ya gbanwere kpamkpam. Nwoke ahụ bụbu onye omekome; ọ maara na ya kwesịrị ọnwụ. Ma, ọ chọrọ ka Jizọs kasie ya obi ma mee ka o nwee olileanya. Olee ihe Jizọs kwuru? “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) Ọ bụrụ na Jizọs ga-achọ ịhụ onye ahụ bụ́bu onye omekome n’ebe ahụ—ka a kpọlite ya n’ọnwụ ma nye ya ohere ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs yiri Iden—ọ́ gaghị achọ ka gị onwe gị nwetakwa otu ohere ahụ? Ọ chọrọ! Nna ya chọkwara! Ọ bụrụ na ị chọrọ ịdị ndụ mgbe nke ahụ ga-eme, mee ihe niile i nwere ike ime iji mụta banyere Chineke, bụ́ onye kere ogige Iden.

      [Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

      a Dị ka ihe atụ, gụọ Jenesis 13:10; Diuterọnọmi 32:8; 2 Samuel 7:14; 1 Ihe E Mere 1:1; Aịzaya 51:3; Ezikiel 28:13; 31:8, 9; Luk 3:38; Ndị Rom 5:12-14; 1 Ndị Kọrịnt 15:22, 45; 2 Ndị Kọrịnt 11:3; 1 Timoti 2:13, 14; Jud 14; na Mkpughe 12:9.

      b Iji matakwuo banyere àjà mgbapụta Kraịst, gụọ isi nke 5 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

      [Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 10]

      AMỤMA NKE JIKỌTARA BAỊBỤL

      “M ga-emekwa ka iro dịrị n’etiti gị na nwaanyị ahụ nakwa n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya. Ọ ga-egwepịa gị isi, ị ga-emerụkwa ya ahụ́ n’ikiri ụkwụ.”—Jenesis 3:15.

      Nke ahụ bụ amụma mbụ dị na Baịbụl, nke Chineke buru n’Iden. Ole ndị bụ ndị anọ ahụ a kpọrọ aha na ya: nwaanyị ahụ, mkpụrụ ya, agwọ ahụ, na mkpụrụ ya? Olee otú “iro” ahụ e buru n’amụma si mezuo?

      AGWỌ AHỤ

      Setan bụ́ Ekwensu.—Mkpughe 12:9.

      NWAANYỊ AHỤ

      Nzukọ Jehova dị n’eluigwe nke ndị nọ na ya bụ ndị mmụọ ozi. (Ndị Galeshia 4:26, 27) Aịzaya kwuru banyere “nwaanyị” ahụ, kwuo na ọ ga-amụta otu mba ime mmụọ n’ọdịnihu.—Aịzaya 54:1; 66:8.

      MKPỤRỤ NKE AGWỌ AHỤ

      Ndị họọrọ ime uche Setan. —Jọn 8:44.

      MKPỤRỤ NKE NWAANYỊ AHỤ

      Onye bụ́ isi na ya bụ Jizọs Kraịst, onye si ná nzukọ Jehova nke a na-anaghị ahụ anya dị n’eluigwe bịa n’ụwa. Ndị ọzọ so ná “mkpụrụ” ahụ bụ ụmụnna ime mmụọ Kraịst, bụ́ ndị ha na ya ga-eso chịa n’eluigwe. Ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ bụ mba ime mmụọ, bụ́ “Izrel nke Chineke.”—Ndị Galeshia 3:16, 29; 6:16; Jenesis 22:18.

      AHỤ́ A GA-EMERỤ YA N’IKIRI ỤKWỤ

      Ahụ́ a ga-emerụ Mesaya ahụ, ma ọ ga-ala ala. Setan mere ka e gbuo Jizọs n’ụwa. A kpọlitere Jizọs n’ọnwụ.

      NGWEPỊA A GA-EGWEPỊA YA N’ISI

      Ngwepịa a ga-egwepịa Setan nke ga-akpatara ya ọnwụ. Jizọs ga-egbu Setan ruo mgbe ebighị ebi. Ọbụna tupu mgbe ahụ, Jizọs ga-emezi ihe Setan malitere imebi n’Iden.—1 Jọn 3:8; Mkpughe 20:10.

      Ị chọọ ịhụ ebe a tụlere isiokwu bụ́ isi nke Baịbụl ná mkpirikpi, gụọ broshuọ bụ́ Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

      [Foto dị na peeji nke 11]

      Adam na Iv tara ahụhụ n’ihi mmehie ha

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya