Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ikwusa Alaeze Chineke n’Atụghị Ụjọ
Ihe Mere O ji Dị Mkpa: Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe 2 Timoti 1:7, 8 kwuru, anyị ga na-ekwu gbasara Alaeze Chineke n’atụghị ụjọ. Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-ekwu gbasara Alaeze ahụ n’atụghị ụjọ?
Mee Ihe A n’Ọnwa A:
Legharịa anya ka ị mara onye ị ga-ezi ozi ọma. Rịọ Jehova ka o nye gị obi ike izi ndị mmadụ ozi ọma mgbe ọ bụla i kwesịrị izi ha ozi ọma.