Na-elekwasị Anya N’ebe Onye Ọ Bụla Na-emezi Emezi
“Chineke m, cheta m, imere m ezi ihe.”—NEHEMAỊA 13:31.
1. Olee otú Jehova si egosipụta ịdị mma n’ebe mmadụ nile nọ?
MGBE ọtụtụ ụbọchị ndị ihu igwe ha na-agbachapụghị agbachapụ gasịrị, ihe na-agbanwe ma anwụ malite ịcha. Obi na-adị ndị mmadụ mma, ha na-enwekwa ọṅụ. N’otu aka ahụ, mgbe oge ọkọchị anwụ chasiri ike ruo ogologo oge gasịrị, nshansha mmiri—ọbụna oké mmiri ozuzo—na-eme ka ahụ́ jụọ mmadụ oyi ma ruo ya ala. Onye Okike anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, emewo mbara ụwa anyị ka o nwee ọnọdụ ihu igwe magburu onwe ya. Jizọs dọọrọ uche gaa ná mmesapụ aka Chineke mgbe ọ kụziri, sị: “Nọgidenụ na-ahụ ndị iro unu n’anya ma na-ekpe ekpere maka ndị na-akpagbu unu; ka unu wee gosipụta na unu bụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe, ebe ọ na-eme ka anyanwụ ya na-awakwasị ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri na-ezokwasị ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Matiu 5:43-45) Ee, Jehova na-egosipụta ịdị mma n’ebe mmadụ nile nọ. Ndị ohu ya kwesịrị ịgbalịsi ike iṅomi ya site n’ilekwasị anya n’ebe onye ọ bụla na-emezi emezi.
2. (a) Na gịnị ka Jehova na-adabere egosipụta ịdị mma? (b) Gịnị ka Jehova na-ahụ n’ihe banyere otú anyị si emeghachi omume n’ịdị mma ya?
2 Na gịnị ka Jehova na-adabere egosipụta ịdị mma? Kemgbe Adam mehiesịrị, Jehova akwụsịbeghị ilekwasị anya n’ebe ụmụ mmadụ na-emezi emezi. (Abụ Ọma 130:3, 4) Nzube ya bụ ime ka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi birighachi na Paradaịs. (Ndị Efesọs 1:9, 10) Obiọma ya na-erughịrị mmadụ emewo ka anyị nwee atụmanya nke ịbụ ndị a ga-anapụta ná mmehie na ezughị okè site n’aka Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa. (Jenesis 3:15; Ndị Rom 5:12, 15) Ịnakwere ndokwa e mere maka ihe mgbapụta ahụ na-eme ka o kwe omume anyị imesị bụrụ ndị zuru okè. Jehova nọ ugbu a na-ele onye ọ bụla n’ime anyị iji chọpụta, tinyere ihe ndị ọzọ, otú anyị si emeghachi omume ná mmesapụ aka ya. (1 Jọn 3:16) Ọ na-ahụ ihe ọ bụla anyị na-eme iji na-egosi ekele anyị nwere maka ịdị mma ya. “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya,” ka Pọl onyeozi dere.—Ndị Hibru 6:10.
3. Olee ajụjụ kwesịrị ka anyị tụlee?
3 Oleezi otú anyị pụrụ isi na-eṅomi Jehova na-elekwasị anya n’ebe ndị ọzọ na-emezi emezi? Ka anyị tụlee azịza nye ajụjụ a n’akụkụ anọ nke ndụ: (1) ozi Ndị Kraịst, (2) ezinụlọ, (3) ọgbakọ, na (4) mmekọrịta anyị na ndị ọzọ.
N’ime Nkwusa na n’Ime Ndị Na-eso Ụzọ
4. Olee otú anyị ikere òkè n’ozi Ndị Kraịst si bụrụ igosipụta na anyị na-elekwasị anya n’ebe ndị ọzọ na-emezi emezi?
4 “Ubi ahụ bụ ụwa,” ka Jizọs kọwara mgbe ọ na-aza ajụjụ ndị na-eso ụzọ ya jụrụ banyere ihe ilu ọka wit na ata ahụ pụtara. Dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst n’oge a, anyị na-aghọta eziokwu a mgbe anyị na-ekere òkè n’ozi anyị. (Matiu 13:36-38; 28:19, 20) Ozi ubi anyị na-agụnye ime nkwupụta ihu ọha banyere okwukwe anyị. Kpọmkwem eziokwu ahụ bụ́ na e ji ozi Ndịàmà Jehova na-eje site n’ụlọ ruo n’ụlọ na n’okporo ámá mara ha nke ọma na-agba akaebe na anyị ji ịdị uchu na-achọpụta ndị nile kwesịrị ịnụ ozi Alaeze ahụ. N’ezie, Jizọs nyere ntụziaka, sị: “N’obodo ukwu ma ọ bụ n’obodo nta ọ bụla unu na-abanye, chọpụtanụ onye kwesịrị ekwesị n’ime ya.”—Matiu 10:11; Ọrụ 17:17; 20:20.
5, 6. N’ihi gịnị ka anyị ji anọgide na-agakwuru ndị mmadụ ugboro ugboro n’ebe obibi ha?
5 Mgbe anyị na-aga n’ụlọ ndị mmadụ mgbe ha na-akpọghị anyị, anyị na-achọpụta otú ha si emeghachi omume n’ozi anyị. Mgbe ụfọdụ anyị na-ahụ na otu onye n’ime ezinụlọ anyị gara na ya nwere mmasị ige anyị ntị, ebe onye ọzọ na-esi n’ime ụlọ kwuo, sị, “Anyị enweghị mmasị,” ebe ahụkwa ka okwu biri. Lee ka o si ewute anyị na mmegide ma ọ bụ enweghị mmasị nke otu onye na-emetụta mmeghachi omume nke onye ọzọ! Gịnịzi ka anyị pụrụ ime iji nọgide na-elekwasị anya n’ebe onye ọ bụla na-emezi emezi?
6 Anyị pụrụ inweta ohere ịgwa onye ahụ na-anabataghị anyị n’oge gara aga okwu ma anyị gaghachi n’ụlọ ahụ mgbe anyị na-eme nkwusa n’ógbè ahụ. Icheta ihe mere n’oge ahụ pụrụ inyere anyị aka ime nkwadebe. Ọ pụrụ ịbụ na onye ahụ megidere anyị bu ezi ihe n’obi mee ihe o mere, na-eche na ya kwesịrị ịkwụsị onye nke na-ege ntị ka ọ ghara ige ntị n’ozi Alaeze ahụ. Ikekwe ọ bụ ihe ndị na-abụghị eziokwu ọ nụrụ banyere ihe bụ́ ebumnobi anyị mere o ji chee ihe o chere. Ma nke ahụ adịghị egbochi anyị ịnọgide na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’ụlọ ahụ, jiri akọ na-agbalị ime ka a ghọta nke bụ́ eziokwu. Anyị nwere mmasị n’inyere mmadụ nile aka inweta ezi ihe ọmụma banyere Chineke. Mgbe ahụ, ikekwe Jehova ga-adọtara onwe ya onye ahụ.—Jọn 6:44; 1 Timoti 2:4.
7. Gịnị pụrụ inyere anyị aka inwe echiche ziri ezi mgbe anyị na-ejekwuru ndị mmadụ?
7 Jizọs kwukwara banyere mmegide sitere n’aka ndị òtù ezinụlọ ná ntụziaka o nyere ndị na-eso ụzọ ya. Ọ̀ bụ na o kwughị, sị: “M bịara ịkpata nkewa, nwoke megide nna ya, na nwa nwanyị megide nne ya, nakwa nwanyị a lụrụ ọhụrụ megide nne di ya”? Jizọs gbakwụnyere, sị: “Ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinụlọ nke ya.” (Matiu 10:35, 36) N’agbanyeghị nke ahụ, ọnọdụ na àgwà na-agbanwe agbanwe. Ọrịa mberede, ọnwụ nke onye ikwu, ọdachi, nchekasị, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ pụrụ imetụta otú ndị mmadụ si emeghachi omume ná nkwusa anyị. Ọ bụrụ na anyị enwee echiche na-ezighị ezi—na ndị anyị na-ekwusara ozi ọma ga-anọgide bụrụ ndị na-adịghị anabata ya—ànyị na-elekwasị anya n’ezie n’ebe ha na-emezi emezi? Gịnị ma i jiri ọṅụ gaghachi n’ụlọ ha n’oge ọzọ? Anyị pụrụ ịchọpụta na ha ga-emeghachi omume n’ụzọ dị iche. Mgbe ụfọdụ, ọ bụghị ihe anyị kwuru kama ọ bụ otú anyị si kwuo ya na-eme ka mmeghachi omume ha gbanwee. Ikpekusi Jehova ekpere ike tupu anyị amalite ime nkwusa ga-enyere anyị aka n’ezie inwe echiche ziri ezi na ikwusa ozi Alaeze ahụ n’ụzọ ga-adọrọ mmasị mmadụ nile.—Ndị Kọlọsi 4:6; 1 Ndị Tesalonaịka 5:17.
8. Gịnị pụrụ isi na ya pụta mgbe Ndị Kraịst na-elekwasị anya n’ebe ndị ikwu ha na-ekweghị ekwe na-emezi emezi?
8 N’ọgbakọ ụfọdụ, ọtụtụ ndị si n’otu ezinụlọ na-ejere Jehova ozi. Mgbe mgbe ihe mere ndị nke ka na-eto eto ji nwee mmasị na nkwanye ùgwù n’ebe onye ikwu ha meworo agadi nọ bụ nnọgidesi ike nke onye agadi ahụ bụ́ onye ezi mmekọrịta nke ya na ndị ezinụlọ ya nakwa nke ya na onye òtù ọlụlụ ya mere ka ndị na-eto eto gbanwee obi. Ige ntị na ndụmọdụ Pita onyeozi enyeworo ọtụtụ Ndị Kraịst bụ́ nwunye aka irite di ha n’uru “n’ekwughị okwu ọ bụla.”—1 Pita 3:1, 2.
N’ime Ezinụlọ
9, 10. Olee otú ma Jekọb ma Josef si chọọ ebe ezinụlọ ha meziri emezi?
9 Mmekọrịta chiri anya nke na-ejikọta ndị òtù ezinụlọ ọnụ bụ ebe ọzọ anyị pụrụ ịdị na-achọ ebe ndị ọzọ na-emezi emezi. Tụlee ihe mmụta dị n’otú Jekọb si mesoo ụmụ ya ihe. Na Jenesis isi 37, amaokwu nke 3 na nke 4, Bible na-egosi na Jekọb hụrụ Josef n’anya karịsịa. Ụmụnne Josef bịara nwewere ya anyaụfụ n’ihi ya, ọbụna ruo n’ókè nke ịkpa nkata igbu nwanne ha. Otú ọ dị, rịba ama àgwà Jekọb na Josef gosipụtara ka oge na-aga ná ndụ ha. Ha abụọ lekwasịrị anya n’ebe ndị ezinụlọ ha meziri emezi.
10 Mgbe Josef na-eje ozi dị ka onye na-elekọta ihe oriri n’Ijipt ụnwụ nri kpara aka ọjọọ, ọ nabatara ụmụnne ya. Ọ bụ ezie na ọ gwaghị ha onye ọ bụ ozugbo, o mere ihe iji hụ na e lekọtara ha na iji hụ na ha nwere ihe oriri nke ha ga-ebulara nna ha meworo agadi. Ee, n’agbanyeghị na ha kpọburu ya asị, Josef mere ihe maka ọdịmma ha. (Jenesis 41:53–42:8; 45:23) N’otu aka ahụ, mgbe Jekọb nọ n’ọnụ ọnwụ, ọ gọziri ụmụ ya nile n’ụzọ amụma. Ọ bụ ezie na àgwà ọjọọ ha mere ka a ghara inyecha ha ihe ùgwù ụfọdụ, ọ dịghị onye n’ime ha a na-enyeghị ihe nketa n’ala ahụ. (Jenesis 49:3-28) Lee ka Jekọb si gosipụta ịhụnanya na-adịghị ada ada n’ebe ahụ n’ụzọ magburu onwe ya!
11, 12. (a) Olee ihe atụ amụma nke na-emesi ike mkpa ọ dị ịdị na-elekwasị anya n’ebe ndị òtù ezinụlọ anyị na-emezi emezi? (b) Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe nlereanya nke nna ahụ dị n’ilu Jizọs banyere nwa mmefu?
11 Ogologo ntachi obi nke Jehova gosipụtara n’otú o si mesoo mba Izrel na-enweghị okwukwe ihe na-eme ka anyị ghọtakwuo otú o si elekwasị anya n’ebe ndị ya na-emezi emezi. N’iji ihe mere n’ezinụlọ Hozia onye amụma mee ihe, Jehova mere ihe atụ nke ịhụnanya ya na-adịghị ada ada. Goma, bụ́ nwunye Hozia, kwara iko ugboro ugboro. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova nyere Hozia ntụziaka, sị: “Jeekwa, hụ nwanyị n’anya nke iko hụworo ya n’anya, nke bụkwa nwanyị a lụrụ na nwunye na-akwa iko, dị ka Jehova si ahụ ụmụ [Izrel] n’anya, ọ bụ ezie na ha onwe ha na-eche ihu na chi ọzọ dị iche iche, na-ahụkwa mbadamba mkpụrụ [vaịn] a mịrị amị n’anya.” (Hosea 3:1) N’ihi gịnị ka e ji nye ya ntụziaka dị otú ahụ? Jehova maara na n’etiti mba ahụ nke siworo n’ụzọ ya kpafuo, e nwere ndị ga-emeghachi omume n’ụzọ dị mma n’ebe ndidi ya dị. Hozia kwuru, sị: “E mesịa, ụmụ [Izrel] ga-alọta, chọọ Jehova, bụ́ Chineke ha, na Devid, bụ́ eze ha; ha ga-ejikwa oké egwu bịakwute Jehova, bịaruokwa ịdị mma Ya na mgbe ikpeazụ nke ụbọchị ndị a.” (Hosea 3:5) N’ezie, nke a bụ ihe atụ dị mma nke anyị ga-atụgharị uche na ya mgbe anyị nwere ihe isi ike ezinụlọ. Ma ọ dịghị ihe ọzọ, gị ịnọgide na-elekwasị anya n’ebe ndị òtù ezinụlọ gị ndị ọzọ na-emezi emezi ga-esetịpụ ezi ihe nlereanya n’inwe ndidi.
12 Ilu Jizọs banyere nwa mmefu ahụ na-emekwa ka anyị ghọtakwuo otú anyị pụrụ isi na-elekwasị anya n’ebe ndị ezinụlọ nke anyị na-emezi emezi. Nwa nwoke nke nta lọtara n’ụlọ mgbe ọ hapụsịrị ndụ ịla n’iyi ya. Nna ya ji obi ebere mesoo ya ihe. Olee otú nna ya si meghachi omume ná mkpesa nwa ya nke okenye bụ́ onye na-ahapụtụbeghị ụlọ mere? Nna ahụ gwara nwa ya nke okenye, sị: “Nwa m, mụ na gị anọwo mgbe nile, ihe nile bụ nke m bụkwa nke gị.” Nke a abụghị mba a bara n’iwe kama ọ bụ nnọọ imesighachi ya obi ike na nna ya hụrụ ya n’anya. “Anyị aghaghị nnọọ ime onwe anyị obi ụtọ ma ṅụrịa ọṅụ,” ka ọ gara n’ihu ikwu, “n’ihi na nwanne gị nwoke a nwụrụ anwụ ma dịrịghachi ndụ, o fukwara efu e wee chọta ya.” N’ụzọ yiri nke ahụ, anyị pụrụ ịnọgide na-elekwasị anya n’ebe ndị ọzọ na-emezi emezi.—Luk 15:11-32.
N’ọgbakọ Ndị Kraịst
13, 14. Olee otu ụzọ a pụrụ isi na-etinye iwu nke eze ahụ banyere ịhụnanya n’ọrụ n’ime ọgbakọ Ndị Kraịst?
13 Dị ka Ndị Kraịst, nzube anyị bụ itinye iwu nke eze ahụ banyere ịhụnanya n’ọrụ. (Jems 2:1-9) N’eziokwu, anyị pụrụ ịnabata ndị nọ n’ọgbakọ anyị bụ́ ndị ọnọdụ ha n’ụzọ ihe onwunwe dị iche na nke anyị. Ma ànyị ‘na-akpa ókè’ n’ihi agbụrụ, ọdịbendị, ma ọ bụ ọbụna n’ihi okpukpe mmadụ kpeburu? Ọ bụrụ otú ahụ, olee otú anyị pụrụ isi ṅaa ntị na ndụmọdụ Jems?
14 Ịnabata ndị nile na-abịa nzukọ Ndị Kraịst na-enye ihe àmà na anyị nwere obi imesapụ aka. Mgbe anyị butere ụzọ n’iso ndị ọhụrụ bịara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kwurịta okwu, ahụ́ erughị ala ha na-enwebu ma ọ bụ ihere na-emebu ha pụrụ ịkwụsị. N’ezie, ụfọdụ ndị bịara nzukọ Ndị Kraịst nke mbụ ha na-ekwu, sị: “Mmadụ nile nwere omume enyi. Ọ dị nnọọ ka a ga-asị na mmadụ nile mabu onye m bụ. Ahụ́ ruru m ala.”
15. Olee otú a pụrụ isi nyere ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ aka igosi mmasị n’ebe ndị kataworo ahụ́ nọ?
15 N’ọgbakọ ụfọdụ, mgbe a gbasara nzukọ, ndị ntorobịa ole na ole pụrụ ịgbakọta ọnụ n’ime ma ọ bụ n’èzí Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-ezere iso ndị kataworo ahụ́ na-akpakọrịta. Olee otú a pụrụ isi mee ihe kwesịrị ekwesị iji kwụsị àgwà a? N’ezie, nzọụkwụ mbụ bụ ka ndị nne na nna zụọ ụmụ ha n’ụlọ, na-akwadebe ha maka nzukọ. (Ilu 22:6) A pụrụ inye ha ọrụ nke iwekọta akwụkwọ dị iche iche ka ha nile wee nwee ihe ndị dị ha mkpa ha ga-eji gaa nzukọ. Ndị nne na nna nọkwa n’ọnọdụ kasị mma ịgba ụmụ ha ume iso ndị kataworo ahụ́ na ndị ahụ́ na-adịghị ike na-ekwurịta okwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Inwe ihe ezi uche dị na ya ịgwa ndị dị otú ahụ pụrụ ime ka ụmụaka nwee afọ ojuju.
16, 17. Olee otú ndị toworo eto pụrụ isi na-elekwasị anya n’ebe ndị na-eto eto na-emezi emezi n’ọgbakọ?
16 Ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị kataworo ahụ́ kwesịkwara igosi mmasị n’ebe ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ nọ. (Ndị Filipaị 2:4) Ha pụrụ ibute ụzọ n’iso ndị na-eto eto na-ekwurịta okwu n’ụzọ na-agba ume. A na-ekwukarị isi ihe ụfọdụ ndị dị mkpa ná nzukọ. A pụrụ ịjụ ndị na-eto eto ma nzukọ ọ tọrọ ha ụtọ nakwa ma ọ dị isi ihe ndị kasị masị ha bụ́ ndị ha pụkwara itinye n’ọrụ. Dị ka akụkụ dị mkpa nke ọgbakọ, e kwesịrị ịja ndị ntorobịa mma maka ige ntị nakwa maka azịza ọ bụla ha nyere ná nzukọ ma ọ bụ maka ihe omume ọ bụla ha mere. Otú ndị ntorobịa si eso ndị kataworo ahụ́ na-akpakọrịta n’ọgbakọ na otú ha si arụ ọrụ ndị dị mfe n’ụlọ ga-egosi na ma eleghị anya ha pụrụ ilekọta ibu ọrụ ndị ka ukwuu nke ọma ka oge na-aga ná ndụ ha.—Luk 16:10.
17 Site n’ịnakwere ibu ọrụ, ụfọdụ ndị na-eto eto enwewo ihe ịga nke ọma ruo n’ókè àgwà ime mmụọ ha mere ka o kwe ha omume inweta ọrụ ndị ka mkpa. Ha inwe ihe ha na-eme pụkwara inye aka gbochie àgwà iberibe. (2 Timoti 2:22) Ọrụ ndị dị otú ahụ pụrụ ‘ịnwale iru eru’ nke ụmụnna nwoke bụ́ ndị na-agbalị iru eru ije ozi dị ka ndị ohu na-eje ozi. (1 Timoti 3:10) Otú ha si eji obi ha na-ekere òkè ná nzukọ na ịnụ ọkụ n’obi ha na-enwe n’ozi ahụ, tinyere mmasị onwe onye ha nwere n’ebe mmadụ nile nọ n’ọgbakọ nọ, na-enyere ndị okenye aka ịchọpụta ihe ndị ha pụrụ imeli mgbe ha na-atụle ma a ga-enyekwu ha ọrụ.
Ilekwasị Anya n’Ebe Onye Ọ Bụla Na-emezi Emezi
18. Ihe ize ndụ dị aṅaa ka a ga-ezere n’ihe banyere ikpe ikpe, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
18 “Ile mmadụ anya n’ihu n’ikpe adịghị mma,” ka Ilu 24:23 (NW) na-ekwu. Amamihe nke si n’elu bịa na-achọ ka ndị okenye zere ile mmadụ anya n’ihu mgbe ha na-ekpe ikpe n’ọgbakọ. Jems kwuru, sị: “Amamihe nke sitere n’elu bu ụzọ dị ọcha, na-emekwa udo, nwee ezi uche, dị njikere irube isi, jupụta n’ebere na ezi mkpụrụ, ọ dịghị eji ile mmadụ anya n’ihu na-eme nkewa, ọ dịghị ihu abụọ.” (Jems 3:17) N’ụzọ doro anya, ka ndị okenye na-elekwasị anya n’ebe ndị ọzọ na-emezi emezi, ọ dị mkpa ka ha hụ na mmekọrịta ha na onye a na-ekpe ikpe ma ọ bụ mmetụta ha nwere n’ebe onye ahụ nọ emegharịghị ha anya n’ikpe. “Chineke na-eguzo Onwe ya n’ime nzukọ Chineke,” ka ọbụ abụ ahụ bụ́ Esaf dere. “N’etiti chi nile [ma ọ bụ “ndị yiri chi,” nke na-ezo aka n’ebe ụmụ mmadụ na-ekpe ikpe nọ] ka ọ na-ekpe ikpe. Ruo ole mgbe ka unu ga-ekpe ikpe ajọ omume? Ruokwa ole mgbe ka unu ga-ahụ ndị na-emebi iwu ihu ọma?’” (Abụ Ọma 82:1, 2) N’ihi ya, Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-ezere ihe ọ bụla yiri imelara mmadụ ihe mgbe e nwere okwu ikpe ndị metụtara enyi ma ọ bụ onye ikwu ha. N’ụzọ dị otú a, ha na-echebe ịdị n’otu nke ọgbakọ ma na-ekwe ka mmụọ nsọ Jehova na-arụ ọrụ ya n’enweghị ihe mgbochi.—1 Ndị Tesalonaịka 5:23.
19. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi na-elekwasị anya n’ebe ndị ọzọ na-emezi emezi?
19 Mgbe anyị na-elekwasị anya n’ebe ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị na-emezi emezi, anyị na-egosipụta àgwà Pọl gosipụtara mgbe ọ gwara ọgbakọ dị na Tesalonaịka okwu. Ọ sịrị: “Ọzọkwa, anyị nwere obi ike n’Onyenwe anyị n’ihe banyere unu, na unu na-eme ma bụrụ ndị ga-anọgide na-eme ihe ndị anyị na-enye n’iwu.” (2 Ndị Tesalonaịka 3:4) Anyị ga-enwekwu ike ileghara amaghị eme nke ndị ọzọ anya mgbe anyị na-elekwasị anya n’ebe ha na-emezi emezi. Anyị ga-achọ ebe ndị anyị pụrụ ịja ụmụnna anyị mma, na-ezere nnọọ ịkatọ ha. “Ihe a na-achọ n’aka ndị nlekọta ụlọ,” ka Pọl dere, “bụ ka a hụ mmadụ dị ka onye na-ekwesị ntụkwasị obi.” (1 Ndị Kọrint 4:2) Ikwesị ntụkwasị obi nke, ọ bụghị nanị ndị nlekọta nke ọgbakọ kamakwa nke ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nile bụ́ Ndị Kraịst, na-eme ka anyị hụ ha n’anya. E si otú ahụ adọta anyị nso n’ebe ha nọ, na-eme ka ihe nkekọ nke ọbụbụenyi Ndị Kraịst sikwuo ike. Anyị na-enwe echiche yiri nke Pọl nwere banyere ụmụnna n’oge ya. Ha bụ ‘ndị ọrụ ibe anyị maka alaeze Chineke’ na ‘ndị enyemaka na-eme ka anyị dị ike.’ (Ndị Kọlọsi 4:11) N’ụzọ dị otú a, anyị na-egosipụta àgwà Jehova.
20. Olee ngọzi ndị ga-abịara ndị na-elekwasị anya n’ebe onye ọ bụla na-emezi emezi?
20 N’ezie, anyị na-ekwughachi okwu Nehemaịa kwuru n’ekpere, bụ́: “Chineke m, cheta m, imere m ezi ihe.” (Nehemaịa 13:31) Lee ka obi si atọ anyị ụtọ na Jehova na-elekwasị anya n’ebe ndị mmadụ na-emezi emezi! (1 Ndị Eze 14:13) Ka anyị na-eme otú ahụ mgbe anyị na-emeso ndị ọzọ ihe. Ime otú ahụ na-eme ka anyị nwee atụmanya nke ịbụ ndị a ga-agbapụta na ndị ga-enweta ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ nke dị ezi nso ugbu a.—Abụ Ọma 130:3-8.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• Na gịnị ka Jehova na-adabere egosipụta ịdị mma n’ebe mmadụ nile nọ?
• Olee otú anyị pụrụ isi na-elekwasị anya n’ebe ndị ọzọ na-emezi emezi
• n’ozi anyị?
• n’ezinụlọ anyị?
• n’ọgbakọ anyị?
• ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ?
[Foto dị na peeji nke 18]
N’agbanyeghị na ụmụnne Josef kpọburu ya asị, o lekwasịrị anya n’ebe ha na-emezi emezi
[Foto dị na peeji nke 19]
Mmegide adịghị egbochi anyị ịgbalị inyere mmadụ nile aka
[Foto dị na peeji nke 20]
N’agbanyeghị ihe ndị ụmụ Jekọb mere n’oge gara aga, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha ọ na-agọzighị
[Foto dị na peeji nke 21]
Na-anabata mmadụ nile ná nzukọ Ndị Kraịst