Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g16 nke 1 p. 9
  • Gịnị Na-akpata Esemokwu n’Ezinụlọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Na-akpata Esemokwu n’Ezinụlọ?
  • Teta!—2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jekọb na Ịsọ Kpeziri
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • “Chọọ Udo, Gbasookwa Ya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ihe Ga-enyere Ezinụlọ Aka Ịna-ebi n’Udo
    Teta!—2016
  • Ụmụ Ejima Ndị Na-eyighị
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2016
g16 nke 1 p. 9
Ụmụaka obi na-adịghị mma n’ihi okwu papa ha na mama ha na-ese

Gịnị Na-akpata Esemokwu n’Ezinụlọ?

E NWERE otu nwaanyị onye Gana aha ya bụ Sarah.a Ọ lụrụ di kemgbe afọ iri na asaa. O kwuru, sị: “Ihe na-esekarịrị mụ na di m okwu bụ ego. Ihe bụ́ iwe m bụ na ọ bụ m na-ebu ibu ezinụlọ anyị, di m anaghịdị ajụ m otú m si na-eme ya. Mụ na ya anaghị atụpụrụ onwe anyị ọnụ kemgbe ọtụtụ izu.”

Di ya bụ́ Jacob kwuru na ya na nwunye ya na-agwa ibe ha okwu ọjọọ mgbe ụfọdụ. O kwukwara na ihe na-akpatakarị ya bụ na ha na-aghọtahie ibe ha maka na ha anaghị agwakarị ibe ha ihe ha chọrọ ime. Ihe ọzọ o kwuru mere ha ji esekarị okwu bụ na ha na-ewerekarị ụmụ obere ihe ha gaara eleghara anya ka nnukwu ihe.

E nwere nwoke bụ́ onye India aha ya bụ Nathan ka lụrụ nwaanyị ọhụrụ. O kwuru na ọgọ ya nwoke baara ọgọ ya nwaanyị mba otu ụbọchị, ọgọ ya nwaanyị ewee iwe hapụrụ ya ụlọ. O kwuru na mgbe ọ jụrụ ọgọ ya nwoke ihe mere o ji gwa nwunye ya okwu otú ahụ, ya adị ya ka ọ̀ na-akparị ya. Ọgọ ya nwoke abawaziere onye ọ bụla mba.

O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-esekarị okwu mgbe ọ bụla ị gwara ya okwu na-adịghị mma mgbe ahụ́ na-agbakasị ya. Mkparịta ụka unu ji olu ọma bido nwedịrị ike dagharịa, unu amalite ise okwu. O nweghị mmadụ zuru okè, n’ihi ya, anyị nwere ike ịghọtahie ihe ndị ọzọ kwuru ma ọ bụkwanụ ihe ha bu n’obi mee ihe ha mere. N’agbanyeghị ya, anyị ga-emeli ka udo dị n’ezinụlọ anyị.

Olee ihe di na nwunye nwere ike ime ma ha nwee nghọtahie? Olee ihe onye ọ bụla n’ime ha kwesịrị ime ka ha nwee ike ịdịghachi ná mma? Gịnị ga-enyere ezinụlọ dị iche iche aka ịna-ebi n’udo? Biko, gụọ isiokwu ndị na-esonụ ka ị mata azịza ajụjụ ndị a.

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya