Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 6/15 p. 30
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-eche Nche, Setan Chọrọ Iripịa Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Mara Onye Iro Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Setan
    Teta!—2013
  • Ònye Bụ Setan? Ọ̀ Dị Adị n’Ezie?
    Teta!—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 6/15 p. 30

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Setan bụ́ Ekwensu ò nwere ikike ịma ihe mmadụ bu n’uche?

Ọ bụ ezie na anyị ejichaghị nke a n’aka, o yiri ka ma Setan ma ndị mmụọ ọjọọ ya adịghị nke nwere ikike ịma ihe anyị na-eche.

Tụlee aha ndị a na-eji akọwa Setan. A na-akpọ ya Setan (Onye Nguzogide), Ekwensu (Onye Nkwutọ), Agwọ (nke ya na Onye Nduhie pụtara otu ihe), Onye Ọnwụnwa, na Onye Ụgha. (Job 1:6; Matiu 4:3; Jọn 8:44; 2 Ndị Kọrint 11:3; Mkpughe 12:9) Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime aha nkọwa a na-egosi na Setan nwere ikike ịma ihe mmadụ bu n’uche.

Otú ọ dị, n’ụzọ dị iche, a na-akọwa Jehova Chineke dị ka “onye na-enyocha obi.” (Ilu 17:3, NW; 1 Samuel 16:7; 1 Ihe E Mere 29:17) “Ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’anya ya [Jehova],” ka Ndị Hibru 4:13 na-ekwu, “ma ihe nile gba ọtọ ma bụrụ ndị e kpughepụrụ ekpughepụ n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.” Ọ bụghị ihe ijuanya na Jehova enyewo Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ikike inyocha obi. Jizọs ahụ e si n’ọnwụ kpọlite kwupụtara, sị: “Abụ m onye ahụ na-enyocha akụrụ na obi, m ga-enyekwa unu n’otu n’otu dị ka ihe ndị unu na-eme si dị.”—Mkpughe 2:23.

Bible adịghị ekwu na Setan nwere ikike inyocha obi na uche ụmụ mmadụ. Nke a dị ịrịba ama, ebe ọ bụ na Pọl onyeozi emesiwo anyị obi ike na Ndị Kraịst “abụghị ndị na-amaghị atụmatụ [Setan].” (2 Ndị Kọrint 2:11) Ya mere, ọ dịghị anyị mkpa ịtụwa ụjọ na Setan nwere ikike ụfọdụ pụrụ iche nke anyị na-amatụghị banyere ya.

Otú o sina dị, nke a apụtaghị na Onye Iro anyị apụghị ịmata adịghị ike anyị. Setan ejiwo ọtụtụ narị afọ mụọ akparamàgwà mmadụ. Ọ dịghị ya mkpa inwe ikike ịma ihe anyị bu n’uche iji mara ụdị àgwà anyị na-akpa, iji hụ ụdị ntụrụndụ ndị anyị na-achụso, ma ọ bụ iji nụ ihe anyị na-ekwu, na ihe ndị ọzọ. Ihu anyị na otú anyị si anọ pụkwara ime ka a matatụ ihe anyị na-eche ma ọ bụ mmetụta anyị na-enwe.

Otú ọ dị, n’ụzọ bụ́ isi, Setan na-eji otu ụzọ ahụ o si mee ihe n’ogige Iden—ụgha, aghụghọ, na ihe ọmụma na-abụghị eziokwu—eme ihe. (Jenesis 3:1-5) Ọ bụ ezie na ọ dịghị mkpa ka Ndị Kraịst na-atụ ụjọ na Setan ga-ama ihe ha bu n’uche, e nwere ihe mere ha ga-eji na-enwe nchegbu banyere echiche Setan pụrụ ịgbalị itinye n’ime obi ha. Ọ na-achọ ka Ndị Kraịst bụrụ “ndị e merụrụ uche ha emerụ na ndị a napụrụ eziokwu ahụ.” (1 Timoti 6:5) Ka a sịkwa ihe mere ụwa Setan jiworo na-emepụta imerime ihe ọmụma na ntụrụndụ ndị na-emerụ emerụ. Iji guzogide ajọ mwakpo a, Ndị Kraịst aghaghị ichebe uche ha site n’iyikwasị “okpu ígwè bụ́ nzọpụta.” (Ndị Efesọs 6:17) Ha na-eme nke a site n’iji eziokwu Bible na-emeju uche ha ma na-ezere mmetụta ọjọọ nke ụwa Setan.

Setan bụ ajọ onye iro. Ma ọ dịghị mkpa ka anyị na-atụ ya ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ ya ụjọ na-enweghị isi. Jems 4:7 na-emesi anyị obi ike, sị: “Na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.” Ọ bụrụ na anyị agbasoo ndụmọdụ a, anyị ga-enwe ike ikwu, dị ka Jizọs, na Setan enweghị ike n’ebe anyị nọ.—Jọn 14:30.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya