Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g21 nke 3 p. 10-13
  • Ihe Baịbụl Kọwaara Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Baịbụl Kọwaara Anyị
  • Teta!—2021
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Baịbụl Na-ekwughị?
  • Ihe Ndị Ọkà Mmụta Sayensị Chọpụtarala Ọ̀ Na-emegide Ihe E Dere na Jenesis?
    Teta!—2006
  • Jenesis 1:1—‘Na mbụ, Chineke Kere Eluigwe na Ụwa’
    Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • Otú E Si Kee Ihe
    Teta!—2014
  • Olee Otú Ihe Ndị Dị Ndụ Si Malite Ịdị?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2021
g21 nke 3 p. 10-13

Ihe Baịbụl Kọwaara Anyị

“Ihe a bụ akụkọ otú e si kee eluigwe na ụwa n’oge e kere ha.” (Jenesis 2:4) Ọ bụ otú a ka Baịbụl si kọwaa otú eluigwe na ụwa si malite. Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ dabara n’ihe ndị ọkà mmụta sayensi chọpụtara? Lee ihe atụ ụfọdụ.

Ná Mmalite: E kere eluigwe na ụwa

Eluigwe na ụwa hà nwere mmalite?

Jenesis 1:1 kwuru, sị: “Ná mmalite, Chineke kere eluigwe na ụwa.”

Tupu afọ 1950, ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị a ma ama kweere na eluigwe na ụwa enweghị mmalite. Ma, n’ihi ihe ndị a chọpụtara na nso nso a, ọtụtụ ndị sayensị ekwetala na n’eziokwu, eluigwe na ụwa nwere mmalite.

Olee otú ụwa dị ná mmalite?

Jenesis 1:2, 9 kwuru na ná mmalite “e nweghị ihe dị n’ụwa. Ọ tọgbọ chakoo,” mmiri kpuchikwara ya.

Ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtarala ná nso nso a dabara n’ihe a Baịbụl kọwara. Patrick Shih, onye mụrụ banyere ihe ndị dị ndụ, sịrị na ụwa anyị a ‘enweghị ikuku ọksijin na mbụ, ọ dịghịkwa mma ile anya. Ọ tọgbọ chakoo.’ Otu magazin aha ya bụ Astronomy kwuru, sị: “Ihe ndị a chọpụtara na nso nso a na-egosi na mmiri juru n’ụwa n’oge mbụ. Ọ fọkwara ntakịrị ka ọ bụrụ na e nweghị ala nkịtị dịnụ.”

Olee otú ìhè si rute n’ụwa?

Ihe e dere na Jenesis 1:3-5 gosiri na mgbe mbụ ìhè rutere n’ụwa, e nweghị ike ịnọ n’ụwa hụ ebe ìhè ahụ si na-abịa. Ọ bụ mgbe e mechara ka e nwere ike ịnọ n’ụwa na-ahụ anyanwụ na ọnwa.​—Jenesis 1:14-18.

Baịbụl ekwughị na e ji ụbọchị isii nkịtị nwere awa iri abụọ na anọ kee ihe ndị dị ndụ n’ụwa

Ụlọ ọrụ a na-akpọ The Smithsonian Environmental Research Center kwuru na ìhè mbụ rutere n’ụwa anaghị achasi ike. O kwukwara, sị: “Ikuku a na-akpọ Methane kpuchiri ụwa n’oge ahụ, nke mere ka ebe niile dị inyoghị inyoghị. Ma, ikuku ahụ mechara kusaa, eluigwe agbachapụ.”

Olee usoro e ji kee ihe ndị dị ndụ n’ụwa?

1​—Ụbọchị nke Mbụ: Ìhè rutere n’ụwa. ​—Jenesis 1:3-5

2​—Ụbọchị nke Abụọ: Mmiri juru n’ụwa, alụlụụ ekpuchiekwa ebe niile. Ma, e kewara mmiri ahụ ụzọ abụọ ma mee ka e nwee mbara n’agbata ha.​—Jenesis 1:6-8

3​—Ụbọchị nke Atọ: Mmiri dị n’ụwa bịara sọkọta ọnụ, ala nkịtị apụta.​—Jenesis 1:9-13

4​—Ụbọchị nke Anọ: E nweziri ike ịnọ n’ụwa hụ anyanwụ na ọnwa.​—Jenesis 1:14-19

5​—Ụbọchị nke Ise: Chineke kere anụ ndị bi na mmiri nakwa anụ ndị na-efe efe. O kekwara ha ka ha nwee ike ịmụ ụmụ, nke ọ bụla n’ụdị nke ya.​—Jenesis 1:20-23

6​—Ụbọchị nke Isii: E kere ụmụ anụmanụ ndị ga-ebi n’elu ala, ma ndị ukwu ma ndị nta. Ihe ikpeazụ e kere n’ụbọchị nke isii bụ nwoke mbụ na nwaanyị mbụ.​—Jenesis 1:24-31

Jenesis 1:20-27 kwuru na e bu ụzọ kee azụ̀, bịazie kee ụmụ nnụnụ, kee anụ ndị bi n’elu ala, kezie mmadụ n’ikpeazụ. Ndị sayensị kwetakwara na azụ̀ mbụ e nwere adịla adị ogologo oge tupu e nwee anụ ndị bi n’elu ala, nakwa na o were ogologo oge tupu ụmụ mmadụ emechaa dịrị.

Baịbụl ekwughị na ihe ndị dị ndụ enweghị ike ịgbanwetụ ka oge na-aga

“Ihe a kọrọ na Jenesis isi mbụ adịghị oké ogologo. Ma, otú o si daba n’ihe ndị sayensị chọpụtara dị ịtụnanya.”​—Gerald L. Schroeder, ọ mụrụ gbasara fiziks.

Gịnị Ka Baịbụl Na-ekwughị?

Ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe Baịbụl kwuru adabaghị n’ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtara n’oge a. Ma, ihe na-emekarị ka ha na-ekwu ihe a bụ na ha aghọtachaghị ihe Baịbụl kwuru.

Baịbụl ekwughị na eluigwe ma ọ bụ ụwa dị naanị puku afọ isii (6,000). Ihe Baịbụl kwuru bụ na e kere eluigwe na ụwa “ná mmalite.” (Jenesis 1:1) Baịbụl agwaghị anyị kpọmkwem mgbe e kere ha.

Baịbụl ekwughị na ọ bụ ụbọchị isii nkịtị nwere awa iri abụọ na anọ ka Chineke ji kee ihe ndị dị ndụ n’ụwa. Kama, Baịbụl ji okwu bụ́ “ụbọchị” kọwaa oge ndị e ji kee ihe. Dị ka ihe atụ, mgbe Chineke kechara eluigwe na ụwa, Jenesis isi nke 1 kwuru na o ji “ụbọchị” isii kee ihe ndị dị n’ụwa. Ma, Baịbụl kpọkwara oge e ji kee ihe ndị a niile “ụbọchị Jehovaa Chineke kere eluigwe na ụwa.” (Jenesis 2:4) N’ihi ya, nke ọ bụla n’ime “ụbọchị” isii ahụ Chineke ji kwadebe ụwa ka e nwee ike ibi na ya, keekwa ihe ndị dị ndụ dị n’ụwa, nwere ike ịpụta ogologo oge buru ezigbo ibu.

Baịbụl ekwughị na ihe ndị dị ndụ enweghị ike ịgbanwetụ ka oge na-aga. Akwụkwọ Jenesis kwuru na Chineke kere ụmụ anụmanụ “n’ụdị ha dị iche iche.” (Jenesis 1:24, 25) Okwu bụ́ “n’ụdị ha dị iche iche” e dere na Baịbụl abụghị okwu ndị ọkà mmụta sayensị. Kama, ọ dị ka è ji ya na-akọwa “ụdị” ihe dị iche iche e kere eke. N’ihi ya, ụfọdụ ihe bụ́ otu “ụdị” nwere ike ịgbanwetụ ntakịrị ka oge na-aga. Ma, ọ pụtaghị na ha ga-aghọ ihe ọzọ.

Gịnị ka i chere?

Ihe ndị anyị ka kwupụrụ ugbu a gosiri na Baịbụl ji okwu ndị dị mfe nakwa okwu ndị dabara adaba kọwaa otú eluigwe na ụwa si malite, otú ụwa dịbu na mbụ, nakwa otú ihe ndị dị ndụ si malite dịwa n’ụwa. Baịbụl ò kwukwara Onye ọ bụ ya n’eziokwu kere ihe ndị a? Otu akwụkwọ aha ya bụ Encyclopædia Britannica kwuru, sị: “Echiche bụ́ na o nwere onye karịrị mmadụ kere ihe niile dabara n’ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtarala n’oge a.”b

Chegodị ihe a:

Gụọ Jenesis 1:1–2:4. Chọpụta otú ihe a kọrọ na ya si dị iche n’akụkọ ifo ndị a na-akọ gbasara otú eluigwe na ụwa si malite. Dị ka ihe atụ, ndị Babịlọn kweere na ọ bụ ozu otu chi nwaanyị na ọbara otu chi ka e ji mee eluigwe na ụwa nakwa ụmụ mmadụ. Ndị Ijipt oge ochie chekwara na ọ bụ chi a na-akpọ Ra ji anya mmiri ákwá ya kee ụmụ mmadụ. Na Chaịna, ụfọdụ ndị chere na ọ bụ n’ozu otu dike nwụrụ anwụ ka ụwa si pụta, nakwa na ụmụ mmadụ si n’ụmụ ahụhụ ndị si ya n’ahụ́ pụta dịrị. Ì chere na ihe a kọrọ na Jenesis bụ akụkọ ifo dị ka akụkọ ndị a? Ka ì chere na ọ dabara n’ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtarala?

Lee vidio ga-ewe nkeji anọ aha ya bụ È Kere Eluigwe na Ụwa Eke? Denye aha vidio a n’ebe a na-achọ ihe na jw.org ka ị hụ ya.

a Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

b Akwụkwọ a bụ́ Encyclopædia Britannica anaghị akụzi na o nwere onye kere ihe ndị dị ndụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya