Nkebi nke 24
Pọl Degaara Ọgbakọ Dị Iche Iche Akwụkwọ Ozi
Akwụkwọ ozi ndị Pọl dere gbara Ndị Kraịst narị afọ mbụ ume
ỌGBAKỌ Ndị Kraịst ahụ a malitere ọhụrụ nwere ọrụ dị mkpa ọ ga-arụ iji mezuo nzube Jehova. Ma n’oge na-adịghị anya, a malitere ịkpagbu Ndị Kraịst narị afọ mbụ. Hà ga-anọgide na-eme ihe ziri ezi n’anya Chineke mgbe ndị na-abụghị Ndị Kraịst ibe ha na-akpagbu ha nakwa mgbe ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ji aghụghọ na-achọ ime ka ha mebie iwu Chineke? E ji akwụkwọ ozi iri abụọ na otu so n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst dụọ ha ọdụ ma gbaa ha ume.
Ọ bụ Pọl onyeozi dere akwụkwọ ozi iri na anọ n’ime ha, malite ná Ndị Rom ruo ná Ndị Hibru. A kpọrọ nke ọ bụla n’ime akwụkwọ ozi ndị ahụ aha onye e degaara ya, ma ọ bụkwanụ aha ọgbakọ e degaara ya. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ihe ndị Pọl dere n’akwụkwọ ozi ndị ahụ.
Ndụmọdụ banyere omume ọma. Ndị na-akwa iko, ya bụ, ma ndị lụrụ di na nwunye ma ndị na-alụbeghị, nakwa ndị na-eme mmehie ndị ọzọ jọgburu onwe ha “agaghị eketa alaeze Chineke.” (Ndị Galeshia 5:19-21; 1 Ndị Kọrịnt 6:9-11) Ndị na-efe Chineke kwesịrị ịdị n’otu n’agbanyeghị mba ha si. (Ndị Rom 2:11; Ndị Efesọs 4:1-6) Ha kwesịrị iji obi ụtọ na-enyere ndị kwere ekwe ibe ha nọ ná mkpa aka. (2 Ndị Kọrịnt 9:7) Pọl kwuru, sị: “Na-ekpenụ ekpere n’akwụsịghị akwụsị.” N’eziokwu, a gbara ndị na-efe Chineke ume ka ha jiri ekpere na-agwa Jehova otú obi dị ha. (1 Ndị Tesalonaịka 5:17; 2 Ndị Tesalonaịka 3:1; Ndị Filipaị 4:6, 7) Ọ bụ naanị ekpere mmadụ ji okwukwe kpee ka Chineke na-anụ.—Ndị Hibru 11:6.
Gịnị ga-eme ka ezinụlọ na-eme nke ọma? Ndị bụ́ di kwesịrị ịhụ nwunye ha n’anya dị ka ha hụrụ onwe ha. Ndị bụ́ nwunye kwesịrị ịkwanyere di ha ùgwù nke ukwuu. Ụmụ kwesịrị irubere ndị mụrụ ha isi, n’ihi na ime otú ahụ na-atọ Chineke ụtọ. Ndị nne na nna kwesịrị iji ihe ndị e kwuru n’iwu Chineke na-eduzi ma na-azụ ụmụ ha n’ịhụnanya.—Ndị Efesọs 5:22–6:4; Ndị Kọlọsi 3:18-21.
E nyeere Ndị Kraịst aka ịghọta nzube Chineke. Ọtụtụ ihe e kwuru n’Iwu Mozis chebere ụmụ Izrel ma duzie ha ruo mgbe Kraịst bịara. (Ndị Galeshia 3:24) Ma ọ dịghị mkpa na Ndị Kraịst ga-edebe Iwu ahụ iji fee Chineke. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru, ya bụ, Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu, o mere ka a ghọtakwuo ihe Iwu Mozis pụtara nakwa otú Kraịst si mezuo nzube Chineke. Pọl kọwara na e ji ọtụtụ ihe e kwuru n’Iwu ahụ mee ihe atụ ihe ga-eme n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, àjà e ji ụmụ anụmanụ chụọ gosiri na Jizọs ga-eji ndụ ya chụọ àjà, nke ga-eme ka a gbaghara ụmụ mmadụ mmehie ha kpamkpam. (Hibru 10:1-4) Chineke ji ọnwụ Jizọs kagbuo ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, n’ihi na ọ dịghịzi mkpa.—Ndị Kọlọsi 2:13-17; Ndị Hibru 8:13.
Ntụziaka banyere otú e kwesịrị isi hazie ọgbakọ. Ndị ikom chọrọ ijere ọgbakọ ozi ga-enwerịrị omume ọma, nweekwa àgwà ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru mmadụ ga-enwe tupu a họpụta ya ịbụ onye nlekọta. (1 Timoti 3:1-10, 12, 13; Taịtọs 1:5-9) Ndị na-efe Jehova Chineke kwesịrị iso ndị kwere ekwe ibe ha na-ezukọ mgbe niile iji gbarịta ibe ha ume. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ọmụmụ ihe ọgbakọ kwesịrị ịgba ndị mmadụ ume ma zie ha ihe.—1 Ndị Kọrịnt 14:26, 31.
Pọl onyeozi alaghachila Rom mgbe o degaara Timoti akwụkwọ ozi ya nke abụọ. A tụrụ ya mkpọrọ n’ebe ahụ, ya ana-echezi mgbe a ga-ekpe ya ikpe. Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole obi kara gara leta Pọl. Pọl ma na a ga-egbu ya n’oge na-adịghị anya. O kwuru, sị: “Alụwo m ezi ọgụ ahụ, agbawo m ọsọ ahụ ruo n’isi, edebewo m okwukwe ahụ.” (2 Timoti 4:7) Ọ dị ka è gburu Pọl n’ihi okwukwe ya obere oge o kwuchara ihe ahụ. Ma akwụkwọ ozi ndị onyeozi ahụ dere ka na-eduzi ezi ndị na-efe Chineke taa.
—O si ná Ndị Rom; Ndị Kọrịnt nke Mbụ na nke Abụọ; Ndị Galeshia; Ndị Efesọs; Ndị Filipaị; Ndị Kọlọsi; Ndị Tesalonaịka nke Mbụ na nke Abụọ; Timoti nke Mbụ na nke Abụọ; Taịtọs; Faịlimọn; na Ndị Hibru.
◼ Olee ndụmọdụ ndị Pọl nyere banyere omume ọma n’akwụkwọ ozi ndị o dere?
◼ Olee otú Pọl si mee ka a ghọtakwuo otú Kraịst si mezuo nzube Chineke?
◼ Olee ihe Pọl kwuru banyere otú e kwesịrị isi hazie ọgbakọ?
Igbe dị na peeji nke 28]
ÒNYE BỤ MKPỤRỤ AHỤ E KWERE NÁ NKWA?
Mgbe Adam na Iv mehiechara, Chineke ji okwu ihe atụ gwa agwọ ahụ, sị: “M ga-emekwa ka iro dịrị n’etiti gị na nwaanyị ahụ nakwa n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya. Ọ ga-egwepịa gị isi, ị ga-emerụkwa ya ahụ́ n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:15) Akwụkwọ Nsọ kpọrọ Ekwensu “agwọ mbụ ahụ.” (Mkpughe 12:9) O were ọtụtụ narị afọ tupu Baịbụl e jiri nwayọọ nwayọọ mee ka a mata onye ga-abụ Mkpụrụ ma ọ bụ Onye Nnapụta ahụ Chineke kwere ná nkwa.
Mgbe Adam na Iv mehiechara, ihe dị ka puku afọ abụọ agaa, Jehova gosiri na Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-esi n’ezinụlọ Ebreham. (Jenesis 22:17, 18) Ka ọtụtụ narị afọ gachara, Pọl onyeozi gosiri na Mesaya bụ́ Jizọs Kraịst bụ onye bụ́ isi ná Mkpụrụ ahụ. (Galeshia 3:16) Dị ka e kwuru na Jenesis 3:15, e merụrụ Jizọs ahụ́ “n’ikiri ụkwụ” n’ụzọ ihe atụ mgbe e gburu ya. Ma, Chineke kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, bụ́ onye “e mere ka ọ dị ndụ na mmụọ.”—1 Pita 3:18.
Chineke zubekwara na otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ ga-esokwa ná mkpụrụ ahụ. (Ndị Galeshia 3:29; Mkpughe 14:1) A ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha bụrụ mmụọ ma soro Kraịst chịa n’Alaeze eluigwe.—Ndị Rom 8:16, 17.
Jizọs bụ eze dị ike n’eluigwe. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-ebibi mkpụrụ Ekwensu, ya bụ, ndị mmadụ ọjọọ na ndị mmụọ ọjọọ na-akwado Setan. (Jọn 8:44; Ndị Efesọs 6:12) Ọchịchị Jizọs ga-ewetara ndị niile na-erube isi udo na ọṅụ. Ọ ga-emecha ‘gwepịa agwọ ahụ isi,’ gbuo ya kpamkpam.—Ndị Hibru 2:14.
Chaatị dị na peeji nke 27]
Jenesis
Ọpụpụ
Levitikọs
Ọnụ Ọgụgụ
Diuterọnọmi
Jọshụa
Ndị Ikpe
Rut
Zefanaya
Hagaị
Zekaraya
Malakaị
Matiu
Mak
Luk
Jọn
Ọrụ Ndịozi
Ndị Rom ●
1 Ndị Kọrịnt ●
2 Ndị Kọrịnt ●
Ndị Galeshia ●
Ndị Efesọs ●
Ndị Filipaị ●
Ndị Kọlọsi ●
1 Ndị Tesalonaịka ●
2 Ndị Tesalonaịka ●
1 Timoti ●
2 Timoti ●
Taịtọs ●
Faịlimọn ●
Ndị Hibru ●
Jems
1 Pita
2 Pita
1 Jọn
2 Jọn
3 Jọn
Jud
Mkpughe
[Chaatị dị na peeji nke 28]
Joel
Emọs
Obedaya
Jona
Maịka
Nehọm
Habakọk
Zefanaya
Hagaị
Zekaraya
Malakaị
Matiu
Mak
Luk
Jọn
Ọrụ Ndịozi
● Ndị Rom
● 1 Ndị Kọrịnt
● 2 Ndị Kọrịnt
● Ndị Galeshia
● Ndị Efesọs
● Ndị Filipaị
● Ndị Kọlọsi
● 1 Ndị Tesalonaịka
● 2 Ndị Tesalonaịka
● 1 Timoti
● 2 Timoti
● Taịtọs
● Faịlimọn
● Ndị Hibru
Jems
1 Pita
2 Pita
1 Jọn
2 Jọn
3 Jọn
Jud
Mkpughe
[Map dị na peeji nke 27]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Akwụkwọ Ozi Ndị Pọl Dere N’Ihe dị ka afọ 50-65 O.A.
● Ebe ndị Pọl nọ dee akwụkwọ ozi ya
(?) Ndị a na-amaghị ebe ọ nọ dee ha
ỊTALI
● ROM
Ndị Efesọs
Ndị Kọlọsi
Faịlimọn
Ndị Filipaị
Ndị Hibru
2 Timoti
Sisili
MASEDONỊA
2 Ndị Kọrịnt
1 Timoti
Taịtọs (?)
Filipaị
Ndị Tesalonaịka
GRIS
● KỌRỊNT
1 Ndị Tesalonaịka
2 Ndị Tesalonaịka
Ndị Rom
Krit
● EFESỌS
1 Ndị Kọrịnt
Kọlọsi
GALESHIA
● ANTIỌK
Ndị Galeshia (?)
Saịprọs
Jeruselem
IJIPT
OKÉ OSIMIRI MEDITERENIAN