Ònye Bụ Nwunye Ken?
Ihe Baịbụl Kwuru
Ken bụ nwa mbụ nwoke mbụ na nwaanyị mbụ mụrụ. Ọ lụrụ otu n’ime ụmụnne ya ma ọ bụ onye ikwu ya. Ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ bụ ihe Baịbụl kwuru gbasara Ken na ndị ezinụlọ ha.
Ihe bụ eziokwu gbasara Ken na ndị ezinụlọ ha
Ọ bụ Adam na Iv mụrụ onye ọ bụla dị ndụ. Chineke ‘sitere n’otu mmadụ [Adam] mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ, ka ha biri n’elu ala dum.’ (Ọrụ Ndịozi 17:26) Nwunye Adam bụ́ Iv ghọrọ, “nne nke onye ọ bụla dị ndụ.” (Jenesis 3: 20) N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na Ken lụrụ onye Adam na Iv mụkwara.
Ken na nwanne ya nwoke Ebel bụ ndị Iv bu ụzọ mụọ n’ime ụmụ niile ọ mụrụ. (Jenesis 4: 1, 2) Mgbe a chụpụrụ Ken n’ihi na o gburu nwanne ya, ọ sịrị: “Onye ọ bụla hụrụ m ga-egbu m.” (Jenesis 4: 14) Olee onye Ken na-atụ ụjọ na ọ ga-egbu ya? Baịbụl kwuru na Adam “mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.” (Jenesis 5:4) Ọ ga-abụ na ndị Ken na-atụ ụjọ na ha ga-egbu ya bụ ụmụ ndị ọzọ ahụ Adam na Iv mụrụ.
N’oge ochie, mmadụ ịlụ nwanne ya abụghị ihe ọjọọ. Dị ka ihe atụ, nwoke ezi omume bụ́ Ebreham lụrụ nwanne ya nwaanyị. (Jenesis 20:12) Ebe mbụ a machiri mmadụ ịlụ nwanne ya bụ n’Iwu Mozis. E mere iwu a ọtụtụ afọ Ken nwụchara. (Levitikọs 18: 9, 12, 13) O yiri ka ụmụ ndị lụrụ nwanne ha n’oge ahụ na-amụta anaghị enwe nkwarụ otú ahụ ndị nke oge a na-enwe.
Ihe Baịbụl kọrọ gbasara Adam na Iv, na ndị ezinụlọ ha bụ eziokwu. Ọ bụghị naanị na Jenesis, bụ́ nke Mozis dere, ka e dere usoro ọmụmụ Adam. Ezra na Luk bụ́ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme dekwara ya n’akwụkwọ ha dere. (Jenesis 5: 3-5;1 Ihe E Mere 1: 1-4; Luk 3: 38) Ndị dere Baịbụl mere ka anyị mara na akụkọ Ken bụ ihe mere eme.—Ndị Hibru 11:4; 1 Jọn 3:12; Jud 11.