Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 128
  • Baịbụl Ò Kwuru Maka Pọgatrị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Baịbụl Ò Kwuru Maka Pọgatrị?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Ị̀ Pụrụ Ikwere na Bible?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ọnwụ
    Teta!—2014
  • Ị̀ Pụrụ Inyere Ndị Nwụrụ Anwụ Aka?
    Teta!—2006
  • Gịnị Na-eme Mkpụrụ Obi n’Ọnwụ?
    Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 128
Otú onye sere foto a si chee na pọgatrị dị

Baịbụl Ò Kwuru Maka Pọgatrị?

Ihe Baịbụl kwuru

Mba, o kwughị. Okwu ahụ bụ́ “pọgatrị” adịghị na Baịbụl. O nweghịkwanụ ebe o kwuru na mkpụrụ obi ndị nwụrụ anwụ na-aga ka a nụchaa ha na pọgatrị.a Ka anyị leba anya n’ihe Baịbụl kwuru banyere mmehie na ọnwụ nakwa otú o si dị iche n’ozizi pọgatrị.

  • Ihe ga-asachapụ mmadụ mmehie bụ onye ahụ inwe okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs, ọ bụghị ịga n’ebe a na-akpọ pọgatrị. Baịbụl kwuru na “ọbara Jizọs bụ́ Ọkpara [Chineke] na-asachapụ anyị mmehie niile” nakwa na “Jizọs Kraịst . . . tọpụkwara anyị ná mmehie anyị site n’ọbara nke ya.” (1 Jọn 1:7; Mkpughe 1:5) Jizọs nyere “mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta” maka mmehie ọtụtụ mmadụ.​—Matiu 20:28.

  • Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla. “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” (Ekliziastis 9:5) Onye nwụrụ anwụ enweghị ike ịma ụfụ ihe, n’ihi ya o nweghị otú a ga-esi eji ọkụ pọgatrị mee ka ọ dị ọcha.

  • O nweghị ahụhụ a na-ata onye nwụrụ anwụ maka mmehie ya. Baịbụl kwuru na “ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ” kwuokwa na “a tọhapụwo onye nwụrụ anwụ ná mmehie ya.” (Ndị Rom 6:​7, 23) Ọnwụ bụ ụgwọ ọrụ na ntaramahụhụ zuru ezu maka mmehie.

Gịnị bụ ozizi pọgatrị?

Chọọchị Katọlik kwuru na pọgatrị bụ ebe ma ọ bụ ọnọdụ mkpụrụ obi ndị nwụrụ anwụ na-anọ ka e wee sachapụ ha mmehie ma nụchaa ha.b Akwụkwọ bụ́ Catechism of the Catholic Church sịrị na ihe mere o ji dị mkpa ka a nụchaa mkpụrụ obi ndị a bụ “ka ha nwee ike ịdị nsọ maka ịga eluigwe.” Akwụkwọ katikizim ahụ kwukwara na ‘ozizi ọdịbendị Chọọchị Katọlik kwuru na e nwere ihe a na-akpọ ọkụ nnụcha,’ bụ́ nke e gosiri n’ihe osise dị n’isiokwu a. Ma nke a abụghị ozizi si n’Akwụkwọ Nsọ.

Olee ebe ozizi pọgatrị si?

Ndị Grik oge ochie kweere na e nwere Limbo, nweekwa pọgatrị. Otu nwoke a na-akpọ Clement onye Alegzandria kwetara ihe a ndị Grik oge ochie kweere. Nke a mere o ji kwuo na e nwere ike iji ọkụ nụchaa onye mmehie ya adị ọcha. Ma, akwụkwọ bụ́ The History of Christian Doctrines kwuru na ọ bụ poopu a na-akpọ Gregory nke Mbụ, kwuziri na e nwere ihe bụ ọkụ pọgatrị. Kwuokwa na ọ bụ ozizi a na-anaghị agbagha agbagha. Akwụkwọ a kwukwara na nwoke ahụ a na-akpọ Gregory bụ poopu malite n’afọ 590 ruo 604 Oge Anyị. Kwuokwa na “a na-akpọkarị ya ‘onye wepụtara pọgatrị.’” Ọ bụ ná nnọkọ ndị isi Chọọchị Katọlik nwere n’obodo Liọns n’afọ 1274 nakwa nke ha nwere na Flọrens n’afọ 1439 ka ha nọ kọwakwuo ihe ozizi pọgatrị bụ. Ha mechakwara kwughachi ya ná nnọkọ ọzọ e nwere na Trent n’afọ 1547.

a Akwụkwọ bụ́ Orpheus: A General History of Religions kwuru banyere pọgatrị na “o nweghị ihe ọ bụla e kwuru banyere ya n’oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn.” Akwụkwọ ọzọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru, sị: “E lebachaa anya n’ihe niile, ozizi pọgatrị ahụ chọọchị Katọlik na-akụzi gbadoro ụkwụ ná nkụzi ọdịbendị, ọ bụghị n’Akwụkwọ Nsọ.”​—Second Edition, Volume 11, peeji nke 825.

b Gụọ New Catholic Encyclopedia, Second Edition, Volume 11, peeji nke 824.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya