Inọk—Atụghị Egwu n’Ihu Nsogbu Nile
NYE ezigbo mmadụ, ọ bụ oge kasị njọ. Asọpụrụghị Chineke jupụtara ụwa. E nwere ọdịda na-akawanye njọ nke ọnọdụ omume ihe a kpọrọ mmadụ. N’ezie, o ruwela mgbe a ga-ekwu, sị: “Jehova wee hụ na ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa, Ọ hụkwa na nchepụta nile ọ bụla nke echiche obi ya bụ nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile.”—Jenesis 6:5.
Inọk, onye nke asaa n’usoro ọmụmụ sitere n’Adam, nwere obi ike iguzopụ iche. O guzosiri ike maka ezi omume n’agbanyeghị ihe ndị si na ya pụta. Ozi Inọk mekpara ndị mmehie na-adịghị asọpụrụ Chineke ahụ nke na a kara ya akara maka ogbugbu, ọ bụkwa nanị Jehova pụrụ inyere ya aka.—Jud 14, 15.
Inọk na Ihe Iseokwu Eluigwe na Ala Ahụ
Mgbe dị anya tupu ọmụmụ Inọk, e welitere ihe iseokwu nke ọbụbụeze eluigwe na ala. Ò ruuru Chineke ịchị? Dị ka a pụrụ ikwu ya, Setan Ekwensu sịrị mba. O siri ọnwụ na ihe ndị e kere eke nwere ọgụgụ isi ga-eme nke ọma karị ma ọ bụrụ na ha nweere onwe ha pụọ ná nduzi Chineke. Setan nwara iwulite ihe akaebe ya megide Jehova Chineke site n’iji aghụghọ na-adọrọ ndị mmadụ gaa n’akụkụ nke ya. Adam, nwunye ya Iv, na nwa mbụ ha, bụ́ Ken, bụ ndị a ma ama maka ịnọ n’akụkụ Setan site n’ịhọrọ ịchịisi onwe onye kama ịchịisi Chineke. Mmadụ abụọ mbụ ahụ mere nke a site n’iri mkpụrụ osisi Chineke machibidororịị iwu, Ken mekwara otú ahụ site n’ịkpachara anya gbuo nwanne ya onye ezi omume, bụ́ Ebel.—Jenesis 3:4-6; 4:8.
Ebel ejiriwo obi ike guzo n’akụkụ Jehova. Ebe nguzosi ike n’ezi ihe Ebel kwaliteworo ezi ofufe, ihe ịrụ ụka adịghị ya na Setan nwere obi ụtọ ịhụ ka Ken wụkwasịrị iwe ogbugbu ya n’ahụ ya. Malite n’oge ahụ gaa n’ihu, Setan ejiwo “egwu ọnwụ” mee ihe dị ka ngwá agha na-emenye egwu. Ọ na-achọ ịkụnye egwu n’ime obi nke onye ọ bụla nwere ọchịchọ ife ezi Chineke ahụ.—Ndị Hibru 2:14, 15; Jọn 8:44; 1 Jọn 3:12.
Ka ọ na-erule oge ọmụmụ Inọk, echiche Setan nke na ndị mmadụ agaghị akwado ọbụbụeze Jehova yiri ihe a kwadoro nke ọma. Ebel anwụwo, a dịghị agbasokwa ihe nlereanya ikwesị ntụkwasị obi ya. Ma, Inọk gosiri onwe ya onye dị iche. O nwere ihe mgbakwasị ụkwụ siri ike maka okwukwe, n’ihi na ọ maara nke ọma ihe ndị weere ọnọdụ n’ogige Iden.a Lee otú ọ na-aghaghị isiwo nwee mmasị n’amụma Jehova nke na-egosi na Mkpụrụ e kwere ná nkwa ga-eweta Setan na atụmatụ ya nile ná ngwụsị!—Jenesis 3:15.
N’olileanya nke a na-anọgide n’ihu ya, Inọk abụghị onye ogbugbu Ekwensu kpaliri e gburu Ebel nke a kọrọ akụkọ ya yiri egwu. Kama nke ahụ, ọ nọgidere na-eso Jehova na-eje ije, na-agbaso ụzọ ezi omume n’oge ndụ ya nile. Inọk doro onwe ya iche pụọ n’ụwa, na-ajụ mmụọ ya nke nnwere onwe.—Jenesis 5:23, 24.
Ọzọkwa, Inọk ji obi ike kwuo okwu ma mee ka o doo anya na ọrụ ọjọọ nile nke Ekwensu ga-akụ afọ n’ala. N’okpuru nduzi nke mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ Chineke, Inọk buru amụma gbasara ndị ajọ omume: “Lee, Onyenwe anyị bịara, Ya na ndị nsọ Ya a na-apụghị ịgụta ọnụ, ikpe mmadụ nile ikpe, na ịtụ ndị nile ndị na-asọpụghị Chineke ihe n’anya, bụ́ ọrụ nile nke asọpụghị Chineke ha nke ha rụrụ n’asọpụghị Chineke, ha na okwu dị ike nile nke ndị mmehie ndị na-asọpụghị Chineke kwugidere Ya.”—Jud 14, 15.
N’ihi mkpọsa atụghị egwu Inọk mere, Pọl onyeozi, n’idegara ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru akwụkwọ, gụnyere ya n’etiti oké “ìgwè ndị àmà” setịpụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya nke okwukwe nọ n’ọrụ.b (Ndị Hibru 11:5; 12:1) Dị ka nwoke okwukwe, Inọk nọgidesiri ike n’ụzọ nke iguzosi ike n’ezi ihe ruo ihe karịrị afọ 300. (Jenesis 5:22) Lee otú ikwesị ntụkwasị obi nke Inọk na-aghaghị isiwo kpasuo ndị iro Chineke n’eluigwe na ụwa iwe! Amụma Inọk na-agba agba kpaliri mkpọrọmasị Setan, ma o wetara nchebe Jehova.
Chineke Kuuru Inọk Laa —N’ụzọ Dị Aṅaa?
Jehova ekweghị ka Setan ma ọ bụ ndị na-ejere ya ozi n’elu ala gbuo Inọk. Kama nke ahụ, ihe ndekọ ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ na-asị: “Chineke kuuru ya laa.” (Jenesis 5:24) Pọl onyeozi na-akọwa okwu ahụ otú a: “Okwukwe ka e ji bubiga Inọk ka ọ ghara ịhụ ọnwụ; a hụghịkwa ya, n’ihi na Chineke bubigara ya rịị: n’ihi na mgbe a ka ebubigaghị ya a gbaworo ya àmà na ihe ọ na-emerị na-atọ Chineke ezi ụtọ.”—Ndị Hibru 11:5.
Olee otú e si “bubiga Inọk ka ọ ghara ịhụ ọnwụ”? Ma ọ bụ dị ka e si dee ya ná nsụgharị R. A. Knox mere, olee otú e si ‘wepụ Inọk ọ ghara inwe ahụmahụ nke ọnwụ’? Chineke ji ụzọ udo kwụsị ndụ Inọk, na-egbochiri ya ihe mgbu nke ọnwụ site n’ọrịa ma ọ bụ ime ihe ike n’aka ndị iro ya. Ee, Jehova gbubiri ndụ Inọk n’afọ ndụ nke 365—ọ bụ nnọọ nwa okoro ma e were ya tụnyere ndị ọgbọ ya.
Olee otú Inọk si bụrụ onye ‘a gbawooro àmà na ihe ọ na-emerị na-atọ Chineke ezi ụtọ’? Olee ihe àmà o nwere? Dị ka o yiri, Chineke tinyere Inọk n’ọnọdụ ọhụụ, ọbụna dị ka e “weliri,” ma ọ bụ e bufere, Pọl onyeozi, na-enweta ọhụụ nke Paradaịs ime mmụọ dị n’ihu nke ọgbakọ ndị Kraịst dị ka ihe àmà na-egosi. (2 Ndị Kọrint 12:3, 4) Àmà, ma ọ bụ akaebe, na Inọk anọwo na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ pụrụ ịgụnyeworị nhụpere n’ọhụụ nke paradaịs elu ala ahụ dị n’ihu ebe ndị nile dị ndụ ga-akwado ọbụbụeze Chineke. Ikekwe ọ bụ ka Inọk si otú a na-ahụ ọhụụ na-akpali mmụọ ka Chineke kuuru ya laa n’ọnwụ na-adịghị afụ ụfụ ihi ụra ruo ụbọchị mbilite n’ọnwụ ya. O yiri ka, dị ka n’ọnọdụ Mosis, Jehova ò wepụru anụ ahụ Inọk, n’ihi na “a hụghịkwa ya.”—Ndị Hibru 11:5; Deuterọnọmi 34:5, 6; Jud 9.
Amụma E Mezuru
Taa, Ndịàmà Jehova na-akpọsa ihe bụ isi n’amụma Inọk. Site n’Akwụkwọ Nsọ, ha na-egosi otú a ga-esi mezuo ya mgbe Chineke bibiri ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’ọdịnihu dị nso. (2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-10) Ozi ha na-eme ha ka ha ghara ịbụ ndị a na-ele anya ọma, n’ihi na ọ dị iche nke ukwuu n’echiche na ihe mgbaru ọsọ ndị nke ụwa a. Mmegide ha na-enweta adịghị eju ha anya, n’ihi na Jisọs dọrọ ụmụazụ ya aka ná ntị, sị: “Mmadụ nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.”—Matiu 10:22; Jọn 17:14.
Ma, dị ka Inọk, ndị Kraịst taa bụ ndị e mesiri obi ike na a ga-emesịa napụta ha site n’aka ndị iro ha. Pita onyeozi dere, sị: “Onyenwe anyị matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke, na idebe ndị ajọ omume n’ahụhụ mmehie ruo ụbọchị ikpe.” (2 Pita 2:9) Chineke pụrụ ịhụ ya dị ka ihe kwesịrị ekwesị iwepụ otu nsogbu ma ọ bụ ọnọdụ dị njọ. Mkpagbu pụrụ ịkwụsị. Otú ọ dị, ma ọ kwụsịghị, ọ maara otú ọ ga-esi ‘mee ụzọ mgbapụ’ ka ndị ya nwee ihe ịga nke ọma n’ịtachi obi n’ọnwụnwa ha. Jehova na-enye ọbụna “ọkịka nke ike” mgbe ọ dị mkpa.—1 Ndị Kọrint 10:13; 2 Ndị Kọrint 4:7.
Dị ka “Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ,” Jehova ga-ejikwa ndụ ebighị ebi gọzie ndị na-ejere ya ozi kwesịrị ntụkwasị obi. (Ndị Hibru 11:6) Nye ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ime ha, nke a ga-abụ ndụ agwụghị agwụ na paradaịs elu ala. Dị ka Inọk, ka anyị kpọsaa ozi Chineke n’atụghị egwu. N’okwukwe, ka anyị mee nke a n’ihu nsogbu nile.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Adam dị afọ 622 mgbe a mụrụ Inọk. Inọk biri ndụ ruo ihe dị ka afọ 57 ka Adam nwụsịrị. Ya mere, oge ndụ ha abụọ dabakọrọ ruo oge dị ukwuu.
b Nsụgharị ahụ bụ́ “ndị àmà” ná Ndị Hibru 12:1 na-esite n’okwu Grik bụ́ marʹtys. Dị ka akwụkwọ bụ́ Wuest’s Word Studies From the Greek New Testament kwuru, okwu a na-apụta “onye na-agba akaebe, ma ọ bụ pụrụ ịgba akaebe, nye ihe ọ hụworo ma ọ bụ nụ ma ọ bụ mara site n’ụzọ ọ bụla ọzọ.” Akwụkwọ bụ́ Christian Words, nke Nigel Turner dere, na-ekwu na okwu ahụ pụtara onye na-ekwu “site n’ahụmahụ onwe onye . . . , na site ná nkwenye siri ike banyere eziokwu na echiche.”
[Igbe dị na peeji nke 30]
E Merụọ Aha Chineke
Ihe dị ka narị afọ anọ tupu Inọk, a mụrụ nwa nwa Adam bụ́ Enọsh. “Mgbe ahụ ka a malitere ịkpọku aha Jehova,” ka Jenesis 4:26 na-asị. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta asụsụ Hibru kwere na amaokwu a kwesịrị ịgụ “bidoro n’ụzọ mmerụ” ịkpọku aha Chineke ma ọ bụ, “mgbe ahụ mmerụ bidoro.” Gbasara oge ahụ n’akụkọ ihe mere eme, Targum nke Jerusalem na-asị: “Nke ahụ bụ ọgbọ nke ọ bụ n’ụbọchị ha ka ha bidoro imehie, na ime onwe ha arụsị, na ịkpọkwasị arụsị ha aha nke Okwu nke Onyenwe anyị.”
Oge Enọsh hụrụ iji aha Jehova eme ihe na-ezighị ezi n’ebe nile. Ọ pụrụ ịbụ na ndị ikom jiri aha Chineke mee ihe n’ebe onwe ha nọ ma ọ bụ n’ebe ndị ụfọdụ nọ bụ́ ndị ha si n’aka ha na-eme ka ha na-agakwu Jehova Chineke n’ofufe. Ma ọ bụ ha pụrụ ijiworị aha Chineke mee ihe n’ebe arụsị dị. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, Setan Ekwensu jisiri agbụrụ mmadụ ike n’ọnyà nke ikpere arụsị. Ka ọ na-erule oge ọmụmụ Inọk, ezi ofufe akọọla ụkọ. Onye ọ bụla dị ka Inọk, nke biri ndụ kwekọrọ n’eziokwu ma kwusaakwa ya, bụ onye a na-adịghị ele anya ọma, ya mere bụrụ onye a ga-akpagbu.—Tụlee Matiu 5:11, 12.
[Igbe dị na peeji nke 31]
Inọk Ọ̀ Gara Eluigwe?
“Okwukwe ka e ji bubiga Inọk ka ọ ghara ịhụ ọnwụ.” Ná nsụgharị ha nke akụkụ a nke Ndị Hibru 11:5, nsụgharị Bible ụfọdụ na-egosi na Inọk anwụghị n’ezie. Dị ka ihe atụ, A New Translation of the Bible, nke James Moffatt, na-asị: “Ọ bụ n’okwukwe ka a kpọọrọ Inọk gaa eluigwe nke mere na ọ nwụghị ma ọlị.”
Ma, ihe dị ka afọ 3,000 ka ụbọchị Inọk gasịrị, Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Ọ dịghịkwa onye ọ bụla rịgoworo n’eluigwe, ma ọ bụghị Onye siri n’eluigwe rịdata, bụ́ Nwa nke mmadụ.” (Jọn 3:13) The New English Bible na-agụ, sị: “Ọ dịbeghị onye ọ bụla jeworo eluigwe, ma ọ bụghị onye ahụ si n’eluigwe bịa, bụ́ Nwa nke Mmadụ.” Mgbe Jisọs kwuru okwu ahụ, ọbụna ya onwe ya arịgobeghị eluigwe.—Tụlee Luk 7:28.
Pọl onyeozi na-ekwu na Inọk na ndị ọzọ mejupụtara oké ìgwè ndị àmà ahụ tupu oge ndị Kraịst ‘nwụchara,’ “ha anataghị nkwa ahụ.” (Ndị Hibru 11:13, 39) N’ihi gịnị? N’ihi na mmadụ nile, tinyere Inọk, eketawo mmehie site n’aka Adam. (Abụ Ọma 51:5; Ndị Rom 5:12) Ụzọ nzọpụta e nwere nanị ya bụ site n’àjà mgbapụta Kraịst Jisọs. (Ọrụ 4:12; 1 Jọn 2:1, 2) N’ụbọchị Inọk a kwụbeghị ụgwọ mgbapụta ahụ. Ya mere, Inọk agaghị eluigwe, kama ọ nọ n’ụra ọnwụ na-echere mbilite n’ọnwụ n’ụwa.—Jọn 5:28, 29.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 29]
E sepụtaghachiri ya site n’Illustrirte Pracht - Bibel/Heilige Schrift des Alten und Neuen Testaments, nach der deutschen Uebersetzung D. Martin Luther’s