Jehova, “Onye Ikpe Ụwa Nile” Nke Na-adịghị Ele Mmadụ Anya N’Ihu
“Nna . . . na-ekpe ikpe dị ka ọrụ mmadụ nile n’otu n’otu si dị n’eleghị mmadụ anya n’ihu.”—1 PITA 1:17.
1, 2. (a) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụọ egwu ma nwee nkasi obi site n’echiche ahụ bụ na Jehova bụ nnukwu Onye Ikpe? (b) N’okwu ikpe Jehova megide mba nile, òkè dị aṅaa ka ndị ohu ya nọ n’elu ala na-ekere?
JEHOVA bụ nnukwu “Onye Ikpe ụwa nile.” (Jenesis 18:25) Dị ka Chineke Kasị Elu nke eluigwe na ala, o nwere ikike zuru ezu ikpe ihe nile o kere eke ikpe. N’otu oge ahụ, nke a bụ echiche na-akpali egwu na nke na-akasi obi. A kpaliri Mosis ikwupụta ihe nke a yiri ka ọ dị mgbagwoju anya, sị: “Jehova, bụ́ Chineke unu, ya onwe ya bụ Chineke kachasị chi nile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile, Chineke ukwu ahụ, bụ́ dike, dịkwa egwu, onye na-ahụghị mmadụ ihu ọma n’ikpe, onye na-anaraghị ihe iri ngó. Ọ na-eme ihe e kpere n’ikpe banyere nwa mgbei na nwanyị di ya nwụrụ, ọ na-ahụkwa ọbịa n’anya, inye ya nri na uwe mgbokwasị.”—Deuterọnọmi 10:17, 18.
2 Lee ịha nhata pụtara ìhè nke ahụ bụ! Chineke nke dị ukwuu, dị ike, dịkwa egwu, ma bụrụ onye na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu na onye ji ịhụnanya na-azọchitere ọdịmma nke ụmụ mgbei, ụmụ nwanyị di ha nwụrụ, na ndị ọbịa. Ònye ga-achọ ka e nwee Onye Ikpe na-ahụ n’anya karịa Jehova? N’igosipụta onwe ya dị ka onye nwere okwu ikpe megide mba nile nke ụwa Setan, Jehova na-akpọku ndị ohu ya nọ n’elu ala ka ha bụrụ ndịàmà ya. (Aịsaịa 34:8; 43:9-12) Ọ dịghị adabere n’àmà ha iji nwapụta ịbụ Chineke ya na izi ezi nke ọkaaka ya. Ma ọ na-enye ndịàmà ya ihe ùgwù pụrụ iche nke ịgba àmà n’ihu ihe nile a kpọrọ mmadụ na ha matara ọkaaka ya. Ndịàmà ya na-edo onwe ha n’okpuru ọkaaka ezi omume ya, sitekwa n’ije ozi ihu ọha, ha na-akpali ndị ọzọ ido onwe ha n’okpuru ikike nke Onye Ikpe Kasị Elu.
Ụzọ Jehova Si Ekpe Ikpe
3. Olee ụzọ a pụrụ isi chịkọta ụzọ Jehova si ekpe ikpe, oleekwa ụzọ e si mee ihe atụ nke a n’okwu ikpe metụtara Adam na Iv?
3 N’oge mmalite akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ, Jehova ji aka ya kpee ndị ụfọdụ dara iwu ikpe. Ihe atụ nile nke ụzọ o si duzie okwu ikpe na-esetịpụ ihe nlereanya nye ndị ohu ya ga-emesịa nwee ibu ọrụ nke iduzi okwu ikpe n’etiti ndị ya. (Abụ Ọma 77:11, 12) A pụrụ ịchịkọta ụzọ o si ekpe ikpe otú a: iguzosi ike n’ebe ọ dị mkpa, obi ebere n’ebe o kwere mee. N’ihe banyere Adam na Iv, bụ́ mmadụ ndị e kere eke zuru okè, ndị kpachara anya nupụ isi, ha ekwesịghị imere ebere. Ya mere, Jehova mara ha ikpe ọnwụ. Ma obi ebere ya rụrụ ọrụ n’ebe ụmụ ha nọ, Jehova gburu oge n’imezu ikpe ọnwụ ahụ, si otú a na-ekwere ka Adam na Iv mụta ụmụ. O ji ịhụnanya nye ụmụ ha olileanya nke mgbapụta pụọ n’agbụ nke mmehie na ọnwụ.—Jenesis 3:15; Ndị Rom 8:20, 21.
4. Olee ụzọ Jehova si mesoo Ken, n’ihi gịnịkwa ka okwu ikpe nke a ji bụrụ ihe na-akpali mmasị karịsịa?
4 Ụzọ Jehova si mesoo Ken bụ ihe na-akpali mmasị kpọmkwem n’ihi na ọ bụ okwu ikpe mbụ e dekọrọ nke metụtara otu n’ime ụmụ Adam na Iv ndị na-ezughị okè, ndị ‘e reworo ịnọ n’okpuru mmehie.’ (Ndị Rom 7:14) Jehova ò chere echiche banyere nke a ma mesoo Ken n’ụzọ dị iche pụọ n’ụzọ O si mesoo ndị mụrụ ya? Okwu ikpe nke a ọ̀ dị ihe ọ pụrụ ịkụziri ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta n’oge a? Ka anyị lee. N’ịghọta mmeghachi omume na-ezighị ezi nke Ken mgbe a na-anaraghị àjà ya nke ọma, Jehova ji ịhụnanya dọọ ya aka ná ntị banyere ihe ize ndụ nke ọ nọ n’ime ya. Otu ilu oge ochie na-asị: ‘Mgbochi ka mma karịa ọgwụgwọ.’ Jehova mere ihe nile ọ pụrụ ime site n’ịdọ Ken aka ná ntị banyere ikwe ka ọchịchọ ya nke ime mmehie chịa ya. Ọ gbalịrị inyere ya aka ‘ime nke ọma.’ (Jenesis 4:5-7) Nke a bụ nke mbụ Chineke na-akpọ mmadụ na-emehie emehie òkù ichegharị. Mgbe Ken gosiri omume nke enweghị nchegharị ma mezuo nzube ọjọọ ya, Jehova mara ya ikpe ịga biri n’ala ọzọ, na-eme ka nke a dị nro site n’inye iwu machibidoro ụmụ mmadụ ndị ọzọ igbu ya.—Jenesis 4:8-15.
5, 6. (a) Olee ụzọ Jehova si mesoo ọgbọ ahụ dịrị ndụ tupu oge Iju Mmiri? (b) Gịnị ka Jehova mere tupu o mee ihe e kpere n’ikpe megide ndị bi na Sọdọm na Gọmọra?
5 Tupu Iju Mmiri ahụ, mgbe ‘Jehova hụrụ na ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa, o nwere mwute n’obi ya.’ (Jenesis 6:5, 6) O ‘chegharịrị’ n’ihi na ọ kwara arịrị na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ọgbọ dịrị ndụ tupu oge Iju Mmiri ahụ ejiwo inwe onwe ime nhọrọ ha mee ihe na-ezighị ezi, na ọ ghaghịkwa imezu ihe e kpere n’ikpe n’isi ha. Ma, o nyere ha ịdọ aka ná ntị zuru ezu, na-eji Noa eme ihe ruo ọtụtụ afọ dị ka “onye na-ekwusa ezi omume.” Mgbe nke ahụ gasịrị, Jehova enweghị ihe ọ bụla mere ọ ga-eji ‘meere ụwa ahụ nke na-adịghị asọpụrụ Chineke ebere.’—2 Pita 2:5.
6 N’otu aka ahụ, a manyere Jehova iduzi okwu ikpe megide ndị rụrụ arụ bi na Sọdọm na Gọmọra. Ma rịba ama ụzọ o si mee nke ahụ. Ọ nụwo “iti mkpu” banyere omume na-awụ ibubo n’ahụ nke ndị a, ma ọ dịghị ihe ọzọ site n’ekpere nke Lọt onye ezi omume. (Jenesis 18:20; 2 Pita 2:7, 8) Ma tupu o mee ihe, ọ ‘rịdara’ ịchọpụta ihe bụ eziokwu site n’aka ndị mmụọ ozi ya. (Jenesis 18:21, 22; 19:1) O jikwa oge ahụ mee ihe iji mesie Abraham obi ike ọzọ na ya agajeghị ime ihe na-ezighị ezi.—Jenesis 18:23-32.
7. Ihe ndị dị aṅaa ka ndị okenye na-eje ozi na kọmitii ikpe pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya nke ụzọ Jehova si ekpe ikpe?
7 Gịnị ka ndị okenye taa pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya ndị a? N’okwu banyere Adam na Iv, Jehova gosiri ịhụnanya na nchebara echiche maka ndị ahụ, ndị ọ bụ ezie na ha bụ ndị ikwu nke ndị ikpe mara, enweghị ịta ụta ọ bụla n’okwu ahụ. O gosiri obi ebere n’ebe ụmụ Adam na Iv nọ. N’ihe banyere Ken, Jehova bu ụzọ hụ ihe ize ndụ Ken nọ n’ime ya wee jiri obi ọma soro ya tụgharịa uche, na-agbalị igbochi ya ime mmehie. Ọbụna mgbe ọ chụlasịrị Ken n’ala ọzọ, Jehova chebaara Ken echiche. Ọzọkwa, Jehova mezuru ihe e kpere n’ikpe n’isi ọgbọ ahụ dịrị tupu oge Iju Mmiri nanị mgbe o jisịrị ndidi nwee oké ntachi obi. Mgbe ndị mmadụ siri ọnwụ na-eme ajọ omume, ‘o wutere Jehova n’obi ya.’ O wutere ya na ụmụ mmadụ nupụrụ isi megide ụkpụrụ ezi omume ya, na a na-amanyekwa ya ịma ha ikpe. (Jenesis 6:6; tụlee Ezikiel 18:31; 2 Pita 3:9.) N’okwu banyere Sọdọm na Gọmọra, Jehova mere ihe nanị mgbe ọ chọpụtara ihe bụ eziokwu. Lee ihe nlereanya ndị mara mma ndị ahụ bụụrụ ndị na-eduzi okwu ikpe taa!
Ndị Ikpe Bụ́ Mmadụ n’Oge Ndị Nna Ochie
8. Iwu ndị bụ isi dị aṅaa nke Jehova ka a maara n’oge ndị nna ochie?
8 Ọ bụ ezie na ọ pụtara ìhè na e nweghị ụkpụrụ iwu ọ bụla e dere ede n’oge ahụ, ọha mmadụ nke oge ndị nna ochie maara banyere iwu Jehova ndị bụ isi, ndị ohu ya nwekwara ibu ọrụ nke idebe ha. (Tụlee Jenesis 26:5.) Ihe ahụ mere n’Iden egosiwo mkpa ọ dị irube isi na ido onwe onye n’okpuru ọkaaka Jehova. Okwu banyere Ken ekpughewo na Jehova adịghị akwado igbu mmadụ. Ozugbo Iju Mmiri ahụ gasịrị, Chineke nyere ihe a kpọrọ mmadụ iwu banyere ịdị nsọ nke ndụ, igbu mmadụ, ikpe ọnwụ, na iri ọbara. (Jenesis 9:3-6) Jehova megidere ịkwa iko ndị lụrụ di na nwunye n’ụzọ siri ike n’oge ihe ahụ mere n’etiti Abraham, Sera, na Abimelek, eze Gera, nke dị nso Geza.—Jenesis 20:1-7.
9, 10. Ihe atụ dị aṅaa na-egosi na e nwere usoro ikpe n’ọha mmadụ nke ndị nna ochie?
9 N’ụbọchị ndị ahụ, ndị isi ezinụlọ rụrụ ọrụ dị ka ndị ikpe ma dozie nsogbu ikpe nile. Jehova kwuru banyere Abraham, sị: “Amawo m ya, ka o wee nye ụmụ ya na ụlọ ya, ndị ga-anọchi ya, iwu, ka ha wee debe ụzọ Jehova, ime ezi omume na ihe e kpere n’ikpe.” (Jenesis 18:19) Abraham gosipụtara achọghị ọdịmma onwe ya nanị na nghọta n’idozi esemokwu dị n’etiti ndị na-azụrụ ya anụ ụlọ na ndị nke Lọt. (Jenesis 13:7-11) N’ịrụ ọrụ dị ka nna ochie nke bụ onye isi na onye ikpe, Juda mara nwunye nwa ya bụ́ Tema ikpe ka e jiri nkume tụgbuo ya ma kpọọ ya ọkụ, na-ekweta na ọ bụ onye na-akwa iko. (Jenesis 38:11, 24; tụlee Joshua 7:25.) Otú ọ dị, mgbe ọ matara eziokwu nile dị n’okwu ahụ, o kwupụtara na ọ bụ onye ezi omume karịa ya onwe ya. (Jenesis 38:25, 26) Lee ka o si dị mkpa ịmata ihe nile bụ eziokwu tupu e kpebie ikpe!
10 Akwụkwọ Job kpọtụrụ uche otu usoro ikpe ikpe ma gosi ịdị mma nke ikpe ikpe n’eleghị mmadụ anya n’ihu. (Job 13:8, 10; 31:11; 32:21) Job n’onwe ya na-echeta oge mgbe ọ bụ onye ikpe a na-akwanyere ùgwù nke na-anọdụ n’ụzọ ámá obodo na-ekpe ikpe ziri ezi ma na-ekpechitere nwanyị di ya nwụrụ na nwa mgbei. (Job 29:7-16) Otú a, e nwere ihe àmà na-egosi na n’etiti ọha mmadụ nke ndị nna ochie, “ndị okenye” na-arụ ọrụ dị ka ndị ikpe n’etiti ụmụ Abraham ọbụna tupu oge Ọpụpụ na tupu e nwee ụkpụrụ iwu ndị Chineke nyere mba Israel. (Ọpụpụ 3:16, 18) N’ezie, Mosis nyefere ihe ọgbụgba ndụ Iwu ahụ ga-achọ ka e mee n’aka “ndị okenye” nke Israel, bụ́ ndị nọchitere anya ndị ahụ.—Ọpụpụ 19:3-7.
Usoro Ikpe Ikpe nke Israel
11, 12. Dị ka ndị ọkà mmụta Bible abụọ si kwuo, gịnị mere usoro ikpe ikpe nke Israel ji dị iche pụọ na nke ndị mba ọzọ?
11 Ụzọ e si ekpe ikpe ziri ezi n’Israel dị nnọọ iche pụọ n’usoro ikpe ikpe nke mba ndị gbara ha gburugburu na-agbaso. E nweghị ọdịiche dị n’etiti iwu obobo na iwu imempụ. E jikọrọ ha abụọ n’iwu omume ọma na nke okpukpe. Mmadụ ịda iwu megide onye agbata obi ya bụ ịda iwu megide Jehova. N’akwụkwọ ya bụ́ The People and the Faith of the Bible, onye na-ede akwụkwọ bụ́ André Chouraqui dere, sị: “Usoro ikpe ikpe nke ọdịnala ndị Hibru dị iche pụọ na nke ndị agbata obi ya, ọ bụghị nanị ná nkọwa banyere ihe ndị bụ mmehie na ntaramahụhụ ya kama ná nzube nke iwu ndị ahụ. . . . Torah [Iwu] ahụ adịghị iche ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị; ọ na-achịkwa ụdịdị na ihe mejupụtara ihe a na-eme ná ndụ nke a na-adị kwa ụbọchị site n’inye ngọzi na ọbụbụọnụ. . . . N’Israel . . . ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe na-agaghị ekwe omume ịchọta ọdịiche doro anya n’ihe omume usoro ikpe ikpe nke obodo ahụ. E kpuchiri ha n’ịdị n’otu nke ndụ a na-adịkwa kpam kpam iji mezuo uche nke Chineke ahụ dị ndụ.”
12 Ọnọdụ nke a pụrụ iche mere ka ụzọ e si ekpe ikpe ziri ezi n’Israel nọrọ n’ọkwá dị elu karịa ná mba ndị dị n’oge ahụ. Onye ọkà mmụta Bible bụ́ Roland de Vaux dere, sị: “Iwu ndị Israel, n’agbanyeghị ụzọ ha si yirịta onwe ha n’ụdị na n’ihe dị n’ime ha, dị iche kpam kpam pụọ n’ahịrị okwu ‘nkwekọrịta’ nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nakwa ihe ndị e kwuru ‘n’ụkpụrụ iwu’ ha. Ọ bụ iwu okpukpe. . . . Ọ dịghị ụkpụrụ iwu ọ bụla nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa a pụrụ iji tụnyere iwu ndị Israel, bụ́ nke e kwuru n’akụkụ ya dum na ọ bụ Chineke dere ya. Ọ bụrụ na o nwere, na-agwakọkarịkwa, ntụzi omume na okpukpe, nke a bụ n’ihi na ọ metụtara akụkụ nile nke Ọgbụgba Ndụ Chineke, ọ bụkwa n’ihi na Ọgbụgba Ndụ nke a na-achịkwa mmekọrịta nke ụmụ mmadụ na ibe ha nakwa nke ha na Chineke.” Ọ bụghị ihe ijuanya na Mosis jụrụ, sị: “Olee mba ukwu dịkwa, nke nwere ụkpụrụ na ikpe ziri ezi dị ka iwu a nile, nke mụ onwe m na-etinye n’ihu unu taa?”—Deuterọnọmi 4:8.
Ndị Ikpe n’Israel
13. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Mosis bụ ihe nlereanya nye ndị okenye n’oge a?
13 N’ihi inwe usoro ikpe ikpe dị otú ahụ e buliri elu, ụdị mmadụ dị aṅaa ka a chọrọ ịrụ ọrụ dị ka onye ikpe? Banyere onye ikpe mbụ a họpụtara n’Israel, Bible na-ekwu, sị: “Nwoke ahụ, bụ́ Mosis, dị umeala n’obi nke ukwuu, karịa mmadụ nile ndị nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụgụ 12:3) Ọ dịghị ejikarị onwe ya n’aka gabiga ókè. (Ọpụpụ 4:10) Ọ bụ ezie na a chọrọ ka o kpee ndị ya ikpe, mgbe ụfọdụ ọ ghọrọ onye na-ekwuchitere ha ọnụ ha n’ihu Jehova, na-arịọ ya ka ọ gbaghara ha, ọbụna na-adị njikere iji onwe ya chụọ àjà n’ihi ha. (Ọpụpụ 32:11, 30-32) O kwuru n’ụzọ abụ, sị: “Okwu ọnụ m ga na-erupụta dị ka igirigi; dị ka nsha nsha mmiri n’elu ahịhịa ndụ, dịkwa ka oké mmiri ozuzo n’elu ihe ọkụkụ.” (Deuterọnọmi 32:2) N’abụghị onye na-ekpe ndị ya ikpe site n’ịdabere n’amamihe nke aka ya, o kwupụtara, sị: “Mgbe ha nwere okwu, ha abịakwute m; m na-ekpekwa ikpe n’etiti mmadụ na ibe ya, m na-emekwa ka ha mara ụkpụrụ nile nke Chineke, na iwu ya nile.” (Ọpụpụ 18:16) Mgbe o nwere obi abụọ, ọ ranyere okwu ahụ n’aka Jehova. (Ọnụ Ọgụgụ 9:6-8; 15:32-36; 27:1-11) Mosis bụ ezi ihe nlereanya nye ndị okenye, bụ́ ndị ‘na-azụ ìgwè atụrụ Chineke’ taa ma na-ekpebi okwu ikpe. (Ọrụ 20:28) Ka mmekọrịta nke ha na ụmụnna ha n’otu aka ahụ dịkwa ka “nsha nsha mmiri n’elu ahịhịa ndụ.”
14. Gịnị bụ iru eru ime mmụọ nke ndị ikom ahụ Mosis họpụtara dị ka ndị ikpe n’Israel?
14 Ka oge na-aga, nanị Mosis enwekwaghị ike ibu ibu nke idozi okwu ikpe nile nke ndị ya. (Ọpụpụ 18:13, 18) Ọ nabatara aro nke nna nwunye ya tụrụ banyere ịchọ enyemaka. Ọzọ, ụdị ndị ikom dị aṅaa ka a họpụtara? Anyị na-agụ, sị: “Lepụta ndị dimkpa, ndị na-atụ egwu Chineke, ndị na-ekwu eziokwu, ndị na-akpọ uru na-ezighị ezi asị. . . . Mosis wee si n’etiti Israel nile họpụta ndị dimkpa, mee ha ka ha bụrụ ndị isi ndị ahụ, ndị isi [ọtụtụ puku], na ndị isi [ọtụtụ narị], na ndị isi [ọtụtụ iri ise], na ndị isi [ọtụtụ iri]. Ha wee kpee ndị Israel ikpe na mgbe nile: okwu nile nke siri ike ka ha na-ewetara Mosis, ma ha onwe ha na-ekpe okwu nta nile.”—Ọpụpụ 18:21-26.
15. Gịnị bụ iru eru nke ndị ahụ jere ozi dị ka ndị ikpe n’Israel?
15 A pụrụ ịhụ na afọ ndụ abụghị nanị ihe mgbakwasị ụkwụ e nwere maka ịhọpụta ndị ikom ịrụ ọrụ dị ka ndị ikpe. Mosis kwuru, sị: “Dooro onwe unu ndị ikom maara ihe, ndị nwekwara nghọta, ndị a makwaara aha ha, dị ka ebo nile unu si dị, m ga-edokwa ha ndị isi unu.” (Deuterọnọmi 1:13) Mosis maara nnọọ nke ọma banyere ihe Elaịhu na-eto eto kwuru n’ọtụtụ afọ gara aga: “Ọ bụghị ndị ukwu maara ihe, ọ bụghịkwa ndị okenye na-aghọta ikpe.” (Job 32:9) N’ezie, ndị ahụ a họpụtara aghaghị ịbụ ‘ndị ikom nwere nghọta.’ Ma karịsịa ha aghaghị ịbụ ndị ike dị, ndị na-atụ egwu Chineke, ndị a pụrụ ịtụkwasị obi, ndị kpọrọ uru na-ezighị ezi asị na ndị maara ihe ma nwee uche. Ya mere, o yiri ka “ndị isi” na “ndị ikpe” e hotara na Joshua 23:2 na 24:1 adịghị iche pụọ ná “ndị okenye” e hotara n’otu amaokwu ndị ahụ, kama e si n’etiti ha họpụta ha.—Lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peji nke 549.
Ikpe Ikpe Ziri Ezi
16. Gịnị ka anyị kwesịrị ịrịba ama taa banyere ntụziaka ahụ Mosis nyere ndị ikpe ahụ a họpụtara ọhụrụ?
16 Banyere ntụziaka ndị e nyere ndị ikpe ndị a a họpụtara ahọpụta, Mosis sịrị: “M wee nye ndị ikpe unu iwu na mgbe ahụ, sị, Na-anụnụ ikpe n’etiti ụmụnne unu, na-ekpekwanụ ikpe ezi omume n’etiti nwoke na nwanne ya na ọbịa ya. Unu amatala ihu mmadụ n’ikpe; unu ga-anụ ikpe onye nta na ikpe onye ukwu n’otu ụzọ ahụ; unu atụla ihu mmadụ ụjọ; n’ihi na ikpe ahụ, ọ bụ Chineke nwe ya: ma okwu nke sikarịrị unu ike, unu ga-eweta ya nso m [Mosis], m ga-anụkwa ya.”—Deuterọnọmi 1:16, 17.
17. Olee ndị a họpụtara dị ka ndị ikpe, ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Eze Jehoshafat nyere ha?
17 Otú ọ dị, a pụrụ iwetara Mosis okwu ikpe nanị n’oge ọ nọ ndụ. Ya mere e mere ndokwa ọzọ iwega okwu ikpe ndị siri ike n’aka ndị nchụàjà, ndị Livaị, na karịsịa ndị ikpe a họpụtara ahọpụta. (Deuterọnọmi 17:8-12; 1 Ihe Emere 23:1-4; 2 Ihe Emere 19:5, 8) Nye ndị ikpe ahụ ọ họpụtara n’obodo nile nke Juda, Eze Jehoshafat kwuru, sị: “Leenụ ihe unu onwe unu na-eme: n’ihi na ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe, kama ọ bụ Jehova . . . Otú a ka unu ga-eme n’egwu Jehova, na n’ikwesị ntụkwasị obi, na n’obi zuru okè. Ma mgbe iseokwu ọ bụla ga-eru unu ntị site n’ụmụnne unu ndị bi n’obodo ha, . . . unu ga-emekwa ka ha ghọta, ka ikpe wee ghara ịma ha n’ebe Jehova nọ, iwe ewee dịkwasị unu, dịkwasịkwa ụmụnne unu: otú a ka unu ga-eme, ikpe agaghị amakwa unu.”—2 Ihe Emere 19:6-10.
18. (a) Ụkpụrụ ụfọdụ ndị dị aṅaa ka ndị ikpe n’Israel na-aghaghị itinye n’ọrụ? (b) Gịnị ka ndị ikpe ahụ na-aghaghị icheta, akụkụ akwụkwọ nsọ dịkwa aṅaa na-egosi ihe ndị ga-esi na ha ichezọ nke a pụta?
18 Ndị a so n’ụkpụrụ nile nke ndị ikpe n’Israel na-aghaghị itinye n’ọrụ: ikpe ziri ezi nye ọgaranya na ogbenye (Ọpụpụ 23:3, 6; Levitikọs 19:15); eleghị mmadụ anya n’ihu ma ọlị (Deuterọnọmi 1:17); anaraghị aka azụ. (Deuterọnọmi 16:18-20) Ndị ikpe aghaghị icheta mgbe nile na ndị ha na-ekpe ikpe bụ atụrụ Jehova. (Abụ Ọma 100:3) N’ezie, otu n’ime ihe ndị mere Jehova ji jụ Israel anụ ahụ bụ na ndị nchụàjà na ndị ọzụzụ atụrụ ha ekpeghị ikpe n’ezi omume, mesookwa ndị ha n’obi ịta mmiri.—Jeremaịa 22:3, 5, 25; 23:1, 2; Ezikiel 34:1-4; Malakaị 2:8, 9.
19. Uru dị aṅaa ka ọ baara anyị ime nnyocha nke a banyere ụkpụrụ Jehova nile nke ikpe ziri ezi tupu Oge Anyị, gịnịkwa ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
19 Jehova adịghị agbanwe agbanwe. (Malakaị 3:6) Ntụle nke a dị mkpirikpi nke ụzọ e kwesịrị isiworị kpee ikpe n’Israel na ụzọ Jehova si ele ekpeghị ikpe ziri ezi anya kwesịrị ime ka ndị okenye kwụsịtụ ma chee echiche, bụ́ ndị nwere ibu ọrụ nke ikpebi okwu ikpe n’oge a. Ihe nlereanya nke Jehova dị ka Onye Ikpe, na usoro ikpe ikpe nke o guzobere n’Israel, wepụtara ụkpụrụ ndị setịpụrụ ihe nlereanya maka ikpe ikpe ziri ezi n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. Nke a ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ.
Ajụjụ Ntụleghachi
◻ Olee ụzọ a pụrụ isi chịkọta ụzọ Jehova si ekpe ikpe?
◻ Olee otú e si mee ihe atụ nke ụzọ Jehova ná mmeso o mesoro Ken na ọgbọ ahụ dịrị ndụ tupu Iju Mmiri?
◻ Olee ndị rụrụ ọrụ dị ka ndị ikpe n’oge ndị nna ochie, n’ụzọ dịkwa aṅaa?
◻ Gịnị mere usoro ikpe ikpe nke Israel ji dị iche pụọ na nke ndị mba ọzọ?
◻ Ụdị ndị ikom dị aṅaa ka a họpụtara dị ka ndị ikpe n’Israel, ụkpụrụ dịkwa aṅaa ka ha kwesịworo ịgbaso?
[Foto dị na peeji nke 10]
N’oge ndị nna ochie nakwa n’Israel, ndị okenye a họpụtara ahọpụta kpere ikpe ziri ezi n’ọnụ ụzọ ámá nke obodo