Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 3/15 p. 24-25
  • Ha Emeghịrị Onwe Ha Aha Wuru Ewu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Emeghịrị Onwe Ha Aha Wuru Ewu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajọ Ọdịda
  • Nimrọd—Onye Nkwulu Na-enupụ Isi
  • Ụmụ Mmadụ Ewuo Nnukwu Ụlọ Elu
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Gịnị Mere Alaeze Chineke Ji Dị Anyị Mkpa?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jenesis—Akụkụ nke Mbụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 3/15 p. 24-25

Ha Emeghịrị Onwe Ha Aha Wuru Ewu

BIBLE akpọghị aha ndị wuru ajọ ụlọ elu Bebel. Ihe ndekọ ahụ na-asị: “Ha wee sị, Ngwa, ka anyị wuoro onwe anyị obodo, na ụlọ elu, nke elu ya ga-eru n’eluigwe, ka anyị meekwara onwe anyị aha [wuru ewu NW]; ka anyị wee ghara ịgbasa n’elu ụwa nile.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.)—Jenesis 11:4.

Ole ndị ka “ha” bụ? Ihe omume a weere ọnọdụ n’ihe dị ka afọ 200 mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị. N’oge ahụ Noa, onye dị ihe dị ka afọ 800, biri n’etiti ọtụtụ puku ụmụ ya. Ha nile sụrụ otu asụsụ, bikọọkwa ọnụ n’otu ebe ahụ ya na ụmụ ya biri mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị. (Jenesis 11:1) N’otu oge, otu akụkụ nke ụba mmadụ a e mere ka o buo ibu kwagara n’ebe ọwụwa anyanwụ, ‘ha chọtakwara ala dị larịị n’ala Shaịna.’—Jenesis 11:2.

Ajọ Ọdịda

Ọ bụ na ndagwurugwu a ka ìgwè ahụ kpebiri inupụrụ Chineke isi. N’ụzọ dị aṅaa? Jehova Chineke ekwupụtawo nzube ya mgbe o nyere di na nwunye mbụ ahụ iwu ‘ịmụ ọmụmụ, baa ụba, jupụta ụwa.’ (Jenesis 1:28) A gwaghachiri Noa na ụmụ ya ndị ikom nke a mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị. Chineke nyere ha iwu, sị: “Unu onwe unu kwa, mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba; nupụtanụ ụmụ n’ụwa, baa ụba n’ime ya.” (Jenesis 9:7) N’imegide ntụzi Jehova, ndị ahụ wuru obodo ka ha wee ghara “ịgbasa n’elu ụwa nile.”

Ndị a malitekwara iwu ụlọ elu ná nzube nke imere onwe ha ‘aha wuru ewu.’ Ma n’ụzọ dị iche n’ihe ha tụrụ anya ya, ha ewuchaghị ụlọ elu ahụ. Ihe ndekọ Bible na-egosi na Jehova ghagburu asụsụ ha ka ha wee ghara ịghọta ibe ha. “Jehova” ka ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ na-ekwu, “wee mee ka ha si n’ebe ahụ gbasaa n’elu ụwa nile: ha wee hapụ iwu obodo ahụ.”—Jenesis 11:7, 8.

E mere ka ajọ ọdịda nke atụmatụ a pụta ìhè site n’eziokwu bụ́ na aha ndị ahụ na-ewu ụlọ ahụ aghọghị nke “wuru ewu,” ma ọ bụ nke a ma nke ọma. N’ezie, a maghị aha ha, e hichapụwokwa ya n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Ma gịnị banyere Nimrọd, nwa nwa Noa? Ọ́ bụghị ya bụ onye ndú nke nnupụisi a megide Chineke? Ọ̀ bụ na a maghị aha ya nke ọma?

Nimrọd—Onye Nkwulu Na-enupụ Isi

Obi abụọ adịghị ya, Nimrọd bụ onye ndú ha. Jenesis isi nke 10 na-akọwa ya dị ka “dike n’ịchụ nta n’ihu Jehova.” (Jenesis 10:9) Akwụkwọ Nsọ na-asịkwa na “onye ahụ malitere ịbụ dike n’ụwa.” (Jenesis 10:8) Nimrọd bụ dike, nwoke na-eme ihe ike. Ọ ghọrọ onye ndú mbụ bụ́ mmadụ mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, na-ahọpụta onwe ya dị ka eze. Nimrọd bụkwa onye na-ewu ihe owuwu. Bible na-ekwu na ọ bụ ya wuru obodo asatọ, tinyere Bebel.—Jenesis 10:10-12.

N’ihi ya, Nimrọd—onye na-emegide Chineke, eze Bebel, na onye na-ewu obodo dị iche iche—n’ụzọ obi abụọ na-adịghị ya, keere òkè n’iwu ụlọ elu Bebel. Ọ̀ bụ na o meghịrị onwe ya aha na-ewu ewu? Banyere aha ahụ bụ́ Nimrọd, onye ọkà mmụta ihe banyere ndị Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa bụ́ E. F. C. Rosenmüller dere, sị: “E nyere Nimrọd aha ahụ site na [marad], ‘o nupụrụ isi,’ ‘o mehiere’ dị ka ihe ọ pụtara na Hibru si dị.” Mgbe ahụ Rosenmüller na-akọ na “ọ marala ndị Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa ahụ ịkpọkarị ndị ha a ma ama n’aha e nyere ha mgbe ha nwụsịrị, bụ́ ebe e si enweta, mgbe ụfọdụ, nkwekọ dị ịtụnanya n’etiti aha na ihe ndị e mere.”

Ọtụtụ ndị ọkà mmụta nwere echiche bụ́ na aha ahụ bụ́ Nimrọd abụghị aha a gụrụ n’ọmụmụ. Kama, ha na-ele ya anya dị ka aha a gụrụ mgbe e mesịrị iji kwekọọ n’omume nnupụisi ya mgbe ọ pụtasịrị ìhè. Dị ka ihe atụ, C. F. Keil na-ekwu, sị: “Aha ahụ n’onwe ya, bụ́ Nimrọd sitere na [marad], ‘anyị ga-enupụ isi,’ na-arụ aka ná nguzogide dị ike e guzogidere Chineke. Ọ bụ nnọọ ihe e ji mara ya nke na ọ ghaghị nanị ịbụ nke ndị ọgbọ ya nyere ya, sikwa otú a ghọọ aha aka mmadụ.” N’otu nkọwa ala ala peji, Keil hotara ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Jacob Perizonius dị ka onye na-ede, sị: “Aga m ekwere na nwoke a [Nimrọd], dị ka ọchụnta anya dị ọkụ, nke òtù ya gbakwara gburugburu, iji kpalie ndị ọzọ inupụ isi, na-akpụ n’ọnụ ma na-ekwupụta mgbe nile ugboro abụọ okwu ahụ bụ́ ‘nimrọd, nimrọd,’ nke bụ́, Ka anyị nupụ isi! Ka anyị nupụ isi!’ N’ihi ya, ka e mesịrị, ndị ọzọ, ọbụna Mosis n’onwe ya, kpọrọ ya n’okwu ahụ dị ka aha aka.”

N’ụzọ doro anya, Nimrọd emeghịrị onwe ya aha wuru ewu. Ihe ama na-egosi na a maghị aha a gụrụ ya n’ọmụmụ. E hichapụwo ya n’akụkọ ihe mere eme, dị ka e meworo aha ndị ahụ gbasoro nduzi ya. Ọ hapụghị ọbụna nwa ọ bụla ịza aha ya. Kama inweta otuto na ide ude, a kpọkwasịwo ya ajọ omempụ. Aha ahụ bụ́ Nimrọd akawo ya akara ruo ebighị ebi dị ka onye nkwutọ na-enupụisi zuzuuru maa Jehova Chineke.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya