Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • “Achọrọ M Iso Ya Laa”
    Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2016 | Nke 3
    • E nwere otu mgbede Ribeka gara isere mmiri. Mgbe ọ gbajuchara ite ya mmiri, otu agadi nwoke gbakwuuru ya, medaa obi rịọ ya, sị: “Biko, ka m ṅụrụtụ mmiri n’ite gị.” Ribeka hụrụ na o teela nwoke a pụtara ije. O buturu ite ya ozugbo, nye nwoke ahụ mmiri jụrụ oyi, ya aṅụọ ṅụjuo afọ. Ribeka chọpụtara na nwoke ahụ nwere kamel iri ndị makpu n’akụkụ olulu mmiri ahụ nakwa na mmiri adịghị n’ihe anụmanụ ji aṅụ mmiri dị́ n’ebe ahụ. Ọ hụrụ na nwoke ahụ na-ele ya anya. Ọ chọkwara inyere ya aka otú o nwere ike. Ọ bụ ya mere o ji sị ya: “M ga-esetakwara kamel gị mmiri ruo mgbe ha ṅụjuru afọ.”—Jenesis 24:17-19.

      Ị̀ hụrụ na Ribeka asịghị naanị na ya ga-enye kamel iri ndị ahụ mmiri ka ha ṅụọ, kama, ọ sịrị na ya ga-enye ha mmiri ruo mgbe ha ṅụjuru afọ? Ọ bụrụ na akpịrị kpọrọ kamel nkụ, o nwere ike ịṅụ ihe karịrị lita mmiri iri itoolu na ise otu mgbe. Ọ bụrụzie na akpịrị na-akpọ kamel iri ahụ nkụ, Ribeka ga-eji ọtụtụ awa setara ha mmiri ha ga-aṅụ ṅụjuo afọ. Ma o yiri ka akpịrị anaghị akpọcha kamel ndị ahụ nkụ ná mgbede ahụ.a Ribeka ọ̀ makwanụ na ezigbo mmiri anaghị agụ kamel ndị ahụ mgbe o kwere nkwa inye ha mmiri? Mba. O ji obi ya dum chọọ ime ike ya niile iji nyere agadi nwoke ahụ aka. Nwoke ahụ hapụrụ ya ka o mee ihe ọ chọrọ ime, nọrọzie na-ele ya ka ọ na-aga ugboro ugboro na-esetara kamel ndị ahụ mmiri.—Jenesis 24:20, 21.

      Ebe Ribeka na-awụnyere kamel onye na-ejere Ebreham ozi mmiri ha ga-aṅụ

      Ribeka gbasiri ike, na-elekwa ọbịa nke ọma

  • “Achọrọ M Iso Ya Laa”
    Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2016 | Nke 3
    • a Ọ bụ ná mgbede ka ihe a na-eme. Baịbụl ekwughịkwanụ ihe gosiri na Ribeka nọrọ ọtụtụ awa n’olulu mmiri ahụ. O kwughị na ndị ezinụlọ Ribeka hà ehiwela ụra mgbe ọ lọtara ma ọ bụ na mmadụ chọọrọ ya bịa ka ọ mara ihe mere o ji nọtee aka.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya