-
Olee Ebe I Lekwasịrị Anya?Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2018 | Julaị
-
-
5-7. Olee nsogbu dapụtaranụ obere oge ndị Izrel hapụrụ Ijipt, oleekwa ihe Mozis mere?
5 N’ihe na-erughị ọnwa abụọ ndị Izrel si n’Ijipt pụta, e nwere nnukwu nsogbu dapụtaranụ tupudị ha erute n’Ugwu Saịnaị. Ha malitere ime mkpesa na ha enweghị mmiri ha ga-aṅụ. Ha malitekwara ịtamu ntamu megide Mozis. Ihe bịara ka njọ nke na Mozis besaara Jehova ákwá, sị: “Gịnị ka m ga-eme ndị a? Obere oge ugbu a ha ga-atụ m nkume!” (Ọpụ. 17:4) Jehova gwara Mozis ihe doro anya ọ ga-eme. Ọ gwara ya ka o were mkpara ya kụọ na nkume dị na Horeb ka mmiri gbapụta. Baịbụl kwuru, sị: “Mozis wee mee otú ahụ n’ihu ndị okenye Izrel.” Ndị Izrel ṅụjuru mmiri afọ, ha akwụsị inye Mozis nsogbu.—Ọpụ. 17:5, 6.
-
-
Olee Ebe I Lekwasịrị Anya?Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2018 | Julaị
-
-
11. Olee ihe nwere ike ime ka mkpara Mozis kụrụ na nkume mee ka ndị Izrel chewe na ọ bụghị Jehova mere ka mmiri ahụ gbapụta?
11 E nwekwaara ihe ọzọ nwere ike ịkpata ya. Nnukwu nkume e nwere na Meriba nke mbụ siri ezigbo ike. Ihe ọ sọkwara mmadụ kụọ ya, o nweghị onye ga-atụ anya na mmiri ga-esi na ya gbapụta. Ma, nkume ndị e nwere na Meriba nke abụọ dị iche. Ọtụtụ n’ime ha yiri ụrọ. Ebe ọ bụ na ụdị nkume a esighị ike, mmiri na-eji nwayọọ nwayọọ banye n’ime ya ma dọrọ n’ala ala ya. Ebe ọ dị otú ahụ, mmadụ nwere ike igwu nkume ahụ ma nweta mmiri. N’ihi ya, mgbe Mozis kụrụ mkpara ya na nkume ahụ kama ịgwa ya okwu, ọ̀ ga-abụ na ndị Izrel chere na mmiri ahụ gbapụtara n’onwe ya, na ọ bụghị Jehova mere ka ọ gbapụta?b Anyị amaghị.
-