N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Tụọ Egwu Ezi Chineke ahụ Ugbu A?
“Tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.”—EKLISIASTIS 12:13.
1, 2. N’ihi gịnị ka ịtụ Chineke egwu ziri ezi ji kwesị ekwesị?
EGWU ziri ezi na nke nsọpụrụ maka Chineke dị mma nye mmadụ. Ee, ọ bụ ezie na ọtụtụ egwu nke ụmụ mmadụ na-enye nsogbu ná mmetụta uche, ọbụna bụrụ nke na-adịghị mma n’ahụ ike anyị, ọ dịịrị anyị mma ịtụ Jehova Chineke egwu.—Abụ Ọma 112:1; Eklisiastis 8:12.
2 Onye Okike maara nke a. N’ihi ịhụnanya maka ihe o kere eke, ọ na-enye mmadụ nile iwu ịtụ ya egwu na ife ya ofufe. Anyị na-agụ, sị: “M wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efe n’etiti eluigwe, na-enwe ozi ọma ebighị ebi izisara ndị na-anọdụ n’elu ụwa, bụ́ mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla; ọ na-ewerekwa oké olu sị, Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa Ya otuto; n’ihi na oge hour nke ikpe Ya abịawo: kpọọkwanụ isiala nye Ya, bụ́ Onye kere eluigwe na ala.”—Mkpughe 14:6, 7.
3. Gịnị ka Onye Okike meere nne na nna anyị mbụ?
3 Anyị ekwesịghị n’ezie ileghara Onye Okike nke ihe nile anya, bụ́ Isi Iyi nke ndụ, n’ihi na ọ bụ ya nwe anyị na mbara ụwa nke a. (Abụ Ọma 24:1) Ná ngosipụta nke oké ịhụnanya ya, Jehova nyere ụmụ ya nke elu ala ndụ ma nye ha ebe mara nnọọ mma ibi—paradaịs elu ala nke mara mma. Ma, onyinye nke a dị ebube dabeere n’ihe ụfọdụ. Ihe ọ pụtara n’ezie bụ na e nyefere ha ya ilekọta ya. Nne na nna anyị mbụ ga-elekọta ebe obibi ha ma gbasaa ya ruo mgbe ha bijuru ma buda ụwa dum n’okpuru ha. Ha nwere ihe ùgwù na ibu ọrụ dị iche iche n’ebe anụmanụ ndị nọ n’elu ala, nnụnụ, na azụ nọ—n’ebe ihe nile ọzọ e kere ekere ndị ga-esoro ha na ụmụ ha keta ụwa nọ. Mmadụ ga-aza ajụjụ maka oké ihe a e nyere ya ilekọta.
4. Gịnị ka mmadụ meworo ihe okike nke Chineke?
4 N’agbanyeghị mmalite ahụ magburu onwe ya, lee ihe mmadụ meworo iji metọọ ebe obibi elu ala ya mara mma! N’enweghị nsọpụrụ maka onwunwe Chineke nwe ihe a mara oké mma, ụmụ mmadụ emewo ka ụwa ruo unyi. Mmetọ ahụ eruola n’ókè nke iyi ịdị adị nke ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ụmụ anụmanụ, nnụnụ, na azụ egwu. Chineke anyị nke na-ekpe ikpe ziri, nke na-ahụkwa n’anya agaghị agbachi nkịtị na nke a ruo mgbe ebighị ebi. Mmebi nke ụwa na-akpọ òkù maka ime mpịazi, bụ nke mere ọtụtụ ndị ga-eji tụọ egwu. N’aka nke ọzọ, nye ndị ahụ ji nkwanye ùgwù na-atụkwasị Chineke obi, ọ bụ ihe na-akasi obi ịmara ihe ga-emenụ. Jehova ga-akpọ òkù maka ime mpịazi, a ga-eweghachikwa ụwa n’ọnọdụ ya. Nke a bụ n’ezie ozi ọma nye ndị nile obi ha ziri ezi nọ n’ụwa.
5, 6. Olee otú Jehova ga-esi meghachi omume n’ihe mmadụ meworo ihe okike Ya?
5 Olee otú Chineke ga-esi mezuo ikpe ya? Site na Jisọs Kraịst, bụ́ onye e dokwasịworo ugbu a n’ocheeze dị ka Eze nke Alaeze eluigwe nke Chineke. Site n’Ọkpara ahụ nke eluigwe, Jehova ga-eweta usoro ihe dị ugbu a nke na-adịghị ọcha, nke na-enupụ isi ná njedebe. (2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-9; Mkpughe 19:11) N’ụzọ dị otú a, ọ ga-ewetara ndị na-atụ ya egwu ahụ efe, n’otu oge ahụkwa, napụta ma chebe ebe obibi elu ala anyị.
6 Olee otú nke a ga-esi mee? Bible na-ekwu banyere oké mkpagbu na-abịanụ nke ga-abịa ná njedebe n’agha nke Amagedọn. (Mkpughe 7:14; 16:16) Nke a ga-abụ ikpe Chineke megide usoro ihe nke a e metọrọ emetọ na ndị metọrọ ya. Mmadụ ọ bụla ọ̀ ga-afọ ndụ? Ee! Ọ ga-abụ ndị nwere, ọ bụghị egwu na-akpata obi mgbarụ, nke na-ezighị ezi maka Chineke, kama ndị na-atụ ya egwu nkwanye ùgwù, nke nsọpụrụ. A ga-agbapụta ha.—Ilu 2:21, 22.
Oké Ngosipụta nke Ike
7. N’ihi gịnị ka Chineke ji tinye aka n’ihi Israel n’oge Mosis?
7 Oké ihe omume nke a nke Jehova Chineke bụ nke oké ọrụ ọ rụrụ n’ihi ndị na-efe ya ofufe n’ihe dị ka 1,500 afọ tupu Oge Anyị sere onyinyo ya. Ike agha dị ukwuu nke Ijipt agbataworị ndị ọrụ Israel si ala ọzọ bịa n’ohu, ọbụna na-anwa otu ụdị nke mgbuchapụ otu agbụrụ mgbe onye ọchịchị ya, bụ́ Fero, nyere iwu ka e gbuo ụmụ nwoke nile a mụrụ ọhụrụ nke Israel. Mmeri Chineke meriri Ijipt gaje iwetara Israel ntọhapụ pụọ n’usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị mmegbu ahụ, ee, nnwere onwe pụọ ná mba nke e ji ofufe nke ọtụtụ chi metọọ.
8, 9. Olee otú Mosis na ndị Israel si meghachi omume ná ntinye aka Chineke?
8 Ọpụpụ isi nke 15 dekọrọ mmeghachi omume nke Israel n’ebe ntọhapụ ahụ pụọ n’Ijipt dị. Inyocha ihe ndekọ nke a ga-enyere anyị aka ịghọta otú a pụrụ isi napụta ndị Kraịst n’usoro ihe nke dị ugbu a nke e metọrọ emetọ n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ nkịtị. Ka anyị tụlee Ọpụpụ isi nke 15, na-elekwasị anya n’amaokwu ndị a họpụtara iji mụta ihe mere anyị kwesịrị iji họrọ ịtụ egwu Jehova, bụ́ ezi Chineke ahụ. Anyị na-amalite n’amaokwu nke 1 na nke 2:
9 “Mgbe ahụ Mosis na ụmụ Israel na-abụkuru Jehova abụ a, ha kwuo, sị, Ka m bụkuo Jehova abụ, n’ihi na O biliwo elu nke ukwuu: ịnyịnya na onye ọ na-ebu, Ọ tụbawo ha n’oké osimiri. Ike m na abụ ọma m ka Ja bụ, O wee ghọọrọ m nzọpụta.”
10. Gịnị dujere na Chineke ibibi ndị agha Ijipt?
10 Ndị mmadụ n’ụwa nile maara ihe ndekọ ahụ banyere otú Jehova si tọhapụ ndị Israel pụọ n’Ijipt. O wetaara ike ụwa ahụ dị ike ihe otiti ruo mgbe Fero mesịrị kwere ka ndị Israel pụọ. Ma ndị agha Fero chụsoro ndị a na-enweghị ihe nchebe ọ bụla, o yiekwa ka ha mere ka ha tọ n’ụsọ Osimiri Uhie ahụ. Ọ bụ ezie na o yiri ka ụmụ Israel ha ga-atụfu ngwa ngwa nnwere onwe ha nwetara ọhụrụ, Jehova bu ihe ọzọ n’uche. N’ụzọ ọrụ ebube, o meghere ụzọ n’etiti osimiri ahụ wee wepụta ndị ya n’ihe ize ndụ. Mgbe ndị Ijipt sochiri, o mechikwasịrị ha Osimiri Uhie ahụ wee gbagbuo Fero na usuu ndị agha ya.—Ọpụpụ 14:1-31.
11. Gịnị si n’ihe Chineke mere megide Ijipt pụta?
11 Mbibi Jehova bibiri ndị agha nke Ijipt buliri ya elu n’anya ndị na-efe ya ofufe, meekwa ka a mara aha ya n’ebe nile. (Joshua 2:9, 10; 4:23, 24) Ee, e buliri aha ya elu karịa chi ụgha nile, ndị na-adịghị ike nke Ijipt, bụ́ ndị na-enweghị ike ịnapụta ndị na-efe ha ofufe. Ntụkwasị obi ha nwere na chi ha dị iche iche na ná ndị mmadụ na-anwụ anwụ na ike ndị agha dujere n’oké ndakpọ olileanya. (Abụ Ọma 146:3) Ka a sịkwa ihe mere e ji kpalie ndị Israel ịbụ abụ otuto ndị gosiri egwu ziri ezi maka Chineke ahụ dị ndụ, onye na-anapụta ndị ya n’ụzọ dị ike!
12, 13. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta site ná mmeri Chineke meriri n’Osimiri Uhie?
12 N’otu aka ahụ, anyị kwesịrị ịghọta na ọ dịghị chi ụgha ọ bụla nke oge anyị, ọ dịghịkwa mba bụ dike, ọbụna tinyere ngwá agha nuklia, nke ya na Jehova pụrụ ịha nhata. Ọ pụrụ, ọ ga-anapụtakwa ndị ya. “Dị ka O si achọ ka Ọ na-eme n’usuu ndị agha nke eluigwe, na n’etiti ndị bi n’ụwa: ọ dịghịkwa onye ga-eti aka Ya ihe, sị Ya, Gịnị ka I meworo?” (Daniel 4:35) Mgbe anyị ghọtara ihe okwu ndị a pụtara n’ụzọ zuru ezu, a na-akpalikwa anyị iji obi ụtọ na-abụ abụ otuto ya.
13 Abụ mmeri ahụ a bụrụ n’Osimiri Uhie na-aga n’ihu: “Jehova bụ onye agha: Jehova bụ aha Ya.” Ya mere, Onye Agha nke a a na-apụghị imeri emeri abụghị onye a na-amaghị ama sitere ná nchepụta mmadụ. O nwere aha! Ọ bụ ‘Onye na-eme ka ọ dị,’ Onye Ukwu Na-eme Ihe, Onye “aha [Ya] bụ Jehova, . . . Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” (Ọpụpụ 3:14, NW; 15:3-5; Abụ Ọma 83:18) Í kwetaghị na ọ gaara abụrụ ndị Ijipt oge ochie ahụ ihe amamihe inwe echiche ịtụ egwu ezi uche dị na ya na nke nkwanye ùgwù maka Onye Pụrụ Ime Ihe Nile kama ịma ya aka?
14. Olee otú e si gosi abamuru nke ịtụ egwu Chineke n’Osimiri Uhie?
14 Dị ka Onye Nhazi nke elu ala, Onye Mere osimiri nwere ikike zuru ezu n’ebe ogbu mmiri nile dị. (Ọpụpụ 15:8) N’iji ikike o nwere n’ebe ikuku nọ mee ihe, o mezuru ihe yiri ihe na-apụghị ikwe omume. O kewara ogbu mmiri ahụ n’otu ebe kpọmkwem ma nughachi ya azụ n’akụkụ abụọ chere ibe ha ihu iji waa ụzọ nke mmiri dị n’akụkụ ya abụọ ka ndị ya wee gafere. Jiri uche see onyinyo nke ọnọdụ ahụ: ọtụtụ nde tọn nke mmiri oké osimiri bụ nke dị elu n’akụkụ cherịtara ihu, na-aghọrọ ndị Israel ụzọ mgbapụ nke dị nchebe. Ee, ndị gosiri egwu ziri ezi maka Chineke nwetara nchebe. Mgbe ahụ, Jehova tọhapụrụ miri ahụ, na-ekwe ka ọ sọghachi n’ọnọdụ ya mbụ dị ka oké idei mmiri, na-erikpu ndị agha Fero na ngwá agha ha nile. Lee aha ngosipụta nke ike Chineke n’elu chi ndị na-abaghị n’ihe na ike agha nke ụmụ mmadụ! N’ezie, Jehova bụ onye a ga-atụ egwu, ọ̀ bụ na ọ bụghị?—Ọpụpụ 14:21, 22, 28; 15:8.
Igosipụta Egwu Anyị Maka Chineke
15. Gịnị kwesịrị ịbụ mmeghachi omume anyị n’ọrụ nzọpụta ndị dị ike nke Chineke?
15 A sị na anyị so Mosis guzoro ná nchebe, n’ezie a gaara akpali anyị ịbụ, sị: “Ònye dị ka Gị n’etiti chi nile, Jehova? Ònye dị ka Gị, dị ebube n’ịdị nsọ? Onye a na-atụ egwu n’otuto nile, na-eme ihe ebube dị iche iche.” (Ọpụpụ 15:11) E kwupụtawo mmetụta ndị dị otú ahụ n’ime ọtụtụ narị afọ kemgbe ahụ. N’akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, Jọn onyeozi na-akọwa otu ìgwè nke ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi e tere mmanụ, sị: “Ha na-abụkwa abụ nke Mosis, bụ́ ohu nke Chineke, na abụ nke Nwa atụrụ Chineke.” Gịnị bụ oké abụ nke a? “Ọrụ Gị nile dị ukwuu dịkwa ebube, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile; ụzọ Gi nile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, Gị Eze nke mba nile. Ònye na-agaghị atụ egwu, Onyenwe anyị, tookwa aha Gị? n’ihi na nanị Gị dị ọcha n’obi.”—Mkpughe 15:2-4.
16, 17. Ihe omume dị aṅaa magburu onwe ya ka anyị na-ahụ taa ka ọ na-ewere ọnọdụ?
16 N’otu aka ahụkwa taa, e nwere ndị a tọhapụrụ atọhapụ ndị na-efe ofufe bụ ndị nwere ekele ọ bụghị nanị maka ọrụ okike nile nke Chineke kamakwa n’iwu ya nile. A tọhapụwo ndị si ná mba nile n’ụzọ ime mmụọ, kewapụ ha iche n’ụwa nke a e metọrọ emetọ n’ihi na ha ghọtara ma na-etinye iwu ezi omume nile nke Chineke n’ọrụ. Kwa afọ, ọtụtụ narị puku na-agbapụ n’ụwa nke a e metọrọ emetọ iji soro nzukọ dị ọcha, nke ziri ezi nke ndị na-efe Jehova ofufe biri. N’isi nso, mgbe e mezuchara ikpe ọmụma Chineke ndị na-ere ka ọkụ megide okpukpe ụgha na ihe fọdụrụnụ n’usoro ihe ọjọọ nke a, ha ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume.
17 N’ikwekọ ná Mkpughe 14:6, 7, ihe a kpọrọ mmadụ na-anụ ugbu a ozi ịdọ aka ná ntị nke ikpe nke Ndịàmà Jehova na-akpọsa n’okpuru nduzi nke ndị mmụọ ozi. N’afọ gara aga n’ihe karịrị 230 ala, ihe dị ka nde Ndịàmà ise kpọsara ozi ọma nke Alaeze Chineke na oge hour ya nke ikpe. Iji zie ndị mmadụ ibe ha ihe maka nlanarị, Ndịàmà mere nleta ndị chiri anya n’ebe obibi ndị mmadụ, na-eduzi ọmụmụ Bible n’efu. N’ụzọ dị otú a ọtụtụ narị puku mmadụ kwa afọ na-amụta ihe zuru ezu iji jiri ọgụgụ isi tụọ egwu Chineke, rara ndụ ha nye ya, ma bụrụ ndị e mere baptism. Lee ka o si bụrụ ihe obi ụtọ na ndị dị otú ahụ amalitewo ịtụ ezi Chineke ahụ egwu!—Luk 1:49-51; Ọrụ 9:31; tụlee Ndị Hibru 11:7.
18. Gịnị na-egosi na ndị mmụọ ozi so ná nkwusa anyị?
18 Ọ̀ bụ eziokwu na ndị mmụọ ozi so n’ọrụ nkwusa nke a? N’ezie o yiri ihe doro anya na nduzi nke ndị mmụọ ozi ọtụtụ mgbe edutawo Ndịàmà Jehova n’ebe obibi ebe onye dara mbà n’obi nọ na-achọsi ike, ọbụna na-ekpe ekpere, maka enyemaka ime mmụọ! Dị ka ihe atụ, Ndịàmà Jehova abụọ ndị otu nwatakịrị sonyeere na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’otu àgwàetiti Carribean. Ka ọ na-eru etiti ehihie, mmadụ abụọ ahụ toruworo ogo mmadụ kpebiri na ha ga-emechi maka ụbọchị ahụ. Ma nwatakịrị ahụ nwere ọchịchọ siri ike dị ka ọ na-adịghị emebu ka ha jee letakwuo ụlọ na-esonụ. Mgbe ọ hụrụ na ndị dimkpa ahụ enweghị mmasị ime otú ahụ, ọ gara nanị ya jee kụọ aka. Otu nwa agbọghọ mepere ụzọ. Mgbe ndị dimkpa ahụ hụrụ nke a, ha gakwuuru ya wee gwa ya okwu. Ọ kpọbatara ha n’ụlọ, na-akọwa na mgbe ya nụrụ aka ahụ a kụrụ n’ọnụ ụzọ, na ya nọrịị na-ekpe ekpere ka Chineke zitere ya Ndịàmà ịbịa kụziere ya Bible. E mere ndokwa maka ọmụmụ Bible.
19. Gịnị ka anyị pụrụ izo aka na ya dị ka uru nke ịtụ egwu Chineke?
19 Ka anyị ji ikwesi ntụkwasị obi na-ekwusa ozi ikpe Chineke, anyị na-akụzikwa iwu ezi omume ya nile. Mgbe e tinyere ndị a n’ọrụ ná ndụ ndị mmadụ, ọ na-arụpụta ma ngọzi anụ ahụ ma nke ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, ihe Bible kwuru doro anya ná nkagbu ọ kagburu ụdị mmekọahụ nile rụrụ arụ. (Ndị Rom 1:26, 27, 32) Taa, a na-eleghara ụkpụrụ Chineke anya n’ebe nile n’ụwa. Gịnị ka ọ na-arụpụta? Alụmdi na nwunye na-adakpọ adakpọ. Nnupụisi na-arị elu. Ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ bụ́ ndị na-akpata nkwarụ, bụ́ nke jupụtara ebe nile na narị afọ nke 20 nke a, na-agbasa. N’ezie, a na-agbasa ọrịa ahụ na-atụ ụjọ bụ AIDS ruo n’ókè dị ukwuu site n’omume mmekọahụ rụrụ arụ. Ma ọ̀ bụ na egwu nkwanye ùgwù maka Chineke abụbeghị oké ihe nchebe nye ndị na-efe ezi ofufe?—2 Ndị Kọrint 7:1; Ndị Filipaị 2:12; leekwa Ọrụ Ndị Ozi 15:28, 29.
Ihe Ndị Na-esi n’Ịtụ Egwu Chineke Apụta Ugbu A
20. Gịnị na-egosi na ndị ọzọ maara banyere aha ọma Ndịàmà Jehova nwere?
20 Ngọzi bara ụba nye ndị na-atụ egwu Chineke ma na-agbaso iwu ya nile. Tụlee otu ihe mere nke na-egosi mmata na-arị elu a na-amata eziokwu ahụ bụ na Ndịàmà Jehova na-emejupụta òtù ụmụnna dị n’udo nke ndị Kraịst nwere omume ziri ezi. Ọtụtụ Ndịàmà, ndị jere otu mgbakọ mba nile e nwere na South America, bi n’otu họtel nke e jikwa mee ihe n’otu abalị dị ka ebe ezumezu nke ndị na-abụghị Ndịàmà bụ́ ndị onye isi ala obodo ahụ ga-agwa okwu. Ka ndị ọrụ nchebe ji ọsọ ọsọ dubanye onye isi ala ahụ n’ígwè e ji arịgo ụlọ elu, otu Onyeàmà na-amaghị onye nọ n’ígwè ahụ e ji arịgo ụlọ elu banyere, n’ụzọ tụrụ ndị ọrụ nchebe ahụ n’anya! N’ịghọta ihe o mere, Onyeàmà ahụ rịọrọ mgbaghara maka mwabata ahụ. O gosiri baaji mgbakọ ya nke na-eme ka a mata ya dị ka Onyeàmà wee kwuo na ya abụghị ihe iyi egwu nye onye isi ala ahụ. N’ịmụmụ ọnụ ọchị, otu onye nche sịrị: “Ọ bụrụ na mmadụ nile dị ka Ndịàmà Jehova, ụdị nchebe a agaghị adị anyị mkpa.”—Aịsaịa 2:2-4.
21. Ụzọ ndị ime ihe ndị dị aṅaa ghere oghe nye ndị mmadụ taa?
21 Ọ bụ ụdị ndị a ka Jehova na-achịkọta ugbu a ma na-akwadebe ‘isi n’oké mkpagbu ahụ pụta,’ bụ́ nke ga-eweta usoro ihe nke a ná njedebe. (Mkpughe 7:9, 10, 14) Nlanarị dị otú ahụ agaghị abụ nke onye ọ dabaara. Iji bụrụ onye lanarịrịnụ, mmadụ aghaghị ịtụ egwu Jehova, mata ya dị ka Ọkaaka ahụ kwesịrị ekwesị, rarakwa onwe ya nye ya. Otú ọ dị, nke bụ eziokwu bụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ agaghị azụlite ụdị egwu ahụ nke ga-eme ka e nwee nchebe. (Abụ Ọma 2:1-6) Dị ka ihe àmà nile e nwere na-egosi, Onye Ọchịchị nke Jehova họpụtara, bụ́ Jisọs Kraịst, anọwo na-achị dị ka Eze kemgbe afọ ahụ dị oké egwu bụ́ 1914. Nke a pụtara na oge fọdụrụnụ ka ndị mmadụ zụlite ma gosipụta egwu ziri ezi maka Jehova ji ọsọ na-agwụsị. N’agbanyeghị nke ahụ, Onye Okike anyị na-enye ndị mmadụ, ọbụna ndị nọ n’ọkwá dị elu, ohere ịzaghachi: “Ugbu a, ndị eze, nweenụ uche: ka a dọọ unu aka ná ntị, ndị ikpe nke ụwa. Werenụ egwu fee Jehova ofufe, werekwanụ ọma jijiji tegharịa egwú ọṅụ. Sutunụ onye a họpụtaworo ọnụ, ka ọ ghara iwe iwe, unu wee laa n’iyi n’ụzọ, n’ihi na iwe ya ga-ere ọkụ na mgbe nta. Ndị ihe na-agara nke ọma ka ha bụ, bụ́ ndị nile na-agbaba n’ime ya.”—Abụ Ọma 2:7-12.
22. Gịnị ka ọdịnihu ga-ewetara ndị na-atụ egwu Chineke ugbu a?
22 Ka anyị sorokwa ná ndị ga-eto Onye Okike anyị dị ka Onye napụtara anyị. Otú ọ dị, nke a na-achọ n’aka anyị ịtụ ezi Chineke ahụ egwu ugbu a! (Tụlee Abụ Ọma 2:11; Ndị Hibru 12:28; 1 Pita 1:17.) Anyị aghaghị ịnọgide na-amụ iwu ezi omume ya nile, na-erubekwa isi na ha. Abụ nke Mosis na nke Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ nke e dekọrọ ná Mkpughe 15:3, 4, ga-eru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu mgbe Jehova hichapụrụ ajọ omume nile n’elu ala wee malite ịgwọ mmadụ na ebe obibi ya bụ elu ala pụọ ná mmetụta nile na-emetọ emetọ nke mmehie. Mgbe ahụ, site n’obi anyị nile, anyị ga-abụ, sị: “Ọrụ Gị nile dị ukwuu dịkwa ebube, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile; ụzọ Gị nile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, Gị Eze nke mba nile. Ònye na-agaghị atụ egwu, Onyenwe anyị, tookwa aha Gị?”
Ị̀ Na-echeta?
◻ N’ihi gịnị ka Jehova ji kwesị ekwesị ka anyị tụọ ya egwu ziri ezi?
◻ Gịnị ka e mere ka ọ pụta ìhè site n’ihe ndị Chineke rụzuru n’Osimiri Uhie?
◻ Olee uru ndị na-abịa site n’anyị iji nkwanye ùgwù tụọ Jehova egwu?
◻ Ọdịnihu dị aṅaa na-echere ndị na-atụ ezi Chineke egwu ugbu a?