Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 8/15 p. 24-27
  • Jehova—“Onye Agha”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova—“Onye Agha”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọnyà—Ọ̀ Bụ nye Israel ka ọ̀ bụ nye Fero?
  • Jehova Ebuoro Joshua Agha
  • Agha ahụ E Buru na Kaịshọn
  • Mmeri Megide Gọg na Ndị Òtù Ya
  • “Guzonụ Onwe Unu n’Ebe A, Hụ Nzọpụta Jehova”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ịgafe Oké Osimiri Uhie
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Site Na Teboa Ruo Mmeri!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Jehova Rụrụ Ọrụ Ebube n’Oké Osimiri Uhie
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 8/15 p. 24-27

Jehova—“Onye Agha”

EKPOCHAPỤWO usuu ndị agha Ijipt bụ ọkpọka. N’ogologo Osimiri Uhie ahụ, mmiri nọ na-atụligharị ozu ndị ahụ na-agba ụgbọ ịnyịnya na ndị agha, ngwongwo dị iche iche e ji ebu agha kposachakwa n’ụsọ osimiri ahụ. N’okpuru nduzi nke Mosis, ndị ikom Israel ji ọṅụ bụọ abụ otuto, sị: “Ka m bụkuo Jehova abụ, n’ihi na o biliwo elu nke ukwuu: ịnyịnya na onye ọ na-ebu, ọ tụbawo ha n’oké osimiri. Jehova bụ onye agha: Jehova bụ aha ya.”—Ọpụpụ 15:1, 3.

Mmeri Jehova nwere n’Osimiri Uhie ahụ bụ n’ezie ngosipụta nke ịbụ ọkaaka ya n’ibu agha. Israel chịịrị ihe ekike agha wee hapụ Ijipt ma nkà ibu agha ha nwere dị nnọọ nta. Site n’ogidi igwe ojii nke ghọrọ ogidi ọkụ n’anyasị, Jehova eduruwo ha site na Rameses ruo “ná nsọtụ ọzara” nke dị n’Itam. (Ọpụpụ 12:37; 13:18, 20-22) Mgbe ahụ Jehova gwara Mosis, sị: “Gwa ụmụ Israel ka ha chigharịa, maa ụlọ ikwuu ha n’ihu Paịhahaịrọt, n’etiti Migdọl na oké osimiri, n’ihu Beal-zefọn: . . . Fero ga-ekwukwa okwu banyere ụmụ Israel, sị, Ndị a tụhịworo n’ala ka ha bụ. . . . Ọ ga-achụkwa ha n’azụ.” (Ọpụpụ 14:1-4) N’irube isi, Israel chigharịrị wee zọrọ ije gaa Paịhahaịrọt. Ndị nledo nke Fero kọọrọ ya banyere ihe ahụ yiri ọnọdụ mgbagwoju anya, dịkwa ka e buru n’amụma, Fero chịịrị usuu ndị agha ya chụsoo ha.—Ọpụpụ 14:5-9.

Ọnyà—Ọ̀ Bụ nye Israel ka ọ̀ bụ nye Fero?

N’ịbụ ndị oké ugwu nọchibidoro n’akụkụ abụọ, oké osimiri ahụ dịkwa ha n’ihu, ndị Ijipt nọkwa ha n’azụ, ndị Israel ahụ egwu na-atụ yiri ndị a mataworo n’ọnyà, ya mere ha kpọkuru Chineke maka enyemaka. N’ịgba ndị ahụ ume, Mosis kwuru, sị: “Unu atụla egwu, guzoonụ onwe unu n’ebe a, hụ nzọpụta Jehova, nke ọ ga-emere unu taa: n’ihi na ndị Ijipt ndị unu hụworo taa, unu agaghị ahụkwa ha ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. Jehova ga-eburu unu agha, ma unu onwe unu ga-agba nkịtị.” (Ọpụpụ 14:10-14) N’ikwekọ ná nkwa ahụ, “ogidi igwe ojii ahụ wee si n’ihu ha bulie ije, guzoo n’azụ ha: o wee bata n’etiti ọmụma ụlọ ikwuu Ijipt na ọmụma ụlọ ikwuu Israel. . . . Otu abịarughịkwa nso ibe ya n’abalị ahụ nile.”—Ọpụpụ 14:15-20.

Dị ka Jehova duziri ya, Mosis weliri mkpanaka ya n’elu oké osimiri ahụ wee “kewaa ya” ka ndị Israel nwee ike ịgbapụ. Otu ọrụ ebube dị ịtụnanya werekwara ọnọdụ! (Ọpụpụ 14:16, 21) Otu oké ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ malitere ikewa mmiri nke Osimiri Uhie ahụ, na-ekewapụta ọwara ụzọ nke sara mbara ruo ókè ịnabata mba ahụ dum—ihe dị ka nde mmadụ anọ—ịkwụ n’ahịrị dị ka ndị agha wee gafee. N’aka ekpe na n’aka nri nke ìgwè ndị Israel ahụ, mmiri ahụ nke “rahụrụ arahụ” guzoro dị ka nnukwu mgbidi abụọ.—Ọpụpụ 15:8.

Ndị Israel, site n’enyemaka nke ìhè sitere n’ogidi ọkụ ahụ, si n’ala mmiri ahụ nke ikuku meworo ka ọ ghọọ ala akọrọ gbapụ. Mgbe ọ na-erule ụtụtụ, onye nke ikpeazụ n’etiti ndị Israel agafetewo n’akụkụ nke ọzọ nke ụsọ osimiri ahụ. “Ndị Ijipt wee na-achụ ha, soo ha baa n’etiti oké osimiri, bụ́ ịnyịnya Fero nile, na ụgbọ ala ya, na ndị ịnyịnya ya.” Ndị ahụ na-achụso ha agbabawo n’ọnyà!—Ọpụpụ 14:23.

“[Jehova wee] chụsaa ọmụma ụlọ ikwuu ndị Ijipt. O wezụga wheel nke ụgbọ ala ha, mee ka ọ dị ha arọ ime ka ha na-aga.” Ugbu a, Mosis setịpụrụ aka ya n’elu oké osimiri ahụ, “oké osimiri ahụ wee lata n’oruru ọ na-eru mgbe nile.” Mgbidi nke mmiri ahụ dakpọrọ wee malite irikpu ndị Ijipt. Ha nwara ịgbalaga, ‘ma Jehova rurupụrụ ndị Ijipt n’etiti oké osimiri.’ Ọ dịghị onye lanarịrịnụ! N’oké ọṅụ, ndị Israel bụrụ abụ mmeri ha nye Jehova.—Ọpụpụ 14:24–15:3; Abụ Ọma 106:11.

Jehova Ebuoro Joshua Agha

Jehova gosikwara onwe ya ịbụ “onye agha” n’agha ndị ọzọ. Otu mgbe bụ n’agha ahụ e buru na Ai. Mwakwasị mbụ a wakwasịrị obodo ahụ kụrụ afọ n’ala n’ihi ajọ mmehie Ekan mere. Mgbe e doziri okwu ahụ, Jehova nyere Joshua iwu agha dị iche iche.—Joshua 7:1, 4, 5, 11-26; 8:1, 2.

N’irube isi nye ntụziaka nile nke Jehova, n’anyasị, Joshua debere ndị agha na-ezo n’ọhịa n’azụ obodo ahụ, n’akụkụ ọdịda anyanwụ ya. Ọ chịịrị ìgwè ndị agha ya bụ isi gaa n’ebe ugwu ruo na ndagwurugwu nke dị kpọmkwem n’ihu Ai, wee mee dị ka à ga-asị na ọ chọrọ ịwakwasị ha site n’ihu. Ndị ikom Ai chụsoro ihe ahụ e ji siere ha ọnyà. N’ịbụ ndị ọṅụ mmeri mbụ ha nwere ka jupụtara n’isi, ha si nnọọ n’obodo ahụ gbapụta imegide ndị Israel. N’ime dị ka à ga-asị na ha na-agbalaga agbalaga, ndị Israel lara azụ “n’ụzọ ọzara,” na-adọrọ ndị iro ahụ gbapụkwuo site na Ai.—Joshua 8:3-17.

Kpọmkwem n’oge kwesịrị ekwesị, Jehova gwara Joshua, sị: “Zoo mkpụmkpụ ube nke dị n’aka gị n’ebe Ai dị; n’ihi na n’aka gị ka m ga-enye ya.” Mgbe e nyere ihe àmà nke a, ndị ikom ahụ zoro n’ọhịa dakwasịrị obodo ahụ, jiri mma agha tigbuo ya, suokwa ya ọkụ. N’ịhụ anwụrụ ọkụ ahụ, obi ịda m̀bà rikpuru usuu ndị agha ndị iro ahụ nọ n’èzí. Joshua, n’ịmalite ime mwakwasị kama ịbụ mgbalaga, mere ka ndị iro ahụ tọkịrị n’etiti usuu ndị agha ya abụọ. Nke a ọ̀ bụ mmeri mmadụ nwere? Ee e. Ndị Israel nwere mmeri n’ihi na, dị ka Joshua mesịrị gwa ha: “Jehova, bụ́ Chineke unu, ya onwe ya bụ onye na-alụrụ unu ọgụ.”—Joshua 8:18-27; 23:3.

Agha ahụ E Buru na Kaịshọn

E gosipụtakwara ịbụ ọkaaka nke Jehova n’ibu agha na Ndagwurugwu Kaịshọn nke dị nso Megido. Eze ndị Kenean bụ Jebin akpagbuwo Israel ruo 20 afọ. Usuu ndị agha, n’okpuru nduzi nke Sisera, gụnyere 900 ụgbọ ịnyịnya ndị a kwụnyere mma igwe n’ụkwụ ha—nke yiri usuu ndị agha a na-apụghị imeri emeri n’oge ndị ahụ.—Ndị Ikpe 4:1-3.

Otú o sina dị, site n’ọnụ onye amụma nwanyị bụ Debọra, Jehova kpọrọ Onye Ikpe bụ Berak òkù ka ọ chịkọta puku ndị agha iri n’elu Ugwu Teboa iji maa usuu ndị agha Jebin aka. Sisera meghachiri ihe ngwa ngwa n’ihi nchịkọta ndị agha nke a, jiri ọsọ site na Harọshet gbaga na ndagwurugwu mmiri iyi Kaịshọn, nke dị n’etiti Ugwu Teboa na Megido. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na o chere na n’elu ala ebe a dị larịị, usuu ndị agha Israel ndị ji ụkwụ aga, ndị na-ejighịkwa oké ngwá agha agaghị enwe ike dị ukwuu megide ụgbọ ịnyịnya ya nile. Ma, o cheghị echiche banyere ibuso Onye Iro nke eluigwe agha.—Ndị Ikpe 4:4-7, 12, 13.

Jehova nyere Berak iwu ka ọ hapụ elu ebe ahụ nọ ná nchebe nke Teboa ma banye na ndagwurugwu ahụ dị larịị, na-adọrọ usuu ndị agha Sisera banye n’ibu agha. Mgbe ahụ Jehova mere ihe! Otu oké iju mmiri mere ka mbara ala ibu agha ahụ jupụta n’apịtị, na-eme ka ìgwè ndị agha Sisera ghara inwe ike ọ bụla. N’ime ọgba aghara nke si na nke a pụta, ọ dịịrị ndị agha Israel ji ụkwụ aga mfe imeri ndị iro ha kpam kpam. “Ọmụma ụlọ ikwuu nile nke Sisera wee daa n’ọnụ mma agha; ọ dịghị otu nwoke fọdụrụ.” Mmiri iyi ahụ tojuru etoju nke Kaịshọn emewo ka ụgbọ ịnyịnya nile nke ndị Kenean ghara inwe ike ịga aga, ọ pụkwara ịbụ na o bupụrụ ozu ụfọdụ ndị.—Ndị Ikpe 4:14-16; 5:20, 21.

Mmeri Megide Gọg na Ndị Òtù Ya

Ihe omume oge ochie ndị a sere onyinyo mmeri kachasị ukwuu nke Jehova nke ka gaje ịbịa n’ọdịnihu. Agha ahụ nke gaje iwere ọnọdụ “n’ikpeazụ nke afọ ndị a,” dị ezi nso ugbu a. Dị ka amụma Ezikiel si kwuo, Gọg, bụ́ ihe atụ nke “onye isi ụwa nke a,” Setan bụ Ekwensu, ga-achịkọta ìgwè ndị agha zuru mba nile ọnụ. Ọ ga-eduzi usuu ndị agha ya ịwakwasị ‘elu ugwu nile nke Israel’ n’ụzọ ihe atụ, ya bụ, ọnọdụ ime mmụọ e buliri elu nke “Israel nke Chineke” nke ndị Kraịst.—Ezikiel 38:1-9; Jọn 12:31; Ndị Galetia 6:16.

Gịnị na-akpali Gọg ime oké mwakwasị nke a megide ndị Chineke? Amụma ahụ zoro aka n’ọnọdụ ha nke udo na nke inwe ihe ịga nke ọma ime mmụọ. Gọg na-asị: “M ga-arịgo megide ala bụ nanị obodo na-enweghị mgbidi; m ga-abakwasị ndị nọ jụụ, ndị nọ ná ntụkwasị obi, ha nile bi n’ebe na-enweghị mgbidi, ọ dịghịkwa ihe ntụchi ma ọ bụ ibo ọnụ ụzọ ha nwere: ịkwata ihe nkwata na ịlụta ihe nlụta n’agha . . . [nke] ndị . . . rụtaworo anụ ụlọ na ihe ahịa n’ọrụ.”—Ezikiel 38:10-12.

N’ozuzu ha, ndị Jehova abụghị ndị bara ọgaranya n’ụzọ ihe onwunwe. Otú ọ dị, ha arụpụtawo ihe bara ụba nke ukwuu n’ụzọ ime mmụọ n’ihi ọrụ nkwusa ha zuru ụwa ọnụ. A chịkọtawo “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba nile ọ bụla,” bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha ruru ihe karịrị nde mmadụ anọ ugbu a. (Mkpughe 7:9, 10) Nke a bụ n’ezie ihe onwunwe! Setan—n’inwe oké ọnụma n’ihi ihe ịga nke ọma ime mmụọ nke a—na-anwa ikpochapụ ndị Chineke.

Ma site n’ịwabata n’ala ihe atụ nke Israel, ihe Gọg na-eme n’ezie bụ ịwakwasị Jehova Chineke n’onwe ya. “Ọnụma m ga-arịgote n’imi m,” ka Jehova na-asị, bụ́ onye ga-emeghachi ihe n’ihi ndị ya. A ga-etisasị usuu ndị agha Gọg n’ọgba aghara. “Mma agha onye ọ bụla ga na-emegide nwanne ya.” Mgbe ahụ, Jehova ga-ewepụta ike mbibi ihe ya—“oké mmiri ozuzo na-ezobiga ókè, na oké akụ mmiri igwe, na ọkụ, na brimstone.” Dị ka n’Osimiri Uhie, Ai, na Kaịshọn, Jehova ga-alụkwara ndị ya ọgụ ọzọ wee nye aha ya otuto. “M ga-emekwa onwe m ka m dị ukwuu, m ga-edokwa onwe m nsọ, mee ka a mara mụ onwe m n’anya ọtụtụ mba; ha ewee mara na mụ onwe m bụ Jehova.”—Ezikiel 38:18-23.

Ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme nke agha ndị Jehova buworo n’oge ochie na-enye anyị ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike zuru ezu ná mmeri ọdịnihu nke a n’oge “mkpagbu ukwu” ahụ. (Matiu 24:21, 22) N’ịbụ onye na-achịkwa ihe na-emenụ mgbe nile, Jehova pụrụ iche echiche karịa ndị iro ya, haziekwa ọnọdụ dị iche iche maka nzọpụta nke ndị ya. N’ezie, ọ ga-abụ kpọmkwem dị ka Aịsaịa buru amụma, sị: “Jehova ga-apụta dị ka dike; dị ka onye agha ka ọ ga-akpọte ekworo: ọ ga-eti mkpu agha, ee, ọ ga-eti oké mkpu agha; n’imegide ndị iro ya ka ọ na-eme onwe ya dike.” (Aịsaịa 42:13) N’anya Ndịàmà ya, ọ ga-abụ ruo mgbe ebighị ebi, JEHOVA, “ONYE AGHA”!—Ọpụpụ 15:3.

[[Map dị na peeji 25]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ụzọ e si pụọ Ọpụpụ ahụ site n’Ijipt

GOSHEN

Memphis

Rameses

Sukọt

Migdọl

Paịhahaịrọt

Itam

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

N’ebe a, n’ógbè Ai, Jehova duru Joshua na ndị Ya ruo n’inweta oké mmeri

Mmiri iyi nke Kaịshọn tolitere ngwa ngwa, na-enye aka ná mmeri e meriri ndị iro Jehova

[Ebe e si Nweta Foto]

Photos: Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya