Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche—2000 | Ọktoba 15
    • Jehova, bụ́ onye ndụ anyị dị n’aka ya, nyere iwu na e kwesịghị iri ọbara. (Jenesis 9:3, 4) N’Iwu ahụ Chineke nyere Israel oge ochie, ọ kpara ókè n’otú a ga-esi na-eji ọbara eme ihe n’ihi na ọ na-anọchi anya ndụ. O nyere iwu, sị: “Ndụ nke anụ ahụ, n’ọbara ka ọ dị: Mụ onwe m enyewokwa unu ya n’elu ebe ịchụàjà ikpuchiri mkpụrụ obi unu mmehie ha.” Gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ egbuo anụmanụ maka oriri? Chineke kwuru, sị: “Ọ ga-awụsịkwa ọbara ya, were ájá kpuchie ya.”a (Levitikọs 17:11, 13) Jehova nyeghachiri iwu a ugboro ugboro. (Deuterọnọmi 12:16, 24; 15:2) Akwụkwọ bụ́ Soncino Chumash nke ndị Juu na-ekwu, sị: “E kwesịghị ichekwa ọbara echekwa ma ọlị kama a ga-eme ka a ghara iri ya site n’ịwụsị ya n’ala.” Ọ dịghị onye Israel ga-edebe, chekwaa, ma jiri ọbara nke ihe ọzọ e kere eke, bụ́ nke Chineke nwe ndụ ya, mee ihe.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche—2000 | Ọktoba 15
    • Mgbe ụfọdụ, onye dọkịta na-agba onye ọrịa ume iweta ọbara nke ya ọtụtụ izu tupu a waa ya ahụ (onye a na-aga ịwa ahụ ibu ụzọ nye ọbara a ga-amịnyeghachi ya, ma ọ bụ PAD) ka ọ ga-abụ ọ dị mkpa, o nwee ike ịmịnye onye ọrịa ahụ ọbara ya ahụ e chekwara echekwa. Otú ọ dị, mweta, nchekwa, na mmịnye ọbara dị otú ahụ megidere kpọmkwem ihe e kwuru na Levitikọs na Deuterọnọmi. Ọbara abụghị ihe a ga-echekwa echekwa; ọ bụ ihe a ga-awụsị—ihe a ga-eweghachiri Chineke, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. N’ezie, Iwu Mosis adịghị irè ugbu a. Otú o sina dị, Ndịàmà Jehova na-akwanyere ụkpụrụ ndị Chineke nyere n’ime ya ùgwù, ha na-ekpebisikwa ike ‘ịhapụ ọbara.’ N’ihi ya, anyị adịghị enye onyinye ọbara, anyị adịghịkwa echekwa ọbara anyị maka mmịnye, bụ́ nke e kwesịrị ‘ịwụsị awụsị.’ Omume ahụ ekwekọghị n’iwu Chineke.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche—2000 | Ọktoba 15
    • a Prọfesọ Frank H. Gorman na-ede, sị: “A na-aghọta mwụsị ọbara ahụ n’ụzọ kasị mma dị ka nsọpụrụ ofufe bụ́ nke na-egosipụta nkwanye ùgwù n’ebe ndụ nke anụmanụ ahụ dị, nakwa nkwanye ùgwù n’ebe Chineke nọ, bụ́ onye kere ma nọgide na-elekọta ndụ ahụ.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya