Iji Ịdị Nro Na-azụ Atụrụ Jehova Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa
NDỊ okenye ahụ ji uche ha nile gee ntị. Ha emewo njem ihe dị ka 50 kilomita site n’Efesọs gaa Militọs ije nata ntụziaka site n’ọnụ Pọl onyeozi. Ugbu a ha na-enwe mwute ịnụ na nke a bụ nke ikpeazụ ha ga-ahụ ya. Ya mere ha maara na okwu ọ gaje ikwu ga-abụ nke dị mkpa nke ukwuu: “Na-elezinụ onwe unu na ìgwè atụrụ ahụ dum anya, nke mmụọ nsọ siteworo n’etiti ya họpụta unu ịbụ ndị nlekọta ya, ka unu na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ, bụ́ nke o ji ọbara Ọkpara ya onwe ya zụta.”—Ọrụ 20:25, 28, 38, NW.
Izo aka dị mkpirikpi Pọl zoro n’ebe ndị ọzụzụ atụrụ nọ wepụtaara ndị okenye Efesọs ihe ọmụma dị ukwuu n’ezie. Ha maara banyere ọrụ nke ịkpa atụrụ n’ime obodo dị ha gburugburu. Ha makwaara banyere ọtụtụ izo aka e zoro n’ebe ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ha maara na Jehova ji onwe ya tụnyere Onye Ọzụzụ Atụrụ nke ndị ya.—Aịsaịa 40:10, 11.
Pọl kwuru okwu banyere ha dị ka “ndị nlekọta” n’etiti “ìgwè atụrụ ahụ,” na dị ka “ndị ọzụzụ atụrụ” nke ‘ọgbakọ ahụ.’ Ebe okwu ahụ bụ “ndị nlekọta” na-egosi ihe ọrụ ha bụ, okwu ahụ bụ́ ‘ịzụ atụrụ’ na-akọwa ụzọ ha ga-esi rụzuo ọrụ nlekọta ahụ. Ee, ndị nlekọta ga-emeso onye ọ bụla so n’ọgbakọ n’otu ụzọ ịhụnanya ahụ onye na-azụ atụrụ ga-esi lekọta ìgwè atụrụ ya.
Taa, ndị okenye ole na ole nwere ahụmahụ onwe onye n’ịzụ atụrụ nkịtị. Ma Bible na-ezo aka ọtụtụ ugbo gaa ma n’atụrụ ma ná ndị ọzụzụ atụrụ, karịsịa n’echiche ihe atụ, nke mere na okwu Pọl nwere mmetụta nke oge na-agbanweghị. A pụkwara ịmụta ọtụtụ ihe site n’ihe ndekọ banyere ndị ọzụzụ atụrụ nwetara amara Chineke n’oge ochie. Ihe nlereanya ha kwesịrị ịrịba ama pụrụ inyere ndị okenye nke oge a aka ịhụ ụdị àgwà ọ dị mkpa ka ha zụlite iji nwee ike ịzụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ.
Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ Na-adịghị Atụ Egwu bụ́ Devid
Mgbe anyị chere echiche banyere ndị ọzụzụ atụrụ n’oge Bible, o yikarịrị ka anyị ga-echeta Devid, n’ihi ọ malitere ndụ dị ka onye na-azụ atụrụ. Otu n’ime ihe mbụ ndị anyị na-amụta site ná ndụ Devid bụ na ịbụ onye ọzụzụ atụrụ abụghị ọkwá dị elu. N’ezie, mgbe Samuel onye amụma bịarutere ite nwa Jesi mmanụ dị ka eze ọdịnihu nke Israel, e leghaara nwa okoro ahụ bụ́ Devid anya kpam kpam na mbụ. Ọ bụ nanị mgbe Jehova jụsịworo ụmụnne ya ndị nwoke asaa tọsịrị ya ka a kpọtara aha Devid, bụ́ onye nọ n’ubi “na-azụ atụrụ.” (1 Samuel 16:10, 11) Otú o sina dị, afọ ndị Devid nọrọ dị ka onye ọzụzụ atụrụ kwadebere ya maka oké ọrụ nke ịzụ mba Israel dị ka atụrụ. “[Jehova] họpụtakwara Devid, bụ́ ohu ya, o wee si n’ogige ìgwè ewu na atụrụ kuru ya . . . ịzụ Jekọb, bụ́ ndị ya, . . . dị ka atụrụ,” ka Abụ Ọma 78:70, 71 na-ekwu. N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, Devid dere ọmarịcha Abụ Ọma nke 23 ahụ a maara nke ọma, na-amalite site n’okwu ndị bụ: “Jehova bụ Onye Na-azụ m dị ka atụrụ.”
Dị ka Devid, ndị okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst kwesịrị ije ozi dị ka ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru dị umeala, gharakwa ịchọ ọkwá na-erughịrị ha. Dị ka Pọl onyeozi degaara Timoti, ndị na-eru eru ịnara ibu ọrụ ọzụzụ atụrụ nke a nwere “agụụ ọrụ ọma,” ọ bụghị ịbụ onye a ma ama.—1 Timoti 3:1.
Ọ bụ ezie na ọrụ Devid dị ka onye ọzụzụ atụrụ nkịtị bụ nke dị ala, mgbe ụfọdụ ọ chọrọ obi ike dị ukwuu. Dị ka ihe atụ, mgbe ọdụm buuru atụrụ sitere n’ìgwè atụrụ nke nna ya n’otu oge nakwa n’oge ọzọ mgbe bear buuru, Devid chụsoro ma gbuo anụ ndọgbu ndị ahụ n’atụghị egwu. (1 Samuel 17:34-36) Nke a bụ ngosipụta dị ịrịba ama nke obi ike mgbe mmadụ ghọtara na ọdụm pụrụ igbu anụ ndị buru ibu karịa ya onwe ya. Anụ bear ndị Siria na-acha nchara nchara nke na-ebibu na Palestine, na-enwe ịdị arọ ruru 140 kilogram, pụrụ igbu ele site n’otu mwakwasị nke mbọ aka ya dị ike.
Nchegbu obi ike Devid maka atụrụ nna ya bụ ihe nlereanya dị mma nye ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst. Pọl onyeozi dọrọ ndị okenye Efesọs aka ná ntị banyere “agụ jọgburu onwe ha” bụ́ ndị ‘na-agaghị emere ìgwè atụrụ ebere.’ (Ọrụ 20:29) N’oge ugbu a, oge ga-ebilite mgbe ndị ọzụzụ atụrụ ndị Kraịst ga-egosi obi ike iji wee chee ọdịmma ime mmụọ nke atụrụ Jehova nche.
Ọ bụ ezie na a ga-eji obi ike chebe atụrụ ahụ, e kwesịkwara imeso ha omume n’ịdị nro nke ukwuu, n’iṅomi onye ọzụzụ atụrụ ahụ na-ahụ n’anya bụ́ Devid nakwa Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma, bụ́ Jisọs Kraịst. (Jọn 10:11) Ịmara na ìgwè atụrụ ahụ bụ nke Jehova, ndị okenye ekwesịghị inwe aka ike n’ebe atụrụ ahụ dị, “na-eme ndị bụ ihe nketa dị ka unu bụ ndị nwe ha.”—1 Pita 5:2, 3; Matiu 11:28-30; 20:25-27.
Ime Mpịazi
Nna ochie ahụ bụ́ Jekọb bụ onye ọzụzụ atụrụ ọzọ a ma ama. O lere onwe ya anya dị ka onye ọ bụ ọrụ ya ilekọta atụrụ ọ bụla a tụkwasịrị n’aka ya. O jiwo ikwesị ntụkwasị obi lekọta ìgwè atụrụ nke ọgọ ya nwoke, bụ́ Leban, nke na mgbe 20 afọ nke ije ozi gasịrị, Jekọb pụrụ ịsị: “Nne atụrụ gị na nne ewu gị amụkwoghị ụmụ, erighịkwa m ebulu nke ìgwè ewu na atụrụ gị. Nke anụ ọhịa dọgburu, ewetaghị m ya nye gị; mụ onwe m na-edochi ya; site n’aka m ka ị na-achọ ya, ma ọ bụ ihe e zuru n’ehihie ma ọ bụ ihe e zuru n’abalị.”—Jenesis 31:38, 39.
Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta n’ọgbakọ ndị Kraịst na-egosipụta ọbụna nchegbu dị ukwuu karị maka atụrụ nke Onye Ọzụzụ Atụrụ nke mkpụrụ obi anyị, bụ́ Jehova Chineke, “ji ọbara Ọkpara ya onwe ya zụta.” (Ọrụ 20:28, NW; 1 Pita 2:25; 5:4) Pọl mesiri ike ibu ọrụ nke a dị mkpa mgbe o chetaara ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst na ndị ikom na-edu ndú n’ọgbakọ “na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu, dị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu.”—Ndị Hibru 13:17.
Ihe nlereanya Jekọb na-egosikwa na ọrụ nke onye ọzụzụ atụrụ enweghị oge a kpaara ókè. Ọ bụ ihe a na-eme ehihie na abalị, ọtụtụ mgbe ọ chọkwara iji onwe onye achụ àjà. Ọ gwara Leban, sị: “Otú a ka m nọworo; n’ehihie ọkpụkpọ nkụ riri m, ọtụtụ oyi rikwara m n’abalị; ụra m wee fepụ n’anya m abụọ.”—Jenesis 31:40.
Nke a bụ nnọọ eziokwu banyere ọtụtụ ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-ahụ n’anya taa, dị ka ahụmahụ na-esonụ na-egosi. E nyere otu nwanna àkwà ná ngalaba otu ụlọ ọgwụ a na-elekọta ndị ọrịa ha dị oké njọ mgbe mwepụ e wepụrụ otu akpụ fụrụ ya n’ụbụrụ kpatara ihe isi ike. Ezinụlọ ya mere ndokwa ịnọ ya nso n’ụlọ ọgwụ ahụ ehihie na abalị. Iji nye nkwado okwu ọnụ na agbamume, otu n’ime ndị okenye ọgbakọ ha mezigharịrị usoro ime ihe ya juru eju ka o wee nwee ike ileta nwoke ahụ na-arịa ọrịa na ezinụlọ ya kwa ụbọchị. Otú ọ dị, n’ihi usoro ịgwọ ọrịa dị oké ike nke ụlọ ọgwụ ahụ, ọ dịghị ekwe ya omume mgbe nile ịbịa n’oge ehihie. Nke a pụtara na okenye ahụ na-anọkarị n’ụlọ ọgwụ ahụ ruo ime abalị. Ma o ji obi ụtọ gaa n’ebe ahụ kwa abalị. “Aghọtara m na m gaje ịbịa n’oge ga-amasị onye ọrịa ahụ, ọ bụghị n’oge dị m mma,” ka onye okenye ahụ kwuru. Mgbe nwanna ahụ gbakere ruo n’ókè nke ịbụ onye e bufere n’ógbè ọzọ nke ụlọ ọgwụ ahụ, okenye ahụ nọgidere na-eme nleta ya na-agba ume kwa ụbọchị.
Ihe Mosis Mụtara Dị Ka Onye Ọzụzụ Atụrụ
Bible na-akọwa Mosis dị ka nwoke “dị umeala n’obi nke ukwuu, karịa mmadụ nile ndị nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụgụ 12:3) Otú ọ dị, ihe ndekọ ahụ na-egosi na nke a abụghị ihe meworo eme mgbe nile. Dị ka nwa okorobịa, o gbuwo otu onye Ijipt maka iti onye Israel ibe ya ihe. (Ọpụpụ 2:11, 12) Nke a abụghị kpọmkwem omume onye dị umeala! Ma, Chineke ga-emesịa jiri Mosis mee ihe iduru mba nke ọtụtụ nde mmadụ gabiga ọzara ruo Ala Nkwa ahụ. Mgbe ahụ, o doro anya na ọ dị mkpa ka Mosis nwetakwuo ọzụzụ.
Ọ bụ ezie na Mosis enwetaworị ọzụzụ ndị ụwa “n’amamihe nile nke ndị Ijipt,” a chọkwuru ọtụtụ ihe n’aka ya iji zụọ ìgwè atụrụ Jehova. (Ọrụ 7:22) Olee ihe ọzụzụ nke a a natakwuru nwere ike ịdị ka ya? Lee, ruo 40 afọ Chineke kwere ka Mosis jee ozi dị ka onye ọzụzụ atụrụ dị ala n’ala Midian. Ka ọ na-elekọta ìgwè atụrụ nke ọgọ ya nwoke, bụ́ Jetro, Mosis zụlitere àgwà ọma ndị dị ka ndidi, ịdị ala, umeala, ogologo ntachi obi, ịdị nwayọọ n’obi, na njide onwe onye. Ọ mụtakwara ichere oge Jehova. Ee, ilekọta atụrụ nkịtị mere ka Mosis ruo eru inwe ike ịzụ mba Israel dị ka atụrụ.—Ọpụpụ 2:15-3:1; Ọrụ 7:29, 30.
Ọ̀ bụ na ndị a abụghị àgwà ndị dị onye okenye mkpa iji nwee ike ilekọta ndị Chineke taa? Ee, n’ihi na Pọl chetaara Timoti na “ohu nke Onyenwe anyị . . . [aghaghị] ịdị nwayọọ n’ebe mmadụ nile nọ, ọ ghaghịkwa ịbụ onye nwere ike izi ihe, onye na-anagide ihe ọjọọ, n’ịdị nwayọọ na-adọ ndị na-edo onwe ha imegide ya aka ná ntị.”—2 Timoti 2:24, 25.
A pụrụ inwe oge mgbe onye okenye na-enwe nkụda aka n’onwe ya n’ihi na o nwere ihe isi ike n’ịzụlite àgwà ndị a n’ụzọ zuru ezu. Otú o sina dị, ike ekwesịghị ịgwụ ya. Dị ka n’ebe Mosis nọ, ọ pụrụ iwe ogologo oge iji zụlite àgwà ndị dị mkpa n’ụzọ zuru ezu maka mmadụ ịbụ ezi onye ọzụzụ atụrụ. Otú ọ dị, mgbe oge na-aga, oké mgbalị dị otú ahụ ga-eweta nkwụghachi ụgwọ.—Tụlee 1 Pita 5:10.
Dị ka onye okenye, eleghị anya a dịghị eji gị eme ihe n’ụzọ zuru ezu dị ka ndị ọzọ. Ọ̀ pụrụ ịbụ na, dị ka Mosis, Jehova na-enye gị ohere ịzụlite àgwà ụfọdụ ndị dị mkpa n’ụzọ zuru ezu? Echefula mgbe ọ bụla na ‘ihe banyere gị na-emetụ Jehova n’obi.’ Otú ọ dị, anyị kwesịrị iburu n’uche mkpa ọ dị ‘iji obi dị umeala kee onwe anyị dị ka ákwà, ijerịtara ibe anyị ozi: n’ihi na Chineke na-edo onwe ya imegide ndị mpako ma ọ na-enye ndị dị umeala n’obi amara.’ (1 Pita 5:5-7) Ọ bụrụ na i wepụta onwe gị ma nakwere ọzụzụ nke Jehova kwere ka ọ dịrị, ị pụrụ ịba uru karị nye ya, dị nnọọ ka Mosis bara.
Atụrụ Nile nke Jehova Dị Oké Ọnụ Ahịa
Ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya, ndị a pụrụ ịdabere na ha nke oge Bible nwere echiche nke ibu ọrụ n’ebe atụrụ nke ọ bụla n’otu n’otu dị. Otu ihe ahụ kwesịrị ịbụ eziokwu banyere ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ. Nke a doro anya site n’okwu Pọl bụ́: “Na-elezinụ . . . ìgwè atụrụ ahụ dum anya.” (Ọrụ 20:28, NW) Olee ndị a ga-agụnye n’ime “ìgwè atụrụ ahụ dum”?
Jisọs nyere ihe atụ banyere otu nwoke nke nwere otu narị atụrụ ma jiri ọsọ gaa chọọ otu nke kpafuworo iji weghachi ya azụ n’ìgwè ahụ. (Matiu 18:12-14; Luk 15:3-7) N’otu ụzọ ahụ, onye nlekọta kwesịrị inwe nchegbu maka onye ọ bụla so n’ọgbakọ. Ịjụ oyi n’ozi ahụ ma ọ bụ n’ịbịa nzukọ nile nke ndị Kraịst apụtaghị na atụrụ ahụ abụkwaghị akụkụ nke ìgwè atụrụ ahụ. Ọ ka bụ akụkụ nke “ìgwè atụrụ ahụ dum” bụ́ onye ndị okenye na-aghaghị ‘ịza ajụjụ’ banyere ya n’ihu Jehova.
Otu òtù ndị okenye nwere oké nchegbu na ụfọdụ ndị nọworo n’ọgbakọ akpafuwo n’ọnọdụ ịjụ oyi. E depụtara aha ndị a, e mekwara mgbalị pụrụ iche ije leta ma nyere ha aka ịlaghachi n’ogige atụrụ Jehova. Lee aha ekele ndị okenye ndị a nyere Chineke na n’ime oge dị afọ abụọ na ọkara, ha nwere ike inyere ihe karịrị 30 mmadụ aka ịnụ ọkụ n’ozi Jehova ọzọ. Otu onye n’ime ndị ahụ e nyeere aka otú a ajụwo oyi ruo afọ 17!
A na-emesikwu ịdị mkpa nke ibu ọrụ a ike n’obi ndị nlekọta site n’eziokwu ahụ bụ na “e ji ọbara Ọkpara [Chineke] onwe ya zụta” atụrụ ndị ahụ. (Ọrụ 20:28, NW) Ọ dịghị ọnụ ahịa karịrị nke ahụ nke a pụrụ ịkwụworị maka atụrụ ndị a dị oké ọnụ ahịa. Cheekwa echiche banyere oge na mgbalị nile e tinyere n’ozi a iji chọta ma nyere onye ọ bụla yiri atụrụ aka! Ọ̀ bụ na e kwesịghị ime mgbalị yiri nke ahụ iji mee ka ha nile nọrọ n’ime ogige atụrụ Chineke? N’ezie, atụrụ ọ bụla nọ n’ọgbakọ dị oké ọnụ ahịa.
Ọbụna mgbe onye so n’ìgwè ahụ tinyere aka n’omume dị oké njọ, ibu ọrụ ndị okenye adịghị agbanwe. Ha na-anọgide na-abụ ndị ọzụzụ atụrụ na-enwe nchegbu, na-eji ụzọ dị nro ma dị nwayọọ na-agba mbọ ịzọpụta onye mmehie ahụ ma ọ bụrụ ọ ga-ekwe omume ma ọlị. (Ndị Galetia 6:1, 2) N’ụzọ dị mwute, n’ọnọdụ ụfọdụ, ọ na-apụta ìhè na onye so n’ọgbakọ enweghị mwute Chineke maka ajọ mmehie ndị o meworo. Mgbe ahụ ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya nwere ibu ọrụ Akwụkwọ Nsọ ichebe ihe fọdụrụ n’ìgwè ahụ megide mmetụta nke a na-emetọ emetọ.—1 Ndị Kọrint 5:3-7, 11-13.
Otú o sina dị, Jehova Chineke na-esetịpụ ihe nlereanya zuru okè banyere imere atụrụ nke na-akpafu akpafu ebere. Onye Ọzụzụ Atụrụ anyị nwere ọmịiko kwuru, sị: “Nke furu efu ka m ga-achọ, ọ bụkwa nke a chụfuru achụfu ka m ga-ewelata, ọkpụkpụ a gbajiri agbaji ka m ga-ekezikwa, nke ahụ ya na-adịghị ike ka m ga-emekwa ka ọ dị ike.” (Ezikiel 34:15, 16; Jeremaịa 31:10) N’iṅomi ihe nlereanya nke a mara mma nke ukwuu, e mewo ndokwa ịhụnanya ka ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ nke oge a na-eleta ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ, bụ́ ndị pụrụ ịnakwere enyemaka ha ugbu a. Mgbalị obi ebere ndị a a na-eme iji nwetaghachi atụrụ ndị dị otú ahụ furu efu amịpụtawo ezi mkpụrụ. Otu nwanna nwanyị a kpọbataghachiri n’ọgbakọ kwuru, sị: “Mgbe ndị okenye bịara, ọ bụ agbamume nke dị m mkpa iji laghachite.”
N’enweghị obi abụọ ọ bụla, okwu Pọl gwara ndị okenye Efesọs na Militọs jupụtara ná nkọwa—nye ha nakwa nye ndị nlekọta n’oge a. Aka o zoro n’ebe ndị ọzụzụ atụrụ nọ bụ ihe ncheta banyere àgwà ndị na-adọrọ adọrọ nke kwesịrị ịpụta ìhè n’ebe ndị nlekọta nọ—àgwà ndị dị ka umeala, obi ike, dị ka onye ọzụzụ atụrụ ahụ bụkwa eze bụ́ Devid mere ihe atụ ya; echiche onwe onye nke ibu ọrụ na nlekọta na-echebe echebe, nke pụtara ìhè n’ozi ehihie na abalị nke Jekọb; nakwa ịdị njikere iji ndidi nakwerekwuo ọzụzụ, dị ka Mosis gosipụtara. N’ezie, ihe nlereanya Bible ndị a ga-enyere ndị okenye ọgbakọ aka ịzụlite na igosipụta àgwà ndị ahụ dị mkpa ka ha wee nwee ike iji ụzọ dị nro “na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ, bụ́ nke o ji ọbara Ọkpara ya onwe ya zụta.”