Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 10/1 p. 30-31
  • Shunem—E Ji Ịhụnanya na Ime Ihe Ike Rịba Ya Ama

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Shunem—E Ji Ịhụnanya na Ime Ihe Ike Rịba Ya Ama
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọgụ Abụọ Tara Akpụ
  • Gidiọn Meriri Ndị Midian
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Gidiọn na Narị Ndị Ikom Atọ Ya
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • “Kuru Nwa Gị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • “Mma Agha Dịịrị Jehova Dịkwara Gidiọn!”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 10/1 p. 30-31

Shunem—E Ji Ịhụnanya na Ime Ihe Ike Rịba Ya Ama

N’EBE ndịda Galili, n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke ebe dị larịị Jezreel, ka obodo Shunem dị. A lụrụ abụọ n’ime ọgụ ndị kasị dị ịrịba ama n’akụkọ Bible n’obodo nta nke a, a makwa ya ama dị ka ebe a mụrụ ndị inyom abụọ gosipụtara ihe nlereanya nke ezi ịhụnanya.

Ugwu e chere na ọ bụ More guzo n’azụ Shunem, ebe Ugwu Gilboa guzo n’ofe nke ọzọ nke ala ahụ dị larịị, ihe dị ka kilomita asatọ site n’ebe ahụ. E nwere ala mmiri dere nke ọma, na-amị mkpụrụ n’etiti ugwu abụọ ahụ—otu n’ime ógbè kasị emepụta ihe n’Israel nile.

Ime ime obodo a nke ihe na-eto nke ọma n’ime ya na gburugburu Shunem ka a nọ kọọ otu n’ime akụkọ ịhụnanya kasị ụtọ a kọrọla—Abụ nke Abụ. Abụ a na-akọ banyere otu nwa agbọghọ ime obodo mara mma bụ́ onye họọrọ ịlụ enyi ya bụ́ onye ọzụzụ atụrụ kama ikwenyere Eze Solomọn ịghọ otu n’ime ndị nwunye ya. Solomọn ji amamihe na akụ̀ na ụba ya nile mee ihe inweta obi ya. Ugboro ugboro, o toro ya, sị: “Ònye bụ nwanyị a nke na-elepụ anya dị ka ụtụtụ, nke mara mma dị ka ọnwa, na-enwu ka anyanwụ?” O kwere nkwa iji ọla nile ọ pụrụ ichetụ n’uche zụtọọ ya.—Abụ nke Abụ 1:11; 6:10.

Iji mee ka o detụ ndụ nke ndị eze ire, Solomọn mere ka o soro ya gaa Jerusalem dị ka otu n’ime ndị ozi ya, nke ndị agha 60 ya kasị mma so. (Abụ nke Abụ 3:6-11) O nyere ya ụlọ n’ime obí eze ya, obí nke mara oké mma nke na mgbe eze nwanyị Sheba hụrụ ya, “mmụọ adịghịkwa n’ime ya ọzọ.”—1 Ndị Eze 10:4, 5.

Ma nwa agbọghọ ahụ sitere Shunem guzosiri ike n’ihe nye nwa okoro ahụ bụ́ onye ọzụzụ atụrụ. “Dị ka osisi apple n’etiti osisi oké ọhịa,” ka ọ sịrị, “otú a ka onye ihe ya na-atọ m ụtọ dị.” (Abụ nke Abụ 2:3) Ka Solomọn ṅụrịa n’ihi puku ubi vine ya. Otu ubi vine—tinyere onye ọ hụrụ n’anya—zuuru ya. A pụghị ime ka ịhụnanya ya maa jijiji.—Abụ nke Abụ 8:11, 12.

Nwanyị ọzọ mara mma biri na Shunem. Anyị amaghị ihe ọ bụla banyere ọdịdị elu ahụ ya, ma o doro anya na ọ mara mma n’obi. Bible na-ekwu na ‘o chegburu onwe ya’—ma ọ bụ nwee ọtụtụ nsogbu—iji nye Elaịsha onye amụma nri na ebe obibi mgbe nile.—2 Ndị Eze 4:8-13.

Anyị pụrụ ise onyinyo Elaịsha ka o ji obi ekele na-alọta ka o mechara ogologo njem na-agwụ ike, baa n’ụlọ elu nta ahụ nwanyị ahụ na di ya kwadebewooro ya. Ọ pụrụ ịbụ na ọ gara ụlọ ha ọtụtụ ugboro, ebe ọ bụ na ozi ya ruru afọ 60. N’ihi gịnị ka nwanyị Shunem a ji esi ọnwụ ka Elaịsha nọrọ n’ụlọ ha mgbe ọ bụla ọ gafere n’ụzọ ahụ? N’ihi na o weere ọrụ Elaịsha dị ka ihe dị mkpa. Onye amụma a dị umeala n’obi, na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị rụrụ ọrụ dị ka akọ na uche nke mba ahụ, na-echetara ndị eze, ndị nchụàjà, na ndị nkịtị banyere ọrụ ha nwere ijere Jehova ozi.

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nwanyị Shunem ahụ bụ otu n’ime ndị ahụ Jisọs bu n’uche mgbe ọ sịrị: “Onye na-anara onye amụma n’aha onye amụma ga-anara ụgwọ ọrụ onye amụma.” (Matiu 10:41) Jehova nyere nwanyị a na-atụ egwu Chineke ụgwọ ọrụ pụrụ iche. Ọ bụ ezie na ọ bụwo nwanyị àgà ruo ọtụtụ afọ, ọ mụrụ nwa nwoke. Ọtụtụ afọ ka e mesịrị o nwetara enyemaka sitere n’aka Chineke mgbe ụnwụ nri afọ asaa bibiri ala ahụ. Ihe ndekọ nke a na-akpali akpali na-echetara anyị na Nna anyị nke eluigwe adịghị echefu obiọma anyị gosiri ndị ohu Chineke.—2 Ndị Eze 4:13-37; 8:1-6; Ndị Hibru 6:10.

Ọgụ Abụọ Tara Akpụ

Ọ bụ ezie na a na-echeta Shunem dị ka ebe obibi nke ndị inyom abụọ a na-eguzosi ike n’ihe, a lụkwara ọgụ abụọ gbanwere usoro akụkọ ihe mere eme nke Israel na ya. E nwere ebe dị nso dị mma maka ịlụ agha—ala dị larịị dị n’agbata ugwu More na Gilboa. Ndị ọchịagha n’oge Bible na-ama ụlọikwuu ha mgbe nile n’ebe e si enweta mmiri n’ụba, ala dị elu maka nchebe, na, ọ bụrụ na o kwere mee, ọnọdụ sara mbara na-elefe anya na ndagwurugwu ala akọrọ dị larịị nke nwere ohere dị ukwuu ga-abata ìgwè ndị ikom, ọtụtụ ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya. Shunem na Gilboa nwere ọnọdụ ndị dị otú ahụ.

N’oge ndị ikpe, usuu ndị agha 135,000 nke ndị Midia, ndị Amalek, na ndị ọzọ mara ụlọikwuu ha n’ala ahụ dị larịị n’ihu More. Camel ha “dị ka ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri n’ụba.” (Ndị Ikpe 7:12) Ná ncherịta ihu ha n’ofe nke ọzọ nke ala ahụ dị larịị, n’akụkụ olulu mmiri Harọd na ndịda Ugwu Gilboa, ka ụmụ Israel nọ n’okpuru Onyeikpe Gideọn, onye nwere nanị ndị agha 32,000.

N’ụbọchị ndị sochiri tupu a lụọ ọgụ, akụkụ nke ọ bụla ga-anwa ime ka obi daa akụkụ nke ọzọ mbà. Usuu ndị agha na-akwa emo, camel agha, ụgbọ ịnyịnya, na ịnyịnya ndị ahụ pụrụ imenye ndị agha ahụ ji ụkwụ egwu. N’enweghị obi abụọ, ndị Midia—bụ́ ndị nọdụwororị mgbe ụmụ Israel ka na-ezukọta—bụ ihe na-emenye ụjọ. Mgbe Gideọn jụrụ, sị, “Ònye na-atụ egwu na-amakwa jijiji?” ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ndị agha ya zaghachiri site n’ịhapụ ọgbọ agha ahụ.—Ndị Ikpe 7:1-3.

Nanị usuu ndị agha Israel 10,000 na-elegide ndị agha 32,000 ndị iro ha anya n’ofe nke ọzọ nke ala ahụ dị larịị, n’oge na-adịghịkwa anya, Jehova gbubilatara ọnụ ọgụgụ ndị agha Israel ruo nanị 300. Dị ka ndị Israel si eme, e kewara ìgwè nta a ụzọ atọ. N’abalị, ha gbasara ma were ọnọdụ ha n’akụkụ atọ nke ụlọikwuu ndị iro ha. Mgbe Gideọn nyeziri iwu, mmadụ 300 ahụ tiwasịrị ite ndị ahụ kpuchiri ọwá ndị ahụ, welie ọwá ha ma tie mkpu, sị, “Mma agha dịịrị Jehova dịkwara Gideon.” Ha fụrụ opi ha ma nọgide na-afụ. N’ọchịchịrị ahụ, ìgwè ndị agha ahụ gwara ọgwa ụjọ ji chere na ìgwè nke 300 na-awakpo ha. Jehova tụgharịrị onye ọ bụla megide ibe ya, “ọmụma ụlọikwuu ahụ nile wee gbaa ọsọ; ha wee tie mkpu, gbalaga.”—Ndị Ikpe 7:15-22; 8:10.

Ọgụ nke abụọ weere ọnọdụ na nso Shunem n’oge Eze Sọl. Bible kọrọ na ‘ndị Filistia chịkọtara onwe ha, bịa, maa ụlọikwuu ha na Shunem: Sọl wee chịkọta Israel nile, ha wee maa ụlọikwuu ha na Gilboa,’ dị ka ndị agha Gideọn mere n’ọtụtụ afọ bu ụzọ. Ma Sọl, n’adịghị ka Gideọn, nwere okwukwe dị nta n’ebe Jehova nọ, na-ahọrọ ịgakwuru onye na-ajụ ndị mmụọ ọjọọ ase n’En-doa. Mgbe ọ hụrụ ọmụma ụlọikwuu ndị Filistia, “o wee tụọ egwu, obi ya wee maa jijiji nke ukwuu.” N’ọgụ sochirinụ, ndị Israel gbara ọsọ, e meriekwa ha n’ụzọ dị ukwuu. Ma Sọl ma Jonatan tụfuru ndụ ha.—1 Samuel 28:4-7; 31:1-6.

Otú ahụ ka akụkọ ihe mere eme nke Shunem si bụrụ nke e ji ma ịhụnanya ma ime ihe ike rịba ama, ịtụkwasị Jehova obi na ịdabere ná ndị mmụọ ọjọọ. N’ala ndagwurugwu a, ndị inyom abụọ gosiri ịnọgidesi ike n’ịhụnanya na ile ọbịa, ndị ndú Israel abụọ lụrụ ọgụ ndị tara akpụ. Ihe atụ anọ ndị a na-akọwa mkpa ọ dị ịdabere na Jehova, onye na-adịghị ada ada ịkwụ ndị jeere ya ozi ụgwọ ọrụ.

[Foto dị na peeji nke 31]

Obodo nta nke oge a bụ́ Sulam n’ebe Shunem oge ochie dịbu, More dịkwa n’azụ ya

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya