Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 8/15 p. 17-22
  • Kwere Ka Njide Onwe Onye Gị Na-adị Ma Na-aba Ụba

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kwere Ka Njide Onwe Onye Gị Na-adị Ma Na-aba Ụba
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Dị Mkpa ma Ọ Dịghị Mfe
  • Njide Onwe Onye n’Ihe Banyere Mmetụta Uche Anyị
  • Mmetụta Uche Gị na Ụmụnna Gị
  • Ọ Ga-ekwe Omume!
  • Njide Onwe Onye—n’Ihi Gịnị Ka O Ji Dị Oké Mkpa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ịzụlite Mkpụrụ nke Njide Onwe Onye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Iji Nweta Ihe Nrite ahụ, Na-egosipụta Njide Onwe Onye!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Tụkwasịnụ Njide Onwe Onye n’Ihe Ọmụma Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 8/15 p. 17-22

Kwere Ka Njide Onwe Onye Gị Na-adị Ma Na-aba Ụba

‘Nyezuokwa ijisi onwe unu ike n’okwukwe unu.’—2 PITA 1:5, 6.

1. N’ọnọdụ dị aṅaa pụrụ iche ka onye Kraịst pụrụ ịgba àmà?

JISỌS kwuru, sị: “N’ihu ndị isi na ndị eze ka a ga-ekurukwa unu jee n’ihi m, ịbụrụ ha na ndị mba ọzọ àmà.” (Matiu 10:18) Ọ bụrụ na a kpọọ gị n’ihu onye gọvanọ, ọkà ikpe, ma ọ bụ onye isi ala, gịnị ka ị ga-ekwu banyere ya? Eleghị anya ị ga-ebu ụzọ kwuo ihe mere i ji nọrọ n’ebe ahụ, ebubo e boro gị. Mmụọ Chineke ga-enyere gị aka ime otú ahụ. (Luk 12:11, 12) Ma ị̀ pụrụ iche echiche ikwu banyere njide onwe onye? Ị̀ na-ele nke ahụ anya dị ka akụkụ dị mkpa nke ozi ndị Kraịst anyị?

2, 3. (a) Olee otú o si dapụta na Pọl pụrụ ịgba àmà nye Filiks na Drusila? (b) N’ihi gịnị ka njide onwe onye ji bụrụ isiokwu kwesịrị ekwesị ka Pọl kwuo okwu banyere ya n’ọnọdụ ahụ?

2 Tụlee otu ihe atụ mere eme. E jidere otu n’ime ndịàmà Jehova ma kpọọ ya maka ikpe ikpe. Mgbe e nyere ya ohere ikwu okwu, ọ chọrọ ịkọwa nkwenkwe ya dị ka onye Kraịst, dị ka onyeàmà. Ị pụrụ inyocha ihe ndekọ ahụ, ị ga-ahụkwa na ọ gbara akaebe gara werewere “banyere ezi omume, na imeru ihe ókè, na ikpe ahụ nke gaje ịbịa.” Anyị na-ezo aka n’otu ahụmahụ nke Pọl onyeozi na Sizaria. E bu ụzọ gbaa ya ajụjụ ọnụ. “Mgbe ụbọchị ụfọdụ gasịrị Filiks bịaruru, ya na Drusila nwunye nke aka ya, onye bụ́ nwanyị Juu, o wee kpọta Pọl, wee nụ okwu ya banyere okwukwe n’ime Kraịst Jisọs.” (Ọrụ 24:24) Akụkọ ihe mere eme na-akọ na Filiks “mere ụdị omume obi ọjọọ na ọchịchọ ọ bụla, na-akpa ike dị ka eze site ná mkpali nile nke onye ohu.” Ọ lụwo nwunye ugbo abụọ tupu oge ahụ mgbe o dubanyere Drusila n’ịgba di ya alụkwaghịm (na-emebi iwu Chineke) ma ghọọ nwunye ya nke atọ. Eleghị anya ọ bụ ya bụ onye chọrọ ịnụ banyere okpukpe ọhụrụ ahụ, bụ́ Iso Ụzọ Kraịst.

3 Pọl gara n’ihu ikwu “banyere ezi omume, na imeru ihe ókè, na ikpe ahụ nke gaje ịbịa.” (Ọrụ 24:25) Nke a gaara eme ka ọdịiche dị n’etiti ụkpụrụ ezi omume nile nke Chineke na obi ọjọọ na ikpe na-ezighị ezi nke aka Filiks na Drusila dị na ha pụta ìhè. Ọ pụrụ ịbụ na Pọl nwere olileanya ịkpali Filiks igosipụta ikpe ziri ezi n’okwu ahụ a na-ekpe. Ma n’ihi gịnị ka e ji welite “imeru ihe ókè na ikpe ahụ nke gaje ịbịa”? Mmadụ abụọ a rụrụ arụ chọrọ ịmata ihe “okwukwe n’ime Kraịst Jisọs” metụtara. Ya mere ọ dị mkpa ka ha mara na ịgbaso ya chọrọ mmadụ ijide echiche, okwu ọnụ, na omume ya aka, bụ́ ihe njide onwe onye pụtara. Mmadụ nile ga-aza ajụjụ n’ihu Chineke maka echiche, okwu, na omume ha. Otú a, ihe dị mkpa karịa mkpebi ikpe ọ bụla sitere n’ọnụ Filiks n’okwu Pọl bụ okwu ikpe nke gọvanọ ahụ na nwunye ya na-eche ihu n’ihu Chineke. (Ọrụ 17:30, 31; Ndị Rom 14:10-12) N’ụzọ kwere nghọta, mgbe ọ nụrụ ozi Pọl, “Filiks wee tụọ egwu.”

Ọ Dị Mkpa ma Ọ Dịghị Mfe

4. N’ihi gịnị ka njide onwe onye ji bụrụ akụkụ dị mkpa nke ezi Iso Ụzọ Kraịst?

4 Pọl onyeozi ghọtara njide onwe onye dị ka akụkụ dị mkpa nke Ịsọ Ụzọ Kraịst. Pita onyeozi, dị ka otu n’ime ndị ha na Jisọs kpachiri anya nwapụtara nke a. Mgbe ọ na-edegara ndị ga-aghọ “ndị na-enwekọ ihe o ji bụrụ Chineke” n’eluigwe akwụkwọ, Pita gbara ume igosipụta àgwà ụfọdụ ndị dị mkpa, dị ka okwukwe, ịhụnanya, na njide onwe onye. Ya mere, njide onwe onye so n’ihe a chọrọ ná mmesi obi ike nke a: “A sị na unu nwere ihe ndị a, a sịkwa na unu nwere ha hie nne, ha na-edo unu ndị na-abụghị ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ọ bụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ ruo ịmazu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.”—2 Pita 1:1, 4-8.

5. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji bụrụ ndị na-enwe nchegbu karịsịa banyere njide onwe onye?

5 Otú ọ dị, unu maara na ọ dị mfe ikwu na anyị kwesịrị igosipụta njide onwe onye karịa ka ọ dị itinye ya n’ezie n’omume ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị. Otu ihe mere ya bụ na njide onwe onye dịtụ ụkọ. Na 2 Timoti 3:1-5, Pọl kọwara àgwà ndị ga-ejupụta n’oge anyị, na “mgbe ikpeazụ.” Otu àgwà a ga-eji mara oge anyị bụ na ọtụtụ ga-abụ “ndị na-adịghị ejide onwe ha.” Anyị na-ahụ na nke a bụ eziokwu n’akụkụ anyị nile, ọ́ bụghị otú ahụ?

6. Olee ụzọ e si egosipụta enweghị njide onwe onye taa?

6 Ọtụtụ ndị kwere na n’ụzọ bụ isi ọ bụ ihe dị mma “ịgbaghepụ ọnụ” ma ọ bụ “ịwụpụ iwe.” A na-emesi echiche ha ike site ná ndị ha na-elegara anya bụ ndị a mazuru n’ọha bụ́ ndị o yiri ka ha na-elefuru ụdị njide onwe onye ọ bụla anya, ndị na-eme nnọọ ihe gụrụ ha. Iji maa atụ: Ọtụtụ ndị nwere mmasị n’ọrụ ịsọ mpi egwuregwu abụwo ndị ọ maara ahụ ịhụ ngosipụta nke mmetụta uche, ọbụna iwe ọkụ. Ọ̀ bụ na ị pụghị icheta, ma ọ dịghị ebe ọzọ site ná ndị nta akụkọ, ebe ndị ọgụ obi ọjọọ ma ọ bụ ọgba aghara ìgwè mmadụ weere ọnọdụ n’ihe omume egwuregwu? Otú ọ dị, isiokwu anyị achọghị ka anyị tinye oge dị ukwuu n’ịtụleghachi ihe atụ ndị na-egosi enweghị njide onwe onye. Ị pụrụ idepụta ọtụtụ akụkụ ebe ọ dị mkpa ka anyị gosi njide onwe onye—n’ihe anyị na-eri na ihe anyị na-aṅụ, omume n’ebe ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe anyị nọ, nakwa oge na ego anyị na-etinye n’ihe ndị a na-eme ma e nwee ohere. Ma kama ịtụle ọtụtụ n’ime ihe ndị dị otú ahụ n’elu n’elu, ka anyị tụlee otu akụkụ bụ isi nke anyị na-aghaghị igosipụta njide onwe onye.

Njide Onwe Onye n’Ihe Banyere Mmetụta Uche Anyị

7. Akụkụ njide onwe onye dị aṅaa kwesịrị nlekwasị anya pụrụ iche?

7 Ọtụtụ n’ime anyị enwewo ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ihe ịga nke ọma n’ịchịkwa ma ọ bụ igbochi omume anyị. Anyị adịghị ezu ohi, adaba n’omume rụrụ arụ, ma ọ bụ na-egbu ọchụ; anyị maara ihe iwu Chineke kwuru banyere ajọ ihe ndị dị otú ahụ. Otú ọ dị, ruo ókè hà aṅaa ka anyị na-enwe ihe ịga nke ọma n’ịchịkwa mmetụta uche anyị? Mgbe oge na-aga, ndị na-enweghị ike ịzụlite njide onwe onye nke mmetụta uche adịghị enwekarị njide onwe onye n’ihe banyere omume ha. Ya mere ka anyị lekwasị anya ná mmetụta uche anyị.

8. Gịnị ka Jehova na-atụ anya ya n’aka anyị banyere mmetụta uche anyị?

8 Jehova Chineke adịghị atụ anya ka anyị dị ka ígwè ọrụ, nke na anyị adịghị enwe ma ọ bụ egosipụta mmetụta uche ọ bụla. N’ili Lazarọs, Jisọs ‘sụrụ ude n’ime mmụọ ya ma nwee obi ịlọ mmiri.’ Mgbe ahụ “anya mmiri pụrụ n’anya Jisọs.” (Jọn 11:32-38) O gosiri mmetụta uche dị iche mgbe, site n’ịchịkwa omume ya n’ụzọ zuru okè, ọ chụpụrụ ndị na-agbanwe ego n’ụlọ nsọ. (Matiu 21:12, 13; Jọn 2:14-17) Ndị na-eso ụzọ ya na-anọgidesi ike n’ihe gosipụtakwara mmetụta uche dị omimi. (Luk 10:17; 24:41; Jọn 16:20-22; Ọrụ 11:23; 12:12-14; 20:36-38; 3 Jọn 4) Ma, ha chọpụtara mkpa njide onwe onye dị ka mmetụta uche ha ghara iduba ha ná mmehie. Ndị Efesọs 4:26 na-eme ka nke a doo nnọọ anya: “Unu emehiela mgbe unu na-ewe iwe: ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu.”

9. N’ihi gịnị ka ịchịkwa mmetụta uche anyị ji dị oké mkpa?

9 E nwere ihe ize ndụ nke na onye Kraịst pụrụ iyi ka ọ na-egosipụta njide onwe onye ma, n’ezie, ọ naghị enwe ike ịchịkwa mmetụta uche ya. Cheta ihe mere mgbe Chineke nwapụtara àjà Ebel: “Ken wee wee iwe dị ọkụ nke ukwuu, ihu ya wee gbarụọ. Jehova wee sị Ken, N’ihi gịnị ka ị na-ewe iwe dị ọkụ? Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ihu gị gbarụrụ? Ọ bụrụ na ị na-eme nke ọma, ọ́ bụghị mgbasa ihu ka ị ga-enwe? Ọ bụrụkwa na i meghị nke ọma, n’ọnụ ụzọ ka mmehie na-amakpu dị ka anụ ọhịa: ọ bụkwa n’ebe ị nọ ka ọchịchọ ya dị.” (Jenesis 4:5-7) Ken enweghị ike ịchịkwa mmetụta uche ya, bụ́ nke dugara ya n’igbu Ebel. Mmetụta uche a na-achịkwataghị dubara n’omume a na-achịkwataghị.

10. Gịnị ka ị na-amụta site n’ihe atụ Heman?

10 Tụleekwa otu ihe atụ nke mere n’ụbọchị Mọdekaị na Esta. Onye isi ọchịchị ahụ aha ya bụ́ Heman were iwe na Mọdekaị jụrụ ịkpọrọ ya isiala. E mesịa Heman chere n’ụzọ na-ezighị ezi na a ga-emere ya amara. “Heman wee pụọ ụbọchị ahụ na-aṅụrị ọṅụ, ọ dịkwa ya mma n’obi: ma mgbe Heman hụrụ Mọdekaị n’ọnụ ụzọ ama eze, na ọ bilighị, na ọ maghịkwa jijiji n’ihu ya, Heman jupụtara n’ọnụma megide Mọdekaị. Ma Heman jisiri onwe ya ike, baa n’ụlọ ya.” (Esta 5:9, 10) Ọ dị ngwa n’inwe mmetụta uche nke ọṅụ. Ma ọ dịkwa ngwa n’inwe ọnụma nanị maka na ọ hụrụ onye o buuru iwe n’obi. Ì chere na mgbe Bible sịrị na Heman “jisiri onwe ya ike” na ọ pụtara na ọ bụ ihe nlereanya ná njide onwe onye? Ọ dịghị ma ọlị. N’ime oge ahụ, Heman chịkwara omume ya na ngosipụta mmetụta uche ọ bụla, ma o nweghị ike ịchịkwa ọnụma ekworo ya. Mmetụta uche ya dubara ya n’ime atụmatụ igbu ọchụ.

11. N’ọgbakọ Filipaị, nsogbu dị aṅaa bilitere, gịnịkwa pụrụ idugawo na ya?

11 N’otu aka ahụ, enweghị ike ịchịkwa mmetụta uche n’oge a pụrụ imerụ onye Kraịst ahụ nke ukwuu. ‘Oo,’ ka ụfọdụ pụrụ iche, ‘nke ahụ agaghị abụ nsogbu n’ọgbakọ.’ Ma ọ bụwo. Ndị Kraịst abụọ e tere mmanụ na Filipaị nwere nghọtahie siri ike, nke Bible na-akọwaghị. Cheedị banyere nke a dị ka ihe ọ pụrụ ịbụ: Yuodia kpọrọ ụfọdụ ụmụnna nwoke na nwanyị òkù maka ihe oriri ma ọ bụ nnọkọ dị ụtọ. A kpọghị Sintiki, o wutekwara ya. Eleghị anya o megwaara site n’akpọghị Yuodia n’oge ọzọ. Mgbe ahụ ha abụọ malitere ịchọ ntụpọ nke onye nke ọzọ; mgbe oge na-aga, ọ na-esiri ha ike ighe onwe ha ọnụ. N’ọnọdụ dị otú ahụ, isi nsogbu ha ọ̀ ga-abụ n’ihi akpọghị òkù ịbịa oriri? Ee e. Nke ahụ ga-abụ nanị ihe kpaliri ya. Mgbe ụmụnna nwanyị abụọ ndị a e tere mmanụ na-enweghị ike ịchịkwa mmetụta uche ha, ihe ahụ kpaliri ya ghọrọ ọkụ na-agba ọzara. Nsogbu ahụ dịgidere wee mụbaa ruo mgbe otu onyeozi tinyere ọnụ na ya.—Ndị Filipaị 4:2, 3.

Mmetụta Uche Gị na Ụmụnna Gị

12. N’ihi gịnị ka Chineke ji nye anyị ndụmọdụ ahụ a na-achọta n’Eklisiastis 7:9?

12 N’ụzọ a pụrụ ịnakwere, ọ dịghị mfe mmadụ ịchịkwa mmetụta uche ya mgbe onye ahụ chere na e mejọrọ, megbuo, ma ọ bụ mesoo ya omume n’ihi ịkpọasị. Jehova maara nke ahụ, n’ihi na ọ nọwo na-ekiri mmekọrịta mmadụ site ná mmalite nke mmadụ. Chineke na-adụ anyị ọdụ, sị: “Ekwela ka a kpasuo gị iwe ọsọ ọsọ n’ime mmụọ gị: n’ihi na mkpasu iwe nwere ọnọdụ ya n’obi ndị nzuzu.” (Eklisiastis 7:9) Rịba ama na Chineke na-ebu ụzọ elekwasị anya ná mmetụta uche ọ bụghị omume. (Ilu 14:17; 16:32; Jemes 1:19) Jụọ onwe gị sị, ‘M̀ kwesịrị ilekasịkwu anya n’ịchịkwa mmetụta uche m?’

13, 14. (a) N’ụwa, gịnị na-ebilitekarị site n’enweghị ike ịchịkwa mmetụta uche? (b) Ihe ndị dị aṅaa pụrụ iduba ndị Kraịst n’ibu iwe n’obi?

13 Ọtụtụ ndị n’ụwa bụ́ ndị na-enweghị ike ịchịkwa mmetụta uche ha na-amalite ịbọrịta ọ́bọ̀—ajọ ibu iro, ọbụna ime ihe ike nke na-adịru ogologo oge n’ihi mmejọ mere eme ma ọ bụ nke e chere na e mere megide onwe ha ma ọ bụ onye ikwu. Mgbe ọ bụla mmetụta uche ghọrọ nke a na-apụghị ịchịkwa, ha pụrụ ịkpa ike ha na-emerụ ahụ ruo oge dị anya. (Tụlee Jenesis 34:1-7, 25-27; 49:5-7; 2 Samuel 2:17-23; 3:23-30; Ilu 26:24-26.) N’ezie ndị Kraịst, n’agbanyeghị mba ma ọ bụ ọdịnala ọ bụla ha si pụta, kwesịrị ịhụ ajọ ibu iro na ibu iwe n’obi ndị dị otú ahụ dị ka ihe na-ezighị ezi, ihe ọjọọ, nke a ga-ezere. (Levitikọs 19:17) Ị̀ na-ele izere ibu iwe n’obi anya dị ka akụkụ njide onwe onye gị n’ihe banyere mmetụta uche?

14 Dị nnọọ ka ọ dị n’ọnọdụ Yuodia na Sintiki, enweghị ike ịchịkwa mmetụta uche pụrụ iduba ná nsogbu ugbu a. Otu nwanna nwanyị pụrụ iche na e mejọrọ ya n’ihi na a kpọghị ya òkù oriri agbamakwụkwọ. Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ nwa ya ma ọ bụ nwa nwanne ya ka a na-akpọghị. Ma ọ bụ eleghị anya otu nwanna zụtara otu ụgbọ a gbatụworo n’aka onye Kraịst ibe ya, n’oge na-adịghịkwa anya o mebie. N’agbanyeghị ihe merenụ, nke a kpatara mwute, a chịkwaghịkwa mmetụta uche, ndị nke ahụ metụtara were iwe. Mgbe ahụ gịnị pụrụ ime?

15. (a) Ihe mwute ndị dị aṅaa siworo n’ibu iwe n’obi pụta n’etiti ndị Kraịst? (b) Ndụmọdụ Bible dị aṅaa na-emetụta àgwà nke ibu iwe n’obi?

15 Ọ bụrụ na onye a kpasuru iwe arụghị ọrụ ịchịkwa mmetụta uche ya na ime udo n’ebe nwanna ya nọ, ibu iwe n’obi pụrụ ibilite. E nwewo ọnọdụ ebe Onyeàmà kwuru ka a ghara ikenye ya n’otu Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ n’ihi na o “nweghị mmasị n’ebe” otu onye Kraịst ma ọ bụ ezinụlọ na-abịa n’ebe ahụ nọ. Lee ka o si bụrụ ihe mwute! Bible na-asị na ọ ga-abụ mmeri nye ndị Kraịst ịkpụga onwe ha n’ụlọ ikpe ndị ụwa, ma ọ́ gaghị abụkwa mmeri n’otu aka ahụ ma anyị na-ezere nwanna n’ihi mmejọ gara aga o mere anyị ma ọ bụ onye ikwu anyị? Mmetụta uche anyị ọ̀ na-ekpughe na anyị na-eme ka ndị anyị na ha si n’otu ọbara bute ụzọ karịa iso ụmụnna anyị nwoke na nwanyị dịrị n’udo? Ànyị na-asị na anyị dị njikere ịnwụ n’ihi nwanna anyị nwanyị, ma mmetụta uche anyị akpalie anyị nke ukwuu nke na o siiri anyị ike ighe ya ọnụ ugbu a? (Tụlee Jọn 15:13.) Chineke na-agwa anyị hoo haa, sị: “Unu enyeghachila onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ. . . . A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe unu, ka ihe nke dịịrị unu onwe unu hà, unu na mmadụ nile na-adị n’udo. Ndị m hụrụ n’anya, unu abọlara onwe unu ọ́bọ̀, kama chaaranụ iwe ahụ ụzọ.”—Ndị Rom 12:17-19; 1 Ndị Kọrint 6:7.

16. Abraham setịpụrụ ihe nlereanya dị aṅaa mara mma banyere ịchịkwa mmetụta uche?

16 Otu nzọụkwụ iji nwetaghachi nchịkwa nke mmetụta uche anyị bụ iji ime udo ma ọ bụ ikpezi ihe kpatara mkpesa ahụ, kama ikwere ka ịkpọasị dịgide. Cheta mgbe ala ahụ na-apụghị inyeju ìgwè anụ ụlọ Abraham nakwa nke Lọt afọ, ya mere ndị ha goro ọrụ wee malite ise okwu. Abraham ò kwere ka mmetụta uche ya chịa ya? Ka ò gosipụtara njide onwe onye? N’ụzọ ịja mma, ọ tụrụ aro otú a ga-esi jiri udo dozie esemokwu azụmahịa ahụ; ka onye ọ bụla nwee ókèala dị iche. O nyekwara Lọt nhọrọ nke mbụ. Igosi na Abraham ebughị iro ọ bụla n’obi na o bukwaghị iwe ọ bụla n’obi, o mesịrị jee lụọ agha n’ihi Lọt.—Jenesis 13:5-12; 14:13-16.

17. Olee ụzọ Pọl na Banabas si dahie n’otu oge, ma gịnị sochiri mgbe nke ahụ gasịrị?

17 Anyị pụkwara ịmụta banyere njide onwe onye site n’otu ihe merenụ nke metụtara Pọl na Banabas. Ka ha nọworo na-arụkọ ọrụ ọnụ ruo ọtụtụ afọ, ha sere okwu banyere ịkpọrọ Mak gaa njem. “Oké iwe wee pụta n’etiti ha, nke mere ka ha kewaa otu onye n’ebe ibe ya nọ, Banabas wee kuru Mak nye onwe ya, wee baa n’ụgbọ jee Saịprọs.” (Ọrụ 15:39) Na ndị ikom ndị a tozuru okè enweghị ike ịchịkwa mmetụta uche ha n’oge ahụ kwesịrị ịbụrụ anyị ihe ịdọ aka ná ntị. Ọ bụrụ na ọ pụrụ ime ha, ọ pụrụ ime anyị. Otú ọ dị, ha ekweghị ka e nwee nsogbu na-adịgide adịgide ma ọ bụ ka esemokwu mụbaa. Ihe ndekọ na-egosi na ụmụnna ahụ o metụtara nwetaghachiri nchịkwa nke mmetụta uche ha ma mesịa rụkọọ ọrụ ọnụ n’udo.—Ndị Kọlọsi 4:10; 2 Timoti 4:11.

18. Ọ bụrụ na e nwee mwute, gịnị ka onye Kraịst tozuru okè pụrụ ime?

18 Anyị pụrụ ịtụ anya na a ga-enwe mwute, ọbụna ibu iwe n’obi, n’etiti ndị Chineke. Ha dị adị n’oge ndị Hibru nakwa n’ụbọchị ndị ozi. Ha ewerewokwa ọnọdụ n’etiti ndị ohu Jehova n’oge anyị, n’ihi na anyị nile bụ ndị na-ezughị okè. (Jemes 3:2) Jisọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha dị ngwa n’idozi nsogbu ndị dị otú ahụ dị n’etiti ụmụnna. (Matiu 5:23-25) Ma ọ ka mma ọbụna ibu ụzọ gbochie ha site n’imeziwanye njide onwe onye anyị. Ọ bụrụ na ị na-eche na e mejọrọ ma ọ bụ kpasuo gị iwe site n’otu ihe dịtụ ntakịrị nke nwanna gị nwoke ma ọ bụ nwanyị kwuru ma ọ bụ mee, gịnị mere na ị gaghị nnọọ achịkwa mmetụta uche gị ma chezọọ ya? Ọ̀ dị mkpa n’ezie ijekwuru onye ahụ, dị ka à ga-asị na ị gaghị enwe afọ ojuju ruo mgbe onye ahụ kwetara na ya mejọrọ? Ruo ókè hà aṅaa kpọmkwem ka ị na-achịkwa mmetụta uche gị?

Ọ Ga-ekwe Omume!

19. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị na ihe anyị tụlere lekwasịrị anya n’ịchịkwa mmetụta uche anyị?

19 N’ụzọ bụ isi anyị atụlewo otu akụkụ nke njide onwe onye, ịchịkwa mmetụta uche anyị. Nke ahụ bụkwa akụkụ bụ isi n’ihi na enweghị ike ịchịkwa mmetụta uche anyị pụrụ iduba enweghị ike ịchịkwa ire anyị, mkpali mmekọahụ anyị, àgwà iri ihe anyị, na ọtụtụ akụkụ ndị ọzọ nke ndụ ebe anyị na-aghaghị igosipụta njide onwe onye. (1 Ndị Kọrint 7:8, 9; Jemes 3:5-10) Otú ọ dị, nwee obi ike n’ihi na ị pụrụ imeziwanye n’inwe njide onwe onye.

20. Olee ụzọ anyị pụrụ isi jide n’aka na mmeziwanye ga-ekwe omume?

20 Jehova dị njikere inyere anyị aka. Olee ụzọ anyị pụrụ isi jide n’aka? Ọ dị mma, njide onwe onye bụ otu n’ime mkpụrụ nke mmụọ ya. (Ndị Galetia 5:22, 23) Otú a, ruo n’ókè anyị na-arụ ọrụ iru eru maka na iji nata mmụọ nsọ site n’aka Jehova na igosipụta mkpụrụ ya, ruo n’ókè ahụ ka anyị pụrụ ịtụ anya ịbụ ndị nwere njide onwe onye karị. Echezọla mmesi obi ike Jisọs: ‘Nna unu nke eluigwe ga-ewere mmụọ nsọ nye ndị na-arịọ ya!’—Luk 11:13; 1 Jọn 5:14, 15.

21. Gịnị ka i kpebiworo ime n’ọdịnihu banyere njide onwe na mmetụta uche gị?

21 Echela na ọ ga-adị mfe. Ọ pụkwara isi ike karị nye ụfọdụ ndị tolitere gburugburu ndị na-adịghị achịkwa mmetụta uche ha, nye ụfọdụ ndị obere ihe na-akpalikarị, ma ọ bụ nye ụfọdụ ndị ọ na-adịbeghị mgbe ha gbalịrị igosipụta njide onwe onye. Nye onye Kraịst dị otú ahụ, ikwere ka njide onwe onye dịrị ma baa ụba pụrụ ịbụ ezi ihe ịma aka. Ma ọ ga-ekwe omume. (1 Ndị Kọrint 9:24-27) Ka anyị na-abịaru nso karị n’ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a, ihe isi ike na nrụgide ga-amụba. Anyị gaje ịbụ ndị nwere mkpa maka njide onwe onye dị ukwuu karị, nke dị ezi ukwuu! Nyochaa onwe gị n’ihe banyere njide onwe onye gị. Ọ bụrụ na ị hụ akụkụ ebe ọ dị mkpa ka i meziwanye, rụọ ọrụ na ya. (Abụ Ọma 139:23, 24) Rịọ Chineke ka o nyekwuo gị mmụọ ya. Ọ ga-anụ olu gị ma nyere gị aka ka njide onwe onye gị wee dịrị ma na-aba ụba.—2 Pita 1:5-8.

Isi Ihe Maka Ntụgharị Uche

◻ N’ihi gịnị ka ịchịkwa mmetụta uche gị ji dị oké mkpa?

◻ Gịnị ka ị mụtaworo site n’ihe atụ nke Heman na nke Yuodia na Sintiki?

◻ Gịnị ka ị ga-agbalị ime site n’obi eziokwu ma ọ bụrụ na ihe na-akpasu iwe ebilite?

◻ Olee ụzọ njide onwe onye pụrụ isi nyere gị aka izere ibu iwe ọ bụla n’obi?

[Foto dị na peeji nke 18]

Mgbe ọ nọ n’ihu Filiks na Drusila, Pọl kwuru okwu banyere ezi omume na njide onwe onye

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya