Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
© 2023 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
NỌVEMBA 6-12
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 13-14
“Ọ Bụrụ na Mmadụ Anwụọ, Ọ̀ Ga-adị Ndụ Ọzọ?”
Ọchịchọ Anyị Na-achọ Ndụ Ka Ogologo
ỌBỤNA taa, ọ bụ mmadụ ole na ole pụrụ ịgbagha ihe a e kwuru banyere ịdị mkpụmkpụ nke ndụ, n’agbanyeghị na e dere ya n’ihe dị ka afọ 3,500 gara aga. Ndị mmadụ ahụtawo ya mgbe nile dị ka ihe na-adịghị enye afọ ojuju bụ́ ịdị ndụ n’uju ya ruo nanị nwa oge na imesị kaa nká ma nwụọ. Ya mere, usoro ndị e ji eme ka ndụ ka ogologo amụbaala n’akụkọ ihe mere eme nile.
N’oge Job, ndị Ijipt na-ata mkpụrụ amụ anụmanụ ná mgbalị na-enweghị isi iji laghachi n’oge ntorobịa ha. Otu n’ime ebumnobi bụ́ isi nke nkà mmụta usoro ịgbatịkwu ndụ n’oge ụwa na-emepechabeghị anya bụ imepụta ọgwụ nke pụrụ iduga ná ndụ ka ogologo. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta usoro ịgbatịkwu ndụ kweere na ọlaedo e ji aka mee ga-enye ndụ anwụghị anwụ nakwa na iji efere ọlaedo rie ihe ga-agbatịkwu ndụ. Ndị Tao nke China oge ochie chere na ha pụrụ ịgbanwe ọdịdị nke ahụ site n’iji usoro ndị dị ka ntụgharị uche, mmega ahụ nke iku ume, na ihe oriri eme ihe ma si otú a nweta anwụghị anwụ.
A maara onye Spain na-eme nchọpụta bụ́ Juan Ponce de León maka ọchịchọ na-enweghị ọgwụgwụ nke ọ chọrọ ihe na-akpata ịnọgide na-abụ onye ntorobịa. Otu onye dọkịta nke narị afọ nke 18 kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Hermippus Redivivus, ka e debe ụmụntakịrị nwanyị na-amaghị nwoke n’ime obere ọnụ ụlọ n’oge opupu ihe ubi, ka e jirikwa karama wekọta ume ha kupụrụ ma jiri ha mee ihe dị ka mmiri ọgwụ e ji agbatị ndụ. Ọ baghị uru ikwu na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime usoro ndị a nwere ihe ịga nke ọma ọ bụla.
Osisi E Gbuturu Egbutu Ò Nwere Ike Ipulite Ọzọ?
Ị HỤ osisi oliv kara nká ma hịgọọ ahịgọọ, o nwere ike ịdị gị ka o nweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere oké osisi sida dị na Lebanọn. Ma osisi oliv na-akpa ike dị egwu. O nwere ike ịnọ ọtụtụ afọ, ọ bụrụgodị n’ebe mmiri na-adịghị ma ọ bụ n’ebe bụ́ okwute okwute. E nwere osisi oliv ndị dị ihe dị ka otu puku afọ. Otú mgbọrọgwụ osisi oliv si abami n’ime ala na-eme ka o nwee ike ipute nke ọhụrụ, é gbutugodị úkwù ya. Ọ bụrụhaala na mgbọrọgwụ ya ka dị ndụ, ọ ga-epute nke ọhụrụ.
Obi siri Job ike na ọ bụrụgodị na ya anwụọ, na ya ga-adị ndụ ọzọ. (Job 14:13-15) O ji osisi mee ihe atụ iji gosi na obi siri ya ike na Chineke ga-akpọliteli ya n’ọnwụ. O nwere ike ịbụ osisi oliv ka o bu n’obi. Job sịrị: “Osisi nwere olileanya. Ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epulite ọzọ.” Ọ bụrụ na mmiri ezoo mgbe oké ọkọchị kọchara, úkwù osisi oliv kpọrọ nkụ nwere ike isi na mgbọrọgwụ ya pute nke ọhụrụ ga-emecha ‘waa alaka dị ka osisi pulitere ọhụrụ.—Job 14:7-9.
Ọ “Ga-agụsi Gị Ike”
Okwu Job na-akụziri anyị banyere ọmịiko Jehova: Ọ hụrụ ndị tụkwasịrị ya obi, dị ka Job, bụ́ ndị na-ekwe ka ọ kpụzie ha ịghọ ndị dị mma n’anya ya n’anya. (Aịzaya 64:8) Jehova ji ndị ji ikwesị ntụkwasị obi efe ya kpọrọ ihe. Agụụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi nwụrụ anwụ ‘na-agụsi ya ike.’ Otu onye ọkà mmụta kwuru na okwu Hibru e si na ya sụgharịa okwu ahụ bụ “otu n’ime okwu ndị kasị sie ike na-egosi na ihe gụrụ mmadụ agụụ.” Ọ bụghị naanị na Jehova na-echeta ndị na-efe ya ofufe kama ọ na-agụsikwa ya agụụ ike ịkpọlite ha n’ọnwụ.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 191
Ntụ
A na-ejikwa ntụ akọwa ihe na-enweghị otú ọ hà ma ọ bụ ihe na-abachaghị uru. Dị ka ihe atụ, Ebreham gwara Jehova, sị: “M bụ ájá na ntụ.” (Jen. 18:27; i nwere ike ịgụ Aịza. 44:20; Job 30:19.) Job jikwa ihe ndị sị na ha bịara ịkasi ya obi na-ekwu tụnyere ntụ. Ọ sịrị na ihe ha na-ekwu bụ “ilu ntụ” ma ọ bụ ihe na-enweghị isi na ọdụ—Job 13:12, na ihe e dere n’ala ala peeji ya.
NỌVEMBA 13-19
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 15-17
“Elifaz Gosiri Otú Anyị Na-ekwesịghị Isi Na-akasi Ndị Ọzọ Obi”
Guzogide Echiche Na-ezighị Ezi!
Ugboro atọ o kwuru okwu, Elifaz nyere echiche na Chineke na-achọ ihe karịrị akarị n’aka ndị ohu ya, nakwa na ọ dịghị ihe ha na-eme na-adị ya mma. Elifaz gwara Job, sị: “Lee ọbụna ndị ohu Ya ka ọ na-adịghị atụkwasị obi; ndị mmụọ ozi Ya ka Ọ na-ebo ebubo na ha bụ ndị mmehie.” (Job 4:18) Elifaz mechara kwuo banyere Chineke, sị: “Ọbụna ndị nsọ Ya ka Ọ na-adịghị atụkwasị obi; ọzọ, eluigwe adịghị ọcha n’anya Ya.” (Job 15:15) Ọ jụkwara, sị: “Ọ̀ na-atọ Onye pụrụ ime ihe nile ụtọ na ị bụ onye ezi omume?” (Job 25:5) Bildad kwenyeere echiche a, n’ihi na o kwuru, sị: “Ọbụna ọnwa adịghị eti, ọzọ, kpakpando adịghị ọcha n’anya [Chineke].—Job 25:5.
Anyị aghaghị ịnọ na nche ka echiche dị otú ahụ ghara imetụta anyị. Ọ pụrụ ime ka anyị chee na Chineke na-achọ ihe karịrị akarị n’aka anyị. Echiche a na-emegide nnọọ mmekọrịta anyị na Jehova. Ọzọkwa, ọ bụrụ na echiche dị otú a emetụta anyị, olee otú anyị ga-esi meghachi omume mgbe e nyere anyị ịdọ aka ná ntị dị anyị mkpa? Kama iji obi umeala nabata mgbazi ahụ, ‘obi anyị pụrụ ịdị ọkụ megide Jehova,’ anyị pụkwara ibuwere ya iwe n’obi. (Ilu 19:3) Lee ọdachi ime mmụọ nke ahụ ga-ewetara anyị!
Na-eṅomi Otú Jizọs Si Dị Umeala n’Obi na Otú O Si Nwee Ọmịiko
16 Okwu ọma anyị. Ọ bụrụ na anyị nweere ndị ọzọ ọmịiko, ọ ga-eme ka anyị na-akasi ndị ‘dara mbà’ obi. (1 Tesa. 5:14) Gịnị ka anyị ga-ekwu iji gbaa ụdị ndị ahụ ume? Otú anyị nwere ike isi mee ka obi dị ha mma bụ igosi ha na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi. Anyị nwere ike iji obi anyị niile jaa ha mma ka ha mata na ha nwere àgwà ọma nakwa na e nwere ihe ndị ha na-emeta. Anyị nwere ike ichetara ha na ọ bụ Jehova mere ka ha bịakwute Ọkpara ya. N’ihi ya, o ji ha kpọrọ ihe. (Jọn 6:44) Anyị nwere ike ịgwa ha na Jehova anaghị echefu ndị ohu ya, bụ́ “ndị obi ha tiwara etiwa” ma ọ bụ “ndị e gburu mmụọ ha.” (Ọma 34:18) Okwu ọma anyị ga-akasi ndị dara mbà obi—Ilu 16:24.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Job
7:9, 10; 10:21; 16:22—Okwu ndị a hà na-egosi na Job ekweghị ná mbilite n’ọnwụ? Okwu ndị a bụ maka ọdịnihu dị nso nke Job. Gịnịzi ka ọ na-ekwu? Otu ihe ọ pụrụ ịpụta bụ na ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ dịghịzikwa ndị ha na ya dịkọrọ ndụ ga-ahụ ya ọzọ. N’anya ha, ọ gaghị alaghachi ọzọ n’ụlọ ya ma ọ bụkwanụ a mata ya ọzọ ruo oge Chineke kara aka. Ọ pụkwara ịbụ na ihe Job bu n’uche bụ na ọ dịghị onye pụrụ isi na Shiol laghachi n’onwe ya. Ihe gosiri na Job kwenyere ná mbilite n’ọnwụ ga-adị n’ọdịnihu bụ ihe e dere na Job 14:13-15.
NỌVEMBA 20-26
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 18-19
“Agbahapụkwala Ụmụnna Gị”
Ihe Anyị Nwere Ike Ịmụta n’Anya Mmiri Gbara Jizọs
9 I nwere ike inyere ndị na-eru uju aka. Ọ bụghị naanị na Jizọs so Meri na Mata bee ákwá, o gere ha ntị, kasiekwa ha obi. Anyị nwekwara ike inyere ndị na-eru uju aka. Otu okenye bi n’Ọstrelia aha ya bụ Dan sịrị: “Mgbe nwunye m nwụrụ, m chọrọ ka e nyere m aka. Ọtụtụ ndị di na nwunye wepụtara oge gee m ntị. Ha hapụrụ m ka m bee ákwá ma ruo uju. Ha nyekwaara m aka mee ihe ụfọdụ, dị ka ịsara m ụgbọala, ịzụtara m ihe, na isiri m nri mgbe m na-enweghị ike ime ha n’onwe m. Ha kpekwaara m ekpere ọtụtụ ugboro, gosikwa m na ha bụ ezigbo ndị enyi na ‘nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.’ —Ilu 17:17.
Mgbe Onye Anyị Hụrụ n’Anya Hapụrụ Jehova
16 Nọgide na-enyere ezinụlọ onye a chụrụ n’ọgbakọ aka. Ha chọrọ ka ị hụ ha n’anya ma na-agba ha ume ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. (Hib. 10:24, 25) Mgbe ụfọdụ, ndị ezinụlọ onye a chụrụ n’ọgbakọ na-eche na a kpapụla ha n’ọgbakọ. Ekwela ka ọ dị ha otú ahụ. Ndị na-eto eto a chụrụ nne ha ma ọ bụ nna ha n’ọgbakọ bụ ndị ọ kacha mkpa ka a na-agba ume ma na-aja mma. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Maria, onye a chụrụ di ya n’ọgbakọ, ya agbahapụkwa ezinụlọ ya sịrị: “Ụfọdụ ndị enyi m bịara n’ụlọ anyị nye aka siere anyị nri ma nọnyere anyị n’ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị. Ha meteere m ebere, sorokwa m bee ákwá. Ha gbachiteere m mgbe ụfọdụ ndị na-akatọ m. Ihe ndị ha mere gbara m ume n’eziokwu.—Rom 12:13, 15.
Ị̀ Na-eme Mgbalị Iji Ruo Eru?
20 Òtù ndị okenye kwesịrị ịghọta na iwepụ mmadụ pụrụ ịkpatara onye bụbu onye nlekọta ma ọ bụ ohu na-eje ozi nchekasị, ọbụna ma a sị na o ji aka ya hapụ ihe ùgwù ahụ. Ọ bụrụ na a chụghị ya achụ n’ọgbakọ, ma ndị okenye ahụta na ọ dara mbà n’obi, ha kwesịrị iji ịhụnanya nyere ya aka n’ụzọ ime mmụọ. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Ha kwesịrị inyere ya aka ịghọta na ọ bụ onye dị mkpa n’ọgbakọ ahụ. Ọbụna ma a sị na ọ dịwo mkpa inye ya ndụmọdụ, ọ pụrụ ịbụ na ọ gaghị ewecha ogologo oge tupu nwoke nke nwere obi umeala nke nwekwara obi ekele enweta ihe ùgwù ije ozi ndị ọzọ n’ọgbakọ.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ike nke Okwu Obi Ọma
Otú ọ dị, mgbe Job n’onwe ya nwere mkpa agbamume, Elifaz na ndị enyi ya ekwughị okwu obi ọma. Ha tara Job ụta maka ihe isi ike ya, na-enye echiche bụ na ọ ghaghị inwe mmehie ụfọdụ zoro ezo. (Job 4:8) Nsụgharị The Interpreter’s Bible na-ekwu, sị: “Ihe dị Job mkpa bụ obi ebere nke obi mmadụ. Ihe o nwetara bụ usoro echiche ndị bụ nnọọ ‘eziokwu’ na ndị magburu onwe ha nke okpukpe na nke omume ndị ike ha gwụworo mmadụ.” Ịnụ okwu Elifaz na ndị enyi ya gbaghasịrị Job isi nke ukwuu nke na a manyere ya iti mkpu sị: “Ruo olè mgbe [ka] unu ga-eme ka mkpụrụ obi m ruo újú? Ruo olè mgbe [ka] unu ga-ewere okwu zọpịa m?—Job 19:2.
Anyị ekwesịghị mgbe ọ bụla ịkpatara onye so anyị na-ejere Chineke ozi iti mkpu n’ihe isi ike n’ihi okwu anyị ndị a na-echeghị eche, ndị na-abụghị nke obi ọma. (Tụlee Deuterọnọmi 25:15.) Otu ilu Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Ihe i kwuru pụrụ ichebe ndụ ma ọ bụ bibie ya; ya mere ị ghaghị ịnakwere ihe ndị sitere n’okwu gị nile.—Ilu 18:21, Today’s English Version.
NỌVEMBA 27–DISEMBA 3
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 20-21
“Ọ Bụghị Inwe Akụnụba Na-egosi na Mmadụ Bụ Onye Ezi Omume”
Ị̀ Bụ “Ọgaranya n’Ebe Chineke Nọ”?
12 N’okwu Jizọs, e gosiri na ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ dị iche ná mmadụ ịkpakọbara onwe ya akụ̀. Ya mere, ihe Jizọs nọ na-ekwu bụ na ihe bụ́ isi kwesịrị ịdị na-echegbu anyị abụghị otú anyị ga-esi kpakọba akụ̀ na ụba ma ọ bụ otú anyị ga-esi na-ekpori ndụ. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị iji ihe ọ bụla anyị nwere mee ka mmekọrịta anyị na Jehova sikwuo ike. N’ezie, ime otú ahụ ga-eme ka anyị bụrụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ na-eme ka anyị nweta ọtụtụ ngọzi n’aka ya. Bible na-agwa anyị, sị: “Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.—Ilu 10:22.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Imeri Setan na Ọrụ Ya Nile
19 Ọ bụ ihe na-adọrọ mmasị na ohu Chineke bụ́ Job gbara mgba megide “echiche mgbakasị ahụ” ( NW ) nke Setan nyere site n’ọnụ Elifaz na Zofa. (Job 4:13-18; 20:2, 3) Job si otú a nweta “mkpasu iwe,” nke kpataara ya ikere òkè ‘n’okwu sihiere ụzọ’ banyere “ihe egwu” ndị na-akpagbu uche ya. (Job 6:2-4; 30:15, 16) Elaịhu gere Job ntị n’ekwughị okwu ma jiri ezi obi nyere ya aka ịhụ echiche Jehova nke jupụtara n’amamihe n’okwu ahụ. N’otu aka ahụ taa, ndị okenye nwere nghọta na-egosi na ha na-elekọta ndị nọ ná mkpagbu site n’ịghara ịtụkwasịkwuru ndị dị otú ahụ “mbigide aka.” Kama nke ahụ, dị ka Elaịhu, ha na-eji ndidi gee ha ntị n’olu ma mgbe ahụ jiri mmanụ na-adajụ ahụ nke Okwu Chineke mee ihe. (Job 33:1-3, 7; Jemes 5:13-15) Ya mere onye ọ bụla ajọ ọnọdụ uche nyere mmetụta uche ya nsogbu, ma ò mere eme ma ọ bụ na o meghị, ma ọ bụ onye ‘e menyere ụjọ site ná nrọ na site n’ọhụụ’ dị ka e mere Job, pụrụ ịchọta nkasi obi Akwụkwọ Nsọ naadajụ ahụ n’ime ọgbakọ—Job 7:14; Jemes 4:7.
DISEMBA 4-10
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 22-24
“È Nwere Uru Mmadụ Ga-abara Chineke?”
Guzogide Echiche Na-ezighị Ezi!
Echiche bụ́ na Chineke na-achọ ihe karịrị akarị n’aka mmadụ na echiche bụ́ na ọ na-ele ụmụ mmadụ anya dị ka ndị na-abaghị n’ihe nwere njikọ chiri anya. N’okwu nke atọ Elifaz kwuru, ọ jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ Chineke ka mmadụ na-abara n’ihe? Ee e, kama onye nwere uche na-abara onwe ya n’ihe.” (Job 22:2) Elifaz nọ na-enye echiche na mmadụ abaghị n’ihe n’anya Chineke. N’ụzọ yiri nke ahụ, Bildad rụrụ ụka, sị: “Mmadụ ga-esikwa aṅaa bụrụ onye ezi omume n’ihu Chineke? ma ọ bụ, ọ̀ ga-esi aṅaa dị ọcha n’obi, bụ́ onye nwanyị mụrụ?” (Job 25:4) Ọ bụrụ na e jiri echiche a lee ya anya, olee otú Job, bụ́ mmadụ nkịtị, pụrụ isi chee na ọ ga-abụ onye ezi omume n’anya Chineke?
Ụfọdụ mmadụ taa nwere echiche na-ezighị ezi banyere onwe ha. Ihe ndị dị ka ezinụlọ a zụlitere mmadụ, nrụgide nke ndụ, ma ọ bụ isi n’agbụrụ ma ọ bụ ebo a kpọrọ asị pụrụ iso n’ihe ndị kpatara nke a. Ma Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-enwekwa obi ụtọ ịkụda ndị mmadụ mmụọ. Ọ bụrụ na ha enwee ike ime ka mmadụ chee na ọ dịghị ihe ọ ga-eme ga-adị Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile mma, ọ ga-adị mfe karị onye ahụ inwe nkụda mmụọ. Ka oge na-aga, onye dị otú ahụ pụrụ ịkpafu, ọbụna si n’ebe Chineke dị ndụ nọ wezụga onwe ya—Ndị Hibru 2:1; 3:12.
Ime agadi na nsogbu ahụ́ ike pụrụ ịkpara ihe ndị anyị na-eme ókè. Ihe anyị na-eme n’ozi Alaeze ahụ pụrụ iyi nnọọ ihe dị nta ma e jiri ya tụnyere ihe ndị anyị mere mgbe anyị na-akatachabeghị ahụ́, mgbe anyị nwere ahụ́ ike karị na mgbe anyị gbasiri ike karị. Lee ka o si dị mkpa anyị ịghọta na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-achọ ka anyị chee na ihe anyị na-eme adịghị adị Chineke mma! Anyị aghaghị iguzogide echiche dị otú ahụ.
Ihe Mmụta n’Ụzọ E Si Edozi Nsogbu
Ndị enyi atọ ya gara n’ihu ịkụda Job obi site n’ikwupụta echiche onwe onye dị iche iche kama ikwupụta amamihe Chineke. Elifaz ruru n’ókè nke ịsị na ‘Chineke adịghị atụkwasị ndị ohu ya obi,’ na ọ baghịkwara Jehova uru ma Job ọ̀ bụ onye ezi omume ma ọ bụ na ọ bụghị. (Job 4:18; 22:2, 3) O siri ike iche n’echiche okwu na-akụda obi—ma ọ bụ nke ka bụrụ ụgha—karịa nke ahụ! Ọ bụghị ihe ijuanya na Jehova mesịrị baara Elifaz na ndị enyi ya mba maka nkwulu a. “Unu ekwughị ihe ziri ezi banyere m,” ka o kwuru. (Job 42:7) Ma okwu nke kasị na-emerụ ahụ ka ga-abịa.
Ndị Ntorobịa Bụ́ Ndị Na-eme Ka Obi Jehova Ṅụrịa
10 Dị ka e gosiri n’ihe ndekọ Bible, ọ bụghị nanị iguzosi ike n’ihe Job ka Setan nyoro enyo kamakwa, ọ na-enyo nke ndị ọzọ nile na-ejere Chineke ozi enyo—gụnyere nke gị. N’ezie, n’ikwu banyere ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha, Setan gwara Jehova, sị: “Ihe nile nke mmadụ [ọ bụghị nanị Job kama mmadụ ọ bụla] nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ ndụ ya.” (Job 2:4) Ị̀ hụrụ ebe ihe iseokwu a dị oké mkpa si gbasa gị? Dị ka e gosiri n’Ilu 27:11, Jehova na-ekwu na e nwere ihe ị pụrụ inye ya—ihe ọ ga-eji zaghachi onye na-ata ya ụta, bụ́ Setan, okwu. Cheedị banyere ya—Eze Eluigwe na Ala na-akpọ gị ka i soro n’idozi ihe iseokwu kasịnụ e nwetụrụla. Lee ibu ọrụ na ihe ùgwù dị ebube i nwere! Ị̀ pụrụ imezu ihe Jehova na-achọ n’aka gị? Job mere otú ahụ. (Job 2:9, 10) Otú ahụkwa ka Jizọs na ndị ọzọ a na-apụghị ịgụta ọnụ mere n’akụkọ ihe mere eme nile, gụnyere ọtụtụ ndị ntorobịa. (Ndị Filipaị 2:8; Mkpughe 6:9) Ị pụrụ ime otu ihe ahụ. Otú ọ dị, buru n’obi na mmadụ apụghị ịsị na ọ dịghị ebe ya kwụ n’okwu a. Site n’omume gị, ị ga-egosi na ị na-akwado ma ọ́ bụghị ụta Setan na-ata Jehova ọ bụrụ ihe Jehova na-azaghachi ya. Olee nke ị ga-ahọrọ ịkwado?
Jehova Na-eche Banyere Gị!
11 Nhọrọ ị na-eme ọ̀ dị Jehova mkpa n’ezie? Ọ̀ bụ na ọtụtụ mmadụ ekwesịbeghị ntụkwasị obi iji nye ya ihe zuru ezu ọ ga-eji zaghachi Setan okwu? N’ezie, Ekwensu kwuru na ọ dịghị onye ji ịhụnanya ejere Jehova ozi, bụ́ ebubo nke e gosipụtawororị na ọ bụ ụgha. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova na-achọ ka ị kwụnyere ya n’ihe iseokwu metụtara ọbụbụeze n’ihi na ọ na-eche banyere gị onwe gị. Jizọs sịrị: “Ọ naghị adị Nna m nọ n’eluigwe mma ka otu n’ime ndị a dị nta laa n’iyi.—Matiu 18:14.
12 N’ụzọ doro anya, ụzọ ndụ ị na-ahọrọ gbasara Jehova. Nke ka mkpa, ọ na-emetụta ya. Bible na-eme ka o doo anya na Jehova nwere mmetụta miri emi bụ́ nke omume ọma ma ọ bụ nke omume ọjọọ nke ụmụ mmadụ na-akpali. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị Izrel nupụrụ isi ugboro ugboro, Jehova ‘were iwe.’ (Abụ Ọma 78:40, 41) Tupu Iju Mmiri nke ụbọchị Noa, mgbe “ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne,” Jehova ‘nwere mwute n’obi ya.’ (Jenesis 6:5, 6) Chee banyere ihe nke a pụtara. Ọ bụrụ na ị họrọ ụzọ ndụ ọjọọ, ị pụrụ ime ka Onye Okike gị nwee mwute. Nke a apụtaghị na Chineke adịghị ike ma ọ bụ na ọ bụ onye mmetụta na-achịkwa. Kama nke ahụ, ọ hụrụ gị n’anya ma na-eche banyere ọdịmma gị. N’aka nke ọzọ, mgbe i mere ihe ziri ezi, obi Jehova na-aṅụrị. Obi na-adị ya ụtọ, ọ bụghị nanị n’ihi na o nwekwuola ihe ọ ga-eji zaghachi Setan okwu, kamakwa n’ihi na ọ pụziri ịghọ Onye ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ. Nke ahụ bụkwa ihe ọ chọrọ ịghọ. (Ndị Hibru 11:6) Lee Nna na-ahụ n’anya nke Jehova Chineke bụụrụ gị!
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Jiri Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Wetara Onye Okike Gị Otuto
Tụlee otú Jehova si rụzuo ọrụ nke ike eluigwe na ala. Jehova ji okwu bụ́ “anyasị wee dị, ụtụtụ wee dị,” kewaa oge okike ndị sochiri onwe ha. (Jenesis 1:5, 8, 13, 19, 23, 31) Ná mmalite nke oge okike ọ bụla, ọ maara ihe mgbaru ọsọ, ma ọ bụ ebumnobi ya, maka ụbọchị ahụ. Chineke mezukwara nzube ya nke ike ihe. (Mkpughe 4:11) “Mkpụrụ obi [Jehova] achọsiwokwa ike, O wee mee ya,” ka nna ochie bụ́ Job kwuru. (Job 23:13) Lee ka ọ na-aghaghị isiwo bụrụ ihe afọ ojuju nye Jehova ịhụ “ihe nile ọ bụla O mere” ma kwuo na ha “dị mma nke ukwuu”!—Jenesis 1:31.
Ka anyị wee ruo ihe mgbaru ọsọ anyị, anyị onwe anyị kwa aghaghị inwe ọchịchọ siri ike iru ha. Gịnị ga-enyere anyị aka inwe ọchịchọ siri ike dị otú ahụ? Ọbụna mgbe ụwa ka bụ ihe tọgbọrọ n’efu na ihe tọgbọrọ nkịtị, Jehova pụrụ ịhụ otú ọ ga-emesị dị—ọmarịcha ọla dị ná mbara igwe, nke na-ewetara ya otuto na nsọpụrụ. N’ụzọ yiri nke ahụ, anyị pụrụ ịzụlite ọchịchọ anyị imezu ihe anyị kpebiri ime site n’ịtụgharị uche n’ihe ndị ga-esi n’iru ihe mgbaru ọsọ anyị pụta na abamuru ya. Nke ahụ bụ ahụmahụ Tony bụ́ onye dị afọ 19. O chefutụghị mmasị mbụ o nwere mgbe o letara otu alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe. Site mgbe ahụ gaa n’ihu, ajụjụ dị n’uche Tony bụ, ‘Gịnị ka ọ ga-adị ka ya ibi na ije ozi n’ebe dị otú a?’ Tony akwụsịtụghị iche otú nke ahụ ga-esi kwe omume, ọ nọgidekwara na-eme mgbalị iji ruo ya. Lee ka o si nwee obi ụtọ afọ ole na ole ka e mesịrị mgbe a nabatara akwụkwọ o dejupụtara ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ ahụ!
DISEMBA 11-17
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 25-27
“Ọ Bụghị Iwu na Anyị Ga-ezu Okè Tupu Anyị Ejisie Chineke Aka Ike”
it-1 1210 ¶4
Ijisi Chineke Aka Ike
Job. Ọ ga-abụ na Job dịrị ndụ n’agbata oge Josef nwụrụ na oge Mosis nọ ndụ. Na Baịbụl, e kwuru na Job bụ “onye ezi omume nke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta [Hib., tam]. Ọ na-atụ egwu Chineke, ọ naghịkwa etinye aka n’ihe ọjọọ.” (Job 1:1) Mmadụ ijisi Chineke aka ike ma mgbe ihe siri ike so n’okwu ahụ Setan welitere n’Ogige Iden. Ajụjụ Chineke jụrụ Onye iro ya bụ́ Setan banyere Job mgbe Setan so ndị mmụọ ozi ndị ọzọ zukọọ n’ihu Chineke n’eluigwe gosiri na ihe a bụ eziokwu. Setan kwuru na Job bu ihe ọjọọ n’obi na-efe Chineke, na ọ na-efe ya naanị maka ihe ndị ọ na-enweta n’aka ya. O si otú a na-ekwu na Job ejisighị Chineke aka ike. N’agbanyeghị na e nyere Setan ohere ka ọ napụ Job akụnụba ya na ụmụ ya, Setan emelighị ka Job kwụsị ife Chineke. (Job 1:6–2:3) O kwuziri na ihe mere Job ji die akụnụba ya furunụ na ọnwụ ụmụ ya bụ maka na ahụ́ ka siri yanwa ike. (Job 2:4, 5) Mgbe e mechara, Setan mere ka Job rịawa ọrịa ọjọọ na-afụ ya ezigbo ụfụ. Nwunye ya katọrọ ya, ndị enyi ya kparịkwara ya ma kwuo ihe ndị na-abụghị eziokwu gbasara iwu Chineke na nzube ya. (Job 2:6-13; 22:1, 5-11) Ma n’agbanyeghị ọnwụnwa a niile, Job gosiri na ọ kwụsiri ike n’ebe Chineke nọ. Ọ sịrị: “Ruo mgbe m nwụrụ, m ga-ejisi Chineke aka ike. M ka ga na-eme ezi omume, agaghịkwa m akwụsị. Obi m agaghị ama m ikpe ná ndụ m niile.” (Job 27:5, 6) Otú a Job si jidesie Chineke aka ike gosiri na Onye iro Chineke bụ onye ụgha.
Nọgide Na-ekwesị Ntụkwasị Obi
3 Olee otú ndị na-efe Chineke si egosi na ha na-ekwesị ntụkwasị obi? Ọ bụ iji obi ha niile hụ Jehova n’anya. Nke a mere ka ha na-eme ihe na-adị ya mma mgbe niile. Tụlee ihe ụfọdụ e kwuru na Baịbụl banyere ikwesị ntụkwasị obi. Na Baịbụl, okwu Hibru a sụgharịrị “iguzosi ike n’ezi ihe” ma ọ bụ ikwesị ntụkwasị obi pụtara ihe zuru ezu ma ọ bụ ihe na-enweghị nkwarụ. Dị ka ihe atụ, ndị Izrel ji anụmanụ chụọrọ Jehova àjà. Iwu Mozis kwuru na anụmanụ ndị ahụ agaghị enwe nkwarụ. (Lev. 22:21, 22) Chineke achọghị ka ndị ya jiri anụmanụ dara ngwọrọ, nke ntị chiri, ma ọ bụ nke kpuru ìsì chụọrọ ya àjà. Ọ chọghịkwa ka ha jiri nke na-arịa ọrịa chụọrọ ya àjà. Jehova chọrọ ka e jiri anụmanụ na-enweghị nkwarụ na-achụrụ ya àjà. (Mal. 1:6-9) Ihe ndị a emeela ka anyị ghọta na Jehova ji ihe zuru ezu ma ọ bụ ihe na-enweghị nkwarụ kpọrọ ihe. Anyị chọọ ịzụ ihe, dị ka mkpụrụ osisi, akwụkwọ ma ọ bụ ngwá ọrụ, anyị anaghị achọ ịzụ mkpụrụ osisi na-adịghị mma, akwụkwọ peeji ya na-ezughị ezu ma ọ bụ ngwá ọrụ akụkụ ya ụfọdụ na-ezughị ezu. Anyị chọrọ ịzụ nke dị mma ma ọ bụ nke zuru ezu. Otú ahụ ka ọ dị Jehova ma a bịa n’ihe gbasara ịhụ ya n’anya na irubere ya isi. Ọ chọrọ ka anyị jiri obi anyị niile na-eme otú ahụ.
4 Ànyị kwesịrị ịna-eche na anyị ga-ezurịrị okè tupu anyị enwee ike ikwesị ntụkwasị obi? A sị ka e kwuwe, anyị nwere ike na-eche na anyị na-emejọ ọtụtụ ihe. Tụlee ihe abụọ mere na anyị ekwesịghị ịna-eche na anyị ga-ezurịrị okè tupu anyị enwee ike ikwesị ntụkwasị obi. Nke mbụ bụ na Jehova anaghị elekwasị anya n’ebe anyị na-emejọ ihe. Okwu ya gwara anyị, sị: “A sị na ọ bụ njehie ka ị na-ele, Jaa, Jehova, ònye pụrụ iguzo?” (Ọma 130:3) Ọ ma na anyị ezughị okè, ọ na-ejikwa obi ya niile na-agbaghara anyị. (Ọma 86:5) Nke abụọ bụ na Jehova ma ihe anyị na-agaghị emeli. Ọ naghịkwa atụ anya ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. (Gụọ Abụ Ọma 103:12-14.) Oleezi otú anyị ga-esi zuo okè n’anya ya?
5 Ịhụnanya bụ isi ihe na-eme ka ndị ohu Jehova na-erubere ya isi. Anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-ahụ Nna anyị nke eluigwe n’anya ma na-erubere ya isi. Ọ bụrụ na anyị ana-ahụ ya n’anya ma n’oge ọnwụnwa, anyị na-ekwesị ntụkwasị obi. (1 Ihe 28:9; Mat. 22:37) Ka anyị tụleekwa banyere Ndịàmà Jehova atọ ahụ anyị kwuru banyere ha ná mmalite isiokwu a. Gịnị mere ha ji mee ihe ahụ ha mere? Ọ̀ bụ na nwata nwaanyị ahụ achọghị ịtụrụ ndụ n’ụlọ akwụkwọ? Nwa okorobịa ahụ, ọ̀ chọrọ ka a kwaa ya emo n’ụlọ ahụ ọ chọrọ ịga zie ozi ọma? Ka nwoke ahụ na-arụ ọrụ iji gbooro ndị ezinụlọ ya mkpa ha, ọ̀ chọrọ ka a chụọ ya n’ọrụ? Mbanụ. Kama, ha ma na Jehova nwere ihe ọ chọrọ ha n’aka, ha chọkwara ime ihe dị Nna ha nke eluigwe mma. Ịhụnanya ha nwere n’ebe Jehova nọ na-eme ka ha na-eche banyere ya tupu ha ekpebie ihe ha ga-eme. Ha si otú ahụ gosi na ha na-erubere Chineke isi.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Chineke Haziri Ndị Ya Otú Akwụkwọ Nsọ Kwuru
3 Ihe ndị Chineke kere gosiri na otú o si ahazi ihe enweghị atụ. Baịbụl kwuru, sị: “Jehova ji amamihe tọọ ntọala ụwa. O jikwa nghọta mee ka eluigwe guzosie ike.” (Ilu 3:19) E nwere ọtụtụ ihe anyị na-amaghị banyere ihe ndị Jehova kere. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị ma naanị ‘ntakịrị ihe n’ọrụ ya niile.’ (Job 26:14) Ma obere nke anyị ma banyere eluigwe na ụwa mere ka o doo anyị anya na a haziri ha nke ọma. (Ọma 8:3, 4) E nwere ọtụtụ nde kpakpando n’ụyọkọ kpakpando ndị dị na mbara igwe. Ha niile na-aga n’usoro. Ụwa na ihe ndị ọzọ ndị Bekee na-akpọ planet na-agba anyanwụ gburugburu na mbara igwe n’usoro ka à ga-asị na ha na-erubere iwu okporo ụzọ isi. Ihe ndị a dị́ mgbagwoju anya n’eluigwe na n’ụwa na-enyere anyị aka ịmata n’eziokwu na Jehova “ji nghọta kee eluigwe” na ụwa nakwa na anyị kwesịrị ịna-eto ya, na-erubere ya isi ma na-efe ya—Ọma 136:1, 5-9.
DISEMBA 18-24
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 28-29
“Ì Nwere Aha Ọma Ka Job?”
Na-egosi Ndị Nọ ná Mkpa Obiọma Sitere n’Ịhụnanya
19 Ihe ndekọ Bible ndị ahụ anyị tụleworo na-emesikwa ike eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụ ndị nwere mkpa ha na-agaghị egboli n’onwe ha ka a na-egosi obiọma sitere n’ịhụnanya. Iji hụ na ámá ya echighị, nkwado Betuel dị Ebreham mkpa. Iji hụ na e bugara ozu ya Kenan, enyemaka Josef dị Jekọb mkpa. Ijikwa mụta onye ga-eketa ihe o nwere, enyemaka Rut dị Naomi mkpa. Ma Ebreham, Jekọb, ma Naomi adịghị onye nke pụrụ igbo mkpa ndị ahụ n’enwetaghị enyemaka. N’otu aka ahụ taa, ọ bụ ndị nọ ná mkpa ka e kwesịrị igosi obiọma sitere n’ịhụnanya karịsịa. (Ilu 19:17) Anyị kwesịrị iṅomi nna ochie ahụ bụ́ Job, bụ́ onye lebaara ‘onye e wedara n’ala nke na-etiku ya anya, ya na nwa mgbei, bụ́ onye na-enweghị onye na-enyere ya aka’ nakwa “onye na-ala n’iyi.” Job ‘mekwara obi nwanyị di ya nwụrụ ka o tie mkpu ọṅụ’ ma ghọọrọ ‘onye ìsì anya, ghọọkwara onye ngwụrọ ụkwụ.—Job 29:12-15.
it-1 655 ¶10
Uwe
E nwere ihe ndị ọzọ uwe nọchiri anya ha na Baịbụl. A na-eji ụdị uwe mmadụ yi ma ọ bụ ejiji onye ahụ amata òtù onye ahụ nọ na ya ma ọ bụ nke ọ na-akwado. Otú ahụ ka ọ dịkwa na Baịbụl. Ụdị uwe mmadụ yi na ihe onye ahụ yi uwe ahụ mee na-eme ka a mata onye ọ bụ. Ihe atụ Jizọs mere gbasara otu nwoke na-eyighị uwe agbamakwụkwọ gaa agbamakwụkwọ gosiri na nke a bụ eziokwu. (Mat. 22:11, 12) Ná Mkpughe 16:14, 15, Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị mụrụ anya ka a ghara ịnara anyị uwe anyị, ya bụ, ihe e ji mara ndị ji obi ha niile na-agbara ezi Chineke àmà. Onye kwere ka a nara ya uwe ya tupu “agha a ga-alụ n’oké ụbọchị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,” ga-abanye n’ezigbo nsogbu.
Ò Nwere Ihe Aha A Gụrụ Mmadụ Pụtara?
Ọ bụghị anyị họọrọ aha a gụrụ anyị mgbe a mụrụ anyị. Ma, ọ bụ naanị anyị ga-ekpebi ihe ndị mmadụ ga-eji amara anyị. (Ilu 20:11) Jụgodị onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ na Jizọs na ndịozi ya nọ ugbu a, olee aha ha ga-agụ m? Olee aha dabara adaba nke ga-egosi ụdị àgwà m nwere ma ọ bụ ụdị onye m bụ?’
Anyị kwesịrị ichebara ajụjụ a echiche nke ọma. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na Eze Sọlọmọn, bụ́ onye maara ihe, dere, sị: “Ọ dị mma ịhọrọ ezi aha karịa ịhọrọ akụ̀ dị ukwuu.” (Ilu 22:1) N’eziokwu, anyị nwere ezigbo ihe ma ọ bụrụ na anyị nwere ezi aha n’ebe anyị bi ma ọ bụ ma e jiri aha ọma mara anyị. Ma nke ka mkpa bụ na anyị ga-enweta akụ̀ ga-adịru ebighị ebi ma ọ bụrụ na anyị emeere onwe anyị ezi aha n’ebe Chineke nọ. Olee otú anyị ga-esi enweta ya? Chineke kwere nkwa na ya ga-edeba aha ndị na-atụ egwu ya ‘n’akwụkwọ ncheta,’ ọ ga-enyekwa ha ndụ ebighị ebi—Malakaị 3:16; Mkpughe 3:5; 20:12-15.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Mụmụọ Ọnụ Ọchị—Ọ Baara Gị Uru!
Ịmụmụ ọnụ ọchị ọ̀ na-agbanwe ihe? Ì chetara mgbe ọnụ ọchị mmadụ mụmụrụ mere ka i nwee ahụ efe ma ọ bụ ahụ iru ala? Ma ọ bụ mgbe amụmụghị ọnụ ọchị mere ka ahụ ghara iru gị ala ma ọ bụ ọbụna mee ka i yie onye a jụrụ ajụ? Ee, ịmụmụ ọnụ ọchị na-agbanwe ihe. Ọ na-emetụta ma onye na-amụmụ ọnụ ọchị ma onye a mụmụụrụ ya. Otu onye a kpọtụrụ aha na Bible bụ́ Job kwuru banyere ndị iro ya, sị: “M mụmụọrọ ha ọnụ ọchị—ha adịghị ekwere—ha adịghị emekwa ka ìhè ihu m daa.” (Job 29:24, NW ) “Ìhè” nke ihu Job pụworo igosi na o nwere obi ụtọ ma ọ bụ ihu ọchị.
DISEMBA 25-31
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 30-31
“Otú Job Si Zere Omume Rụrụ Arụ”
Wepụ Anya Gị n’Ihe Na-abaghị Uru!
8 Ndị Kraịst nwekwara ike inwe ọchịchọ nke anya na nke anụ ahụ́. Ya mere, Baịbụl na-agba anyị ume ka anyị nwee njide onwe onye wee kpachara anya n’ihe anyị na-ahụ na ihe anyị na-enwe ọchịchọ inweta. (1 Kọr. 9:25, 27; gụọ 1 Jọn 2:15-17.) Job, bụ́ nwoke ezi omume, ma na mmadụ na-enwekarị ọchịchị inweta ihe ọ na-ahụ anya. Ọ sịrị: “Mụ na anya m agbawo ndụ. Oleezi otú m ga-esi nwee mmasị n’ebe nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nọ?” (Job 31:1) Job anaghị emetụ nwaanyị aka n’ahụ́ otú ga-eme ka o nwee agụụ mmekọahụ, ọ naghịkwa ekwe ka ụdị ihe ahụ bata ya n’echiche. Jizọs kwusiri okwu ike ka anyị ghara ịna-eche ihe rụrụ arụ n’obi mgbe ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.—Mat. 5:28.
Chee Echiche Banyere Ihe ‘Ga-emesị Bụrụ Ọgwụgwụ Ya’
Tupu gị etinye aka n’ihe ọ bụla ị na-achọ ime, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ebe ihe a ga-eduga m?’ Naanị ịkwụsịtụ chee echiche ihe “ga-emesị bụrụ ọgwụgwụ” ihe ị na-achọ ime ezuola ime ka ị ghara itinye aka n’ihe ga-ebutere gị ọdachi. Ọrịa o biri n’ájá ọcha na ọrịa ndị ọzọ a na-ebute ná mmekọahụ, ite ime, ntisasị alụmdi na nwunye na obi amamikpe bụ mkpụrụ ndị leghaara ịdọ aka ná ntị Chineke anya na-aghọrọ. Pọl onyeozi kwuru nke ọma ebe ụzọ ọjọọ nke ndị na-eme omume rụrụ arụ ga-eduga ha. Ọ sịrị na ha “agaghị eketa alaeze Chineke.—1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.
Ndị Na-eto Eto—Ka Okwu Chineke Na-edu Unu
15 Olee mgbe i chere a ga-akacha ele okwukwe gị ule? Ọ̀ bụ mgbe gị na ndị ọzọ nọ ka ọ̀ bụ mgbe naanị gị nọ? Mgbe ị nọ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ị na-arụ ọrụ, ị na-akpachara anya ka ị ghara ime ihe ga-emebi adịm ná mma gị na Chineke. Ọ bụ mgbe ị nọ naanị gị ma ọ bụ mgbe ị na-atụrụ ndụ ka ọnwụnwa na-abịakarị.
16 Gịnị mere i ji kwesị ịgbalị rubere Jehova isi mgbe naanị gị nọ? Cheta na i nwere ike ime ihe ga-ewute Jehova ma ọ bụ mee ihe ga-eme ka obi ya ṅụrịa. (Jen. 6:5, 6; Ilu 27:11) Ihe ọ bụla i mere gbasara Jehova n’ihi na “ihe banyere [gị] na-emetụ ya n’obi.” (1 Pita 5:7) Ọ chọrọ ka i gee ya ntị ka i wee baara onwe gị uru. (Aịza. 48:17, 18) O wutere Jehova mgbe ụfọdụ ndị ohu ya n’Izrel oge ochie nupụụrụ ya isi. (Ọma 78:40, 41) Ma, Jehova hụrụ Daniel onye amụma n’anya nke ukwuu, nke mere ka otu mmụọ ozi kpọọ ya “nwoke a hụrụ n’anya nke ukwuu.” (Dan. 10:11) Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Daniel rubeere Chineke isi ma n’ihu ọha ma mgbe ọ nọ naanị ya—Gụọ Daniel 6:10.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Nkà nke Iji Ịhụnanya Ege Ntị
Ndị enyi Job nụrụ ma ọ dịkarịa ala okwu iri o kwuru. N’agbanyeghị nke ahụ, Job tipụrụ, sị: “Ọ ga adị m nnọọ mma ma a sị na enwere m onye ga-ege m ntị!” (Job 31:35) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ntị ha gere ya akasighị ya obi. Ha echeghị banyere Job ka ọ fọdụ ịchọ ịghọta otú obi dị ya. N’ezie, ha egosighị mmasị n’ebe ọ nọ dị ka ndị ji ọmịiko ege mmadụ ntị. Ma Pita onyeozi na-adụ ọdụ, sị: “Unu nile nwee otu obi, na-egosi mmetụta maka onye ọzọ, na-enwe mmetụta ụmụnna, na-enwe obi ọmịiko, na-adị umeala n’obi.” (1 Pita 3:8) Olee otú anyị pụrụ isi gosi mmasị n’ebe onye ọzọ nọ? Otu ụzọ anyị pụrụ isi mee nke ahụ bụ ichebara mmetụta onye nke ọzọ echiche na ịgbalị ịghọta ya. Ikwu okwu ọmịiko ndị dị ka “ụdị ihe ahụ na-ewe iwe” ma ọ bụ “ọ ga-adị gị nnọọ ka à ghọtahiere gị” bụ otu ụzọ isi gosipụta na anyị na-eche banyere ọnọdụ onye ahụ. Ihe ọzọ anyị pụrụ ime bụ ikwughachi ihe onye ahụ kwuru n’okwu nke aka anyị, si otú ahụ gosi na anyị ghọtara ihe o kwuru. Iji ịhụnanya ege ntị pụtara ige ntị n’ihe onye ahụ na-ekwu nakwa n’ihe ndị na-apụtachaghị ìhè okwu ya na-egosi banyere ihe dị ya n’obi.