Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 10/15 p. 13-19
  • Jerusalem—Ọ̀ Dị ‘n’Elu Isi Ọṅụ Gị’?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jerusalem—Ọ̀ Dị ‘n’Elu Isi Ọṅụ Gị’?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ngọzi na Ibu Ọrụ
  • Mmegide Site n’Aka Ndị Agbata Obi Nwere Anya Ụfụ
  • Nsogbu Ndị Si n’Ime
  • E Wuchaa Mgbidi Jerusalem
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Nehemaịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • “Nọgide Jiri Ezi Ihe Na-emeri Ihe Ọjọọ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Jerusalem nke Kwekọrọ n’Aha Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Mgbidi Jeruselem
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 10/15 p. 13-19

Jerusalem—Ọ̀ Dị ‘n’Elu Isi Ọṅụ Gị’?

“Ka ire m rapara n’okpo ọnụ m, . . . ma ọ bụrụ na adịghị m eme ka Jerusalem dị elu n’elu isi ọṅụ m.”—ABỤ ỌMA 137:6.

1. Omume dị aṅaa ka ọtụtụ ndị Juu a chụpụrụ n’ala ha nwere n’ebe obodo Chineke họpụtara dị?

IHE fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ asaa agafewo kemgbe ndị Juu mbụ a chụpụrụ n’ala ha lọghachiri Jerusalem na 537 T.O.A. E wughachiwo ụlọ nsọ Chineke, ma obodo ahụ ka bụ mkpọmkpọ ebe. Ka ọ dị ugbu a, ọgbọ ọhụrụ etolitewo ná mba ọzọ. Obi abụọ adịghị ya na ọtụtụ n’ime ha nwere mmetụta yiri nke ọbụ abụ ahụ bụ́ onye bụrụ, sị: “Ọ bụrụ na echezọọ m gị, Jerusalem, ka aka nri m chezọọ nkà ya.” (Abụ Ọma 137:5) Ụfọdụ mere ihe karịrị nanị icheta Jerusalem; ha gosipụtara site n’omume ha na ọ dịwo elu “n’elu isi ọṅụ [ha].”—Abụ Ọma 137:6.

2. Ònye bụ Ezra, è sikwa aṅaa gọzie ya?

2 Dị ka ihe atụ, tụlee onye nchụàjà bụ́ Ezra. Ọbụna tupu ya alọta n’ala nna ya, o jiriwo ịnụ ọkụ n’obi rụọ ọrụ maka ọdịmma nke ofufe dị ọcha na Jerusalem. (Ezra 7:6, 10) A gọziri Ezra n’ụba maka nke ahụ. Jehova Chineke kpaliri obi nke eze Peasia inye Ezra ihe ùgwù nke iduru ìgwè nke abụọ nke ndị si n’ibi n’ala ọzọ na-alọghachi Jerusalem. Ọzọkwa, eze nyere ha ọlaedo na ọlaọcha hiri nne iji ‘mee ka ụlọ Jehova maa mma.’—Ezra 7:21-27.

3. Olee otú Nehemaịa si gosi na Jerusalem bụ ihe na-echegbu ya karịsịa?

3 Ihe dị ka afọ 12 mgbe nke a gasịrị, e nwere onye Juu ọzọ nke mere ihe chọrọ mkpebisi ike—Nehemaịa. O jere ozi n’obí eze Peasia nke dị na Shushan. O nwere ọkwá ùgwù dị na ya dị ka obu ihe ọṅụṅụ Eze Ataksakses, ma nke ahụ abụghị “isi ọṅụ” Nehemaịa. Kama nke ahụ, ọ chọsiri ike ịga wughachi Jerusalem. Nehemaịa kpere ekpere banyere nke a ruo ọtụtụ ọnwa, Jehova Chineke gọzikwara ya maka ime otú ahụ. Mgbe ọ matara nchegbu Nehemaịa, eze Peasia ahụ nyere ya usuu ndị agha, tinyekwara akwụkwọ ozi ndị na-enye ya ikike iwughachi Jerusalem.—Nehemaịa 1:1–2:9.

4. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na ofufe Jehova dị n’elu ihe ọ bụla ọzọ nke pụrụ ime ka anyị ṅụrịa ọṅụ?

4 N’enweghị obi abụọ, Ezra, Nehemaịa, na ọtụtụ ndị Juu bụ́ ndị so ha na-arụ ọrụ gosipụtara na ofufe Jehova, nke hiwere isi na Jerusalem, dị mkpa karịa ihe ọ bụla ọzọ—na ọ dị ‘n’elu isi ọṅụ ha,’ ya bụ, n’elu ihe ọ bụla ọzọ nke ha pụrụ ịṅụrị ọṅụ na ya. Lee ihe agbamume mmadụ ndị a bụ nye ndị nile taa bụ́ ndị na-ele Jehova, ofufe ya, na nzukọ ya e ji mmụọ nsọ na-eduzi anya n’otu ụzọ ahụ! Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu banyere gị? Ị̀ na-egosi site ná ntachi obi gị n’ọrụ nsọpụrụ Chineke na ihe kachasị enye gị ọṅụ bụ ihe ùgwù nke iso ndị Jehova raara onwe ha nye na-efe ya ofufe? (2 Pita 3:11) Dị ka ihe agbamume ọzọ iji mee nke ahụ, ka anyị tụlee ezi ihe ndị si na njem Ezra mere gaa Jerusalem pụta.

Ngọzi na Ibu Ọrụ

5. Olee ngọzi ndị bara ụba bịaara ndị bi na Juda n’ụbọchị Ezra?

5 Ìgwè nke ihe dị ka 6,000 bụ́ ndị bi n’ala ọzọ bụ́ ndị so Ezra na-alọta wetara onyinye ọlaedo na ọlaọcha maka ụlọ nsọ Jehova. Ndị a ruru ihe dị ka nde dollar 35 n’ọnụ ahịa ugbu a. Nke a ji ihe dị ka okpukpu asaa karịa ọlaedo na ọlaọcha nke ndị mbụ si ná nchụpụ n’ala ha jisiri ike weta. Lee aha ekele ndị bi na Jerusalem na Juda na-aghaghị inyeworị Jehova n’inweta nkwado mmadụ na ihe onwunwe a nile! Ma ngọzi bara ụba ndị si n’aka Chineke na-ewetakwa ibu ọrụ.—Luk 12:48.

6. Gịnị ka Ezra chọpụtara n’obodo ya, ò sikwa aṅaa meghachi omume?

6 N’oge na-adịghị anya, Ezra chọpụtara na ọtụtụ ndị Juu, gụnyere ụfọdụ ndị nchụàjà na ndị okenye, embiwo Iwu Chineke site n’ịlụ ndị inyom na-ekpere arụsị. (Deuterọnọmi 7:3, 4) N’ụzọ ziri ezi, mmebi a e mebiri Iwu ọgbụgba ndụ Chineke wutere ya nke ukwuu. “Mgbe m nụrụ okwu a, adọwara m uwe m na uwe mwụda m, . . . m wee nọdụ, ibobo wee nwụọ m n’ahụ.” (Ezra 9:3) Mgbe ahụ, n’ihu ndị Israel na-echegbu onwe ha, Ezra gwara Jehova ihe nile dị ya n’obi n’ekpere. Ka mmadụ nile nọ na-ege ntị, Ezra tụleghachiri nnupụisi gara aga nke Israel na ịdọ aka ná ntị Chineke banyere ihe ga-eme ma ha lụọ ndị na-ekpere arụsi bi n’ala ahụ. O kwubiri, sị: “Jehova, bụ́ Chineke Israel, onye ezi omume ka Ị bụ; n’ihi na anyị fọdụrụ ịbụ ndị mgbapụ, dị ka o si dị taa: lee, anyị nọ n’ihu Gị n’ikpe ọmụma anyị; n’ihi na ọ dịghị onye [pụrụ] iguzo n’ihu Gị n’ihi nke a.”—Ezra 9:14, 15.

7. (a) Ihe nlereanya ọma dị aṅaa ka Ezra setịpụrụ n’ime ihe banyere omume ọjọọ? (b) Olee otú ndị ikpe mara si meghachi omume n’ụbọchị Ezra?

7 Ezra ji okwu ahụ bụ́ “anyị” mee ihe. Ee, ọ gụnyere onwe ya, ọ bụ ezie na ikpe amaghị ya. Oké mwute nke Ezra na ekpere obi umeala ya metụrụ ndị ahụ n’obi ma kwalie ha ịrụ ọrụ ndị kwesịrị nchegharị. Ha wepụtara onwe ha ime otu ihe ngwọta na-egbu mgbu—ndị nile mebiworo Iwu Chineke ga-ezilaga ndị nwunye ala ọzọ ahụ obodo ha, tinyere ụmụ ndị ha mụụrụ ha. Ezra kwenyere n’atụmatụ a ma gbaa ndị ikpe mara ume ka ha mee ya. Site n’ikike eze Peasia ahụ nyere ya, Ezra nwere ikike igbuchapụ ndị nile dara iwu ma ọ bụ ịchụpụ ha site na Jerusalem na Juda. (Ezra 7:12, 26) Ma o yiri ka o meghị otú ahụ. “Mkpọkọta ahụ nile” sịrị: “O ziri ezi, dị ka okwu gị nile n’ebe anyị nọ si dị, anyị aghaghị ime otú a.” Ọzọkwa, ha kwupụtara, sị: “Anyị ejehiewo hie nne n’okwu a.” (Ezra 10:11-13) Ezra isi nke 10 depụtara aha ndị ikom 111 bụ́ ndị rubere isi ná mkpebi ahụ site n’izilaga ndị nwunye ala ọzọ ha na ụmụ ndị ha mụtaara ha.

8. Gịnị mere mkpebi ahụ siri ike nke izilaga ndị nwunye ala ọzọ ji bụrụ n’ihi ọdịmma nke ihe nile a kpọrọ mmadụ?

8 Ihe a ha mere abụghị nanị maka ọdịmma nke Israel kamakwa maka nke ihe nile a kpọrọ mmadụ. A sị na ọ dịghị ihe e meworo iji dozie ọnọdụ ahụ, ụmụ Israel na mba ndị gbara ha gburugburu pụrụ ịgwakọtaworị. A sị na o mere, a gaara emerụworị eriri usoro ọmụmụ nke na-eduga ná Mkpụrụ ahụ E Kwere ná Nkwa maka ịgọzi ihe nile a kpọrọ mmadụ. (Jenesis 3:15; 22:18) Ọ gaara esiworị ike ịkọwa Mkpụrụ ahụ E Kwere ná Nkwa dị ka nwa Eze Devid nke ebo Juda. Ihe dị ka afọ 12 mgbe e mesịrị, e lebaara okwu a dị mkpa anya ọzọ mgbe ‘mkpụrụ Israel kewapụtara onwe ha n’ahụ ndị ala ọzọ nile.’—Nehemaịa 9:1, 2; 10:29, 30.

9. Ndụmọdụ ọma dị aṅaa ka Bible na-enye ndị Kraịst nwere di ma ọ bụ nwunye ndị na-ekweghị ekwe?

9 Gịnị ka ndị ohu Jehova nke oge a pụrụ ịmụta site n’ihe ndekọ a? Ndị Kraịst anọghị n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. (2 Ndị Kọrint 3:14) Kama nke ahụ, ha na-erube isi ‘n’iwu Kraịst.’ (Ndị Galetia 6:2) N’ihi ya, onye Kraịst nwere di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe ga-eme ihe kwekọrọ na ndụmọdụ Pọl bụ́: “Ọ bụrụ na nwanna ọ bụla nwere nwunye na-ekweghị ekwe, ọ bụrụkwa na ọ dị nwanyị ahụ ezi mma ka ya na ya biri, ka di ya ghara ịhapụ ya.” (1 Ndị Kọrint 7:12) Ọzọkwa, ndị Kraịst nwere di ma ọ bụ nwunye ndị na-ekweghị ekwe nwere ibu ọrụ Akwụkwọ Nsọ kwadoro nke ịrụ ọrụ ime ka alụmdi na nwunye ha na-aga nke ọma. (1 Pita 3:1, 2) Irube isi na ndụmọdụ ọma a ọtụtụ mgbe arụpụtawo ngọzi nke na ndị òtù ọlụlụ nke na-ekweghị ekwe agbanwewo obi ha n’ebe ezi ofufe dị. Ọbụna ụfọdụ abụrụwo ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi e mere baptism.—1 Ndị Kọrint 7:16.

10. Gịnị ka ndị Kraịst pụrụ ịmụta site n’aka ndị ikom 111 nke Israel ahụ bụ́ ndị zilagara ndị nwunye ala ọzọ ha?

10 Ma, ihe banyere ndị Israel ahụ zilagara ndị nwunye ala ọzọ ha na-enye ihe mmụta magburu onwe ya maka ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye. Ndị a ekwesịghị ịmalite soro ndị na-ekweghị ekwe na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha na-eme mbedo. Izere mmekọrịta dị otú ahụ pụrụ isi ike, ọbụna na-egbu mgbu, ma ọ bụ ụzọ kasị mma ka mmadụ wee nọgide na-enweta ngọzi Chineke. E nyere ndị Kraịst iwu, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu.” (2 Ndị Kọrint 6:14) Onye Kraịst ọ bụla na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nke na-achọ ịbanye n’ọlụlụ kwesịrị ime atụmatụ ịlụ ezi onye kwere ekwe ibe ya.—1 Ndị Kọrint 7:39.

11. Dị ka ndị ikom Israel, olee otú a pụrụ isi lee anyị ule n’ihe banyere ihe anyị ji aṅụrị ọṅụ?

11 N’ọtụtụ ụzọ ndị ọzọkwa, ndị Kraịst emewo mgbanwe mgbe e mere ka ha mara na ha na-aga n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. (Ndị Galetia 6:1) Site n’oge ruo n’oge, magazin a emewo ka a mata àgwà Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị nke ga-eme ka mmadụ ghara iru eru ịnọgide na-abụ akụkụ nke nzukọ Chineke. Dị ka ihe atụ, na 1973, ndị Jehova bịara ghọta n’ụzọ zuru ezu na iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi nakwa iji ụtaba eme ihe bụ mmehie ndị dị oké njọ. Iji gbasoo ụzọ nke Chineke, anyị aghaghị ‘ịsachapụ n’onwe anyị mmerụ nile nke ahụ na nke mmụọ.’ (2 Ndị Kọrint 7:1) Ọnụ ọgụgụ buru nnọọ ibu ji ndụmọdụ Bible dị otú ahụ kpọrọ ihe; ha dị njikere ịta ahụhụ ihe mgbu ndị mbụ na-esite n’ịkwụsị ya ka ha wee nọgide bụrụ akụkụ nke ndị Chineke dị ọcha. E nyewokwa nduzi doro anya ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ banyere okwu ndị metụtara mmekọahụ, uwe, ejiji, na iji amamihe họrọ ọrụ, ntụrụndụ, na egwú. N’agbanyeghị ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị e mere ka anyị mara, ka anyị dị njikere ịbụ ndị ‘e mere ka ha zuo okè,’ dị ka ndị ikom 111 ahụ nke Israel. (2 Ndị Kọrint 13:11) Nke a ga-egosi na ihe ùgwù nke ife Jehova ofufe n’etiti ndị ya dị nsọ ‘dị elu n’elu isi ọṅụ anyị.’

12. Gịnị mere na 455 T.O.A.?

12 Mgbe ọ kọsịrị banyere ihe omume ahụ metụtara ndị nwunye ala ọzọ, Bible agwaghị anyị ihe mere na Jerusalem ruo afọ 12 ọzọ. Obi abụọ adịghị ya na ndị agbata obi Israel bukwuru iro megide ha n’ihi nkagbu a kagburu ọtụtụ nkekọ alụmdi na nwunye. Na 455 T.O.A., ndị agha duuru Nehemaịa bịarute Jerusalem. A họpụtawo ya ịbụ onye ọchịchị Juda, o wetawokwa akwụkwọ ozi ndị na-enye ya ikike iwughachi mgbidi ahụ site n’aka eze Peasia.—Nehemaịa 2:9, 10; 5:14.

Mmegide Site n’Aka Ndị Agbata Obi Nwere Anya Ụfụ

13. Omume dị aṅaa ka ndị agbata obi na-ekpe okpukpe ụgha nke ndị Juu gosipụtara, Nehemaịa sikwa aṅaa meghachi omume?

13 Ndị agbata obi bụ́ ndị na-ekpe okpukpe ụgha megidere nzube Nehemaịa ji bịa. Ndị ndú ha yiri ya egwu site n’ịjụ, sị: “Ọ̀ bụ eze ka unu na-enupụ isi imegide?” N’igosi okwukwe n’ebe Jehova nọ, Nehemaịa zaghachiri, sị: “Chineke nke eluigwe, Ya onwe ya ga-eme ka ihe gaara anyị nke ọma; anyị onwe anyị, bụ́ ndị ohu Ya, ga-ebilikwa rụọ mgbidi: ma unu enweghị òkè, ma ọ bụ ọnọdụ ziri ezi, ma ọ bụ ihe ncheta, n’ime Jerusalem.” (Nehemaịa 2:19, 20) Mgbe a malitere ịrụzi mgbidi ahụ, otu ndị iro ahụ mere akaje, sị: ‘Gịnị ka ndị Juu ndị a ndị na-ata ahụ na-eme? Hà ga-esi n’obo ájá mee ka nkume dị adị ọzọ? Ọ bụrụ na nkịta ọhịa arịgoo n’elu ya, ọ ga-etipukwa mgbidi nkume ha.’ Kama ịzaghachi okwu ndị a, Nehemaịa kpere ekpere, sị: “Nụrụ, Chineke anyị; n’ihi na anyị bụ ndị e ledaworo anya: Gị meekwa ka ịta ụta ha laghachi n’isi ha.” (Nehemaịa 4:2-4) Nehemaịa nọgidere na-esetịpụ ezi ihe nlereanya a nke ịdabere na Jehova!—Nehemaịa 6:14; 13:14.

14, 15. (a) Olee otú Nehemaịa si mee ihe banyere iyi egwu ime ihe ike ndị iro? (b) Olee otú Ndịàmà Jehova siworo nwee ike ịnọgide n’ọrụ ihe owuwu ime mmụọ ha n’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ?

14 Iji rụzuo ọrụ nkwusa ha dị mkpa, Ndịàmà Jehova taa na-adaberekwa n’ebe Chineke nọ. Ndị mmegide na-agbalị igbochi ọrụ a site n’ime akaje. Mgbe ụfọdụ, ndị nwere mmasị n’ozi Alaeze na-ada mbà n’ihi na ha apụghị ịtachi obi n’ịkwa emo. Ọ bụrụ na ịkwa emo adaa, ndị mmegide pụrụ iwe iwe ma malite iyi egwu imeso ha ihe ike. Nke a bụ ihe ndị wuru mgbidi Jerusalem hụrụ. Ma Nehemaịa ekweghị ka a majaa ya. Kama nke ahụ, o nyere ndị ahụ na-ewu ihe owuwu ngwá agha iji guzogide mwakpo ndị iro ma wusie okwukwe ha ike site n’ịsị: “Unu atụla egwu ha: chetanụ Onyenwe anyị, Nke dị ukwuu dịkwa egwu, bukwaaranụ ụmụnne unu, na ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom, na ndị inyom unu, na ụlọ unu, agha.”—Nehemaịa 4:13, 14.

15 Dị ka ọ dị n’ụbọchị Nehemaịa, a kwadebewo Ndịàmà Jehova nke ọma ịnọgide na-arụ ọrụ ihe owuwu ime mmụọ ha n’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ. “Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” enyewo nri ime mmụọ ndị na-ewusi okwukwe ike, bụ́ ndị na-eme ka ndị Chineke na-arụpụta ihe ọbụna n’ebe a machibidoro ọrụ ahụ iwu. (Matiu 24:45) N’ihi ya, Jehova anọgidewo jiri mmụba na-agọzi ndị ya n’ụwa nile.—Aịsaịa 60:22.

Nsogbu Ndị Si n’Ime

16. Nsogbu ndị dị aṅaa si n’ime yiri mmụọ nke ndị ahụ na-ewu mgbidi Jerusalem egwu?

16 Ka mwughachi nke mgbidi Jerusalem gara n’ihu, mgbidi ahụ adịkwuokwa elu, ọrụ ahụ sikwuru ike. Ọ bụ mgbe ahụ ka otu nsogbu pụtara ìhè bụ́ nke yiri mmụọ nke ndị ahụ ji ndọlị na-ewu ihe owuwu egwu. N’ihi ụkọ nri, ọ na-esiri ụfọdụ ndị Juu ike inye ezinụlọ ha ihe oriri na ịtụ ụtụ isi ha nye gọọmenti Peasia. Ndị Juu ka baa ọgaranya gbazinyere ha ihe oriri na ego. Otú ọ dị, n’ụzọ megidere Iwu Chineke, ndị Israel ka daa ogbenye jiri ala na ụmụ ha kwe nkwa dị ka ihe ibé ma ha akwụghachighị ego ahụ n’ọmụrụ nwa. (Ọpụpụ 22:25; Levitikọs 25:35-37; Nehemaịa 4:6, 10; 5:1-5) Ugbu a ndị ahụ e ji ụgwọ na-eyi egwu ịnara ha ala ha na ịmanye ha ire ụmụ ha dị ka ndị ohu. Nehemaịa were oké iwe n’ihi omume enweghị ịhụnanya a, nke ịhụ ihe onwunwe n’anya. O mere ihe ngwa ngwa iji hụ na ngọzi Jehova nọgidere n’ọrụ nke iwughachi mgbidi Jerusalem.

17. Gịnị ka Nehemaịa mere iji hụ na ngọzi Jehova dịgidere n’ọrụ ihe owuwu ahụ, gịnịkwa si na ya pụta?

17 E mere ndokwa maka “mkpọkọta ukwu,” Nehemaịa gosikwara ndị Israel ahụ ka baa ọgaranya n’ụzọ doro anya na ihe ha meworo adịghị Jehova ụtọ. Mgbe ahụ ọ rịọrọ ndị ahụ ikpe mara, gụnyere ụfọdụ ndị nchụàjà, ka ha weghachi ọmụrụ nwa nile ha narawooro, weghachikwa ala ndị ahụ ha werewooro n’ụzọ megidere iwu site n’aka ndị ahụ na-apụghị ịkwụ ọmụrụ nwa. Ọ bụ ihe kwesịrị ịja mma na ndị ahụ ikpe mara kwuru, sị: “Anyị ga-enyeghachi ha, anyị agaghị achọkwa ihe n’aka ha; otú a ka anyị ga-eme, dị ka gị onwe gị na-ekwu.” Ndị a abụghị okwu efu, n’ihi na Bible na-akọ na “ndị [ahụ mere] dị ka okwu [Nehemaịa] si dị.” Mkpọkọta ahụ nile tokwara Jehova.—Nehemaịa 5:7-13.

18. Omume dị aṅaa ka e jiworo mara Ndịàmà Jehova?

18 Gịnị banyere ụbọchị anyị? Kama inwe omume nrigbu, a maara Ndịàmà Jehova nke ọma maka omume mmesapụ aka ha n’ebe ndị kwere ekwe ibe ha na ndị ọzọ bụ́ ndị ahụhụ dakwasịrị nọ. Dị ka ọ dị n’ụbọchị Nehemaịa, nke a arụpụtawo ọtụtụ okwu ekele ndị e ji nye Jehova otuto. Otú ọ dị, n’otu oge ahụ, “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ahụwo na ọ dị mkpa inye ndụmọdụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ n’okwu azụmahịa nakwa ná mkpa ọ dị izere iji anyaukwu erigbu ndị ọzọ. Ná mba ụfọdụ, ọ bụ ihe a na-ahụkarị bụ́ ịsị ka a kwụọ ụgwọ isi nwanyị buru ibu, ma Bible na-adọ aka ná ntị n’ụzọ doro anya na ndị anyaukwu na ndị na-apụnara mmadụ ihe agaghị eketa Alaeze Chineke. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Mmeghachi omume dị mma nke ihe ka ọtụtụ n’ime ndị Kraịst n’ebe ndụmọdụ dị otú ahụ dị na-echetara anyị otú ndị Juu ahụ si hụ mmehie nke irigbu ụmụnna ha ndị ka daa ogbenye.

E Wuchaa Mgbidi Jerusalem

19, 20. (a) Mmetụta dị aṅaa ka mwucha nke mgbidi Jerusalem nwere n’ahụ ndị okpukpe na-emegide ya? (b) Mmeri dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova nwetaworo n’ọtụtụ ala?

19 N’agbanyeghị mmegide nile ahụ, e wuchara mgbidi Jerusalem n’ụbọchị 52. Mmetụta dị aṅaa ka nke a nwere n’ahụ ndị mmegide? Nehemaịa kwuru, sị: ‘Mgbe ndị iro anyị nile nụrụ ya, mba nile nke dị anyị gburugburu tụrụ egwu, wee daa adaa nke ukwuu n’anya nke aka ha: ha wee mara na e sitere n’aka Chineke anyị jee ozi a.’—Nehemaịa 6:16.

20 Taa, mmegide ndị iro n’ebe ọrụ Chineke dị na-anọgide n’ụzọ na n’ebe ndị dị iche iche. Otú ọ dị, ọtụtụ nde ndị mmadụ ahụwo abaghị uru nke imegide Ndịàmà Jehova. Dị ka ihe atụ, tụlee mgbalị ndị gara aga e mere iji kwụsị ọrụ nkwusa na Nazi Germany, Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, na n’ọtụtụ mba nke Africa. Mgbalị ndị ahụ nile adawo, ọtụtụ mmadụ na-aghọtakwa ugbu a na ‘anyị sitere n’aka Chineke na-eje ozi anyị.’ Lee ụgwọ ọrụ nke a bụwooro ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nọworo ogologo oge bụ́ ndị mere ka ofufe Jehova ‘dị elu n’elu isi ọṅụ ha’ n’ala ndị dị otú ahụ!

21. Olee ihe omume dị ịrịba ama a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

21 N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụleghachi ihe omume ndị dị mkpa bụ́ ndị dujere ná nraranye na-enye ọṅụ nke mgbidi Jerusalem e wughachiri ewughachi. Anyị ga-atụlekwa otú mwucha nke obodo ka nnọọ ebube maka abamuru nke ihe nile a kpọrọ mmadụ si na-abịaru nso.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Olee otú Ezra na ndị ọzọ si ṅụrịa ọṅụ n’ihi Jerusalem?

◻ Njehie ndị dị aṅaa ka Ezra na Nehemaịa nyeere ọtụtụ ndị Juu aka idozi?

◻ Gịnị ka ị pụrụ ịmụta site n’ihe ndekọ ndị ahụ metụtara Ezra na Nehemaịa?

[Foto dị na peeji nke 15]

Jerusalem, ọ bụghị ọrụ ya ùgwù dị na ya na Shushan, bụ ihe na-echegbu Nehemaịa karịsịa

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Dị ka Nehemaịa, ọ dị anyị mkpa ikpe ekpere maka enyemaka Jehova na maka ume iji nọgide n’ọrụ nkwusa anyị kachasị mkpa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya