Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 3/8 p. 12-15
  • Ịmụ Bible n’Ogige A Na-edebe Anụ Ọhịa!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịmụ Bible n’Ogige A Na-edebe Anụ Ọhịa!
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Nweghị Ngịga, E Nweghị Ihe Ngechi
  • Ịnyịnya Ibu Ọhịa Ndị Akpịrị Na-akpọ Nkụ
  • “N’oghere Imi Ya Abụọ Ka Anwụrụ Ọkụ Na-apụta”
  • ‘Inwe Uche Dị Ka Agwọ’
  • “Jekwuru Ndanda, . . . wee Mara Ihe”
  • Usuu Ndị Agha Azọlie Ije!
    Teta!—2003
  • Ndị Ọkachamara n’Ikpofu Unyi n’Ala Ụmụ Ahụhụ
    Teta!—2002
  • Olee Otú Ụmụ Ahụhụ Si Achara Ibe Ha n’Ụzọ?
    È Kere Ya Eke?
  • N’ihi Gịnị Ka Ịnyịnya Ibu Ọhịa Ji Enwe Akara?
    Teta!—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 3/8 p. 12-15

Ịmụ Bible n’Ogige A Na-edebe Anụ Ọhịa!

N’OTU oge gara aga anyị họọrọ ebe anyị na-adịghị anọbu maka ọmụmụ Bible kwa izu nke ezinụlọ anyị—ogige a na-edebe anụ ọhịa n’Emmen, na nso nso ebe obibi anyị na Netherlands. E nwekwara ezi ihe kpatara nke a, bụ́ nke ga-edo gị anya n’oge na-adịghị anya.

Dị ka ọtụtụ ezinụlọ ndị Kraịst n’ụwa nile, anyị na-enwe ọmụmụ Bible kwa izu. N’oge ọmụmụ ihe a anyị na-agụkarị banyere ụmụ anụmanụ ndị e ji mee ihe n’ime Bible dị ka ihe nnọchianya nke àgwà ndị dị mma na ndị na-adịghị mma. Anyị na-eche ma ọ̀ dị mgbe anyị pụrụ ịmata ụmụ anụmanụ ndị ahụ nke ọma karị wee kpebie ime ya mgbalị ezinụlọ ga-ejikọ aka mee. E kenyere onye òtù ọ bụla nke ezinụlọ kpọmkwem otu anụmanụ wee gwa ya ka o nyochaa ihe ọmụma banyere anụmanụ nke a n’akwụkwọ ndị dị ka Insight on the Scriptures na mpịakọta Ụlọ Nche na Teta!

Ka anyị na-erute nso ọnụ ụzọ ámá ogige a na-edebe anụ ọhịa n’Emmen, anya ụmụ anyị, bụ́ Mari-Claire, Charissa, na Pepijn, gbukepụrụ n’atụmanya. Anyị gaje ịhụ agụiyi, bear, ịnyịnya ibu ọhịa, ụmụ ahụhụ, na ma eleghị anya ọbụna ndị ọzọ n’ụmụ anụmanụ ndị anyị gụworo banyere ha n’ime Bible. Ma, ka anyị buru ụzọ gwa gị banyere ogige nke a pụrụ iche a na-edebe anụ ọhịa.

E Nweghị Ngịga, E Nweghị Ihe Ngechi

Noorder Dierenpark, dị ka a na-akpọ ogige ahụ a na-edebe anụ ọhịa n’Emmen n’asụsụ Dutch, bụ ogige anụmanụ pụrụ nnọọ iche, nke e dokwara dị ka ụkpụrụ ọgbara ọhụrụ si dị. N’ebe a ị gaghị ahụ anụmanụ ọ bụla n’ime ngịga ma ọ bụ n’azụ ihe ngechi. N’ụzọ megidere nke ahụ, e mewo ihe nile n’Emmen iji webata ụmụ anụmanụ na gburugburu ebe obibi yiri nnọọ ebe obibi ha bụ́ ọhịa ruo n’ókè o kwere mee. “Ọ bụ ndị ọbịa, kama ụmụ anụmanụ, bụ ndị na-anọ n’azụ ihe ngechi,” ka Wijbren Landman, otu n’ime ndị ọkà mmụta n’ihe ndị dị ndụ nke ogige ahụ, bụ́ onye na-amụmụ ọnụ ọchị, na-ekwu.

“A hazighị ụmụ anụmanụ ndị ahụ dị ka ụdị ha dị iche iche si dị, kama dị ka ebe ha sitere si dị. Nke ahụ bụ ihe mere na n’akụkụ ahụ buru ibu a na-edote anụmanụ ndị sitere n’ala na-enweghị oké ọhịa nke Africa bụ́ nke ị na-ahụ n’ebe a, e dokọtara ọtụtụ anụmanụ na-ebikọ ọnụ n’ime ọhịa n’otu ebe ruo n’ókè o kwere mee.” N’eziekwa, n’ebe ahụ ka anyị na-ahụ ha—anụmanụ ndị kasị too ogologo n’ụwa, anịgo ndị ahụ nwere ogologo olu, bụ́ nke pụrụ itoru mita isii n’ịdị elu. Ha na ele springbok, ele impala, ịnyịnya ibu ọhịa, ele gnu, ele waterbuck, na ọbụna anụ rhinoceros ole na ole nọ otu ebe.

Ma Wijbren ka nwekwuru ihe ọzọ ịgwa anyị banyere ala na-enweghị oké ọhịa nke Emmen: “Ụmụ anụmanụ ndị a nwere ohere dị ukwuu n’ebe a nke na ọ dịghị adị ha ka e ji ha eji ma ọlị. Otú ọ dị, anyị emewokwa ụzọ mgbapụ ụfọdụ. Ị̀ na-ahụ nnukwu nkume ndị ahụ dị n’ebe ahụ? Ele springbok pụrụ ịgbaba n’agbata ha maka nchebe ka rhino wee ghara inwe ike inye ha nsogbu. Ugwu ahụ dịkwa n’ebe ahụ na-enyere ụmụ anụmanụ aka ịpụ kpam kpam n’ebe ibe ha ga na-ahụ ha anya. Ma ọtụtụ mgbe, ụmụ anụmanụ ndị a adịghị amatakarị mgbe ibe ha nọ nso. Nke a abụchaghị ihe ijuanya ebe ọ bụ na ha ebikọtawo ọnụ n’ebe obibi ha n’Africa ruo ọtụtụ puku afọ.”

Ịnyịnya Ibu Ọhịa Ndị Akpịrị Na-akpọ Nkụ

“Lee! Ịnyịnya ibu ọhịa!” Charissa nwere nnọọ mkpali. O mere nchọpụta ndị na-akpali mmasị banyere ịnyịnya ibu ọhịa. “Akara ndị dị ya n’ahụ na-eme ka ọdịdị na ịdị n’otu nke ihe e ji amata ịnyịnya ibu ọhịa ghara ịpụta ìhè nke na ọbụna ụmụ amaala anya ha dị nkọ adịghị amatakarị mgbe ha nọ nso, mgbe ha nọ nanị 40 ruo 50 mita site n’ebe ha nọ. Ikike dị ike nke ịhụ ụzọ na ịnụ ísìsì nke ịnyịnya ibu ọhịa nwere, tinyekwara ikike ha nwere ịgba oké ọsọ—ọbụna ihe karịrị 60 kilomita kwa hour—na-arụ ọrụ dị ka ihe nchebe megide anụmanụ ndị na-eri anụ. Dị ka Abụ Ọma 104:11 na-ekwu, ịnyịnya ibu ọhịa ‘na-emeju akpịrị ịkpọ nkụ ha.’ Ọ bụ ihe mere na a dịghị ahụkarị ha ihe karịrị kilomita asatọ site n’ebe mmiri dị.” Mgbe ahụ ọ gbakwụnyere, sị: “Anyị onwe anyị kwa aghaghị imeju akpịrị ịkpọ nkụ ime mmụọ anyị mgbe nile site n’ịnọ ọgbakọ nso, ịmụ Bible, na ịga nzukọ dị iche iche.”

Anyị si n’ala na-enweghị oké ọhịa nke Africa pụọ wee gaa n’ebe otu n’ime anụ ndị kasị ukwuu na-adọgbu adọgbu n’ụwa nọ, bụ́ anụ bear kodiak. Nke a kasị ukwuu n’ime anụ bear nile pụrụ itoru mita atọ n’ogologo na ihe ruru 780 kilogram n’ịdị arọ. Ka ogige ha n’ebe a wee dị ka ebe ha bi n’ime ọhịa ruo n’ókè o kwere mee, e jiriwo mmiri iyi na nnukwu nkume dị iche iche chọọ ya mma. Anụ bear na-acha nchara nchara nke Syria, bụ́ nke dịrị ndụ n’Israel n’oge Bible, na anụ bear kodiak ahụ buru ibu sitere n’otu ụdị. Dị ka Mari-Claire chọpụtara, bear na-eri ụdị nri dị iche iche. Ha na-ata akwụkwọ ndụ na mkpọrọgwụ osisi tinyekwara mkpụrụ osisi dị iche iche, berrie, akị, àkwá, ụmụ ahụhụ, azụ, òké, na ndị yiri ha, ha na-enwekwa mmasị pụrụ iche ná mmanụ aṅụ. N’Israel oge ochie mgbe e nwere ụkọ nke akwụkwọ nri bear na-ata, ndị na-azụ atụrụ aghaghị ịnọ na nche megide mwakpo nke anụ bear. N’oge ntorobịa ya, Devid jiri obi ike nagide mwakwasị nke bear iji chebe ìgwè ewu na atụrụ nna ya.—1 Samuel 17:34-37.

“N’oghere Imi Ya Abụọ Ka Anwụrụ Ọkụ Na-apụta”

Ma e nwere anụmanụ ndị ọzọ anyị chọrọ nnọọ ịhụ. N’ụbọchị gara aga n’ọmụmụ Bible anyị, anyị mụrụ ihe banyere “Leviathan” (NW), bụ́ agụiyi. Na mbụ, Pepijn kọwara ya dị ka ‘otu ụdị nke azụ, nke buru nnọọ ibu!’ Ebe ọ bụ na ọnọdụ okpomọkụ na-agbanwe agbanwe adịghị amasị agụiyi ma ọlị, a na-edote ha n’Ụlọ Africa, ebe e nwere okpomọkụ ihu igwe na-adịghị agbanwe agbanwe. Ozugbo anyị banyere, okpomọkụ na uzu mmiri, nke gbachuru enyo anya anyị, zutere anyị n’ike. Tụkwasị na nke ahụ, anyị aghaghị ime ka ọchịchịrị ahụ mara anyị ahụ. N’ịgabiga n’elu otu àkwà mmiri e ji osisi wuo, anyị zutere agụiyi ole na ole na mberede, bụ́ ndị nọ ná njikere n’akụkụ abụọ nke àkwà mmiri ahụ. Ha tọgbọ nnọọ ebe ahụ n’emegharịghị ahụ nke na a kpaliri Pepijn ikwu, sị: “Ha abụghị ezi agụiyi.”

Agụiyi so n’anụ ndị na-akpụ akpụ kasị ukwuu e nwere ugbu a. Ụfọdụ pụrụ iru mita isii n’ogologo, dịkwa arọ ruo ihe dị ka 900 kilogram. Ikike dị n’agba ha dị egwu—ọbụna agụiyi dị nnọọ nta nke ịdị arọ ya bụ 50 kilogram pụrụ ịkpa ikike hà ka ihe karịrị 700 kilogram. Mgbe agụiyi sere n’elu mmiri ka ọ nọsịrị n’okpuru mmiri ruo oge ụfọdụ, nkupụ ume nke na-esi n’oghere imi ya apụta ngwa ngwa pụrụ ịkpata mfesasị mmiri nke na nnwupụ nke anwụ ụtụtụ pụrụ nnọọ ịbụ ‘mgbukepụ nke ìhè,’ nakwa ‘anwụrụ ọkụ nke na-apụta n’oghere imi ya abụọ,’ nke akwụkwọ Job na-akọwa.—Job 41:1, 18-21.

‘Inwe Uche Dị Ka Agwọ’

Anyị akahapụbeghị agụiyi ndị ahụ mgbe anyị hụrụ n’ime ọchịchịrị—n’ụzọ ihe ndabara ọma, n’azụ ọbọ́ enyo—ọtụtụ n’ime ụdị ihe dị iche iche ndị e kere eke e ji mee ihe n’ime Bible dị ka ihe atụ nke ma àgwà ndị dị mma ma ndị na-adịghị mma. Anyị na-ekwu banyere agwọ, anụmanụ mbụ a kpọrọ n’aha n’ime Bible. (Jenesis 3:1) Jisọs jiri inwe uche nke agwọ mee ihe mgbe ọ na-enye ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ banyere àgwà ha n’etiti ndị mmegide yiri agụ. (Matiu 10:16) Ma, n’eziokwu, a na-akọwakarị agwọ dị ka “agwọ ochie ahụ,” Setan bụ́ Ekwensu, onye a kọwara ná 2 Ndị Kọrint 11:3 dị ka onye aghụghọ na onye nghọgbu dị ka agwọ.—Mkpughe 12:9.

“Jekwuru Ndanda, . . . wee Mara Ihe”

Otu ihe anyị hụrụ nke anyị na-atụghị anya ya n’ogige anụmanụ ahụ bụ nnukwute ọzụrụ, bụ́ ebe obibi nke ụdị ìgwè ndanda atọ na-eri akwụkwọ ndụ. Ndị a bụ ndị ọrụ ubi n’etiti ndanda ndị ahụ. Anyị pụrụ ịhụ ìgwè ahụ n’azụ enyo; nke a na-enyere anyị aka ịmụta otú ihe ndị a e kere eke dị nta si adị ndụ. Ndanda masịrị anyị n’ihi na e ji ha mee ihe n’ime Bible dị ka ihe atụ nke ịdị uchu na amamihe ebumpụta ụwa.—Ilu 6:6.

Wijbren Landman bụ onye ọkachamara n’ụmụ ahụhụ. Ọ na-akọwa, sị: “Ndanda e mere atụmatụ ịbụ otu nde a mụbara otu ijeri ugboro na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’elu ụwa, nke pụtara na maka otu mmadụ ọ bụla, e nwere ihe na-adịghị ala karịa 200,000 ndanda! N’ime 15,000 ụdị ndanda dị iche iche anyị na-ahụ gbasazuru na kọntinent nile ma e wezụga ógbè ndị na-ajụbiga oyi ókè, ọ dịghị abụọ yiri onwe ha. Ha nile na-ewu ụdị ụlọ dị iche iche, ha na-erikwa ụdị nri ndị dị iche, ma a haziri ha nile n’ihe fọrọ nnọọ nke nta ka ọ bụrụ n’otu ụzọ ahụ.

“Ndanda ndị na-eri akwụkwọ ndụ na-akọ ero ndị a pụrụ iri eri, dị nnọọ ka ụmụ mmadụ si akọ ero. Dị ka ị na-ahụ, nkọpụta nke a na-ewere ọnọdụ n’okpuru ala, ma nri ero ndị ahụ na-eri na-abịa site n’elu ala. Ụbọchị nile, ndanda ọrụ ọrụ na-eji ọrụ n’aka ibuba akwụkwọ ndụ n’akwụ́ ha. Ha na-arịgo elu osisi ma họrọ otu akwụkwọ. Mgbe ahụ, n’iji agba ha eme ihe dị ka mkpà, ha na-egbubipụ iberibe akwụkwọ n’ụzọ fọrọ nke nta ka ha dị gburugburu site n’akwụkwọ ahụ, n’ịkwụkwa n’ahịrị, ha na-eburu ha gaa n’akwụ́ ha, na-eburu ha dị ka obere nche anwụ n’elu isi ha. Nke a na-akọwa aha ha nke abụọ, bụ ndanda nche anwụ. Mgbubi ahụ na-aga n’ihu ngwa ngwa nke ukwuu nke na n’Ebe Ndịda na n’Etiti America, ha na-erichapụ mkpa akwụkwọ ma ọ bụ osisi kpam kpam nanị n’ime hour ole na ole. Ka a sịkwa ihe mere na a maghị ha nke ọma n’ebe ahụ! N’ime akwụ́ ahụ, ndị ọrụ ndị ọzọ na-eji nlezianya hichasịa iberibe akwụkwọ ndụ ndị ahụ tupu ha atarie ha. Mgbe e mesịrị, a na-eji enzyme na amino acid nke ndanda ndị ahụ na-anyụpụta gwakọta n’iberibe akwụkwọ ndị ha tariri atari. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka iberibe akwụkwọ ndị ahụ a tariri atari kwesịrị ekwesị iji ya eme ihe dị ka nri maka ero ndị ahụ, si otú a na-eme ka e jide n’aka na a ga-anọgide na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ na-adịgide adịgide maka ìgwè ahụ dum.”

N’ịbụ ndị amamihe na nkà pụtara ìhè n’ụdị dị iche iche nke ọtụtụ ihe e kere eke kpasuru mmasị ha n’ụzọ dị omimi, anyị na-ahapụ ógbè ndanda ahụ. Oge agamiwo n’ehihie, anyị aghaghịkwa ịlaghachi n’ebe obibi anyị. Ma anyị nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ịhụ. Anyị ejebeghị n’ebe ikwiikwii nọ (Aịsaịa 13:21), seal (Ọpụpụ 35:23), enyi mmiri (“Òtòbò,” Job 40:15), enyi nnụnụ (Jeremaịa 50:39), ma ọ bụ ọtụtụ anụmanụ ndị ọzọ bi n’ebe a, ndị a kpọtụrụ aha n’ime Bible. Nke ọ bụla kwesịrị ka a mụọ ihe banyere ya. Anyị ga-abịaghachirịrị n’ogige a na-edebe anụ ọhịa n’Emmen!—Ọ bụ onye ọzọ dere ya.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 12]

Enyi nnụnụ: Yotvatah Nature Reserve

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya