Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 9/15 p. 21-24
  • Ụzọ Isi Nọgide Na-enwe Ọṅụ n’Ozi Oge Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Isi Nọgide Na-enwe Ọṅụ n’Ozi Oge Nile
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịnagide Ndakpọ Olileanya
  • Isoro Ndị Ọzọ Na-adị n’Udo
  • Mgbe Ahụ Na-esighị Mmadụ Ike
  • Ịnọgide Na-enwe Ọṅụ n’Agbanyeghị Enweghị Mmasị Ọha na Eze
  • Agbamume Site n’Aka Ndị Ọzọ
  • Ọṅụ Jehova—Ike Anyị
  • Na-echeta Ndị Nọ n’Ozi Oge Niile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ngọzi nke Ozi Ọsụ Ụzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Iji Ihe Ùgwù nke Ije Ozi Dị Nsọ Kpọrọ Ihe nke Ukwuu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Otú Ị Ga-esi Na-enwe Obi Ụtọ ma Ozi Ị Na-eje Gbanwee
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 9/15 p. 21-24

Ụzọ Isi Nọgide Na-enwe Ọṅụ n’Ozi Oge Nile

MMEZU amụma Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ nke usoro ihe a na-adịghị asọpụrụ Chineke. N’ịmara nke a, ndị ohu Jehova Chineke na-etinye nnukwu oge dị ka ha nwere ike n’ụzọ ezi uche dị na ya n’ịgbasa ozi ọma nke Alaeze ya. Ihe karịrị Ndịàmà Jehova 600,000 ahaziwo ndụ ha iji kere òkè n’ozi oge nile. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị nkwusa Alaeze oge nile a na-akpọ ndị ọsụ ụzọ. Ndị ọzọ bụ ndị ọrụ afọ ofufo Betel nọ n’isi ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ ya dị iche iche. Ma ndị ọzọ bụ ndị ozi ala ọzọ na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị.

Bible na-egosi na na mgbe ikpeazụ, “oge dị oké egwu” gaje ịdị. (2 Timoti 3:1-5) Akụkụ ihe odide Bible Grik na-eji otu okwu a pụrụ ịsụgharị “oge ụjọ a kara aka” eme ihe. N’ihi ya, ọ dịghị onye kwesịrị ịtụ anya ndụ nsogbu na-adịghị na ya n’ụbọchị anyị. Nye ụfọdụ ndị Kraịst na-eje ozi, nsogbu ndị ahụ yiri ihe dị nnọọ njọ nke na ha pụrụ ịjụ onwe ha, ‘Àpụrụ m ịnọgide n’ozi oge nile, ka m ga-akwụsịrịrị?’

Ọnọdụ ndị dị aṅaa pụrụ ime ka mmadụ tụleghachi ọnọdụ ya dị ka ọsụ ụzọ, onye ọrụ afọ ofufo Betel, onye nlekọta na-ejegharị ejegharị ma ọ bụ onye ozi ala ọzọ? Ma eleghị anya e nwere ajọ nsogbu ahụ ike. Ikekwe onye ikwu kaworo nkà ma ọ bụ nke ahụ na-adịkwaghị ike chọrọ nlekọta chiri anya. Ọ pụrụ ịbụ na di na nwunye na-amalite ezinụlọ. Ọ dịghị mkpa ka onye na-akwụsị ozi oge nile n’ihi ihe ndị dị otú ahụ na n’ihi ọrụ ndị Akwụkwọ Nsọ kwadoro sọọ ihere maka ime mgbanwe dị otú ahụ.

Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ na-eme atụmatụ ịkwụsị ozi oge nile n’ihi enweghị ọṅụ? Ikekwe onye ọsụ ụzọ na-ahụ nzaghachi dị nta n’ozi ya wee na-ajụ, ‘Gịnị mere m ga-eji nọgide n’ụzọ ndụ m nke ịchụ onwe onye n’àjà mgbe nanị ole na ole na-ege ntị?’ Ma eleghị anya onye ọrụ afọ ofufo Betel enwechaghị obi ụtọ banyere ọrụ ya. Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na ọrịa na-akpasu iwe, ọ bụ ezie na ọ dịghị egbochi ozi ịsụ ụzọ, na-erichapụ obi ụtọ mmadụ n’ikpeazụ. Olee otú ndị dị otú ahụ pụrụ isi nọgide na-enwe ọṅụ ha? Ka anyị tụlee ihe ndị ozi ụfọdụ nweworo ahụmahụ na-ekwu.

Ịnagide Ndakpọ Olileanya

Anny, onye sitere Switzerland, gara Watchtower Bible School of Gilead na 1950. Ọ tụrụ anya inweta ọrụ ozi ala ọzọ n’ofesi. Mgbe e kenyeghachiri ya ọrụ Betel na Europe, Anny nwere ndakpọ olileanya. Ka o sina dị, ọ nakweere ọrụ ya ná Ngalaba Nsụgharị, ọ ka na-arụkwa ọrụ ahụ. Olee otú o si merie ndakpọ olileanya ya? “E nwere nnukwu ọrụ a ga-arụ. Mmetụta na nhọrọ m adịrughị mkpa ka ọrụ ahụ,” ka Anny na-akọwa.

Ọ bụrụ na ihe agaghị dị ka anyị chọrọ n’ọrụ anyị, ikekwe anyị pụrụ ịzụlite àgwà Anny. Nhọrọ onwe anyị abụghị ihe kachasị mkpa. Ihe kasị mkpa bụ ka a rụọ ọrụ nile dị iche iche metụtara ịgbasa ozi Alaeze ahụ nke ọma. Ilu 14:23 na-agwa anyị na “ná ndọgbu nile nke mmadụ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ uru dị ya.” N’agbanyeghị ụdị ọrụ e nyeworo anyị, iji ikwesị ntụkwasị obi na-arụ ya na-atụnye ụtụ n’ịrụzu ọrụ Alaeze. A pụkwara inwe nnukwu afọ ojuju—ee, ọṅụ—n’ọrụ dị otú ahụ sitere n’aka Chineke.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 12:18, 27, 28.

Isoro Ndị Ọzọ Na-adị n’Udo

Ozi oge nile na-agụnye isoro ụdị mmadụ nile na-enwe mmekọrịta chiri anya—n’ozi ubi, na Betel, n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ, ma ọ bụ ka a na-eleta ọgbakọ dị iche iche dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. N’ihi ya, ọṅụ na-adabere n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu n’isoro ndị ọzọ na-adị n’udo. Otú ọ dị, ‘oge ụjọ’ ahụ e buru n’amụma maka mgbe ikpeazụ a na-etinye nnukwu ihe isi ike ná mmekọrịta ụmụ mmadụ. Olee otú onye ozi pụrụ isi zere ọṅụ ya ifunahụ ya, ọbụna a sị na mmadụ kpasuru ya iwe? Ikekwe anyị pụrụ ịmụta ihe site n’aka Wilhelm.

Wilhelm ghọrọ onye òtù nke otu ezinụlọ Betel dị na Europe na 1947. Ka nke ahụ gasịrị, ọ rụrụ ọrụ ịsụ ụzọ ma jee ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. “Ọ bụrụ na mụ na nwunye m ahụ ihe anyị chere na ha ezighị ezi ma ọ bụ nke na-echegbu anyị, anyị na-agwa Jehova mmetụta anyị ma hapụziere ya ihe nile ka o dozie,” ka Wilhelm na-akọwa.—Abụ Ọma 37:5.

Ikekwe gị onwe gị enwewo nchegbu n’ihi akparamàgwà nke onye Kraịst ibe gị bụ́ onye gwara gị okwu n’ụzọ na-adịghị egosi nkwanye ùgwù na iche echiche. Cheta na anyị nile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugbo n’okwu anyị. (Jemes 3:2) Ya mere gịnị mere na ị gaghị ewere ọnọdụ a bịarukwuo “Onye na-anụ ekpere” nso? (Abụ Ọma 65:2) Kọọrọ Jehova okwu ahụ, ma hapụzie ya n’aka ya. Ọ bụrụ na Chineke achọọ ime mgbanwe, ọ ga-eme otú ahụ. Ọ pụrụ ịdị ndị bi n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ mkpa iburu nke a n’uche ma ọ bụrụ na nrụgide ebilite n’akụkụ ndị dị otú ahụ, ebe nke a ga-enyere ha aka ịnọgide na-enwe ọṅụ ha n’ozi Jehova.

Mgbe Ahụ Na-esighị Mmadụ Ike

Mmadụ ole na ole na-enwe ezi ahụ ike mgbe nile. Ọbụna ndị nọ n’ihe a sị na ọ bụ uju nke ndụ pụrụ ịbụ ndị ịda mbà n’obi ma ọ bụ ọrịa tiri aka. Ọrịa na-eme ka ọ dị ụfọdụ mkpa ịkwụsị ozi oge nile, ma ka nke ahụ gasịrị ha na-arụ ọrụ magburu onwe ya dị ka ndị nkwusa Alaeze. Otú ọ dị, ndị ọzọ na-enwe ike ịga n’ihu n’ozi oge nile n’agbanyeghị ahụ esighị ike. Dị ka ihe atụ, tụlee banyere Hartmut na Gislind.

Hartmut na Gislind bụ di na nwunye ndị nọworo afọ 30 dị ka ndị ọsụ ụzọ, ndị ozi ala ọzọ, na n’ọrụ njegharị. Ha abụọ arịawo ajọ nrịanrịa ndị mịkpọworo ha n’ụzọ anụ ahụ na n’ụzọ mmetụta uche n’oge ụfọdụ. Ka o sina dị, ha arụwo ọrụ magburu onwe ya, ha enwewokwa ike ịgba ndị ọzọ na-enwe ọnwụnwa ndị yiri ha ume. Olee ndụmọdụ ha na-enye? “Legide anya n’ọdịnihu, ọ bụghịkwa n’oge ndị gara aga. Mee ihe nile i nwere ike ime n’ọnọdụ ọ bụla. Ụbọchị nke ọ bụla pụrụ iweta nanị otu ohere iji too Jehova. Jiri ohere ahụ mee ihe, nwetakwa obi ụtọ na ya.”

Tụlee banyere ọnọdụ Hannelore. Nrịanrịa na-abịaghachi mgbe mgbe esogbuwo ya n’afọ 30 ọ rụrụ ọrụ dị ka ọsụ ụzọ, onye ozi ala ozọ, n’ọrụ njegharị ya na di ya, na n’ozi Betel. Hannelore na-asị: “Ana m etinye uche n’ihe iseokwu ahụ Setan welitere—na ụmụ mmadụ na-ejere Jehova ozi nanị mgbe ime otú ahụ dịịrị ha mfe. Site n’idi ọnwụnwa, apụrụ m ikere òkè n’igosi na Setan ekwuzighị ekwuzi.” Nke a pụrụ ịbụ ihe mkpali siri ike. Cheta na iguzosi ike n’ihe gị nye Jehova n’okpuru ule dị ya mkpa.—Job 1:8-12; Ilu 27:11.

Mgbe ị na-agbalị ime mkpebi guzoziri eguzozi n’ihe banyere ahụ ike gị, tụlee akụkụ abụọ nke amụma Jisọs Kraịst banyere ọgwụgwụ usoro ihe a. Jisọs buru n’amụma ọrịa na-efe efe ịdị n’ebe dị iche iche. O kwukwara, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Matiu 24:3, 14; Luk 21:11) Jisọs maara na na mgbe ikpeazụ, ụmụazụ ya ga-agbaso ọrịa mgba. Ma ọ ghọtara na ọ bụghị nanị ndị nwere ezi ahụ ike ga-arụ ọrụ nkwusa ahụ kamakwa ndị na-arịa ajọ nrịanrịa. Ọ bụrụ na anyị nwere ike ịnọgide n’ozi oge nile n’agbanyeghị ọrịa, Jehova agaghị echefu ịhụnanya anyị na-egosi maka aha ya.—Ndị Hibru 6:10.

Ịnọgide Na-enwe Ọṅụ n’Agbanyeghị Enweghị Mmasị Ọha na Eze

Otú ndị mmadụ si emeghachi omume n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ pụrụ imetụta àgwà anyị. “Ọ na-esiri ọbụna ndị ọsụ ụzọ ike iso onye nwe ụlọ malite mkparịta ụka,” ka otu onye ozi nweworo ahụmahụ kwuru. “Anyị nile aghaghị ịgba mgba iji nọgide na-enwe ọṅụ anyị.” Ee, enweghị mmasị ọha na eze pụrụ ibelata ọṅụ anyị n’ozi ubi. Ya mere olee otú onye ọsụ ụzọ nke na-ezute enweghị mmasị mgbe nile ga-esi nọgide na-enwe ọṅụ ya? Ndị ozi nweworo ahụmahụ na-atụ aro ndị na-esonụ bụ́ ndị a nwapụtaworo, nwaleekwa.

Enweghị mmasị bụ ọnwụnwa, ma ọ bụghị iwu na ọ ga-apụta mmeri. N’onwe ya, enweghị mmasị juru ebe nile abụghị ihe mere a ga-eji akwụsị ozi oge nile. Anyị pụrụ ịnọgide na-enwe ọṅụ anyị n’agbanyeghị enweghị mmasị ma ọ bụrụ na anyị ewepụta oge zuru ezu maka ịmụsi Akwụkwọ Nsọ ike. Ha na-eme ‘ka anyị zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla,’ nke ahụ na-agụnyekwa ịgwa ndị na-adịghị ege ntị n’ozi ọma ahụ okwu. (2 Timoti 3:16, 17) Ọ bụ ezie na ndị mmadụ achọghị ige Jeremaịa onye amụma ntị, nke ahụ akwụsịghị ya. (Jeremaịa 7:27) Mgbe anyị na-amụ Bible site n’enyemaka nke mbipụta ndị Kraịst, anyị pụrụ irite uru dị ukwuu ma ọ bụrụ na anyị arịba ama echiche ndị na-ewusi okwukwe anyị ike ma na-enyere anyị aka ịgbaso enweghị mmasị mgba.

Ka e were ya na enweghị mmasị bụ ihe ịma aka, ka anyị nyochaa àgwà anyị n’ebe ndị anyị na-ekwusara nọ. Gịnị mere ha adịghị enwe mmasị? Otu ihe na-akpata enweghị mmasị juru ebe nile n’akụkụ ụfọdụ nke Europe bụ, dị ka ihe atụ, ihe ndekọ jọgburu onwe ya nke okpukpe ụgha. Ndị mmadụ adịghị echekwa na okpukpe nwere òkè ná ndụ ha, ha achọghịkwa itinye aka n’ihe ọ bụla metụtara ya. Ọ dị anyị mkpa ịdị nro, na-akọrọ ndị mmadụ banyere ihe ndị na-emetụta ha, dị ka enweghị ọrụ, ahụ ike, mpụ, ekweghị ibe nọrọ, gburugburu ebe obibi, na iyi egwu nke agha.

Ná mmalite okwu anyị nye onye nwe ụlọ, anyị pụrụ ikwu otu ihe na-adọrọ mmasị n’ógbè anyị. Nke ahụ bụ ihe Dietmar gbalịrị ime mgbe ọ na-eme nkwusa n’otu obodo nta ebe ọ nọ na-enwe obere ihe ịga nke ọma. Otu onye bi ebe ahụ kwuru na otu ọdachi dakwasịrị obodo nta ahụ ụnyaahụ. N’ọnụ ụzọ ọ bụla ka nke ahụ gasịrị, Dietmar gosipụtara ezi mwute maka ọdachi ahụ. “Na mberede, ndị ahụ malitere ikwu okwu,” ka o kwuru. “Ọdachi ahụ dị n’uche onye ọ bụla. Enwere m ọtụtụ mkparịta ụka dị mma n’ụbọchị ahụ n’ihi na egosiri m mmasị ná ndụ ha.”

Ọ dị anyị mkpa ịgbara ndị mmadụ àmà banyere Alaeze ahụ n’ebe ọ bụla anyị hụrụ ha. Ịgba àmà mberede pụrụ ịmị mkpụrụ, anyị pụkwara ịzụ onwe anyị n’ọrụ a site n’iji aro ndị a tụrụ ná mbipụta ndị dabeere na Bible eme ihe. Ọṅụ pụrụ isi n’okwu enyi na enyi ole na ole pụta ma ọ bụ site n’inyefe onye nwe ụlọ magazin Ụlọ Nche na Teta! Ọ bụrụ na anyị emewo nletaghachi ma maliteworị iduziri onye nwere mmasị ọmụmụ Bible, anyị pụrụ inweta onye ọzọ nwere mmasị site n’ịjụ, sị: “Ò nwere onye ọ bụla ọzọ ị maara nke ga-enwe mmasị ịmụ Bible?” Nke a pụrụ iduje n’iguzobe ọmụmụ Bible ebe obibi ọzọ. Otú o sina dị, ka anyị nwee àgwà ziri ezi, na-adabere na Jehova site n’ekpere, ghara ikwe ka enweghị mmasị kụda anyị aka.

Agbamume Site n’Aka Ndị Ọzọ

Jürgen na Christiane anọwo na-asụ ụzọ ma na-arụ ọrụ njegharị ruo ihe karịrị afọ 30. Ọ dị mgbe ha nwere ọrụ nke gụnyere ime nkwusa n’otu ógbè ebe ihe ka ukwuu ná ndị mmadụ bụ ndị na-enweghị mmasị ma na-agba isi akwara. Lee otú Jürgen na nwunye ya siri nwee agụụ maka agbamume ụfọdụ! Ma, n’ihi ihe ụfọdụ, ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ emeghị ihe maka mkpa ha.

Ya mere Jürgen maara site n’ahụmahụ na “ọ na-esiri ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ ike. Ha chọkwuru agbamume site n’aka ndị okenye na ndị nkwusa ndị ọzọ.” Chineke gwara Mosis ka ọ gbaa Joshua ume ma wusie ya ike. (Deuterọnọmi 3:26-28) Ndị Kraịst kwesịkwara ịbụ isi iyi agbamume nye ibe ha. (Ndị Rom 1:11, 12) Ndị nkwusa Alaeze pụrụ ịgba ndị nọ n’ozi oge nile ume site n’okwu ndị na-ewuli elu na site n’isonyere ha n’ozi site n’oge ruo n’oge.

Ọṅụ Jehova—Ike Anyị

Ndị Kraịst bụ́ ndị tinyeworo ihe ka ukwuu ná ndụ ha dị ka ndị ọsụ ụzọ ma ọ bụ ndị ozi ala ọzọ, na-eje ozi na Betel, ma ọ bụ na-eleta ọgbakọ dị iche iche n’ọrụ njegharị achọpụtawo na ọtụtụ nsogbu na-adị mkpirikpi oge, ma ụfọdụ na-adịte anya. Ọbụna nsogbu ole na ole ndị na-eyighị ma ọlị ka ha ga-ala ala ekwesịghị ịnapụ anyị ọṅụ anyị. Ramon, onye jeworo ozi n’ọrụ ofesi ruo ihe karịrị afọ 45, na-atụ aro na mgbe ọ bụla nsogbu kpasuru anyị iwe, “o kwesịrị ka anyị chee echiche banyere ọtụtụ ngọzi anyị nwere na banyere ọtụtụ puku ndị ọzọ nọ n’ihe isi ike ka ukwuu.” N’ezie, ndị kwere ekwe ibe anyị na-ata ahụhụ gburugburu ụwa, Jehova na-echekwa banyere anyị nile n’ezie.—1 Pita 5:6-9.

Ya meziri, ọ bụrụ na ọnọdụ onwe anyị nyere anyị ohere ikere òkè n’ozi oge nile ma nọgide na ya, ka anyị nọgide na-enwe ọṅụ anyị site n’ịdabere ná Nna anyị nke eluigwe. Ọ na-ewusi ndị ohu ya ike, anyị nile kwesịkwara icheta na ‘ọṅụ Jehova bụ ike anyị.’—Nehemaịa 8:10.

[Foto dị na peeji nke 21]

“Mmetụta na nhọrọ m adịrughị mkpa ka ọrụ ahụ”

[Foto dị na peeji nke 22]

“Anyị na-agwa Jehova mmetụta anyị ma hapụziere ya ihe nile”

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

“Mee ihe nile i nwere ike ime n’ọnọdụ ọ bụla. Ụbọchị nke ọ bụla pụrụ iweta nanị otu ohere iji too Jehova”

[Foto dị na peeji nke 23]

“Site n’idi ọnwụnwa, apụrụ m ikere òkè n’igosi na Setan ekwuzighị ekwuzi”

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

“Ọ na-esiri ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ ike. Ha chọkwuru agbamume site n’aka ndị okenye na ndị nkwusa ndị ọzọ”

[Foto dị na peeji nke 24]

“O kwesịrị ka anyị chee echiche banyere ọtụtụ ngọzi anyị nwere”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya