Iji Ihe Ùgwù nke Ije Ozi Dị Nsọ Kpọrọ Ihe nke Ukwuu
E KWESỊGHỊ iwere ọrụ nke ije ozi dị nsọ kpọrọ ihe n’ụzọ dị nta. Mgbe ndị nchụàjà na Juda oge ochie gosipụtara àgwà nke enweghị mmasị n’ebe ihe ùgwù ha ndị metụtara ụlọ nsọ Jehova dị, ọ dọrọ ha aka ná ntị n’ụzọ siri ike. (Malakaị 1:6-14) Mgbe ụfọdụ n’Israel gbakwara ndị Naziraịt ume ka ha ghara iji ibu ọrụ ndị ha narawooro dị ka akụkụ nke ije ozi ha dị nsọ kpọrọ ihe, Jehova baara ndị Israel ahụ mere mmehie mba. (Emọs 2:11-16) Ezi ndị Kraịst na-ekerekwa òkè n’ozi dị nsọ, ha na-ewere ya dị ka ihe dị mkpa. (Ndị Rom 12:1) Ozi a dị nsọ nwere ọtụtụ akụkụ, ha nile dị mkpa.
Mgbe Jisọs ka so ụmụazụ ya nọrọ n’elu ala, ọ zụrụ ha ịbụ ndị nkwusa nke Alaeze Chineke. Ka oge na-aga, ozi ha ga-eru nsọtụ nile nke ụwa. (Matiu 28:19, 20; Ọrụ 1:8) Ime nkwusa a adịwo ngwa ọbụna karị n’ụbọchị ikpeazụ nke usoro ihe dị ugbu a.
Ndịàmà Jehova nile na-ekere òkè n’ọrụ a. Ọtụtụ narị puku na-enwe ọṅụ n’inwe ike ime otú ahụ dị ka ndị ọsụ ụzọ. Iji rụzuo ihe ndị dị mkpa a chọrọ n’ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ, ọtụtụ puku ewepụtawo onwe ha maka ozi oge nile pụrụ iche na Betel, n’ọrụ ime njegharị dị ka ndị nlekọta sekit na distrikti, ma ọ bụ n’ozi ala ọzọ. Gịnị ka nke a pụrụ ịchọ n’aka ndị chọrọ ịnọgide n’ozi pụrụ iche dị otú ahụ?
Mgbe E Nwere Mkpa Ezinụlọ Ndị Chọrọ Nlebara Anya
Tupu e were ozi oge nile pụrụ iche, mmadụ aghaghị ime mgbanwe ụfọdụ n’ọnọdụ ya dị ka ọ na-adịkarị. Ọ bụghị mmadụ nile pụrụ ime nke a. Ibu ọrụ Akwụkwọ Nsọ kwadoro bụ́ nke mmadụ nwewororị pụrụ ime ka ọ ghara ikwe omume. Ma, gịnị ga-eme mgbe mkpa ezinụlọ ndị chọrọ ime ihe ngwa ngwa, ikekwe ndị na-emetụta nne na nna meworo agadi, chere ndị nọbu n’ozi pụrụ iche ihu? Ụkpụrụ na ndụmọdụ Bible dị ka ndị a na-esonụ na-enye nduzi dị mkpa.
Ndụ anyị nile kwesịrị ịbụ nke hiwere isi ná mmekọrịta anyị na Jehova. (Eklisiastis 12:13; Mak 12:28-30) E kwesịrị iji ihe ndị dị nsọ e nyefere anyị ilekọta kpọrọ ihe nke ukwuu. (Luk 1:74, 75; Ndị Hibru 12:16) N’otu oge, Jisọs gwara otu nwoke nke nwere mkpa ịgbanwe ihe ndị o butere ụzọ na o kwesịrị imikpu onwe ya n’ụzọ zuru ezu n’ọrụ ịkpọsa Alaeze Chineke. Dị ka ihe àmà na-egosi, nwoke ahụ nọ na-ezube iyigharị ọrụ dị otú ahụ ruo mgbe nna ya nwụsịrị. (Luk 9:59, 60) N’aka nke ọzọ, Jisọs kpughere echiche na-ezighị ezi nke onye ọ bụla na-azọrọ na ya ararawo ihe nile nye Chineke ma gharazie ‘imere nna ya ma ọ bụ nne ya ihe ọ bụla.’ (Mak 7:9-13) Pọl onyeozi gosipụtakwara ibu ọrụ dị mkpa nke inye ‘ndị nke aka mmadụ,’ ihe ndị na-akpa ha, tinyere ndị nne na nna na ndị nne na nna ochie.—1 Timoti 5:3-8.
Nke a ọ̀ pụtara na mgbe mkpa chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa bilitere, ndị nọ n’ozi pụrụ iche kwesịrị ịhapụ ọrụ ha iji ghọọ ndị na-enye nlekọta? Ọtụtụ ihe metụtara azịza ya. Mkpebi mmadụ bụ okwu aka ya. (Ndị Galetia 6:5) Ọtụtụ echewo na ọ bụ ezie na ha hụrụ ọrụ ha n’anya, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịnọnyere nne na nna ha iji nye ha enyemaka ndị dị mkpa. N’ihi gịnị? Mkpa ahụ pụrụ ịdịworị ukwuu, ọ pụrụ ịbụworị na e nweghị onye ọzọ so n’ezinụlọ ahụ pụrụ inye aka, ma ọ bụ na ọ pụrụ ịbụ na ọgbakọ dị n’ógbè ahụ enweghị ike imeworị ihe a chọrọ. Ụfọdụ enwewo ike ịsụ ụzọ ka ha na-enye aka ndị dị otú ahụ. Ndị ọzọ enwewo ike iwereghachi ozi oge nile pụrụ iche mgbe ha lekọtasịrị ọnọdụ ahụ dị n’ezinụlọ. Otú ọ dị, n’ọtụtụ ọnọdụ, o kwewo omume ime ihe banyere ọnọdụ ahụ n’ụzọ ndị ọzọ.
Iburu Ibu Ọrụ Ha
Mgbe mkpa ndị chọrọ nlebara anya biliteworo, ụfọdụ ndị nọ n’ozi oge nile pụrụ iche enwewo ike ilebara mkpa ndị ahụ anya n’ahapụghị ọrụ ha. Tụlee nanị ole na ole n’ime ọtụtụ ihe atụ.
Otu di na nwunye na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ ụwa nke Ndịàmà Jehova banyere n’ozi Betel na 1978, mgbe ha keresịwororị òkè n’ọrụ sekit na distrikti. Ọrụ nwanna nwoke ahụ gụnyere ibu ọrụ dị arọ ná nzukọ ọchịchị Chineke. Ma nne na nna ya achọwokwa enyemaka. Di na nwunye a nọ na Betel emewo njem nleta ugboro atọ ma ọ bụ anọ kwa afọ—ihe dị ka kilomita 3,500 ma ije eje ma ịlọta alọta—iji lekọta nne na nna ha. Ha wuru ụlọ n’onwe ha iji mezuo mkpa nne na nna ha. E nwewo njem ndị e mere iji lekọta ọnọdụ ahụ ike ndị chọrọ ime ihe ngwa ngwa. Ha ejiriwo ihe fọdụrụ nke nta ka ọ bụrụ oge ezumike ha nile maka ihe dị ka afọ 20 mee ihe iji lekọta ibu ọrụ a. Ha hụrụ nne na nna ha n’anya, na-asọpụrụkwa ha, ma ha jikwa ihe ùgwù ha nke ije ozi dị nsọ kpọrọ ihe.
Nwanna nwoke ọzọ anọwo n’ọrụ njegharị ruo afọ 36 mgbe o chere ihe ọ na-akọwa dị ka otu n’ime ọnọdụ ndị kasị ịma aka ná ndụ ya ihu. Ọ dị nne nwunye ya gbara afọ 85, bụ́ ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, mkpa ka ya na onye pụrụ inyere ya aka biri. N’oge ahụ, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ ya chere na ọ gaghị adịrị ha mfe ha na ya ibiri. Otu n’ime ndị ikwu ya gwara onye nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị na ya na nwunye ya kwesịrị ịhapụ ije ozi ahụ ma lekọtara ezinụlọ ahụ nne ha. Ma di na nwunye ahụ akwụsịghị ije ozi ha dị oké ọnụ ahịa, ha eleghịkwa mkpa ndị nne ha nwere anya dị ka ihe dị nta. Ruo afọ itoolu sochirinụ, ya na ha nọrọ oge ka ukwuu. Na mbụ ha bi n’ebe obibi a na-adọkpụgharị adọkpụgharị, e mesịa n’ụlọ dị iche iche nke ndị sekit ahụ nyere. Ruo ogologo oge, nwanna nwoke ahụ, bụ́ onye nlekọta distrikti n’oge ahụ, nọgidere na-eme njem ilekọta ọrụ ya ebe nwunye ya nọnyeere nne ya iji nye ya nlekọta ịhụnanya oge nile. Kwa izu, mgbe nzukọ gasịrị na Sunday, di ya na-eme ogologo njem ịlaghachi iji nyere ha aka. Ọtụtụ ndị maara banyere ọnọdụ ahụ gosipụtara ekele miri emi maka ihe di na nwunye a na-eme. Mgbe oge na-aga, ndị ọzọ so n’ezinụlọ ahụ nwere mkpali inyetụ aka. Ọtụtụ puku ndị Jehova na-anọgide na-erite uru site n’ije ozi nke di na nwunye ahụ na-achụ onwe ha n’àjà n’ihi na ha jigidesiri ihe ùgwù ha nke ozi oge nile pụrụ iche ike.
Site ná Nkwado Ezinụlọ
Mgbe ndị òtù ezinụlọ dị iche iche ghọtara uru nke ozi oge nile, ha pụrụ inye nkwado ka ma ọ dịkarịa ala ụfọdụ n’ime ha nwee ike ikere òkè na ya.
Mmụọ nke nkwado ezinụlọ dị otú ahụ enyeworo otu di na nwunye si Canada aka bụ́ ndị na-eje ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ n’Ọdịda Anyanwụ Africa. Ha echeghị ruo mgbe ọnọdụ mberede bilitere, na-enwe nnọọ olileanya na e nweghị ihe ga-eme. Tupu ha ejee Watchtower Bible School of Gilead, ná nkwadebe maka ozi mba ọzọ, nwanna nwoke ahụ na nwanne ya nwoke nta kwurịtara okwu banyere ilekọta nne ha ma ọ bụrụ na ọ daa ọrịa ma ọ bụ nwee nkwarụ. N’igosi ịhụnanya maka nne ha nakwa ekele maka uru nke ozi ala ọzọ, nwanne ya nke nta ahụ sịrị: “Enwere m ezinụlọ na ụmụ ugbu a. Apụghị m ịgate anya ma mee ihe ị pụrụ ime. Ya mere ọ bụrụ na ihe ọ bụla emee Mama, aga m elekọta ya.”
Otu di na nwunye na-eje ozi na Ndịda America nwetara nkwado di ukwuu site n’aka ezinụlọ nke nwunye ya n’ilekọta nne nwanyị ahụ na-eme agadi. Otu n’ime ụmụnne ya ndị nwanyị na di nwanne ya lekọtara nne ha ruo mgbe nwanne ya nwanyị ahụ dara ọrịa na-egbu egbu. Mgbe ahụ gịnị mere? Iji belata nchegbu ọ bụla, di nwanne ya nwanyị ahụ dere, sị: “Ọ bụrụhaala na mụ na ụmụaka dị ndụ, ọ dịghị mgbe ọ ga-adị mkpa ka unu hapụ ozi ala ọzọ.” E nwetakwuru enyemaka site n’aka ezinụlọ ahụ mgbe nwanne ya nwanyị ọzọ na di ya hapụrụ ebe obibi ha ma kwagaa n’ebe nne ha bi iji lekọta ya, ha mekwara otú ahụ ruo ọnwụ ya. Lee ezi mmụọ nke nkwado ọ bụ! Ha nile nọ na-enye aka ịkwado ozi ala ọzọ ahụ.
Ndị Nne na Nna Na-enye Jehova Ihe ná Mmesapụ Aka
Ndị nne na nna na-egosipụtakarị ekele pụtara ìhè maka ije ozi dị nsọ. N’ime ihe ndị ha nwere kasị baa uru ha pụrụ iji sọpụrụ Jehova bụ ụmụ ha. (Ilu 3:9) Ọtụtụ nne na nna bụ́ ndị Kraịst na-agba ụmụ ha ume ịbanye n’ozi oge nile. Ụfọdụ n’ime ha na-enwekwa mmetụta dị ka Hana, bụ́ onye nyere Jehova nwa ya nwoke bụ́ Samuel maka ozi ya “ruo mgbe ebighị ebi,” ya bụ, ruo “ụbọchị nile ọ na-adị ndụ.”—1 Samuel 1:22, 28.
Otu nne dị otú ahụ degaara nwa ya nwanyị nọ n’Africa akwụkwọ, sị: “Anyị na-ekele Jehova maka ihe ùgwù magburu onwe ya nke i nwere. Ọ dịghị ihe anyị tụrụ anya ya ka nke ahụ mma.” N’oge ọzọkwa ọ sịrị: “Ọ bụ ezie na anyị aghaghị ịchụ àjà nke ịnọpụ iche, ma lee ihe na-enye ọṅụ ọ bụ ịhụ otú Jehova si na-elekọta gị!”
Mgbe ọ tụleghachisịrị ọnọdụ dị iche iche biliteworonụ n’inye nne na nna ya meworo agadi nlekọta ha chọrọ, otu onye ozi ala ọzọ n’Ecuador dere, sị: “Echere m na enyemaka kasịnụ nke mụ na nwunye m nataworo bụ ekpere nna m. Mgbe ọ nwụsịrị, nne m gwara anyị, sị: ‘Ọ dịghị ụbọchị gafere nna unu na-ekpeghị ekpere nye Jehova ka o kwe ka unu abụọ nọgide n’ọrụ e kenyere unu.’”
Otu di na nwunye mere agadi na California, U.S.A., nwere obi ụtọ na otu n’ime ụmụ ha ndị ikom nọ n’ozi oge nile. Nwa ha nwoke ahụ na nwunye ya nọ na Spain mgbe nne ya nwụrụ. Ndị ọzọ so n’ezinụlọ ahụ chere na ọ dị mkpa ime ndokwa iji lekọta nna ha. N’ihi na ha ji ọrụ ego na ịzụlite ụmụ ha n’aka, ha chere na ha apụghị iburu ibu ọrụ ahụ. Kama nke ahụ, ha gbasiri di na nwunye ahụ nọ n’ozi oge nile pụrụ iche ume ike ịlọtaghachi ụlọ ma lekọta nna ha. Otú ọ dị, nna ha, ọ bụ ezie na ọ gbara afọ 79, ka nwere ezi ahụ ike, ma na-ahụ ụzọ nke ọma n’ụzọ ime mmụọ. Ná nzukọ ezinụlọ, mgbe ndị ọzọ kwusịrị obi ha, nna ha biliri ọtọ ma kwusie ike, sị: “Achọrọ m ka ha laghachi na Spain ma nọgide na-arụ ọrụ.” Ha mere otú ahụ, ma ha nyekwaara ya aka n’ụzọ ndị pụtara ìhè. Ha nọ n’ọrụ sekit ugbu a na Spain. Kemgbe nzukọ ezinụlọ ahụ gasịrị, ndị ọzọ so n’ezinụlọ ahụ egosiwo ekele maka ihe di na nwunye ahụ nọ n’ozi mba ọzọ na-eme. Ka ọtụtụ afọ gasịrị, otu n’ime ụmụ ndị ikom ha ndị ọzọ kpọbatara nna ha ahụ n’ebe obibi ya ilekọta ya ruo mgbe ọ nwụrụ.
Na Pennsylvania, U.S.A., otu nwanna nwoke e tere mmanụ bụ́ onye sụworo ụzọ ruo ihe dị ka afọ 40, nọ n’ihe karịrị afọ 90 mgbe nwunye ya dara oké ọrịa ma nwụọ. O nwere otu nwa nwoke na ụmụ nwanyị atọ, n’agụnyeghị ọtụtụ ụmụ ime mmụọ. Otu n’ime ụmụ ya nwanyị anọwo n’ozi oge nile ruo ihe karịrị afọ 40, ebe ya na di ya jeworo ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ, n’ọrụ njegharị, nakwa na Betel. O nyere aka mee ndokwa ka e nwee ike inye nna ya nlekọta dị mma. Ụmụnna nọ n’ógbè ahụ nyekwara aka n’ịkpọrọ ya eje nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ikpeazụ, mgbe di ya nwụsịrị, ọ jụrụ nna ya ma ọ̀ chọrọ ka ya hapụ Betel iji ilekọta ya. Ọ ji ihe ndị dị nsọ kpọrọ ihe nke ukwuu, o chekwara na a pụrụ ilekọta mkpa ya n’ụzọ ndị ọzọ. Ya mere ọ zaghachiri, sị: “Nke ahụ ga-abụ ihe kasị njọ ị pụrụ ime, ọ ga-adịkwa njọ ọbụna karị ma ọ bụrụ na m ekwere ka i mee ya.”
Ọgbakọ Ndị Na-enye Nkwado
Ụfọdụ ọgbakọ enyewo aka nke ukwuu n’ilekọta ndị nne na nna na-eme agadi nke ndị nọ n’ozi oge nile pụrụ iche. Ha na-enwe ekele karịsịa maka ndị tinyeworo ọtụtụ afọ n’ozi dị otú ahụ. Ọ bụ ezie na ha apụghị ịnapụ ha ibu ọrụ ha Akwụkwọ Nsọ kwadoro, ọgbakọ ndị a na-eme ihe dị ukwuu iji mee ka ibu ahụ dị nnọọ mfe na ka o wee ghara ịdị mkpa na ụmụ ha ga-ahapụ ọrụ ha pụrụ iche.
Otu di na nwunye si Germany anọwo n’ọrụ ala ọzọ ha ruo ihe dị ka afọ 17, ihe ka ukwuu n’oge ahụ n’ọrụ njegharị, mgbe mkpa nke nne nke nwoke meworo agadi mụbara. Kwa afọ ha jiri oge ezumike ha mee ihe inyere ya aka. Ndị agbata obi bụ́ Ndịàmà nyekwara aka n’ụzọ ịhụnanya. E mesịa mgbe di na nwunye ahụ nọ n’ozi oge nile na-anọnyere nne nke nwoke n’oge dị oké njọ, ndị okenye ọgbakọ dị n’ógbè ahụ mere nhazi ijekwuru ha. Ha maara nke ọma ihe di na nwunye ahụ na-emere nne ha mgbe mgbe. Ha jikwa ịba uru nke ozi pụrụ iche nke di na nwunye ahụ na-ekere òkè na ya kpọrọ ihe. Ya mere ndị okenye ahụ depụtara usoro nlekọta e mere atụmatụ ya maka nne ha, mgbe ahụ kwuokwa, sị: “Unu enweghị ike ilekọta ya karịa ka unu na-eme; anyị ga-enyere unu aka ka unu wee nwee ike ịnọgide n’ọrụ unu na Spain.” Kemgbe afọ asaa, ndị okenye a anọgidewo na-eme otú a.
N’otu aka ahụ, otu nwanna nwoke nke nọworo na-eje ozi na Senegal eri 1967 nwetara nkwado ịhụnanya dị ukwuu site n’aka ọgbakọ dị n’ebe nna ya nọ. Mgbe otu nsogbu bilitere, onye nke bụ dị, site ná nkwado si n’obi nke nwunye ya na-ahụ n’anya, mere njem nanị ya gaa United States inyere ndị mụrụ ya aka. Ọ chọpụtara na ọ dị mkpa ka ya nọgide n’ebe ahụ ruo ọnwa ụfọdụ. Ọnọdụ ahụ siri ike, ma mgbe o mere ihe ọ pụrụ ime, ọgbakọ ahụ tinyere aka ma nye aka ka o wee nwee ike ịnọgide n’ozi ala ọzọ ya. Ruo ihe dị ka afọ 18, ọgbakọ ahụ nyere aka n’ụzọ ịhụnanya n’ọtụtụ ụzọ, nke mbụ maka nna ya (ọ bụ ezie na ọ dịkwaghị amata ọtụtụ n’ime ha), mgbe ahụkwa maka nne ya. Nke ahụ ọ̀ tọhapụrụ nwa nwoke ahụ n’ibu ọrụ ya? Ee e; ọ na-emekarị njem site na Senegal, na-ejikwa oge ezumike ya mee ihe iji nye aka nile ọ pụrụ inye. Ma ọtụtụ n’ime ọgbakọ ahụ nwere obi ụtọ ịmara na ha na-ekere òkè n’ime ka di na nwunye na-agba mbọ nọgide n’ozi oge nile pụrụ iche na Senegal.
Jisọs sịrị na ndị hapụrụ ihe nile n’ihi ozi ọma ahụ ga-enweta narị okpukpu ụmụnne ndị ikom, ụmụnne ndị inyom, nne, na ụmụ. (Mak 10:29, 30) Nke ahụ n’ezie bụ eziokwu n’etiti ndị ohu Jehova. Otu di na nwunye na-eje ozi ugbu a na Benin, Ọdịda Anyanwụ Africa, nwere ahụmahụ nke a n’ụzọ pụrụ iche mgbe Ndịàmà abụọ nọ n’ọgbakọ ndị mụrụ ha gwara ha ka ha ghara ichegbu onwe ha banyere nne na nna ha. Ha gbakwụnyere, sị: “Nne na nna unu bụkwa nne na nna anyị.”
Ee, e nwere ọtụtụ ụzọ anyị pụrụ isi gosipụta na anyị na-eji ihe ùgwù nke ije ozi dị nsọ akpọrọ ihe nke ukwuu. È nwere ụzọ ndị ị pụrụ isi mee nke a ọbụna n’ụzọ zuru ezu karị?
[Foto ndị dị na peeji nke 26]
Ha ewepụtawo onwe ha maka ozi oge nile pụrụ iche