Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Dị ka Matiu 17:20 si kọọ, ndị ozi ahụ enweghị ike ịgwọ otu nwa okoro nọ n’ihe mgbu ‘n’ihi okwukwe nta ha.’ Otú ọ dị, na Mak 9:29, e jikọrọ enweghị ike ha ná mkpa maka ekpere. Gịnị mere e ji kwuo ihe ndị dịgasị iche kpatara ya n’ihe ndekọ Oziọma dịgasị iche?
N’eziokwu, ihe ndekọ abụọ ndị ahụ na-emejupụta ibe ha, ọ bụghị imegide onwe ha. Na mbụ, lee na Matiu 17:14-20. Otu nwoke kọrọ na nwa ya nwoke bụ onye akwụkwụ na-eme, nakwa na ndị na-eso ụzọ Jisọs apụghị ịgwọ nwa okoro ahụ. Mgbe ahụ Jisọs gwọrọ nwa okoro ahụ site n’ịchụpụ mmụọ ọjọọ nke na-akpagbu ya. Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ihe mere na ha apụghị ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ. Dị ka ihe ndekọ Matiu si kọọ, Jisọs zaghachiri, sị: “N’ihi okwukwe nta unu: n’ihi na n’ezie asị m unu, Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe dị ka mkpụrụ mustard, unu ga-asị ugwu a, Si n’ebe a gabiga n’ebe ahụ; ọ ga-agabigakwa; ihe ọ bụla agaghị adịkwa nke unu na-apụghị ime.”—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.
Ugbu a sapeta Mak 9:14-29, bụ́ ebe anyị na-ahụ nkọwa ndị ka saa mbara. Dị ka ihe atụ, Mak 9:17 na-enye nkọwa sara mbara na n’ọnọdụ a ihe ọdụdọ a yiri nke akwụkwụ bụ nke mmụọ ọjọọ na-akpata. Ọ dị mma ịrịba ama na Bible na-ekwu n’ebe ọzọ na Jisọs gwọrọ ndị akwụkwụ na ndị mmụọ ọjọọ ji. (Matiu 4:24) N’ọnọdụ a pụrụ iche, ihe kpatara ọdụdọ ahụ bụ “mmụọ na-adịghị ekwu okwu na nke ntị chiri,” ya bụ, ajọ mmụọ, nke Luk bụ́ dibịa na-akwado. (Luk 9:39; Ndị Kọlọsi 4:14) Rịba ama nkebi okwu dị na Mak 9:18 bụ́, “Ebe ọ bụla o [mmụọ ọjọọ ahụ] jidere ya.” Ya mere mmụọ ọjọọ ahụ adịghị amaja nwa okoro ahụ mgbe nile, nanị site n’oge ruo n’oge. Ma, ndị ahụ na-eso ụzọ apụghị ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ wee si otú ahụ gwọọ nwa okoro ahụ. Mgbe ha jụrụ ihe kpatara ya, Jisọs zara, sị: “Aha mmụọ nke a apụghị ịpụta site n’ihe ọ bụla, ma ọ bụghị site n’ekpere.”
Otú ọ dị, ọgụgụ e ji nlezianya gụọ ihe ndekọ Mak na-egosi na ya na ihe Matiu dekọrọ adịghị emegide onwe ha. Na Mak 9:19, anyị na-agụ na Jisọs kwupụtara mwute maka enweghị okwukwe nke ọgbọ ahụ. N’amaokwu nke 23, e dekọkwara na ọ gwara nna nwa okoro ahụ, sị: “Onye nke kwere pụrụ ime ihe nile.” Ya mere Mak na-emesikwa ịdị mkpa nke okwukwe ike. Ọ bụ nanị na n’amaokwu 29, Mak na-enyekwu nkọwa sara mbara. Mak na-agbakwụnye ihe Jisọs kwuru banyere ekpere, bụ́ nke ma Matiu ma Luk na-edekọghị.
Gịnịzi ka anyị pụrụ ikwu? N’oge ndị ọzọ ma ndị ozi 12 ahụ ma ndị na-eso ụzọ 70 ahụ chụpụrụ ndị ajọ mmụọ. (Mak 3:15; 6:13; Luk 10:17) Ma n’oge a ndị ahụ na-eso ụzọ apụghị ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ. N’ihi gịnị? Ọ bụrụ na anyị ejikọta nkọwa ndị ahụ sara mbara a kpọtụrụ uche n’ihe ndekọ ahụ dị iche iche, anyị aghaghị ikwubi na ha adịghị njikere ime nke ahụ n’ọnọdụ a. Ikekwe otu ihe kpatara ya bụ ụdị mmụọ ọjọọ ọ bụ, ebe o yiri ka ndị mmụọ ọjọọ pụrụ inwe ọdịdị, mmasị, na ọbụna ikike ndị dịgasị iche. Na nke a, okwukwe siri nnọọ ike na ikpesi ekpere ike maka enyemaka Chineke dị mkpa. N’ezie, Jisọs nwere ụdị okwukwe ahụ. O nwekwara nkwado nke Onye Na-anụ ekpere, bụ́ Nna ya. (Abụ Ọma 65:2) Ọ bụghị nanị na Jisọs pụrụ ịgwọ nwa okoro ahụ nọ n’ihe mgbu site n’ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ kamakwa o mere otú ahụ.