-
Gịnị Ka Ihe Ndị E Kere Eke Na-akụziri Anyị?Teta!: Gịnị Ka Ihe Ndị E Kere Eke Na-akụziri Anyị?
-
-
Ihe Ndị Sayensị Leere Anya n’Ụkwụ Agụ Ụlọ Rụpụta
E nwekwara ọtụtụ ihe ụmụ anụmanụ ndị na-akpagharị n’ala na-akụziri anyị. Otu n’ime ụmụ anụmanụ ndị ahụ bụ agụ ụlọ. Agụ ụlọ na-adị obere, ma ọ na-arịgo n’ahụ́ ụlọ, si na ya rigoro n’uko ụlọ ma gagide aka na ya chee ihu n’elu n’adapụghị. Ọ bụ ụdị ihe a ka e ji mara agụ ụlọ, ma n’oge a ma n’oge a na-ede Baịbụl. (Ilu 30:28) Gịnị na-eme ka agụ ụlọ nwee ike ịnọ n’elu otú a n’adapụghị?
Agụ ụlọ na-enwe ụmụ irighịrị ihe yiri ajị n’ụkwụ ya. Ọ bụ ya mere ọ na-eji enwe ike anọ n’elu otú ahụ n’adapụghị, ya sọkwa ya ya bụrụ na ọ nọ n’ihe na-akwọ mụrụmụrụ. Ụkwụ ya anaghị anyagide n’ihe. Ihe na-enyere ya aka bụ ụmụ irighiri ihe dị n’ụkwụ ya nakwa ndị nke dị n’ihe ọ nọ n’elu ya. Ihe a na-akpọ van der Waals na-enyere ụmụ irighiri ihe ndị ahụ dị n’ụkwụ agụ ụlọ na n’ihe ọ nọ n’elu ya aka, mezie ka ọ rapara n’ihe ọ nọ n’elu ya n’adapụghị. Otú e si kee ụwa na-eme ka ụdị ihe a ghara ikwe omume. Ọ bụ ya mere na mmadụ agaghị enwe ike gagide aka nkịtị n’ahụ́ ụlọ rịgoro na ya. Ma, ụmụ irighiri ihe ndị ahụ yiri ajị ndị dị n’ụkwụ agụ ụlọ na-eme ka o nwee ike ịgagide aka n’ahụ́ ụlọ ma ghara ịdapụ. Ihe ahụ a na-akpọ Van der Waals na-ejupụta n’ihe ndị ahụ yiri ajị dị n’ụkwụ ya, ya enwee ike ịgagide aka ya na ụkwụ ya n’ihe n’adapụghị.
Olee uru ihe a ndị sayensị chọpụtara nwere ike ịba? E nwere ike iji ihe ndị ha leere anya n’ụkwụ agụ ụlọ rụọ dochie ihe a na-akpọ majik gọm.a Ndị rụrụ ya leere anya n’ihe ndị e kere eke rụọ ya. Akwụkwọ bụ́ The Economist kwuru ihe otu onye na-eme nchọpụta kwuru. Ọ sịrị na bandeeji ndị sayensị leere anya n’ụkwụ agụ ụlọ rụọ bara uru, karịchaa “mgbe a na-agwọ mmadụ ọrịa, ya abụrụ na a gaghị ejili bandeeji kemikal dị na ya gwọọ onye ahụ.”
-
-
Gịnị Ka Ihe Ndị E Kere Eke Na-akụziri Anyị?Teta!: Gịnị Ka Ihe Ndị E Kere Eke Na-akụziri Anyị?
-
-
Ụkwụ agụ ụlọ anaghị eru unyi, a naghị ahụ ihe na-egosi ebe ọ zọrọ ụkwụ, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ọ na-agagide ma aka ma ụkwụ n’ihe niile, ọ naghịkwa esiri ya ike ịgagide ma ọ bụ ịgapụ ha n’ihe. Ndị sayensị na-agba mbọ ịrụpụta ihe ga na-eme ka ya
-