Akụ̀ na Ụba Ọ̀ Pụrụ Ime Gị Obi Ụtọ?
Eze Solomọn maara uru ego bara. O dere, sị: “N’ihi ịchị ọchị ka a na-esi nri, mmanya vine na-eme ka ndụ ṅụrịa: ego na-azakwa ihe nile.” (Eklisiastis 10:19) Iso ndị enyi na-eri nri pụrụ ịbụ ihe na-atọ ụtọ nke ukwuu, ma iji nweta nri ma ọ bụ mmanya, ego dị gị mkpa. Ebe ọ bụ na ego bụ ụzọ e si enweta ihe onwunwe, ọ “na-azakwa ihe nile.”
Ọ BỤ ezie na Solomọn bara nnọọ ọgaranya, ọ maara na akụ̀ na ụba nwere ịkpa ókè ha. Ọ ghọtara na ụzọ ndụ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya adịghị akpọpe ụzọ na-eduje n’obi ụtọ. O dere, sị: “Onye na-ahụ ego n’anya, ego agaghị eju ya afọ; ọzọ, onye na-ahụ inwe ihe bara ụba n’anya, ihe omume agaghị eju ya afọ.”—Eklisiastis 5:10.
Ka e were ya na onye bara ọgaranya nwetara ọbụna akụ̀ na ụba ka ukwuu. Solomọn na-asị: “Mgbe ezi ihe na-aba ụba, ndị na-eri ya abawokwa ụba.” (Eklisiastis 5:11) Ka “ezi ihe,” ma ọ bụ ihe onwunwe mmadụ na-aba ụba, a chọkwuru ndị mmadụ iji lekọta ha. Ndị ndozi, ndị nlekọta, ndị na-eje ozi, ndị nche, na ndị ọzọ nile—a ghaghị ịkwụ ha nile ụgwọ maka ọrụ ha. N’aka nke ọzọ, nke a na-achọkwu nnọọ ego.
Ọnọdụ dị otú ahụ na-emetụta obi ụtọ mmadụ kpọmkwem. Onye Gris na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Xenophon, onye dịrị ndụ na narị afọ nke anọ T.O.A., deturu okwu otu ogbenye nke ghọworo ọgaranya kwuru.
“Legodị, ị̀ na-eche n’ezie . . . na ka m na-enwetakwu ihe, otú ahụ ka m na-ebikwu ndụ obi ụtọ? Ị maghị,” ọ gara n’ihu ikwu, “na ọ dịghị enyekwu m otu mkpụrụ obi ụtọ ọ bụla bụ́ iri nri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ na ihi ụra ugbu a karịa ka ọ na-enye m mgbe m bụ ogbenye. Nanị ihe m ritere n’inwe ọtụtụ ihe bụ na m nwere ibu ọrụ ilekọtakwu ọtụtụ ndị, ikesakwuru ọtụtụ ndị ihe, na inwe nsogbu nke ilekọta ọtụtụ ihe karịa ka m nweburu. N’ihi na ugbu a ọtụtụ ndị oje ozi na-elekwasị m anya maka nri, ọtụtụ maka ihe ọṅụṅụ, ọtụtụ kwa maka uwe, ebe dọkịta dị ụfọdụ mkpa; otu na-abịakwutekwa m na-eji ogologo akụkọ banyere atụrụ ndị anụ ọhịa wolf wakwasịrị, ma ọ bụ banyere oké ehi nwụrụ n’ihi isi n’ugwu dapụ, ma ọ bụ ikwu na otu ọrịa etiwapụwo n’etiti ìgwè ehi. N’ihi ya kwa ọ na-eyi m . . . ka m nwekwuru nsogbu ugbu a site n’inwe ihe dị ukwuu karịa ka m nweburu site n’inwe ihe dị nta.”
Ihe ọzọ mere ndị mmadụ ji achụso akụ̀ na ụba ka nnọọ ukwuu bụ na ihe Jisọs Kraịst kpọrọ “aghụghọ nke akụ̀” na-emegharị ha anya. (Matiu 13:22) A na-aghọrị ha n’ihi na ha adịghị enweta afọ ojuju ma ọ bụ obi ụtọ ha tụrụ anya inweta ma ọlị n’akụ̀ na ụba ndị a ha na-achụsosi nnọọ ike. Ha na-eche na ihe obere akụ̀ na ụba na-enweghị ike ime, akụ̀ na ụba ka ukwuu ga-eme ya. Ya mere a na-enwe nchụso na-adịghị akwụsị akwụsị maka inwetakwu ihe.
Ịhụ Ego n’Anya Adịghị Eduga n’Obi Ụtọ
Inwe nchegbu maka ihe onwunwe ya pụrụ igbochi ọgaranya ịnụ ụtọ nke ụra anyasị. Solomọn na-ede, sị: “Ihe ụtọ ka ụra nke onye [na-arụ] ọrụ ubi bụ, ma ọ̀ bụ ihe nta ma ọ bụ ihe hiri nne ka ọ na-eri: ma afọ ojuju nke ọgaranya adịghị ekwe ya arahụ ụra.”—Eklisiastis 5:12.
Mgbe nchekasị banyere mfu mmadụ pụrụ inwe n’akụ̀ na ụba ya gabigara ókè, ọ na-akpata ihe karịrị nanị ehighị ụra. N’ịkọwa onye bụ́ ọkpa akụ̀ eri eri, Solomọn na-ede, sị: “N’ụbọchị ya nile ọ bụ n’ọchịchịrị ka ọ na-eri ihe, a na-akpasukwa ya iwe hie nne, o nwekwara ọrịa na iwe.” (Eklisiastis 5:17) Kama inweta obi ụtọ site n’akụ̀ na ụba ya, ọ na-eri nri ‘n’iwe,’ dị ka a ga-asị na ọbụna ego ọ na-aghaghị imefu iji zụta nri na-ewute ya. Echiche dị otú ahụ na-adịghị mma pụrụ ịkpata ahụ adịghị ike. N’aka nke ya, ahụ adịghị ike na-etinye ihe ná nchegbu nke ọkpa akụ̀ eri eri ahụ, ebe ọ na-egbochi ya ịkpakọta akụ̀ na ụba ka ukwuu.
Ikekwe nke a na-echetara gị ihe Pọl onyeozi dere: “Ndị na-ezube ịbụ ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ agụụ ihe ọjọọ nke uche na-adịghị n’ime ha, nke na-emerụkwa ahụ, bụ́ ihe na-eme ka mmadụ mikpuo emikpuo n’ime mbibi na ịla n’iyi. N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche: nke ụfọdụ na-agbasosi ike, . . . ha werekwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.” (1 Timoti 6:9, 10) Ná nchụso ego, ndị mmadụ na-aghọ aghụghọ, agha ụgha, ezu ohi, agba akwụna, na ọbụna na-egbu mmadụ. Ihe ọ na-arụpụta bụ onye e ji ọtụtụ ihe mgbu mmetụta uche, nke anụ ahụ, na nke ime mmụọ dụpuo n’ihi ịgbalị inweta na ijidesi akụ̀ na ụba ike. Nke a ọ̀ na-ada ka ụzọ na-eduga n’obi ụtọ? Ọ dịghị ma ọlị!
Inwe Afọ Ojuju n’Ihe Anyị Nwere
Solomọn nwekwuru ihe ọ ga-ekwu banyere echiche ziri ezi maka akụ̀ na ụba. O dere, sị: “Dị ka o siri n’afọ nne ya pụta, ọtọ ka ọ ga-alaghachi ịla dị ka o siri bịa, ma ọ dịghị ihe ọ bụla ọ ga-eburu site ná ndọgbu ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, nke ọ ga-ewere n’aka ya laa. Lee, ihe nke mụ onwe m hụworo na ọ bụ ezi ihe nke mara mma bụ ka mmadụ rie ihe, ka ọ ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, ka ọ hụkwa ezi ihe n’ime ndọgbu ya nile nke ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ n’ime ya n’okpuru anyanwụ, ọnụ ọgụgụ ụbọchị ndụ ya nke Chineke nyeworo ya: n’ihi na nke a bụ òkè ya.”—Eklisiastis 5:15, 18.
Okwu ndị a na-egosi na obi ụtọ adabereghị n’ịgbalị ịkwakọba akụ̀ na ụba maka oge nke nwere ike ghara iru eru ma ọlị. Ọ ka nnọọ mma inwe afọ ojuju na ịṅụrị ọṅụ n’ihe si n’ịrụsi ọrụ ike anyị pụta. Pọl onyeozi kwupụtara echiche yiri nke ahụ n’akwụkwọ ozi sitere n’ike mmụọ nsọ o degaara Timoti, na-asị: “Anyị ewetaghị ihe ọ bụla n’ụwa, ọ bụkwa n’ihi na anyị apụghị iwere ihe ọ bụla pụọ n’ime ya; ma ebe anyị nwere ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ, afọ ga-eju anyị n’ihe ndị a.”—1 Timoti 6:7, 8; tụlee Luk 12:16-21.
Isi Ihe Na-eweta Obi Ụtọ
Solomọn nwere ụba nke akụ̀ na ụba na amamihe Chineke. Ma o jikọtara obi ụtọ na amamihe, ọ bụghị ya na ego. Ọ sịrị: “Onye [obi ụtọ, NW] ka mmadụ nke chọtaworo amamihe bụ, ya na mmadụ nke na-enwepụta nghọta. N’ihi na ọzụzụ ahịa ya dị mma karịa ọzụzụ ahịa ọlaọcha, uru ya dị mma karịa ọlaedo ọma. Ihe dị oké ọnụ ahịa ka ọ bụ karịa ruby: ihe nile kwa nke na-atọ gị ụtọ, ha agaghị aha ka ya. Ụbọchị ndụ dị ogologo dị n’aka nri ya; n’aka ekpe ya ka akụ̀ na nsọpụrụ dị. Ụzọ ya nile bụ ụzọ nke ịdị ụtọ, okporo ụzọ ya nile bụkwa udo. Osisi na-enye ndụ ka ọ bụụrụ ndị na-ejide ya aka: ee, onye ọ bụla nke na-ejisi ya aka ike bụ onye [obi ụtọ, NW].”—Ilu 3:13-18.
N’ihi gịnị ka amamihe ji karịa ihe onwunwe nkịtị? Solomọn dere: “Amamihe bụ ndo, ego bụkwa ndo: ma ọkaaka nke ihe ọmụma bụ, na amamihe na-eme ka onye nwe ya dị ndụ.” (Eklisiastis 7:12) Ọ bụ ezie na ego na-enye ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ndo, na-enye onye nwe ya ike ịzụta ihe dị ya mkpa, amamihe pụrụ ichebe mmadụ pụọ n’ime ihe ize ndụ nke pụrụ ịnapụ ya ndụ ya. Ọ bụghị nanị na ezi amamihe pụrụ ịzọpụta mmadụ pụọ n’ọnwụ nnwụchu kama, ebe ọ dabeere n’egwu kwesịrị ekwesị maka Chineke, ọ ga-eduba n’inweta ndụ ebighị ebi.
N’ihi gịnị ka amamihe Chineke ji eduga n’obi ụtọ? N’ihi na ezi obi ụtọ pụrụ ịbịa nanị site n’aka Jehova Chineke. Ahụmahụ na-anwapụta na a pụrụ inweta ezigbote obi ụtọ nanị site n’irubere Onye Kasị Ihe Nile Elu isi. Obi ụtọ na-adịgide adịgide na-adabere ná nguzo a nwapụtara anwapụta n’ebe Chineke nọ. (Matiu 5:3-10) Site n’itinye ihe anyị na-amụta n’ọmụmụ Bible n’ọrụ, anyị ga-azụlite “amamihe ahụ nke si n’elu bịa.” (Jemes 3:17) Ọ ga-enye anyị obi ụtọ nke ọ na-adịghị mgbe akụ̀ na ụba ga-eweta.
[Foto ndị dị na peeji nke 4, 5]
Eze Solomọn maara ihe na-eme mmadụ obi ụtọ. Ị̀ maara ya?