Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • dp isi 18 p. 306-319
  • Jehova Ekwee Daniel Nkwa Ụgwọ Ọrụ Magburu Onwe Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Ekwee Daniel Nkwa Ụgwọ Ọrụ Magburu Onwe Ya
  • Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “LAA, RUO ỌGWỤGWỤ IHE NDỊ A”
  • ỊTACHI OBI DỊ KA ONYE NA-AMỤ OKWU CHINEKE
  • DANIEL NỌGIDESIRI IKE N’EKPERE
  • ỊTACHI OBI DỊ KA ONYE NA-AKỤZI OKWU CHINEKE
  • “Ị GA-EZUKWA IKE”
  • ‘Ị GA-EGUZO ỌTỌ’
  • EBE E KEWORO NYE DANIEL NA PARADAỊS—NA EBE NKE GỊ!
  • Onye E Mere Ka Ọ Dị Ike Site n’Aka Onye Ozi Chineke Zitere
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Gị na Akwụkwọ Daniel
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Daniel
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Gị n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
dp isi 18 p. 306-319

Isi nke Iri na Asatọ

Jehova Ekwee Daniel Nkwa Ụgwọ Ọrụ Magburu Onwe Ya

1, 2. (a) Olee àgwà dị mkpa nke onye na-agba ọsọ kwesịrị inwe iji nwee ihe ịga nke ọma? (b) Olee otú Pọl onyeozi si jiri ndụ nke ikwesị ntụkwasị obi n’ozi Jehova tụnyere ịgba ọsọ?

ONYE na-agba ọsọ na-agbalị ịgbaru n’ebe njedebe ya. Ọ fọrọ ntakịrị ka ọ tụbọọ, ma ebe ọ na-ahụ ebe mgbaru ọsọ ya anya, ọ na-etinye ike ọ bụla o nwere n’ọsọ ikpeazụ ndị ahụ fọdụrụnụ. N’itinye ume ya nile, ọ gbaruo ebe njedebe ahụ n’ikpeazụ! Ihu ya na-egosi ahụ efe na mmeri. Ịtachi obi ruo ọgwụgwụ abaworo ya uru.

2 Ná ngwụsị nke Daniel isi nke 12, anyị na-ahụ ka onye amụma ahụ a hụrụ n’anya na-eru nso ebe njedebe nke “ọsọ” nke ya—ndụ ya nke ijere Jehova ozi. Mgbe o hotasịrị ihe atụ dị iche iche nke okwukwe n’etiti ndị ohu Jehova dịrị ndụ tupu oge ndị Kraịst, Pọl onyeozi dere, sị: “Ya mere ka anyị onwe anyị, ebe anyị nwere oké ìgwè ndị àmà dị otú a ndị gbara anyị gburugburu dị ka igwe ojii, ka anyị tụpụkwa ibu nile ọ bụla, ya na mmehie ahụ nke na-arapara anyị n’ahụ nke ukwuu, ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu, na-elegide Jisọs anya, bụ́ onye ndú na onye mmezu nke okwukwe anyị, Onye n’ihi ọṅụ e debere n’ihu Ya na-atachi obi [n’osisi ịta ahụhụ, NW] Ya, na-elelị ihere anya, O wee nọdụ n’aka nri nke ocheeze Chineke.”—Ndị Hibru 12:1, 2.

3. (a) Gịnị kpaliri Daniel ‘iwere ntachi obi gbaa ọsọ’? (b) Olee ihe atọ dị iche iche mmụọ ozi Jehova gwara Daniel?

3 Daniel so ‘n’oké ìgwè ndị àmà’ ahụ. Ọ bụ n’ezie onye na-aghaghị ‘iwere ntachi obi gbaa ọsọ,’ ịhụnanya dị ukwuu o nwere n’ebe Chineke nọ kpalikwara ya ime otú ahụ. Jehova ekpugheworo Daniel ihe dị ukwuu banyere ihe ga-eme gọọmenti ụwa n’ọdịnihu, ma ugbu a O ziteere ya agbamume a: “Gị onwe gị, laa, ruo ọgwụgwụ ihe ndị a: ị ga-ezukwa ike, guzo ọtọ n’ebe e keworo nye gị, n’ọgwụgwụ ụbọchị ndị a.” (Daniel 12:13) Mmụọ ozi Jehova nọ na-agwa Daniel ihe atọ dịgasị iche: (1) na Daniel ‘ga-ala ruo ọgwụgwụ ihe ndị a,’ (2) na ọ “ga-ezukwa ike,” nakwa (3) na ọ ‘ga-eguzo ọtọ’ ọzọ n’ọdịnihu. Olee otú okwu ndị a pụrụ isi gbaa ndị Kraịst ume taa ịtachi obi ruo n’ebe njedebe n’ọsọ ndụ ahụ?

“LAA, RUO ỌGWỤGWỤ IHE NDỊ A”

4. Gịnị ka mmụọ ozi Jehova bu n’uche site n’ịsị “laa, ruo ọgwụgwụ ihe ndị a,” n’ihi gịnịkwa ka nke a pụrụ ijiworị bụụrụ Daniel ihe ịma aka?

4 Gịnị ka mmụọ ozi ahụ bu n’uche mgbe ọ gwara Daniel: “Ma gị onwe gị, laa, ruo ọgwụgwụ ihe ndị a”? Ọgwụgwụ gịnị? Ebe ọ fọrọ ntakịrị ka Daniel gbaa 100 afọ, o doro anya na nke a na-ezo aka n’ọgwụgwụ nke ndụ ya, bụ́ nke yiri ka ọ dị nnọọ nso.a Mmụọ ozi ahụ nọ na-agba Daniel ume ka o jiri ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi ruo ọnwụ. Ma ime nke ahụ agaghị adịcha mfe. Daniel adịwo ndụ hụ ka a kwaturu ọchịchị Babilọn, hụkwa ka ihe fọdụrụ ná ndị Juu e mere ka ha biri n’ala ọzọ laghachiri Juda na Jerusalem. Nke ahụ aghaghị inyeworị onye amụma ahụ meworo agadi ọṅụ dị ukwuu. Otú ọ dị, ọ dịghị ihe ndekọ na-egosi na o sonyere na njem ahụ e ji ụkwụ mee. O nwekwara ike ịbụ na o mewo oké agadi ma bụrụ onye ahụ na-adịchaghị ike n’oge ahụ. Ma ọ bụ ikekwe ọ bụ uche Jehova na ọ ga-anọgide na Babilọn. Otú o sina dị, mmadụ ga na-eche ma ò wutetụrụ Daniel mgbe ndị obodo ya lawara Juda.

5. Gịnị na-egosi na Daniel tachiri obi ruo ọgwụgwụ?

5 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Daniel nwetara ike dị ukwuu site n’okwu obiọma nke mmụọ ozi ahụ: “Laa, ruo ọgwụgwụ ihe ndị a.” A pụrụ ichetara anyị ihe Jisọs Kraịst kwuru ihe dị ka narị afọ isii n’ihu: “Onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.” (Matiu 24:13) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ ihe Daniel mere. Ọ tachiri obi ruo ọgwụgwụ, jiri ikwesị ntụkwasị obi gbaa ọsọ ndụ ruo n’isi. Nke ahụ pụrụ ịbụ otu ihe mere e ji mesịa kwuo okwu ọma banyere ya n’Okwu Chineke. (Ndị Hibru 11:32, 33) Gịnị mere ka Daniel nwee ike ịtachi obi ruo ọgwụgwụ? Ihe ndekọ banyere ndụ ya na-enye anyị azịza ya.

ỊTACHI OBI DỊ KA ONYE NA-AMỤ OKWU CHINEKE

6. Olee otú anyị si mara na Daniel bụ onye ji ịdị uchu mụọ Okwu Chineke?

6 Nye Daniel, ịtachi obi ruo ọgwụgwụ gụnyere ịnọgide na-amụ ma na-atụgharị uche n’ụzọ miri emi ná nkwa Chineke ndị na-akpali akpali. Anyị maara na Daniel bụ onye ji ịdị uchu mụọ Okwu Chineke. Ma ọ bụghị ya, olee otú ọ gaara esi mara nkwa Jehova kwere Jeremaịa na ịnọ n’ala ọzọ ahụ ga-adịru afọ 70 n’ogologo? Daniel n’onwe ya dere, sị: “Mụ onwe m, . . . jiri akwụkwọ nile anyị ghọta ọnụ ọgụgụ afọ ahụ.” (Daniel 9:2; Jeremaịa 25:11, 12) O doro anya na Daniel chọpụtara akwụkwọ nile nke Okwu Chineke dị mgbe ahụ. Ihe odide Mosis, Devid, Solomọn, Aịsaịa, Jeremaịa, Ezikiel—ihe ọ bụla aka ya ruru—n’ezie mere Daniel obi ụtọ ịgụ ha na ịtụgharị uche na ha.

7. Ọ bụrụ na anyị ejiri oge anyị tụnyere oge Daniel, olee otú anyị si nọrọ n’ọnọdụ ka mma n’ihe banyere ịmụ Okwu Chineke?

7 Ịmụ Okwu Chineke, itinye uche anyị nile n’ime ya, dị oké mkpa ka anyị wee zụlite ntachi obi taa. (Ndị Rom 15:4-6; 1 Timoti 4:15) Anyị nwekwara Bible zuru ezu, bụ́ nke gụnyere ihe ndekọ nke otú e si mezuo ụfọdụ n’ime amụma Daniel ọtụtụ narị afọ mgbe e mesịrị. Ọzọkwa, anyị bụ ndị a gọziri agọzi ibi na “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a,” nke e buru amụma ya na Daniel 12:4. N’oge anyị, e jiriwo nghọta ime mmụọ gọzie ndị ahụ e tere mmanụ, ha na-enwu dị ka ogidi nke ìhè eziokwu n’ụwa a gbara ọchịchịrị. N’ihi ya, ọtụtụ n’ime amụma ndị dị omimi dị n’akwụkwọ Daniel, nke ụfọdụ n’ime ha gbagwojuru ya anya, nwere ọtụtụ ihe ọ pụtaara anyị taa. Ya mere, ka anyị nọgide na-amụ Okwu Chineke kwa ụbọchị, ghara iwere ihe ndị a dị ka ihe dị nta ma ọlị. Ime nke ahụ ga-enyere anyị aka ịtachi obi.

DANIEL NỌGIDESIRI IKE N’EKPERE

8. Olee ihe nlereanya Daniel setịpụrụ n’ihe banyere ekpere?

8 Ekpere nyekwaara Daniel aka ịtachi obi ruo ọgwụgwụ. Kwa ụbọchị ọ gakwuuru Jehova Chineke ma gwa ya okwu n’ezoghị ihe ọ bụla site n’obi jupụtara n’okwukwe na obi ike. Ọ maara na Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2; tụlee Ndị Hibru 11:6.) Mgbe obi Daniel jupụtara ná mwute n’ihi nnupụisi nke Israel, ọ gwara Jehova ihe nile dị ya n’obi. (Daniel 9:4-19) Ọbụna mgbe Daraịọs nyere iwu na ọ bụ nanị ya ka a ga-arịọ arịrịọ ruo ụbọchị 30, Daniel ekweghị ka nke ahụ mee ka ọ kwụsị ikpegara Jehova Chineke ekpere. (Daniel 6:10) Ọ̀ bụ na ọ dịghị emetụ anyị n’obi ijiri anya nke uche hụ ka agadi nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ji obi ike tachie obi n’olulu jupụtara n’ọdụm kama ịgbahapụ ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa nke ikpe ekpere? A pụghị inwe ihe ịrụ ụka ọ bụla na Daniel ji ikwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ ya, jiri obi ya nile na-ekpeku Jehova ekpere kwa ụbọchị.

9. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji were ihe ùgwù nke ikpe ekpere dị ka ihe dị nta?

9 Ikpe ekpere dị mfe. Anyị pụrụ ikpe ekpere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’oge nile, n’ebe nile, n’olu dara ụda ma ọ bụ n’ime obi. Otú ọ dị, ya adịla mgbe anyị ga-ewere ihe ùgwù a dị oké ọnụ ahịa dị ka ihe dị nta. Bible na-ejikọ ekpere na ntachi obi, nnọgidesi ike, na ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ. (Luk 18:1; Ndị Rom 12:12; Ndị Efesọs 6:18; Ndị Kọlọsi 4:2) Ọ̀ bụ na ọ dịghị ịrịba ama na anyị na onye kasị elu n’eluigwe na ala nwere ụzọ nkwurịta okwu na-enweghị ihe mgbochi, nke ghere oghe mgbe nile? Ọ na-egekwa ntị! Cheta oge Daniel kpere ekpere, Jehova ezitekwa otu mmụọ ozi ná nzaghachi. Mmụọ ozi ahụ rutere mgbe Daniel ka na-ekpe ekpere! (Daniel 9:20, 21) Oge anyị nwere ike ọ gaghị abụ oge a na-enwe ụdị nleta mmụọ ozi dị otú ahụ, ma Jehova agbanwebeghị. (Malakaị 3:6) Dị nnọọ ka ọ nụrụ ekpere Daniel, ọ ga-anụ nke anyị. Ka anyị na-ekpekwa ekpere, anyị ga-abịarukwu Jehova nso, na-enwe nkekọ nke ga-enyere anyị aka ịtachi obi ruo ọgwụgwụ, dị ka Daniel mere.

ỊTACHI OBI DỊ KA ONYE NA-AKỤZI OKWU CHINEKE

10. N’ihi gịnị ka ịkụzi eziokwu nke Okwu Chineke ji dị Daniel mkpa?

10 Daniel aghaghị ‘ịla, ruo ọgwụgwụ ihe ndị a’ n’echiche ọzọ. Ọ ghaghị ịtachi obi dị ka onye na-akụzi eziokwu ahụ. Ọ dịghị mgbe o chefuru na ya bụ otu n’ime ndị a họpụtara bụ́ ndị Akwụkwọ Nsọ kwuworo banyere ha, sị: “Unu onwe unu bụ ndị àmà m, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta, na ohu m nke M họpụtara.” (Aịsaịa 43:10) Daniel mere ihe nile ọ pụrụ ime iji rụzuo ọrụ ahụ. Eleghị anya ọrụ ya gụnyere ịkụziri ndị ala ya e ji n’ala Babilọn ihe. Anyị amakebeghị ihe banyere otú ya na ndị Juu ibe ya si mekọrịta ihe ma e wezụga mmekọrịta ya na mmadụ atọ ahụ a kpọrọ “ndị ibe ya”—Hananaịa, Mishael, na Azaraịa. (Daniel 1:7; 2:13, 17, 18) Ọbụbụenyi ha chiri anya nyeere onye nke ọ bụla n’ime ha aka nke ukwuu ịtachi obi. (Ilu 17:17) N’ịbụ onye Jehova ji nghọta pụrụ iche gọzie, Daniel nwere ihe dị ukwuu ọ ga-akụziri ndị enyi ya. (Daniel 1:17) O nwekwara ihe ndị ọzọ ọ ga-akụzi.

11. (a) Gịnị pụrụ iche banyere ọrụ Daniel? (b) Ruo n’ókè ha aṅaa ka Daniel nweruru ihe ịga nke ọma n’ịrụ ọrụ ya pụrụ iche?

11 Karịa onye amụma ọ bụla ọzọ, Daniel nwere ọrụ nke ịgbara ndị Jentaịl nwere ọkwá dị elu àmà. Ọ bụ ezie na ọ ghaghị izi ozi na-adịghị ọha mma mgbe mgbe, o mesoghị ndị ọchịchị a dị ka a ga-asị na ha na-asọ oyi ma ọ bụ na o nwere ka ha si dị ala karịa ya. O ji nkwanye ùgwù na nkà gwa ha okwu. E nwere ụfọdụ—dị ka ndị nnọchianya ahụ na-ekwo ekworo, na-akpa nkata arụrụala—ndị chọrọ ịla Daniel n’iyi. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị ọzọ nwere ọkwá dị elu kwanyeere ya ùgwù. N’ihi na Jehova mere ka Daniel nwee ike ịkọwa ihe nzuzo ndị gbagwojuru ndị eze na ndị maara ihe anya, onye amụma ahụ ghọrọ onye a ma ama nke ukwuu. (Daniel 2:47, 48; 5:29) N’eziokwu, ka ọ na-eme agadi, ọ pụkwaghị ịdị gara gara otú ọ dị n’oge ntorobịa ya. Ma n’ezie o ruru ọgwụgwụ ya ka nọgide jiri ikwesị ntụkwasị obi na-achọ ụzọ ọ bụla ọ pụrụ isi jee ozi dị ka onye na-agbara Chineke ya ọ hụrụ n’anya àmà.

12. (a) Olee ọrụ izi ihe anyị na-arụ taa dị ka ndị Kraịst? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gbasoo ndụmọdụ Pọl bụ́ ‘ijegharị n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ’?

12 N’ọgbakọ ndị Kraịst taa, anyị pụrụ ịchọta ndị enyi kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịtachi obi, dị nnọọ ka Daniel na ndị òtù ya atọ nyerịtaara ibe ha aka. Anyị na-akụzikwara ibe anyị ihe, ‘na-akasirịta ibe anyị obi.’ (Ndị Rom 1:11, 12) Dị ka Daniel, e nyere anyị ọrụ ịgbara ndị na-ekweghị ekwe àmà. (Matiu 24:14; 28:19, 20) N’ihi ya ọ dị anyị mkpa ịmụcha nkà anyị ka anyị wee “na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahụ” n’ịgwa ndị mmadụ okwu banyere Jehova. (2 Timoti 2:15) Ọ ga-enyekwa aka ma ọ bụrụ na anyị erube isi ná ndụmọdụ Pọl: “Na-ejegharịnụ n’amamihe n’ebe ndị nọ n’èzí nọ.” (Ndị Kọlọsi 4:5) Ụdị amamihe ahụ na-agụnye inwe echiche ziri ezi banyere ndị anyị na ha na-anọghị n’otu okpukpe. Anyị adịghị eleda ndị dị otú ahụ anya, na-ewere onwe anyị dị ka ndị ka elu. (1 Pita 3:15) Kama nke ahụ, anyị na-achọ ịdọta ha n’eziokwu ahụ, na-eji akọ na nkà eji Okwu Chineke eme ihe ka anyị wee ruo n’obi ha. Mgbe anyị nweliri ike iru n’obi mmadụ, lee ọṅụ nke a na-enye anyị! Ụdị ọṅụ ahụ na-enyere anyị aka n’ezie ịtachi obi ruo ọgwụgwụ, dị ka Daniel tachiri.

“Ị GA-EZUKWA IKE”

13, 14. N’ihi gịnị ka atụmanya nke ịnwụ anwụ ji tụọ ọtụtụ ndị Babilọn ụjọ, oleekwa otú echiche Daniel si dị iche?

13 Mmụọ ozi ahụ gara n’ihu imesi Daniel obi ike, sị: “Ị ga-ezukwa ike.” (Daniel 12:13) Gịnị ka okwu ndị ahụ pụtara? Daniel maara na ya na-aga ịnwụ. Ọnwụ abụrụwo ọgwụgwụ a na-apụghị ịgbanahụ agbanahụ nye mmadụ nile, malite n’oge Adam ruo n’oge anyị. N’ụzọ kwesịrị ekwesị Bible kpọrọ ọnwụ “onye iro.” (1 Ndị Kọrint 15:26) Otú ọ dị, nye Daniel, atụmanya nke ịnwụ anwụ pụtara nnọọ ihe dị iche site n’ihe ọ pụtaara ndị Babilọn gbara ya gburugburu. Nye ha, n’ịbụ ndị mikpuru onwe ha n’ife ihe dị ka chi ụgha 4,000, ọnwụ na-emenye ụjọ nke ukwuu. Ha kweere na mgbe a nwụsịrị, ndị biri ndụ na-adịghị ụtọ ma ọ bụ ndị nwụrụ ọnwụ ike na-aghọ ndị mmụọ na-achọ ịbọ ọ́bọ̀ bụ́ ndị na-achụgharị ndị dị ndụ. Ndị Babilọn kwekwara n’ala mmụọ na-atụ ụjọ, nke ajọ anụ ndị dị n’ụdị mmadụ na anụmanụ bijuru.

14 Nye Daniel, ọnwụ apụtaghị ihe ndị ahụ. Ọtụtụ narị afọ tupu oge Daniel, Chineke enyewo Eze Solomọn ike mmụọ nsọ ikwu, sị: “Ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5) Banyekwara onye nwụrụ anwụ, ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.” (Abụ Ọma 146:4) N’ihi ya Daniel maara na okwu mmụọ ozi ahụ gwara ya ga-emezu. Ọnwụ pụtara ezumike. E nweghị echiche ọ bụla, oké mwute, mmekpa ahụ—n’eziekwa, e nweghị ajọ anụ ọ bụla. Jisọs Kraịst kwuru ihe yiri nke ahụ mgbe Lazarọs nwụrụ. Ọ sịrị: “Enyi anyị Lazarọs adawo n’ụra.”—Jọn 11:11.

15. Olee otú ụbọchị ọnwụ mmadụ pụrụ isi kara ụbọchị ọmụmụ mma?

15 Tụlee ihe ọzọ mere atụmanya nke ịnwụ anwụ atụghị Daniel ụjọ. Okwu Chineke na-asị: “Ezi aha dị mma karịa ezi mmanụ otite na-esi ísì ụtọ; ọzọ, ụbọchị ọnwụ mmadụ dị mma karịa ụbọchị a mụrụ ya.” (Eklisiastis 7:1) Olee otú ụbọchị ọnwụ mmadụ, oge iru újú n’ezie, ga-esi kara ụbọchị ọmụmụ na-enye ọṅụ mma? Isi ihe dị na ya bụ “aha.” “Ezi mmanụ otite na-esi ísì ụtọ” pụrụ ịdị oké ọnụ nke ukwuu. N’otu mgbe, nwanne Lazarọs bụ́ Meri tere ụkwụ Jisọs mmanụ na-esi ísì ụtọ nke ọnụ ego ya fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụgwọ ọrụ otu afọ! (Jọn 12:1-7) Olee otú aha nkịtị pụrụ isi dị oké ọnụ ahịa otú a? Eklisiastis 7:1 sịrị “ezi aha.” Ọ bụghị nanị aha kama ihe ọ nọchiri anya ya bụ nke bara nnukwu uru. Mgbe a mụrụ onye na-aza aha ahụ, ọ dịghị aha ọma, ihe ndekọ nke ezi ọrụ, ihe ncheta dị oké ọnụ ahịa nke àgwà na omume o nwere. Ma mgbe ọ nwụrụ, aha ya na-egosipụta ihe ndị a nile. Ọ bụrụkwa na ọ bụ aha ọma n’anya Chineke, ọ dị oké ọnụ ahịa nke ukwuu karịa ka ihe onwunwe ọ bụla pụrụ ịdị.

16. (a) Olee otú Daniel si gbalịa inwe ezi aha n’ebe Chineke nọ? (b) N’ihi gịnị ka Daniel pụrụ iji gaa zuo ike na-enwe nnọọ obi ike na o meworo onwe ya ezi aha n’ebe Jehova nọ?

16 Ná ndụ ya nile, Daniel mere ihe nile o nwere ike iji meere onwe ya aha ọma n’ebe Chineke nọ, Jehova echezọghịkwa ihe ndị a. O legidere Daniel anya ma nyochaa obi ya. Chineke meere Eze Devid otu ihe ahụ, bụ́ onye bụrụ, sị: “Jehova, I gwupụtawo ala obi m, I wee mara m. Gị onwe gị amawo nnọdụ ala m na mbili ọtọ m, Ị na-aghọta echiche m nile site n’ebe dị anya.” (Abụ Ọma 139:1, 2) N’eziokwu, Daniel ezughị okè. Ọ bụ nwa Adam onye mmehie, ọ bụkwa nwa amaala nke mba na-eme mmehie. (Ndị Rom 3:23) Ma Daniel chegharịrị site n’omume mmehie ya ma nọgide na-agbalị isoro Chineke ya na-ejegharị n’ụzọ kwụ ọtọ. N’ihi ya onye amụma ahụ kwesịrị ntụkwasị obi pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-agbaghara ya mmehie ya, ọ gaghịkwa eweso ya iwe. (Abụ Ọma 103:10-14; Aịsaịa 1:18) Ọ na-amasị Jehova icheta ọrụ ọma nke ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi. (Ndị Hibru 6:10) N’ihi nke a, ugboro abụọ mmụọ ozi Jehova kpọrọ Daniel “onye bụ ihe a na-achọsi ike nke ukwuu.” (Daniel 10:11, 19) Nke a pụtara na Chineke hụrụ Daniel n’anya nke ukwuu. Daniel pụrụ ịga zuo ike n’afọ ojuju, na-amara na ya enwetawo aha ọma n’ebe Jehova nọ.

17. N’ihi gịnị ka o ji dị oké ngwa na anyị meere onwe anyị ezi aha n’ebe Jehova nọ taa?

17 Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịjụ, sị, ‘M̀ meworo onwe m aha ọma n’ebe Jehova nọ?’ Anyị bi n’oge jupụtara ná nsogbu. Ọ bụghị ịtụ ụjọ na-enweghị isi kama nanị ihe ezi uche dị na ya ịghọta na ọnwụ pụrụ igbu onye ọ bụla n’ime anyị oge ọ bụla. (Eklisiastis 9:11) Mgbe ahụ, lee ka o si dị oké mkpa na onye ọ bụla n’ime anyị kpebiri imere onwe ya aha ọma n’ebe Chineke nọ ugbu a, n’egbughị oge. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ọ dịghị anyị mkpa ịtụwa ụjọ ọnwụ. Ọ bụ nanị izu ike—dị ka ihi ụra. Dịkwa ka ihi ụra, ihe na-esochi ya bụ nteta!

‘Ị GA-EGUZO ỌTỌ’

18, 19. (a) Gịnị ka mmụọ ozi ahụ bu n’uche mgbe o buru amụma na Daniel ‘ga-eguzo ọtọ’ n’ọdịnihu? (b) N’ihi gịnị ka Daniel na-aghaghị ijiworị mara banyere olileanya mbilite n’ọnwụ?

18 Akwụkwọ Daniel ji otu n’ime nkwa kasị mma Chineke kwetụworo mmadụ mechie. Mmụọ ozi Jehova gwara Daniel, sị: ‘Ị ga-eguzo ọtọ n’ebe e keworo nye gị, n’ọgwụgwụ ụbọchị ndị a.’ Gịnị ka mmụọ ozi ahụ bu n’uche? Ebe ‘izu ike’ ọ ka zosịrị aka na ya bụ ọnwụ, nkwa bụ́ na Daniel ‘ga-eguzo ọtọ’ n’ọdịnihu pụrụ nanị ịpụta otu ihe—mbilite n’ọnwụ!b N’ezie, ụfọdụ ndị ọkà mmụta ekwuwo na Daniel isi nke 12 nwere izo aka mbụ doro anya e zoro ná mbilite n’ọnwụ n’ime Akwụkwọ Nsọ Hibru. (Daniel 12:2) Otú ọ dị, ha ekwuteghị nke a. Daniel maara olileanya mbilite n’ọnwụ nke ọma.

19 Dị ka ihe atụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na Daniel maara okwu ndị a nke Aịsaịa dekọrọ narị afọ abụọ tupu mgbe ahụ: “Ndị Gị ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ; ozu m nile ga-ebili. Tetanụ, tie mkpu ọṅụ, unu ndị bi n’ájá: n’ihi na . . . ala ga-amụpụtakwa ndị na-adịghị ndụ.” (Aịsaịa 26:19) Ogologo oge tupu mgbe ahụ, Jehova nyere Elaịja na Elaịsha ike ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ. (1 Ndị Eze 17:17-24; 2 Ndị Eze 4:32-37) Ọbụna tupu oge ahụ, Hana, nne onye amụma bụ́ Samuel, kwetara na Jehova nwere ike isite na Sheol, ili, kpọlite ndị mmadụ. (1 Samuel 2:6) Tupu mgbe ahụkwa, Job kwesịrị ntụkwasị obi kwupụtara olileanya nke ya n’okwu ndị a: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ? Ụbọchị nile nke obubuagha m ka m ga-eche, ruo mgbe mgbanwe m ga-abịa. Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa Gị: agụụ ọrụ aka Gị ga-agụ Gị.”—Job 14:14, 15.

20, 21. (a) Mbilite n’ọnwụ dị aṅaa ka Daniel ji n’aka na ọ ga-eso na ya? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka o yiri ka mbilite n’ọnwụ nke ga-adị n’ime Paradaịs ga-esi were ọnọdụ?

20 Dị ka Job, Daniel nwere ihe mere ọ ga-eji nwee obi ike na ọ ga-agụ Jehova agụụ n’ezie ịkpọghachite ya ná ndụ otu ụbọchị n’ọdịnihu. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ghaghị ịbụworị ihe na-akasi obi nke ukwuu ịnụ ka mmụọ e kere eke dị ike na-akwado olileanya ahụ. Ee, Daniel ga-eguzo ọtọ “ná mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume,” nke ga-ewere ọnọdụ n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst. (Luk 14:14) Gịnị ka nke ahụ ga-abụrụ Daniel? Okwu Chineke na-agwa anyị ihe dị ukwuu banyere ya.

21 Jehova “abụghị Chineke nke aghara, kama Ọ bụ Chineke nke udo.” (1 Ndị Kọrint 14:33) Mgbe ahụ, o doro anya na mbilite n’ọnwụ ahụ nke ga-adị n’ime Paradaịs ga-ewere ọnọdụ n’usoro. Eleghị anya oge ụfọdụ ga-agafeworị mgbe Amagedọn gasịrị. (Mkpughe 16:14, 16) A ga-ewepụworị ihe nile fọdụrụ n’usoro ihe ochie a, o dokwara anya na a ga-emeworị ndokwa dị iche iche iji nabataghachi ndị nwụrụ anwụ. A bịa n’ihe banyere usoro nke ndị nwụrụ anwụ ga-eji alọghachi, Bible na-enye ụkpụrụ a: “Mmadụ nile n’otu n’otu n’usoro nke aka ha.” (1 Ndị Kọrint 15:23) O yiri ka a bịa n’ihe banyere “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume,” a ga-ebu ụzọ kpọghachi ndị ezi omume. (Ọrụ 24:15) N’ụzọ dị otú ahụ, ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie, dị ka Daniel, ga-enwe ike inye aka ná nlekọta nke ihe a na-eme n’elu ala, gụnyere izi ọtụtụ ijeri “ndị ajọ omume” a kpọghachiri ná ndụ ihe.—Abụ Ọma 45:16.

22. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị o doro anya na Daniel ga-achọsi ike inweta azịza ha?

22 Tupu Daniel adị njikere iwere ibu ọrụ ndị dị otú ahụ, ọ ghaghị inwe ụfọdụ ajụjụ ọ ga-ajụ. E kwuwerị, banyere ụfọdụ amụma ndị dị omimi e mere ka o buo, o kwuru, sị: “Mụ onwe m wee nụ, ma adịghị m aghọta.” (Daniel 12:8) Lee obi ụtọ ọ ga-enwe ịghọta ihe omimi ndị a nke Chineke n’ikpeazụ! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ ga-achọ ịnụ ihe nile banyere Mesaịa ahụ. Daniel ga-eji oké mmasị nụ otú ike ọchịchị ụwa si pụta malite n’oge ya ruo n’oge anyị, banyere ndị bụ “ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu”—ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị nọgidesiri ike n’agbanyeghị mkpagbu na “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a”—nakwa banyere mbibi ikpeazụ nke Alaeze Mesaịa nke Chineke bibiri alaeze nile nke mmadụ.—Daniel 2:44; 7:22; 12:4.

EBE E KEWORO NYE DANIEL NA PARADAỊS—NA EBE NKE GỊ!

23, 24. (a) Olee otú ụwa Daniel ga-ahụ onwe ya n’ime ya mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ ga-esi dị iche na nke ọ mabu? (b) Daniel ọ̀ ga-enwe ọnọdụ na Paradaịs, oleekwa otú anyị si mara?

23 Daniel ga-achọ ịmara banyere ụwa nke ọ ga-achọta onwe ya na ya n’oge ahụ—ụwa nke ga-adị nnọọ iche na nke ụbọchị ya. Ihe nile banyere agha na mmegbu nke mere ka ụwa ọ maara jọọ njọ ga-apụcha. Iru újú, ọrịa, na ọnwụ agaghị adị. (Aịsaịa 25:8; 33:24) Ma a ga-enwe nri n’ụba, ọtụtụ ụlọ, na ọrụ na-enye afọ ojuju maka mmadụ nile. (Abụ Ọma 72:16; Aịsaịa 65:21, 22) Ihe a kpọrọ mmadụ ga-abụ otu ezinụlọ dị n’otu, nke nwere obi ụtọ.

24 Daniel ga-enwerịrị ọnọdụ n’ụwa ahụ. ‘Ị ga-eguzo ọtọ n’ebe e keworo nye gị,’ ka mmụọ ozi ahụ gwara ya. Okwu Hibru a sụgharịrị n’ebe a ịbụ ‘ebe e keworo’ na nke e ji eme ihe maka ibe ala nkịtị bụ otu ihe.c O nwere ike ịbụ na Daniel maara amụma Ezikiel banyere ike ala Israel ahụ e weghachiri eweghachi. (Ezikiel 47:13–48:35) Ná mmezu ya na Paradaịs, gịnị ka amụma Ezikiel na-enye echiche ya? Na ndị Chineke nile ga-enwe ọnọdụ na Paradaịs, ọbụna ala ahụ n’onwe ya abụrụ nke e kere n’usoro na n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Otú ọ dị, ebe e kenyere Daniel na Paradaịs ga-agụnye ihe karịrị ala nkịtị. Ọ ga-agụnye òkè ya ná nzube Chineke n’ebe ahụ. E ji n’aka na Daniel ga-enweta ụgwọ ọrụ e kwere ya ná nkwa.

25. (a) Olee ụfọdụ olileanya nke ndụ n’ime Paradaịs ndị masịrị gị? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Paradaịs dịịrị ndị mmadụ?

25 Otú ọ dị, gịnị banyere ebe e kenyere gị? Nkwa ndị ahụ pụkwara imezu n’isi gị. Jehova chọrọ ka ụmụ mmadụ na-erube isi “guzo ọtọ” maka ebe e kenyere ha, inwe ọnọdụ na Paradaịs. Cheedị echiche! N’ezie, ọ ga-abụ ihe obi ụtọ ịhụ Daniel ihu na ihu, tinyere ndị ikom na ndị inyom ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi n’oge Bible. Mgbe ahụ a ga-enwe imerime ndị ọzọ ga-esi n’ọnwụ lọghachi bụ́ ndị ga-achọ ka e zie ha ihe ka ha wee mara ma hụ Jehova Chineke n’anya. Jiri anya nke uche leedị onwe gị ka ị na-elekọta ebe obibi elu ala anyị ma na-enye aka ime ka ọ ghọọ paradaịs nke nwere ụdị ihe dị iche iche mara mma ndị na-adịgidekwa adịgide. Cheedị banyere ịbụ onye Jehova na-ezi ihe, ịmụta ibi ndụ otú o zubere ka ihe a kpọrọ mmadụ si bie ndụ. (Aịsaịa 11:9; Jọn 6:45) Ee, i nwere ọnọdụ na Paradaịs. Ọ bụ ezie na Paradaịs ga-ada ụfọdụ ndị taa dị ka ihe ọhụrụ, cheta na Jehova kere ihe a kpọrọ mmadụ na mbụ ibi n’ụdị ebe ahụ. (Jenesis 2:7-9) N’echiche ahụ, Paradaịs bụ ebe obibi sitere n’okike nye ọtụtụ ijeri ndị nọ n’elu ala. Ọ bụ ebe kwesịrị ha. Inweta ya ga-adị ka ịlaru ụlọ.

26. Olee otú Jehova si gosi na ọ maara na ichere maka ọgwụgwụ nke usoro ihe a adịghịrị anyị mfe?

26 Anyị na-enwe ekele dị ukwuu mgbe anyị na-eche banyere ihe a nile, ọ́ bụghị otú ahụ? Ọ̀ bụ na ọ dịghị agụsi gị agụụ ike ịnọ n’ebe ahụ? Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere o ji agụsi Ndịàmà Jehova agụụ ike ịmara mgbe ọgwụgwụ nke usoro ihe a ga-abịa! Ọ dịghị mfe ichere. Jehova maara nke ahụ, n’ihi na ọ na-agba anyị ume ka anyị “chere” mgbe ọgwụgwụ ma “ọ bụrụ na ọ laa azụ.” Ihe ọ na-ekwu bụ na ọ pụrụ iyi ka ọ na-egbu oge n’anya anyị, n’ihi na n’otu akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ, a na-emesi anyị obi ike, sị: “Ọ gaghị anọ ọdụ.” (Habakuk 2:3; tụlee Ilu 13:12.) Ee, ọgwụgwụ ahụ ga-abịa n’oge ya kpọmkwem.

27. Gịnị ka ị na-aghaghị ime iji guzoro n’ihu Chineke ruo mgbe nile ebighị ebi?

27 Gịnị ka i kwesịrị ime ka mgbe ọgwụgwụ ahụ na-eru nso? Dị ka onye amụma Jehova hụrụ n’anya bụ́ Daniel, tachie obi n’ikwesị ntụkwasị obi. Jiri ịdị uchu na-amụ Okwu Chineke. Na-ekpesi ekpere ike. Jiri ịhụnanya soro ndị kwere ekwe ibe gị na-akpakọ. Jiri ịnụ ọkụ n’obi na-akụziri ndị ọzọ eziokwu ahụ. Ka ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a na-eruwanye nso kwa ụbọchị, nọgide ná mkpebisi ike gị ịbụ ohu na-eguzosi ike n’ihe nke Onye Kasị Ihe Nile Elu na onye na-akwadosi Okwu ya ike. Gbalịsie nnọọ ike ịṅa ntị n’amụma Daniel! Ka Eze Onyenwe Anyị Jehova nyekwa gị ihe ùgwù nke iji ọṅụ guzoro n’ihu ya ruo mgbe nile ebighị ebi!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a E mewo ka Daniel gaa biri na Babylon na 617 T.O.A., eleghị anya mgbe ọ nọ n’afọ iri na ụma. Ọ natara ọhụụ a n’afọ nke atọ nke Saịrọs, ma ọ bụ na 536 T.O.A.—Daniel 10:1.

b Dị ka akwụkwọ bụ́ The Brown-Driver-Briggs Hebrew and English Lexicon si kwuo, okwu Hibru maka ‘iguzo ọtọ,’ nke e ji mee ihe n’ebe a na-ezo aka ná “ntụteghachi mgbe a nwụsịrị.”

c Okwu Hibru ahụ yiri okwu e ji eme ihe maka “nkume iyi,” ebe a na-eji obere nkume efe nza. Mgbe ụfọdụ a na-esi otú a eke ala. (Ọnụ Ọgụgụ 26:55, 56) Akwụkwọ bụ́ A Handbook on the Book of Daniel na-asị na n’ebe a okwu ahụ pụtara “ihe (Chineke) debeere mmadụ iche.”

GỊNỊ KA Ị GHỌTARA?

• Gịnị nyeere Daniel aka ịtachi obi ruo ọgwụgwụ?

• N’ihi gịnị ka atụmanya nke ịnwụ anwụ na-ejighị tụọ Daniel ụjọ?

• Olee otú a ga-esi mezuo nkwa mmụọ ozi ahụ bụ́ na Daniel ‘ga-eguzo ọtọ n’ebe e keworo nye ya’?

• Olee otú i siworo rite uru n’onwe gị site n’ịṅa ntị n’amụma Daniel?

[Foto dị na peeji nke nke 307]

[Foto dị na peeji nke 318]

Dị ka Daniel, ị̀ na-aṅa ntị n’okwu amụma Chineke?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya